Numbers 23 (BOICB)
1 Belam sịrị, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa nʼebe a. Kwadokwaara m oke ehi asaa na ebule asaa.” 2 Balak mezuru dịka Belam gwara ya. Ha abụọ gburu otu oke ehi na otu nwa ebule nʼebe ịchụ aja asaa ahụ nʼotu na otu. 3 Mgbe ahụ, Belam gwara Balak sị, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ aja gị ka m gaa nʼihu chọpụta ma eleghị anya ONYENWE ANYỊ ga-ezute m. Aga m agwa gị ihe ọbụla o kpughere m.” Ya mere, Belam rigooro nʼebe ọhịa na-adịghị. 4 Chineke zutere ya nʼebe ahụ. Belam gwara ya sị, “Edoziela m ebe ịchụ aja asaa, gbukwaa otu oke ehi na otu ebule nʼelu ha niile nʼotu na otu.” 5 Nʼoge a, ONYENWE ANYỊ tinyere Belam ozi nʼọnụ sị ya, “Laghachi gaa zie Balak ozi a.” 6 Mgbe Belam lọghachiri ọ hụrụ ya ka o guzoro nʼakụkụ ihe aja ya ndị ahụ, ya na ndịisi Moab niile. 7 Nke a bụ ozi Belam ziri:“Balak esitela nʼobodo Aram kpọta m.Eze Moab esitela nʼọwụwa anyanwụ nke ugwu ahụ kpọta m.Ọ sịrị m, bịa bụọrọ m Jekọb ọnụbịa kwutọọ Izrel. 8 M ga-esi aṅaa bụọonye Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ?M ga-esi aṅaakọchaa onye ONYENWE ANYỊ na-akọchaghị? 9 Esitela m nʼelu nkume ndị a hụ ha.Elegidere m ha anya site nʼugwu ahụ,hụ na ha bụ ndị biri onwe ha,ndị dị iche site nʼetiti mba niile ọzọ. 10 Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị?Maọbụ gụta ole otu ụzọ nʼime nkewa anọ nke Izrel dị.Ọ ga-atọ m ụtọ ịnwụ ụdị ọnwụ ndị na-eme ezi omume.Ka ọgwụgwụ ndụ m bụrụ ihe nwere ike iyi nke ha!” 11 Balak sịrị Belam, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Akpọtara m gị ka ị bụọrọ m ndị iro m ọnụ, ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ i mere karịa naanị ịgọzi ha!” 12 Ma Belam zaghachiri sị ya, “Ọ bụghị ihe ONYENWE ANYỊ tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu?” 13 Mgbe ahụ, Balak sịrị ya, “Soro m bịa nʼebe ọzọ ebe ị ga-ahụ ha; ọ bụ naanị nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ha ka ị ga-ahụ, ị gaghị ahụ ha niile. Site nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.” 14 Ya mere, eze Balak duuru Belam gaa nʼọhịa Zofim, nʼelu ugwu Pisga, wuo ebe ịchụ aja asaa nʼebe ahụ. O jikwa otu oke ehi, otu oke ehi, na otu ebule, otu ebule, chụọ aja nʼebe ịchụ aja ndị ahụ. 15 Belam sịrị Balak, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ ihe aja gị, ebe mụ onwe m ga-ezute ya nʼofe nke ọzọ.” 16 Ma ONYENWE ANYỊ zutere Belam gwa ya ihe ọ ga-ekwu sị ya, “Laghachikwuru Balak zie ya ozi a.” 17 Ya mere, ọ lọghachiri azụ nʼebe ahụ Balak na ụmụ eze Moab guzoro nʼakụkụ ihe aja ha. Balak jụrụ ya sị, “Gịnị ka ONYENWE ANYỊ sịrị?” 18 Ma Belam zaghachiri sị ya:“Bilie ọtọ Balak, nụrụ ozi.Ṅaa ntị nʼokwu m, gị nwa Zipoa. 19 Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ.Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ.O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru?O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere? 20 Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha.Ọ gọziela ha, a pụghịkwa ịgbanwe ya! 21 “O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb,ahụghịkwa mwute ọbụla nʼIzrel. ONYENWE ANYỊ Chineke ha nọnyeere ha.Iti mkpu nke Eze dịkwa nʼetiti ha. 22 Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt.Ha dị ike dịka ehi ọhịa. 23 Ọ dịghị mgbaasị ga-emegide ha.Ọ dịkwaghị ịgba afa a pụrụ iji megide Izrel.Nʼihi na ugbu a, ihe dị otu a ka a ga-ekwu banyere Jekọbna Izrel. ‘Lee, ihe Chineke mere ha.’ 24 Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm,ha na-enugharị onwe ha dịka ọdụm,nke na-adịghị edina ala tutu o richaa ihe o gburu,ma ṅụọkwa ọbara ihe ahụ o tigburu!” 25 Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Abụla ha ọnụ ma ọlị, ma ọ bụkwanụ gọzie ha ma ọlị.” 26 Ma Belam zaghachiri, “Ọ bụ na m agwaghị gị, ihe ọbụla nke ONYENWE ANYỊ ga-ekwu ka m ga-eme?” 27 Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Bịa, aga m akpọrọ gị gaa nʼebe ọzọ. Eleghị anya ọ ga-amasị Chineke ka i si nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.” 28 Ya mere, Balak duuru Belam gaa nʼelu ugwu Peoa nke na-elegide ọzara ahụ anya. 29 Belam gwara Balak okwu sị ya, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa ọzọ. Doziekwa ụmụ oke ehi asaa na ebule asaa e ji achụ aja.” 30 Balak mere dịka Belam gwara ya. O ji otu oke ehi na otu ebule chụọ aja nʼebe ịchụ aja ahụ nʼotu na otu.
In Other Versions
Numbers 23 in the ANGEFD
Numbers 23 in the ANTPNG2D
Numbers 23 in the AS21
Numbers 23 in the BAGH
Numbers 23 in the BBPNG
Numbers 23 in the BBT1E
Numbers 23 in the BDS
Numbers 23 in the BEV
Numbers 23 in the BHAD
Numbers 23 in the BIB
Numbers 23 in the BLPT
Numbers 23 in the BNT
Numbers 23 in the BNTABOOT
Numbers 23 in the BNTLV
Numbers 23 in the BOATCB
Numbers 23 in the BOATCB2
Numbers 23 in the BOBCV
Numbers 23 in the BOCNT
Numbers 23 in the BOECS
Numbers 23 in the BOGWICC
Numbers 23 in the BOHCB
Numbers 23 in the BOHCV
Numbers 23 in the BOHLNT
Numbers 23 in the BOHNTLTAL
Numbers 23 in the BOILNTAP
Numbers 23 in the BOITCV
Numbers 23 in the BOKCV
Numbers 23 in the BOKCV2
Numbers 23 in the BOKHWOG
Numbers 23 in the BOKSSV
Numbers 23 in the BOLCB
Numbers 23 in the BOLCB2
Numbers 23 in the BOMCV
Numbers 23 in the BONAV
Numbers 23 in the BONCB
Numbers 23 in the BONLT
Numbers 23 in the BONUT2
Numbers 23 in the BOPLNT
Numbers 23 in the BOSCB
Numbers 23 in the BOSNC
Numbers 23 in the BOTLNT
Numbers 23 in the BOVCB
Numbers 23 in the BOYCB
Numbers 23 in the BPBB
Numbers 23 in the BPH
Numbers 23 in the BSB
Numbers 23 in the CCB
Numbers 23 in the CUV
Numbers 23 in the CUVS
Numbers 23 in the DBT
Numbers 23 in the DGDNT
Numbers 23 in the DHNT
Numbers 23 in the DNT
Numbers 23 in the ELBE
Numbers 23 in the EMTV
Numbers 23 in the ESV
Numbers 23 in the FBV
Numbers 23 in the FEB
Numbers 23 in the GGMNT
Numbers 23 in the GNT
Numbers 23 in the HARY
Numbers 23 in the HNT
Numbers 23 in the IRVA
Numbers 23 in the IRVB
Numbers 23 in the IRVG
Numbers 23 in the IRVH
Numbers 23 in the IRVK
Numbers 23 in the IRVM
Numbers 23 in the IRVM2
Numbers 23 in the IRVO
Numbers 23 in the IRVP
Numbers 23 in the IRVT
Numbers 23 in the IRVT2
Numbers 23 in the IRVU
Numbers 23 in the ISVN
Numbers 23 in the JSNT
Numbers 23 in the KAPI
Numbers 23 in the KBT1ETNIK
Numbers 23 in the KBV
Numbers 23 in the KJV
Numbers 23 in the KNFD
Numbers 23 in the LBA
Numbers 23 in the LBLA
Numbers 23 in the LNT
Numbers 23 in the LSV
Numbers 23 in the MAAL
Numbers 23 in the MBV
Numbers 23 in the MBV2
Numbers 23 in the MHNT
Numbers 23 in the MKNFD
Numbers 23 in the MNG
Numbers 23 in the MNT
Numbers 23 in the MNT2
Numbers 23 in the MRS1T
Numbers 23 in the NAA
Numbers 23 in the NASB
Numbers 23 in the NBLA
Numbers 23 in the NBS
Numbers 23 in the NBVTP
Numbers 23 in the NET2
Numbers 23 in the NIV11
Numbers 23 in the NNT
Numbers 23 in the NNT2
Numbers 23 in the NNT3
Numbers 23 in the PDDPT
Numbers 23 in the PFNT
Numbers 23 in the RMNT
Numbers 23 in the SBIAS
Numbers 23 in the SBIBS
Numbers 23 in the SBIBS2
Numbers 23 in the SBICS
Numbers 23 in the SBIDS
Numbers 23 in the SBIGS
Numbers 23 in the SBIHS
Numbers 23 in the SBIIS
Numbers 23 in the SBIIS2
Numbers 23 in the SBIIS3
Numbers 23 in the SBIKS
Numbers 23 in the SBIKS2
Numbers 23 in the SBIMS
Numbers 23 in the SBIOS
Numbers 23 in the SBIPS
Numbers 23 in the SBISS
Numbers 23 in the SBITS
Numbers 23 in the SBITS2
Numbers 23 in the SBITS3
Numbers 23 in the SBITS4
Numbers 23 in the SBIUS
Numbers 23 in the SBIVS
Numbers 23 in the SBT
Numbers 23 in the SBT1E
Numbers 23 in the SCHL
Numbers 23 in the SNT
Numbers 23 in the SUSU
Numbers 23 in the SUSU2
Numbers 23 in the SYNO
Numbers 23 in the TBIAOTANT
Numbers 23 in the TBT1E
Numbers 23 in the TBT1E2
Numbers 23 in the TFTIP
Numbers 23 in the TFTU
Numbers 23 in the TGNTATF3T
Numbers 23 in the THAI
Numbers 23 in the TNFD
Numbers 23 in the TNT
Numbers 23 in the TNTIK
Numbers 23 in the TNTIL
Numbers 23 in the TNTIN
Numbers 23 in the TNTIP
Numbers 23 in the TNTIZ
Numbers 23 in the TOMA
Numbers 23 in the TTENT
Numbers 23 in the UBG
Numbers 23 in the UGV
Numbers 23 in the UGV2
Numbers 23 in the UGV3
Numbers 23 in the VBL
Numbers 23 in the VDCC
Numbers 23 in the YALU
Numbers 23 in the YAPE
Numbers 23 in the YBVTP
Numbers 23 in the ZBP