Psalms 11 (BOICB)
undefined Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. 1 Nʼime ONYENWE ANYỊ ka m mere ebe mgbaba m.Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị,“Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.” 2 Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha;ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha,zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ,ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta. 3 Mgbe a na-ebibi ntọala niile,gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime? 4 ONYENWE ANYỊ nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya; ONYENWE ANYỊ nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe.Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme;anya ya na-anwalekwa ụzọ ha. 5 ONYENWE ANYỊ na-ele onye ezi omume ule,ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya,ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu. 6 Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omumedịka mmiri ozuzo;oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha. 7 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ onye ezi omume,ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya;ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.