Psalms 127 (BOICB)
undefined Abụ nrigo, nke Solomọn. 1 Ọ bụrụ na ONYENWE ANYỊ ewughị ụlọ,ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.Ọ bụrụ na ONYENWE ANYỊ echeghị obodo,nʼefu ka ndị nche na-amụ anya. 2 Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụna-adọgbu onwe gị nʼọrụịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị,nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo. 3 Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka ONYENWE ANYỊ,ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye. 4 Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha,otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị. 5 Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụonye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya.Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị irona-arụrịta ụka nʼama.