Revelation 3 (BOICB)
1 “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Sardis, sị ya: Ndị a bụ okwu onye ahụ nwere mmụọ asaa nke Chineke na kpakpando asaa. Amaara m ọrụ gị niile, ị nwere aha dịka onye dị ndụ ma ị bụ onye nwụrụ anwụ. 2 Ugbu a, sị nʼụra bilite. Mee ka ihe ntakịrị ahụ fọdụrụ na-achọ ịnwụ anwụ dịrị ike. Nʼihi na ọ dịghị ọrụ gị m hụrụ dị ka ihe zuruoke nʼanya Chineke m. 3 Ya mere, cheta ihe ndị ahụ ị natara na nke ị nụrụ; rube isi nye ya, chegharịakwa. Ma ọ bụrụ na i tetaghị, aga m abịakwute gị dị ka onye ohi, ị gaghị amatakwa oge m ji bịakwute gị. 4 Otu ọ dị, i nwere ụfọdụ mmadụ na Sardis ndị na-emerụbeghị uwe ha. Ha ga-eyiri uwe ọcha ma soro m jee ije nʼihi na ha bụ ndị kwesiri ekwesi. 5 Onye ọbụla na-emeri emeri, ka a ga-eyikwasị uwe mwụda ọcha dịka ha. Agaghị m ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, kama aga m ekwupụtakwa aha ahụ nʼihu Nna m na nʼihu ndị mmụọ ozi niile. 6 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ nsọ na-agwa nzukọ niile. 7 “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Filadelfia, sị ya: Ndị a bụ okwu onye dị nsọ na onye eziokwu, onye ahụ ji ọtụghe igodo Devid, nke o ji emeghepụ ihe onye ọbụla na-apụghị imechi, na nke o ji emechi ihe onye ọbụla na-apụghị imeghe. 8 Amaara m ọrụ gị niile. Lee, edebela m nʼihu gị ọnụ ụzọ nke e meghere emeghe, nke onye ọbụla na-apụghị imechi. Amaara m na i nwere ike dị ntakịrị, ma i debere okwu m, ị gọnarịkwaghị aha m. 9 Aga m eme ka ndị ahụ so na nzukọ ekwensu, bụ ndị na-asị na ha bụ ndị Juu ma ha abụghị, kama ha bụ ndị ụgha, aga m eme ka ha bịa kpọọ isiala nye gị, si otu a ghọta na ahụrụ m gị nʼanya. 10 Ebe i sitere na ntachiobi sọpụrụ okwu m niile, aga m ekpuchi gị site nʼoke mkpagbu ahụ, nke ga-abịakwasị ụwa mgbe a ga-anwale ndị niile bi nʼime ya. 11 Ana m abịa ọsịịsọ. Jidesienụ ihe unu nwere aka ike, ka onye ọbụla ghara ịnapụ gị okpueze gị. 12 Ma onye ọbụla na-emeri emeri, ka m ga-eme ka ọ bụrụ ogidi nʼime ụlọnsọ Chineke m. Ọ gaghị esikwa nʼebe ahụ pụọ apụọ. Aga m edekwasịkwa aha Chineke m nʼahụ, na aha obodo nsọ Chineke, nke bụ Jerusalem ọhụrụ ahụ si nʼeluigwe, ebe Chineke nọ na-arịdata. Aha ọhụrụ m ka a ga-edekwasịkwa nʼihu ya. 13 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. 14 “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Laodisia, sị ya: Ndị a bụ okwu Amen, onye kwesiri ntụkwasị obi, na onye bụ ezi onyeama, bụrụkwa isi mmalite ihe niile Chineke kere. 15 Amaara m ọrụ gị niile, na ị jụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ. Ọ gaara adị nnọọ mma ma asị na ị na-ajụ oyi ma ọ bụkwanụ na-ekpo ọkụ. 16 Nʼihi nke a, ebe ị na-ajụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ, ihe ị dị bụ ṅaraṅara. Nʼihi ya, aga m esi nʼọnụ m gbụpụ gị. 17 Nʼihi na ị na-asị, ‘abụ m ọgaranya, nwezuo ihe niile. Mkpa ihe ọbụla akpakwaghị m.’ Ma ị ghọtaghị na onye gba aka ka ị bụ. Ị bụ onye e kwesiri imere ebere. Ị bụkwa ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ. 18 Ana m adụ gị ọdụ ka ịzụta ezigbo ọlaedo nʼaka m, bụ ọlaedo a nụchara anụcha nʼime ọkụ. Mgbe ahụ, ị ga-abụkwa ọgaranya nʼezie. Ị gaara esitekwa nʼaka m zụta akwa ọcha na-enweghị ntụpọ ka ị ghara ịgba ọtọ, ka ihere gharakwa ime gị. Ka ị zụrụkwa ezigbo ọgwụ ọrịa anya tee, ka ibido ịhụ ụzọ nke ọma. 19 Ndị m hụrụ nʼanya ka m na-abara mba na-enyekwa ha ahụhụ. Ya mere, nwee ịnụ ọkụ nʼobi, chegharịakwa. 20 Lee, ana m eguzo nʼọnụ ụzọ na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọbụla anụ olu m ma meghee ụzọ, aga m abata soro ya rikọọ ihe, ya onwe ya ga-esokwa m rie ihe. 21 Onye ọbụla na-emeri emeri, ka mụ ga-enye ikike ka o soro m nọdụ nʼocheeze m. Ọ bụladị dịka m meriri sorokwa Nna m nọdụ nʼocheeze ya. 22 Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.”
In Other Versions
Revelation 3 in the ANGEFD
Revelation 3 in the ANTPNG2D
Revelation 3 in the AS21
Revelation 3 in the BAGH
Revelation 3 in the BBPNG
Revelation 3 in the BBT1E
Revelation 3 in the BDS
Revelation 3 in the BEV
Revelation 3 in the BHAD
Revelation 3 in the BIB
Revelation 3 in the BLPT
Revelation 3 in the BNT
Revelation 3 in the BNTABOOT
Revelation 3 in the BNTLV
Revelation 3 in the BOATCB
Revelation 3 in the BOATCB2
Revelation 3 in the BOBCV
Revelation 3 in the BOCNT
Revelation 3 in the BOECS
Revelation 3 in the BOGWICC
Revelation 3 in the BOHCB
Revelation 3 in the BOHCV
Revelation 3 in the BOHLNT
Revelation 3 in the BOHNTLTAL
Revelation 3 in the BOILNTAP
Revelation 3 in the BOITCV
Revelation 3 in the BOKCV
Revelation 3 in the BOKCV2
Revelation 3 in the BOKHWOG
Revelation 3 in the BOKSSV
Revelation 3 in the BOLCB
Revelation 3 in the BOLCB2
Revelation 3 in the BOMCV
Revelation 3 in the BONAV
Revelation 3 in the BONCB
Revelation 3 in the BONLT
Revelation 3 in the BONUT2
Revelation 3 in the BOPLNT
Revelation 3 in the BOSCB
Revelation 3 in the BOSNC
Revelation 3 in the BOTLNT
Revelation 3 in the BOVCB
Revelation 3 in the BOYCB
Revelation 3 in the BPBB
Revelation 3 in the BPH
Revelation 3 in the BSB
Revelation 3 in the CCB
Revelation 3 in the CUV
Revelation 3 in the CUVS
Revelation 3 in the DBT
Revelation 3 in the DGDNT
Revelation 3 in the DHNT
Revelation 3 in the DNT
Revelation 3 in the ELBE
Revelation 3 in the EMTV
Revelation 3 in the ESV
Revelation 3 in the FBV
Revelation 3 in the FEB
Revelation 3 in the GGMNT
Revelation 3 in the GNT
Revelation 3 in the HARY
Revelation 3 in the HNT
Revelation 3 in the IRVA
Revelation 3 in the IRVB
Revelation 3 in the IRVG
Revelation 3 in the IRVH
Revelation 3 in the IRVK
Revelation 3 in the IRVM
Revelation 3 in the IRVM2
Revelation 3 in the IRVO
Revelation 3 in the IRVP
Revelation 3 in the IRVT
Revelation 3 in the IRVT2
Revelation 3 in the IRVU
Revelation 3 in the ISVN
Revelation 3 in the JSNT
Revelation 3 in the KAPI
Revelation 3 in the KBT1ETNIK
Revelation 3 in the KBV
Revelation 3 in the KJV
Revelation 3 in the KNFD
Revelation 3 in the LBA
Revelation 3 in the LBLA
Revelation 3 in the LNT
Revelation 3 in the LSV
Revelation 3 in the MAAL
Revelation 3 in the MBV
Revelation 3 in the MBV2
Revelation 3 in the MHNT
Revelation 3 in the MKNFD
Revelation 3 in the MNG
Revelation 3 in the MNT
Revelation 3 in the MNT2
Revelation 3 in the MRS1T
Revelation 3 in the NAA
Revelation 3 in the NASB
Revelation 3 in the NBLA
Revelation 3 in the NBS
Revelation 3 in the NBVTP
Revelation 3 in the NET2
Revelation 3 in the NIV11
Revelation 3 in the NNT
Revelation 3 in the NNT2
Revelation 3 in the NNT3
Revelation 3 in the PDDPT
Revelation 3 in the PFNT
Revelation 3 in the RMNT
Revelation 3 in the SBIAS
Revelation 3 in the SBIBS
Revelation 3 in the SBIBS2
Revelation 3 in the SBICS
Revelation 3 in the SBIDS
Revelation 3 in the SBIGS
Revelation 3 in the SBIHS
Revelation 3 in the SBIIS
Revelation 3 in the SBIIS2
Revelation 3 in the SBIIS3
Revelation 3 in the SBIKS
Revelation 3 in the SBIKS2
Revelation 3 in the SBIMS
Revelation 3 in the SBIOS
Revelation 3 in the SBIPS
Revelation 3 in the SBISS
Revelation 3 in the SBITS
Revelation 3 in the SBITS2
Revelation 3 in the SBITS3
Revelation 3 in the SBITS4
Revelation 3 in the SBIUS
Revelation 3 in the SBIVS
Revelation 3 in the SBT
Revelation 3 in the SBT1E
Revelation 3 in the SCHL
Revelation 3 in the SNT
Revelation 3 in the SUSU
Revelation 3 in the SUSU2
Revelation 3 in the SYNO
Revelation 3 in the TBIAOTANT
Revelation 3 in the TBT1E
Revelation 3 in the TBT1E2
Revelation 3 in the TFTIP
Revelation 3 in the TFTU
Revelation 3 in the TGNTATF3T
Revelation 3 in the THAI
Revelation 3 in the TNFD
Revelation 3 in the TNT
Revelation 3 in the TNTIK
Revelation 3 in the TNTIL
Revelation 3 in the TNTIN
Revelation 3 in the TNTIP
Revelation 3 in the TNTIZ
Revelation 3 in the TOMA
Revelation 3 in the TTENT
Revelation 3 in the UBG
Revelation 3 in the UGV
Revelation 3 in the UGV2
Revelation 3 in the UGV3
Revelation 3 in the VBL
Revelation 3 in the VDCC
Revelation 3 in the YALU
Revelation 3 in the YAPE
Revelation 3 in the YBVTP
Revelation 3 in the ZBP