Revelation 9 (BOICB)

1 Mgbe mmụọ ozi nke ise ahụ fụrụ opi ike ya, ahụrụ m otu kpakpando si nʼeluigwe daa nʼala. E nyere ya ihe ọtụghe igodo nke e ji atụghe olulu nke Abis ahụ. 2 Mgbe o meghere olulu Abis ahụ, anwụrụ ọkụ dị ukwu sitere nʼime ya pụta dịka anwụrụ ọkụ si nʼọkụ icheku ọkụ ya dị ukwuu, mee ka oke ọchịchịrị kpuchie ihu anyanwụ na mbara eluigwe. 3 Igurube sitere nʼanwụrụ ọkụ ahụ pụta fedakwasa ụwa. E nyekwara ha ike ịta mmadụ ọbụla dịka akpị si agba mmadụ. 4 E nyere ha iwu si ha emebila ahịhịa ndụ ọbụla, maọbụ osisi na ihe ọbụla a kụrụ nʼala. Kama ọrụ ha bụ ịbịakwasị mmadụ ọbụla na-enweghị akara Chineke nʼegedege ihu ya. 5 Iwu e nyere ha abụghị ka ha gbuo ndị a, kama ọ bụ ka ha mekpaa ha ahụ ọnwa ise. Mmekpa ahụ ha dịka ahụ ụfụ na nhụju anya nke akpị mgbe ọ gbara mmadụ. 6 Nʼime ụbọchị ndị ahụ, ọtụtụ mmadụ ga-achọ iji aka ha gbuo onwe ha ma ha agaghị enwe ike mee ya. Agụụ ịnwụ ọnwụ ga-agụ ha, ma ọnwụ ga-esi nʼebe ha nọ wezuga onwe ya. 7 Igurube ndị a nwere oyiyi dị ka ịnyịnya a kwadebere maka ibu agha. Ha nwere ihe yiri okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha. Ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ. 8 Agịrị isi ha dịka agịrị isi ụmụ nwanyị. Eze ha dịkwa ka eze ọdụm. 9 Ha yikwasịrị onwe ha ihe ikpuchi obi dịka nke e ji igwe kpụọ. Nku ha na-eme mkpọtụ dị ka ụda nzọ ụkwụ ọtụtụ ịnyịnya nke ụgbọ agha na-esekpu na-abanye nʼọgbọ agha. 10 Ha nwere ọdụdụ dịka akpị. Ma ike niile e nyere ha bụ imerụ ndị mmadụ ahụ ọnwa ise site nʼike dị nʼọdụdụ ha. 11 Ha nwere mmụọ ozi nke Abis, onye na-achịkọta ha dịka eze. Aha ya nʼasụsụ Hibru bụ Abadọn, ma nʼasụsụ Griik ọ bụ Apolion. 12 Ahụhụ nke mbụ agafeela, ebe ahụhụ abụọ ọzọ na-abịa nʼihu. 13 Mgbe mmụọ ozi nke isii fụrụ opi ike ya, anụrụ m olu sitere na mpi anọ ahụ dị nʼebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo wuo, nke dị nʼihu ocheeze Chineke, 14 na-agwa mmụọ ozi nke isii ahụ, nke ji opi ike okwu, “Tọpụ mmụọ ozi anọ ndị ahụ e kere agbụ nʼebe osimiri Yufretis dị.” 15 A tọhapụrụ ndị mmụọ ozi anọ ahụ, ndị e jibu eji na njikere maka oge awa ahụ, na ụbọchị ahụ, na ọnwa ahụ, na afọ ahụ, iji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ. 16 Ndị agha ahụ, ọnụọgụgụ ha bụ narị nde abụọ. Anụrụ m mgbe e kwuru ole ha dị. 17 Nʼime ọhụ m, ahụrụ m ịnyịnya ha, hụkwa ndị nọkwasịrị ha nʼelu. Ndị nọ nʼelu ịnyịnya ndị a yi ihe ikpuchi obi nke ụfọdụ nʼime ha na-acha ọbara ọbara. Ụfọdụ na-acha dịka akpụkpọ eluigwe, ụfọdụ na-acha odo odo. Ụfọdụ na-acha dịka anwụrụ ọkụ. Isi ịnyịnya ha dịka isi ọdụm, anwụrụ ọkụ na ọkụ na nkume ọkụ sị ha nʼọnụ na-apụta. 18 E sitere nʼihe mmekpa ahụ ndị a, ire ọkụ, anwụrụ ọkụ na nkume ọkụ na-adịghị anyụ anyụ, ka ha ji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ niile bi nʼụwa. 19 Ike ịnyịnya ndị a dị nʼọnụ ha, na ọdụdụ ha. Ọdụdụ ha dị ka agwọ, nwee isi agwọ nke ha ji emerụ mmadụ ahụ. 20 Ma ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ, bụ ndị a na-egbughị site nʼihe ntaramahụhụ ọrịa ndị a, echegharịghị site nʼọrụ aka ha maọbụ ịkwụsị ife mmụọ ọjọọ ofufe. Ha jụkwara ịkwụsị ife arụsị ha niile nke ha ji ọlaedo na ọlaọcha na bronz na igwe na nkume na osisi kpụọ. Chi ndị na-apụghị ịhụ ụzọ, maọbụ ịnụ ihe, maọbụ ije ije. 21 Ha echegharịghị site nʼigbu mmadụ ha, maọbụ ụzọ mgbaasị ha, maọbụ ndụ ịkwa iko ha, na izu ohi ha pụta.

In Other Versions

Revelation 9 in the ANGEFD

Revelation 9 in the ANTPNG2D

Revelation 9 in the AS21

Revelation 9 in the BAGH

Revelation 9 in the BBPNG

Revelation 9 in the BBT1E

Revelation 9 in the BDS

Revelation 9 in the BEV

Revelation 9 in the BHAD

Revelation 9 in the BIB

Revelation 9 in the BLPT

Revelation 9 in the BNT

Revelation 9 in the BNTABOOT

Revelation 9 in the BNTLV

Revelation 9 in the BOATCB

Revelation 9 in the BOATCB2

Revelation 9 in the BOBCV

Revelation 9 in the BOCNT

Revelation 9 in the BOECS

Revelation 9 in the BOGWICC

Revelation 9 in the BOHCB

Revelation 9 in the BOHCV

Revelation 9 in the BOHLNT

Revelation 9 in the BOHNTLTAL

Revelation 9 in the BOILNTAP

Revelation 9 in the BOITCV

Revelation 9 in the BOKCV

Revelation 9 in the BOKCV2

Revelation 9 in the BOKHWOG

Revelation 9 in the BOKSSV

Revelation 9 in the BOLCB

Revelation 9 in the BOLCB2

Revelation 9 in the BOMCV

Revelation 9 in the BONAV

Revelation 9 in the BONCB

Revelation 9 in the BONLT

Revelation 9 in the BONUT2

Revelation 9 in the BOPLNT

Revelation 9 in the BOSCB

Revelation 9 in the BOSNC

Revelation 9 in the BOTLNT

Revelation 9 in the BOVCB

Revelation 9 in the BOYCB

Revelation 9 in the BPBB

Revelation 9 in the BPH

Revelation 9 in the BSB

Revelation 9 in the CCB

Revelation 9 in the CUV

Revelation 9 in the CUVS

Revelation 9 in the DBT

Revelation 9 in the DGDNT

Revelation 9 in the DHNT

Revelation 9 in the DNT

Revelation 9 in the ELBE

Revelation 9 in the EMTV

Revelation 9 in the ESV

Revelation 9 in the FBV

Revelation 9 in the FEB

Revelation 9 in the GGMNT

Revelation 9 in the GNT

Revelation 9 in the HARY

Revelation 9 in the HNT

Revelation 9 in the IRVA

Revelation 9 in the IRVB

Revelation 9 in the IRVG

Revelation 9 in the IRVH

Revelation 9 in the IRVK

Revelation 9 in the IRVM

Revelation 9 in the IRVM2

Revelation 9 in the IRVO

Revelation 9 in the IRVP

Revelation 9 in the IRVT

Revelation 9 in the IRVT2

Revelation 9 in the IRVU

Revelation 9 in the ISVN

Revelation 9 in the JSNT

Revelation 9 in the KAPI

Revelation 9 in the KBT1ETNIK

Revelation 9 in the KBV

Revelation 9 in the KJV

Revelation 9 in the KNFD

Revelation 9 in the LBA

Revelation 9 in the LBLA

Revelation 9 in the LNT

Revelation 9 in the LSV

Revelation 9 in the MAAL

Revelation 9 in the MBV

Revelation 9 in the MBV2

Revelation 9 in the MHNT

Revelation 9 in the MKNFD

Revelation 9 in the MNG

Revelation 9 in the MNT

Revelation 9 in the MNT2

Revelation 9 in the MRS1T

Revelation 9 in the NAA

Revelation 9 in the NASB

Revelation 9 in the NBLA

Revelation 9 in the NBS

Revelation 9 in the NBVTP

Revelation 9 in the NET2

Revelation 9 in the NIV11

Revelation 9 in the NNT

Revelation 9 in the NNT2

Revelation 9 in the NNT3

Revelation 9 in the PDDPT

Revelation 9 in the PFNT

Revelation 9 in the RMNT

Revelation 9 in the SBIAS

Revelation 9 in the SBIBS

Revelation 9 in the SBIBS2

Revelation 9 in the SBICS

Revelation 9 in the SBIDS

Revelation 9 in the SBIGS

Revelation 9 in the SBIHS

Revelation 9 in the SBIIS

Revelation 9 in the SBIIS2

Revelation 9 in the SBIIS3

Revelation 9 in the SBIKS

Revelation 9 in the SBIKS2

Revelation 9 in the SBIMS

Revelation 9 in the SBIOS

Revelation 9 in the SBIPS

Revelation 9 in the SBISS

Revelation 9 in the SBITS

Revelation 9 in the SBITS2

Revelation 9 in the SBITS3

Revelation 9 in the SBITS4

Revelation 9 in the SBIUS

Revelation 9 in the SBIVS

Revelation 9 in the SBT

Revelation 9 in the SBT1E

Revelation 9 in the SCHL

Revelation 9 in the SNT

Revelation 9 in the SUSU

Revelation 9 in the SUSU2

Revelation 9 in the SYNO

Revelation 9 in the TBIAOTANT

Revelation 9 in the TBT1E

Revelation 9 in the TBT1E2

Revelation 9 in the TFTIP

Revelation 9 in the TFTU

Revelation 9 in the TGNTATF3T

Revelation 9 in the THAI

Revelation 9 in the TNFD

Revelation 9 in the TNT

Revelation 9 in the TNTIK

Revelation 9 in the TNTIL

Revelation 9 in the TNTIN

Revelation 9 in the TNTIP

Revelation 9 in the TNTIZ

Revelation 9 in the TOMA

Revelation 9 in the TTENT

Revelation 9 in the UBG

Revelation 9 in the UGV

Revelation 9 in the UGV2

Revelation 9 in the UGV3

Revelation 9 in the VBL

Revelation 9 in the VDCC

Revelation 9 in the YALU

Revelation 9 in the YAPE

Revelation 9 in the YBVTP

Revelation 9 in the ZBP