Romans 2 (BOICB)

1 Nʼihi ya, ị nweghị ngọpụ, onye ọbụla ị bụ, mgbe ị na-ekpe ndị ọzọ ikpe. Nʼihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, ọ bụ onwe gị ka ị na-ama ikpe maka na gị onwe gị na-emekwa ụdị ihe ndị ahụ. 2 Ma anyị maara na Chineke na-ekpe ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a ikpe nʼụzọ ziri ezi. 3 Gị bụ mmadụ, gịnị mere i ji na-ama ndị na-eme ihe dị otu a ikpe mgbe gị onwe gị na-eme otu ihe ahụ. I chere na ị ga-agbanarị ikpe Chineke? 4 Ka ị na-eleda obiọma Chineke, na nnagide ọ na-anagide ndụ ọjọọ gị, na ogologo ntachiobi ya anya? Ị maghị na obiọma Chineke nwere nʼebe ị nọ kwesiri ime ka i site na mmehie gị chegharịa? 5 Ma nʼihi isiike gị na obi gị kpọrọ nkụ nke enweghị nchegharị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma nke Chineke nʼụbọchị oke iwe ya, mgbe a ga-ekpughe ikpe ya ziri ezi. 6 Ọ ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya siri dị. 7 Chineke ga-enye ndị niile sitere na ntachiobi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide bụ ndụ ebighị ebi. 8 Ma ndị niile na-akpa iche iche, ndị jụkwara isoro eziokwu ahụ, ndị na-anọgidekwa na-eme ihe ọjọọ, ka a ga-ata ahụhụ, gosi ha iwe ọkụ na ọnụma. 9 Nsogbu na iru ụjụ ga-abịakwasị ndị niile na-eme ihe ọjọọ, mbụ, ọ ga-adịrị ndị Juu, emechaa, ọ ga-adịkwara ndị mba ọzọ. 10 Ma otuto na nsọpụrụ na udo ga-abụ nke onye ọbụla na-eme ezi ihe, malite nʼonye Juu ruokwa na ndị mba ọzọ. 11 Nʼihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nʼihu. 12 Ndị niile mehiere nʼọnọdụ enweghị iwu ga-ala nʼiyi nʼọnọdụ enweghị iwu. Ma ndị niile mehiere megide iwu ahụ ha mara ihe banyere ya ka a ga-ama ikpe dịka iwu siri kwuo. 13 Nʼihi na ọ bụghị ndị ahụ na-anụ mgbe a na-agụpụta akwụkwọ iwu ka a na-agụ dịka ndị ezi omume nʼihu Chineke, kama ọ bụ ndị ahụ niile na-eme ihe iwu kwuru ka a ga-agụ ka ndị ezi omume. 14 Nʼezie, mgbe ndị mba ọzọ bụ ndị na-enweghị iwu sitere nʼobi ha mee ihe iwu kwuru, o gosiri na ha bụ iwu nye onwe ha, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu ahụ e dere ede. 15 Ha na-egosipụta na edeela ihe ndị ahụ iwu kwuru nʼobi ha. Akọnuche ha na-egosikwa na nke a bụ eziokwu, ebe ọ bụ na akọnuche ha na-ama ha ikpe mgbe ụfọdụ, ma na-agọpụrụ ha mgbe ụfọdụ. 16 Dịka oziọma ahụ m na-ekwusa si kwuo, Chineke ga-ekpe ndụ nzuzo niile ụmụ mmadụ na-ebi ikpe, site na Kraịst Jisọs. 17 Ma ugbu a, gị onye na-akpọ onwe gị onye Juu, onye tụkwasịrị obi gị nʼiwu ahụ, onye na-anyakwa isi na ị maara Chineke, 18 ọ bụrụ na ị mara uche ya ma kwenyekwa nʼihe nke ka mma nʼihi na e ziri gị ihe site nʼiwu; 19 ọ bụrụ na o doro gị anya na ị bụ onyendu nye ndị ìsì, bụrụkwa ìhè nye ndị nọ nʼọchịchịrị, 20 ị na-agụkwa onwe gị dịka onye nkuzi nke ndị na-amaghị ihe, na onye nkuzi ụmụntakịrị, nʼihi na ị maara iwu nke ọma, jupụtakwa nʼamamihe na eziokwu. 21 Gị onye na-akụziri mmadụ ibe gị ihe, ị na-akụzikwara onwe gị? Gị onye na-ekwusa ka mmadụ ezula ohi, ị na-ezu ohi? 22 Gị onye na-asị mmadụ akwala iko, ị na-akwa iko? Gị onye na-akpọ arụsị ihe arụ, ị na-ezuru ihe dị nʼụlọ arụsị nʼohi? 23 Gị onye na-anya isi na ị maara iwu, ị na-emenye Chineke ihere site nʼimebi iwu ahụ? 24 Dịka esi dee ya, “Ndị mba ọzọ na-ekwulu aha Chineke nʼihi unu.” 25 Obibi ugwu bara uru nʼezie ma ọ bụrụ na ị na-edebe iwu, ma ọ bụrụ na ị na-emebi iwu, obibi ugwu gị dịka mgbe i bighị ugwu. 26 Ọ bụrụ na ndị e bighị ugwu na-edebe ihe iwu kwuru, ọ bụ na a gaghị agụ ebighị ugwu ha dịka obibi ugwu? 27 Ya bụ, ndị ahụ a na-ebighị ugwu nʼanụ ahụ ma na-edebe iwu ga-ama unu ikpe, bụ ndị nwere iwu ahụ e dere nʼakwụkwọ na ndị e bikwara ugwu ma na-emebi iwu. 28 Ị bụ ezigbo onye Juu abụghị nke elu ahụ. Ezigbo ibi ugwu abụkwaghị ihe a na-ahụ nʼanụ ahụ. 29 Kama ezigbo onye Juu bụ onye ọbụla nke bụ ya nʼime mmụọ. Ezigbo obibi ugwu bụkwa nke ime obi, nke mmụọ, ọ bụghị nke e dere ede. Otuto ya esiteghị nʼaka mmadụ kama o sitere nʼaka Chineke.

In Other Versions

Romans 2 in the ANGEFD

Romans 2 in the ANTPNG2D

Romans 2 in the AS21

Romans 2 in the BAGH

Romans 2 in the BBPNG

Romans 2 in the BBT1E

Romans 2 in the BDS

Romans 2 in the BEV

Romans 2 in the BHAD

Romans 2 in the BIB

Romans 2 in the BLPT

Romans 2 in the BNT

Romans 2 in the BNTABOOT

Romans 2 in the BNTLV

Romans 2 in the BOATCB

Romans 2 in the BOATCB2

Romans 2 in the BOBCV

Romans 2 in the BOCNT

Romans 2 in the BOECS

Romans 2 in the BOGWICC

Romans 2 in the BOHCB

Romans 2 in the BOHCV

Romans 2 in the BOHLNT

Romans 2 in the BOHNTLTAL

Romans 2 in the BOILNTAP

Romans 2 in the BOITCV

Romans 2 in the BOKCV

Romans 2 in the BOKCV2

Romans 2 in the BOKHWOG

Romans 2 in the BOKSSV

Romans 2 in the BOLCB

Romans 2 in the BOLCB2

Romans 2 in the BOMCV

Romans 2 in the BONAV

Romans 2 in the BONCB

Romans 2 in the BONLT

Romans 2 in the BONUT2

Romans 2 in the BOPLNT

Romans 2 in the BOSCB

Romans 2 in the BOSNC

Romans 2 in the BOTLNT

Romans 2 in the BOVCB

Romans 2 in the BOYCB

Romans 2 in the BPBB

Romans 2 in the BPH

Romans 2 in the BSB

Romans 2 in the CCB

Romans 2 in the CUV

Romans 2 in the CUVS

Romans 2 in the DBT

Romans 2 in the DGDNT

Romans 2 in the DHNT

Romans 2 in the DNT

Romans 2 in the ELBE

Romans 2 in the EMTV

Romans 2 in the ESV

Romans 2 in the FBV

Romans 2 in the FEB

Romans 2 in the GGMNT

Romans 2 in the GNT

Romans 2 in the HARY

Romans 2 in the HNT

Romans 2 in the IRVA

Romans 2 in the IRVB

Romans 2 in the IRVG

Romans 2 in the IRVH

Romans 2 in the IRVK

Romans 2 in the IRVM

Romans 2 in the IRVM2

Romans 2 in the IRVO

Romans 2 in the IRVP

Romans 2 in the IRVT

Romans 2 in the IRVT2

Romans 2 in the IRVU

Romans 2 in the ISVN

Romans 2 in the JSNT

Romans 2 in the KAPI

Romans 2 in the KBT1ETNIK

Romans 2 in the KBV

Romans 2 in the KJV

Romans 2 in the KNFD

Romans 2 in the LBA

Romans 2 in the LBLA

Romans 2 in the LNT

Romans 2 in the LSV

Romans 2 in the MAAL

Romans 2 in the MBV

Romans 2 in the MBV2

Romans 2 in the MHNT

Romans 2 in the MKNFD

Romans 2 in the MNG

Romans 2 in the MNT

Romans 2 in the MNT2

Romans 2 in the MRS1T

Romans 2 in the NAA

Romans 2 in the NASB

Romans 2 in the NBLA

Romans 2 in the NBS

Romans 2 in the NBVTP

Romans 2 in the NET2

Romans 2 in the NIV11

Romans 2 in the NNT

Romans 2 in the NNT2

Romans 2 in the NNT3

Romans 2 in the PDDPT

Romans 2 in the PFNT

Romans 2 in the RMNT

Romans 2 in the SBIAS

Romans 2 in the SBIBS

Romans 2 in the SBIBS2

Romans 2 in the SBICS

Romans 2 in the SBIDS

Romans 2 in the SBIGS

Romans 2 in the SBIHS

Romans 2 in the SBIIS

Romans 2 in the SBIIS2

Romans 2 in the SBIIS3

Romans 2 in the SBIKS

Romans 2 in the SBIKS2

Romans 2 in the SBIMS

Romans 2 in the SBIOS

Romans 2 in the SBIPS

Romans 2 in the SBISS

Romans 2 in the SBITS

Romans 2 in the SBITS2

Romans 2 in the SBITS3

Romans 2 in the SBITS4

Romans 2 in the SBIUS

Romans 2 in the SBIVS

Romans 2 in the SBT

Romans 2 in the SBT1E

Romans 2 in the SCHL

Romans 2 in the SNT

Romans 2 in the SUSU

Romans 2 in the SUSU2

Romans 2 in the SYNO

Romans 2 in the TBIAOTANT

Romans 2 in the TBT1E

Romans 2 in the TBT1E2

Romans 2 in the TFTIP

Romans 2 in the TFTU

Romans 2 in the TGNTATF3T

Romans 2 in the THAI

Romans 2 in the TNFD

Romans 2 in the TNT

Romans 2 in the TNTIK

Romans 2 in the TNTIL

Romans 2 in the TNTIN

Romans 2 in the TNTIP

Romans 2 in the TNTIZ

Romans 2 in the TOMA

Romans 2 in the TTENT

Romans 2 in the UBG

Romans 2 in the UGV

Romans 2 in the UGV2

Romans 2 in the UGV3

Romans 2 in the VBL

Romans 2 in the VDCC

Romans 2 in the YALU

Romans 2 in the YAPE

Romans 2 in the YBVTP

Romans 2 in the ZBP