Romans 9 (BOICB)

1 Ana m ekwu eziokwu nʼime Kraịst. Anaghị m ekwu okwu ụgha. Akọnuche m nke Mmụọ Nsọ na-achị na-agbakwara m ama. 2 A nọ m nʼọnọdụ oke ihe mwute na ihe mgbu dị ukwuu nʼobi m. 3 A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe mee, ejikeere m ịbụ onye a bụrụ ọnụ na onye e wepụrụ site nʼebe Kraịst nọ nʼihi ụmụnna m na ndị ikwu m, 4 bụ ndị Izrel. Ndị Chineke họọrọ ka ha bụrụ ụmụ ya, ndị o nyere ebube ya na ọgbụgba ndụ ya. O nyekwara ha iwu na ife ofufe nʼụlọnsọ ukwu ahụ na ọtụtụ nkwa dị iche iche. 5 Ha si nʼagbụrụ nna nna anyị ochie ha. Kraịst nʼonwe ya, nʼụdịdị mmadụ, sikwa nʼagbụrụ ha pụta, onye bụ Chineke nke ihe niile, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen. 6 Ọ bụghị dị ka a ga-asị na okwu Chineke na-ala azụ. Nʼihi na ọ bụghị onye ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị Izrel bụ onye Izrel. 7 Na ha sitere nʼagbụrụ Ebraham pụta emeghị ka ha bụrụ ụmụ Ebraham nʼezie. Ma nʼakụkụ nke ọzọ, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.” 8 Nke a na-egosi na ọ bụghị ndị niile a mụrụ na-anụ ahụ bụ ụmụ Chineke, kama ụmụ ndị ahụ e kwere na nkwa bụ ndị a na-agụnye dị ka ụmụ Ebraham site na nkwa ahụ. 9 Lee ka e si kwee nkwa ahụ, “Mgbe oge ahụ a kara aka ruru, aga m alọghachi, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.” 10 Ọ bụghị naanị nke a. Ụmụ Ribeka si nʼotu nna, ya bụ nna nna anyị Aịzik. 11 Ma tupu a mụọ ụmụ ejima ndị a, ma ọ bụkwanụ tupu ha emee ihe ọbụla dị mma maọbụ nke dị njọ, iji mee ka ọchịchọ Chineke banyere nhọpụta ha guzoro, 12 ọ bụghị site nʼọrụ kama ọ bụ site nʼonye ahụ nke na-akpọ, nʼihi na a gwara ya sị, “Nke okenye ga-ejere nke nta ozi.” 13 Dịka e dere ya, “Jekọb ka m hụrụ nʼanya ma Ịsọ ka m kpọrọ asị.” 14 Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ bụ onye ajọ omume? Mba! 15 Nʼihi na ọ gwara Mosis,“Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere,ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.” 16 Ya mere, ọ dabereghị nʼọchịchọ nke mmadụ maọbụ ịrụsị ọrụ ike ya kama ọ dabere nʼebere Chineke. 17 Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ gwara Fero, “Emere m ka ị bụrụ ihe ị bụ nʼihi nke a, ka m were gị zipụta ike m, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.” 18 Ọ pụtara ihe na ọ bụ naanị ndị Chineke chọrọ ka ọ na-emere ebere, ndị ọ chọkwara ka ọ na-eme ka ha bụrụ ndị obi ha kpọchiri akpọchi. 19 Ma eleghị anya unu pụrụ ịgwa m, “Gịnị kwanụ mere o ji ata anyị ụta? Onye kwanụ pụrụ iguzogide ihe o zubere ime?” 20 Onye ka ị bụ gị mmadụ efu, iji ajụ Chineke ajụjụ? “Nkata mmadụ na-akpa ọ ga-ajụ onye na-akpa ya ajụjụ, ‘Onye sị gị kpaa m otu a?’ ” 21 Otu a kwa, onye ọkpụ ite o nweghị ike isite nʼotu ụrọ ahụ o nwere kpụọ ụdị ite ọbụla masịrị ya, ụfọdụ ite pụrụ iche na ụfọdụ e ji eje ozi nʼụlọ? 22 Ọ bụrụkwanụ na Chineke ekpebie igosi iwe ya na ime ka a mara ike ya site nʼinwe oke ndidi banyere ndị oke iwe ya ga-adakwasị bụ ndị a kwadoro maka mbibi? 23 Ma ọ bụrụkwanụ na o mere nke a iji mee ka ndị ahụ ọ na-emere ebere mata ịba ụba nke ebube ya, bụ ndị o bururị ụzọ kwadoo maka ebube a. 24 Ọ bụladị anyị bụ ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị naanị site na ndị Juu kama site na ndị mba ọzọ? 25 Dịka o kwuru nʼakwụkwọ Hosiya,“Aga m akpọ ha ‘ndị m,’ bụ ndị na-abụghị ndị m.Aga m akpọkwa ya ‘onye m hụrụ nʼanya’ bụ onye m na-ahụghị nʼanya.” 26 Ma,“Nʼotu ebe ahụ a nọ sị ha,‘Unu abụghị ndị m,’bụkwa ebe a ga-anọ kpọọ ha, ‘Ụmụ nke Chineke dị ndụ. ’ ” 27 Aịzaya bere akwa nʼihi ụmụ Izrel,“Ọ bụ ezie na ọnụọgụgụ ụmụ Izrel dịka uzuzu dị nʼakụkụ osimiri,maọbụ naanị mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta. 28 Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ikpe ụwa a ikpe.Ọ ga-eme ọsịịsọ nʼikpe ahụ ma kpebie ya.” 29 Ọ bụkwa dịka Aịzaya kwuru na mbụ,“Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niileahapụrụghị anyị ụmụ ụmụ,anyị gara adị ka Sọdọm,anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.” 30 Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na o enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ha gbasoro ezi omume, ma ha natara ya, bụ ezi omume nke sitere nʼokwukwe, 31 ma ndị Izrel na-agbaso iwu nke ezi omume, enwebeghị ike ime onwe ha ndị a ga-anabata. 32 Gịnị gbochiri ha? Ọ bụ nʼihi na ha agbasoghị ya site nʼokwukwe. Kama ha chere na ọ bụ site nʼọrụ. Ha zọhiere ụkwụ nʼoke nkume ịsọ ngọngọ ahụ. 33 Dịka e dere ya,“Lee, ana m atọgbọ na Zayọn nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ,oke nkume nke na-eme ka ha daa.Ma onye nke kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”

In Other Versions

Romans 9 in the ANGEFD

Romans 9 in the ANTPNG2D

Romans 9 in the AS21

Romans 9 in the BAGH

Romans 9 in the BBPNG

Romans 9 in the BBT1E

Romans 9 in the BDS

Romans 9 in the BEV

Romans 9 in the BHAD

Romans 9 in the BIB

Romans 9 in the BLPT

Romans 9 in the BNT

Romans 9 in the BNTABOOT

Romans 9 in the BNTLV

Romans 9 in the BOATCB

Romans 9 in the BOATCB2

Romans 9 in the BOBCV

Romans 9 in the BOCNT

Romans 9 in the BOECS

Romans 9 in the BOGWICC

Romans 9 in the BOHCB

Romans 9 in the BOHCV

Romans 9 in the BOHLNT

Romans 9 in the BOHNTLTAL

Romans 9 in the BOILNTAP

Romans 9 in the BOITCV

Romans 9 in the BOKCV

Romans 9 in the BOKCV2

Romans 9 in the BOKHWOG

Romans 9 in the BOKSSV

Romans 9 in the BOLCB

Romans 9 in the BOLCB2

Romans 9 in the BOMCV

Romans 9 in the BONAV

Romans 9 in the BONCB

Romans 9 in the BONLT

Romans 9 in the BONUT2

Romans 9 in the BOPLNT

Romans 9 in the BOSCB

Romans 9 in the BOSNC

Romans 9 in the BOTLNT

Romans 9 in the BOVCB

Romans 9 in the BOYCB

Romans 9 in the BPBB

Romans 9 in the BPH

Romans 9 in the BSB

Romans 9 in the CCB

Romans 9 in the CUV

Romans 9 in the CUVS

Romans 9 in the DBT

Romans 9 in the DGDNT

Romans 9 in the DHNT

Romans 9 in the DNT

Romans 9 in the ELBE

Romans 9 in the EMTV

Romans 9 in the ESV

Romans 9 in the FBV

Romans 9 in the FEB

Romans 9 in the GGMNT

Romans 9 in the GNT

Romans 9 in the HARY

Romans 9 in the HNT

Romans 9 in the IRVA

Romans 9 in the IRVB

Romans 9 in the IRVG

Romans 9 in the IRVH

Romans 9 in the IRVK

Romans 9 in the IRVM

Romans 9 in the IRVM2

Romans 9 in the IRVO

Romans 9 in the IRVP

Romans 9 in the IRVT

Romans 9 in the IRVT2

Romans 9 in the IRVU

Romans 9 in the ISVN

Romans 9 in the JSNT

Romans 9 in the KAPI

Romans 9 in the KBT1ETNIK

Romans 9 in the KBV

Romans 9 in the KJV

Romans 9 in the KNFD

Romans 9 in the LBA

Romans 9 in the LBLA

Romans 9 in the LNT

Romans 9 in the LSV

Romans 9 in the MAAL

Romans 9 in the MBV

Romans 9 in the MBV2

Romans 9 in the MHNT

Romans 9 in the MKNFD

Romans 9 in the MNG

Romans 9 in the MNT

Romans 9 in the MNT2

Romans 9 in the MRS1T

Romans 9 in the NAA

Romans 9 in the NASB

Romans 9 in the NBLA

Romans 9 in the NBS

Romans 9 in the NBVTP

Romans 9 in the NET2

Romans 9 in the NIV11

Romans 9 in the NNT

Romans 9 in the NNT2

Romans 9 in the NNT3

Romans 9 in the PDDPT

Romans 9 in the PFNT

Romans 9 in the RMNT

Romans 9 in the SBIAS

Romans 9 in the SBIBS

Romans 9 in the SBIBS2

Romans 9 in the SBICS

Romans 9 in the SBIDS

Romans 9 in the SBIGS

Romans 9 in the SBIHS

Romans 9 in the SBIIS

Romans 9 in the SBIIS2

Romans 9 in the SBIIS3

Romans 9 in the SBIKS

Romans 9 in the SBIKS2

Romans 9 in the SBIMS

Romans 9 in the SBIOS

Romans 9 in the SBIPS

Romans 9 in the SBISS

Romans 9 in the SBITS

Romans 9 in the SBITS2

Romans 9 in the SBITS3

Romans 9 in the SBITS4

Romans 9 in the SBIUS

Romans 9 in the SBIVS

Romans 9 in the SBT

Romans 9 in the SBT1E

Romans 9 in the SCHL

Romans 9 in the SNT

Romans 9 in the SUSU

Romans 9 in the SUSU2

Romans 9 in the SYNO

Romans 9 in the TBIAOTANT

Romans 9 in the TBT1E

Romans 9 in the TBT1E2

Romans 9 in the TFTIP

Romans 9 in the TFTU

Romans 9 in the TGNTATF3T

Romans 9 in the THAI

Romans 9 in the TNFD

Romans 9 in the TNT

Romans 9 in the TNTIK

Romans 9 in the TNTIL

Romans 9 in the TNTIN

Romans 9 in the TNTIP

Romans 9 in the TNTIZ

Romans 9 in the TOMA

Romans 9 in the TTENT

Romans 9 in the UBG

Romans 9 in the UGV

Romans 9 in the UGV2

Romans 9 in the UGV3

Romans 9 in the VBL

Romans 9 in the VDCC

Romans 9 in the YALU

Romans 9 in the YAPE

Romans 9 in the YBVTP

Romans 9 in the ZBP