2 Timothy 1 (BOICB)
1 Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs, dị ka uche Chineke si dị, na dị ka nkwa ndụ nʼime Kraịst Jisọs si dị, 2 Nye gị Timoti, ezi nwa m. Ka amara, na ebere na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị gị. 3 Ana m ekele Chineke, bụ onye m na-ejere ozi ekele, dị ka nna nna m ha mere site nʼakọnuche dị ọcha, ọtụtụ mgbe ka m na-echeta gị nʼekpere m ehihie na abalị. 4 Ka m na-echeta anya mmiri gị, ọ na-agụsị m agụụ ike ehihie na abalị ịhụ gị, ka ọṅụ m zuo oke. 5 Emere m ka m cheta okwukwe ihu abụọ nʼadịghị nke i nwere, bụ okwukwe nke burii ụzọ dịrị nʼime nne nne gị Lọịsi, bịa dịkwa nʼime nne gị Yunaịsi. Emere ka m kwenye na otu okwukwe ahụ dịkwa nʼime gị. 6 Nʼihi nke a, achọrọ m ichetara gị ka i mee ka onyinye Chineke ahụ i nwere na-enwu dị ka ọkụ, bụ nke i natara mgbe m bikwasịrị gị aka m abụọ nʼisi. 7 Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke. 8 Ihere emela gị ikwupụta ama banyere Onyenwe anyị maọbụ banyere m bụ onye mkpọrọ ya. Kama, site nʼike Chineke, soro m hụọ ahụhụ nʼihi oziọma ahụ. 9 Ọ zọpụtara anyị, kpọbata anyị na ndụ dị nsọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị kwesiri ka a kpọọ anyị, kama, ọ bụ nʼihi nzube ya na amara ya. E nyere anyị amara nʼime Kraịst Jisọs tupu a tọọ ntọala ụwa a. 10 Ugbu a, o meela ka ihe niile o zubere pụta ìhè site nʼọbịbịa Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike ọnwụ nʼiyi, zi anyị ụzọ anyị ga-esi nwee ndụ ebighị ebi site nʼoziọma ahụ. 11 Nʼihi oziọma a, ahọpụtara m ka m bụrụ onye na-ekwusa oziọma a, na onyeozi, na onye nkuzi. 12 Ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji na-ahụ ahụhụ ndị a nʼebe a, ma nʼeziokwu, ihere adịghị eme m, nʼihi na amaara m onye m na-atụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe niile m nyere ya nʼaka idebe tutu ruo ụbọchị ahụ. 13 Jidesie eziokwu ahụ aka ike, ụdị eziokwu ahụ mụ onwe m ziri gị, eziokwu ahụ gbasara okwukwe ahụ, na ịhụnanya ahụ dị nʼime Kraịst Jisọs. 14 Chezie onyinye ọma ahụ e sitere nʼaka Mmụọ Nsọ bi nʼime gị nye gị idebe. 15 Dị ka i maara, ndị niile si nʼEshịa bịa nʼebe a agbakụtala m azụ. Ọ bụladị Faigelọs na Hamogịnịs ahapụla m laa. 16 Ka Onyenwe anyị mere ezinaụlọ Onisiferọs ebere, nʼihi ume ọ gbara m ọtụtụ mgbe. Ihere emeghị ya na-abụ m onye mkpọrọ. 17 Mgbe ọ bịaruru Rom, ọ chọgharịrị m nʼebe niile, ma nʼikpeazụ, ọ chọtara m. 18 Ka Onyenwe anyị kwe ka ọ nata ebere nʼaka Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. Ị mara nke ọma ụdị aka o nyere m nʼEfesọs.
In Other Versions
2 Timothy 1 in the ANGEFD
2 Timothy 1 in the ANTPNG2D
2 Timothy 1 in the AS21
2 Timothy 1 in the BAGH
2 Timothy 1 in the BBPNG
2 Timothy 1 in the BBT1E
2 Timothy 1 in the BDS
2 Timothy 1 in the BEV
2 Timothy 1 in the BHAD
2 Timothy 1 in the BIB
2 Timothy 1 in the BLPT
2 Timothy 1 in the BNT
2 Timothy 1 in the BNTABOOT
2 Timothy 1 in the BNTLV
2 Timothy 1 in the BOATCB
2 Timothy 1 in the BOATCB2
2 Timothy 1 in the BOBCV
2 Timothy 1 in the BOCNT
2 Timothy 1 in the BOECS
2 Timothy 1 in the BOGWICC
2 Timothy 1 in the BOHCB
2 Timothy 1 in the BOHCV
2 Timothy 1 in the BOHLNT
2 Timothy 1 in the BOHNTLTAL
2 Timothy 1 in the BOILNTAP
2 Timothy 1 in the BOITCV
2 Timothy 1 in the BOKCV
2 Timothy 1 in the BOKCV2
2 Timothy 1 in the BOKHWOG
2 Timothy 1 in the BOKSSV
2 Timothy 1 in the BOLCB
2 Timothy 1 in the BOLCB2
2 Timothy 1 in the BOMCV
2 Timothy 1 in the BONAV
2 Timothy 1 in the BONCB
2 Timothy 1 in the BONLT
2 Timothy 1 in the BONUT2
2 Timothy 1 in the BOPLNT
2 Timothy 1 in the BOSCB
2 Timothy 1 in the BOSNC
2 Timothy 1 in the BOTLNT
2 Timothy 1 in the BOVCB
2 Timothy 1 in the BOYCB
2 Timothy 1 in the BPBB
2 Timothy 1 in the BPH
2 Timothy 1 in the BSB
2 Timothy 1 in the CCB
2 Timothy 1 in the CUV
2 Timothy 1 in the CUVS
2 Timothy 1 in the DBT
2 Timothy 1 in the DGDNT
2 Timothy 1 in the DHNT
2 Timothy 1 in the DNT
2 Timothy 1 in the ELBE
2 Timothy 1 in the EMTV
2 Timothy 1 in the ESV
2 Timothy 1 in the FBV
2 Timothy 1 in the FEB
2 Timothy 1 in the GGMNT
2 Timothy 1 in the GNT
2 Timothy 1 in the HARY
2 Timothy 1 in the HNT
2 Timothy 1 in the IRVA
2 Timothy 1 in the IRVB
2 Timothy 1 in the IRVG
2 Timothy 1 in the IRVH
2 Timothy 1 in the IRVK
2 Timothy 1 in the IRVM
2 Timothy 1 in the IRVM2
2 Timothy 1 in the IRVO
2 Timothy 1 in the IRVP
2 Timothy 1 in the IRVT
2 Timothy 1 in the IRVT2
2 Timothy 1 in the IRVU
2 Timothy 1 in the ISVN
2 Timothy 1 in the JSNT
2 Timothy 1 in the KAPI
2 Timothy 1 in the KBT1ETNIK
2 Timothy 1 in the KBV
2 Timothy 1 in the KJV
2 Timothy 1 in the KNFD
2 Timothy 1 in the LBA
2 Timothy 1 in the LBLA
2 Timothy 1 in the LNT
2 Timothy 1 in the LSV
2 Timothy 1 in the MAAL
2 Timothy 1 in the MBV
2 Timothy 1 in the MBV2
2 Timothy 1 in the MHNT
2 Timothy 1 in the MKNFD
2 Timothy 1 in the MNG
2 Timothy 1 in the MNT
2 Timothy 1 in the MNT2
2 Timothy 1 in the MRS1T
2 Timothy 1 in the NAA
2 Timothy 1 in the NASB
2 Timothy 1 in the NBLA
2 Timothy 1 in the NBS
2 Timothy 1 in the NBVTP
2 Timothy 1 in the NET2
2 Timothy 1 in the NIV11
2 Timothy 1 in the NNT
2 Timothy 1 in the NNT2
2 Timothy 1 in the NNT3
2 Timothy 1 in the PDDPT
2 Timothy 1 in the PFNT
2 Timothy 1 in the RMNT
2 Timothy 1 in the SBIAS
2 Timothy 1 in the SBIBS
2 Timothy 1 in the SBIBS2
2 Timothy 1 in the SBICS
2 Timothy 1 in the SBIDS
2 Timothy 1 in the SBIGS
2 Timothy 1 in the SBIHS
2 Timothy 1 in the SBIIS
2 Timothy 1 in the SBIIS2
2 Timothy 1 in the SBIIS3
2 Timothy 1 in the SBIKS
2 Timothy 1 in the SBIKS2
2 Timothy 1 in the SBIMS
2 Timothy 1 in the SBIOS
2 Timothy 1 in the SBIPS
2 Timothy 1 in the SBISS
2 Timothy 1 in the SBITS
2 Timothy 1 in the SBITS2
2 Timothy 1 in the SBITS3
2 Timothy 1 in the SBITS4
2 Timothy 1 in the SBIUS
2 Timothy 1 in the SBIVS
2 Timothy 1 in the SBT
2 Timothy 1 in the SBT1E
2 Timothy 1 in the SCHL
2 Timothy 1 in the SNT
2 Timothy 1 in the SUSU
2 Timothy 1 in the SUSU2
2 Timothy 1 in the SYNO
2 Timothy 1 in the TBIAOTANT
2 Timothy 1 in the TBT1E
2 Timothy 1 in the TBT1E2
2 Timothy 1 in the TFTIP
2 Timothy 1 in the TFTU
2 Timothy 1 in the TGNTATF3T
2 Timothy 1 in the THAI
2 Timothy 1 in the TNFD
2 Timothy 1 in the TNT
2 Timothy 1 in the TNTIK
2 Timothy 1 in the TNTIL
2 Timothy 1 in the TNTIN
2 Timothy 1 in the TNTIP
2 Timothy 1 in the TNTIZ
2 Timothy 1 in the TOMA
2 Timothy 1 in the TTENT
2 Timothy 1 in the UBG
2 Timothy 1 in the UGV
2 Timothy 1 in the UGV2
2 Timothy 1 in the UGV3
2 Timothy 1 in the VBL
2 Timothy 1 in the VDCC
2 Timothy 1 in the YALU
2 Timothy 1 in the YAPE
2 Timothy 1 in the YBVTP
2 Timothy 1 in the ZBP