Acts 11 (BOICB)

1 Ndị ozi na ụmụnna ndị bi na Judịa niile nụrụ na ndị mba ọzọ anabatala okwu Chineke. 2 Mgbe Pita ruru Jerusalem, ndị kwere ekwe e biri ugwu tara ya ụta, 3 na-asị, “Gịnị mere ị ji gakwuru ndị a na-ebighị ugwu soro ha rie ihe?” 4 Pita kọwaara ha ihe niile mere na otu o si mee, na-asị. 5 “Otu ụbọchị, mgbe m nọ nʼobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nʼoge m na-ekpe ekpere. Nʼime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata site nʼeluigwe. E budatara ya nʼihu m. 6 Nʼime ya, ahụrụ m anụmanụ ndị nwere ụkwụ anọ, na anụ ọhịa, na anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke eluigwe. 7 Mgbe ahụ, anụrụ m olu gwara m sị, ‘Pita, bilie, gbuo ma riekwa.’ 8 “Ma asịrị m, ‘Mba, Onyenwe m, ọ dịbeghị mgbe ihe na-adịghị ọcha maọbụ ihe rụrụ arụ bara m nʼọnụ.’ 9 “Olu ahụ siri nʼeluigwe zaghachi nke ugboro abụọ, ‘Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.’ 10 Nke a mere ugboro atọ, ma emesịa dọlie ha niile laa nʼeluigwe. 11 “Nʼotu oge ahụ, ndị ikom atọ ndị e zipụrụ site Sizaria ịkpọ m bịarutere kwụsị nʼọnụ ụzọ nʼụlọ ebe m nọ. 12 Mmụọ Nsọ gwara m ka m ghara inwe obi abụọ isoro ha na-akpaghị oke ọbụla. Mmadụ isii ndị a nʼetiti ụmụnna anyị sokwa m, bịarute nʼụlọ nwoke ahụ. 13 Ọ gwara anyị otu o si hụ mmụọ ozi nʼụlọ ya, onye sịrị, ‘Ziga ndị ozi jee Jopa ka ha kpọta Saimọn onye a na-akpọ Pita. 14 Ọ ga-ewetara gị ozi nke a ga-esite na ya zọpụta gị nʼezinaụlọ gị niile.’ 15 “Mgbe m ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ha dịka o siri bịakwasị anyị na mbụ. 16 Mgbe ahụ, echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru sị, ‘Jọn ji mmiri mee unu baptizim, ma a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.’ 17 Ya mere, ọ bụrụ na Chineke nyere ha otu onyinye ahụ o nyere anyị mgbe anyị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye ka m bụ iguzogide Chineke?” 18 Mgbe ha nụrụ nke a, ha agaghị nʼihu nʼịrụ ụka kama ha toro Chineke, na-asị, “Nʼezie, Chineke enyela ohere ka ọ bụladị ndị mba ọzọ chegharịa baa na ndụ.” 19 Ugbu a, ndị ahụ niile gbasasịrị nʼihi mkpagbu ahụ bidoro mgbe a tụgburu Stivin na nkume, jeruru akụkụ Fonisia na Saiprọs na Antiọk na-ekwusa oziọma ahụ naanị nʼetiti ndị Juu. 20 Ma otu ọ dị, ụfọdụ nʼime ndị ikom ndị ahụ sitere nʼakụkụ Saiprọs na Sirini gara Antiọk, malite ikwusara ndị Griik oziọma banyere Onyenwe anyị Jisọs. 21 Onyenwe anyị gọziri mgbalị ha niile. Nʼihi na ọtụtụ mmadụ chegharịrị kwere nʼOnyenwe anyị. 22 Mgbe nzukọ dị na Jerusalem nụrụ ihe ndị a, ha zipụrụ Banabas ka ọ gaa Antiọk. 23 Mgbe o rutere, hụ ihe amara Chineke rụrụ nʼetiti ha. Ọ ṅụrịrị ọṅụ, mgbakwaa ha niile ume, gwa ha ka ha were obi ha niile nọgide nʼime Onyenwe anyị. 24 Ọ bụ ezigbo mmadụ, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ na okwukwe. O nwekwara okwukwe dị ebube, nʼihi ya ọtụtụ mmadụ chegharịkwara bịakwute Onyenwe anyị. 25 Emesịa, ọ gara Antiọk obodo Tasọs ịchọ Sọl. 26 Mgbe ọ chọpụtara ya, o duuru ya bịa nʼAntiọk. Ihe ha ka otu afọ, ka ha na-ezukọ nʼụlọ chọọchị na-akụziri ọtụtụ igwe mmadụ ihe. Ọ bụ nʼime Antiọk ka e buru ụzọ kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ndị Kraịst. 27 Nʼoge ahụ, ndị amụma sitere na Jerusalem bịaruru Antiọk. 28 Otu onye nʼime ha a na-akpọ Agabọs biliri ọtọ buo amụma site nʼike Mmụọ Nsọ banyere oke ụnwụ ga-abịakwasị ụwa niile. Amụma a mezukwara nʼoge Klọdiọs na-achị. 29 Ndị na-eso ụzọ ya kwekọrịtara ịtụkọta na iziga onyinye dị iche iche nye ndị kwere ekwe nọ na Judịa. Onye ọbụla nyekwara ihe dịka o nwere ike. 30 Ha mere nke a, ha zigara ndị okenye ihe ha tụkọtara, site nʼaka Banabas na Sọl.

In Other Versions

Acts 11 in the ANGEFD

Acts 11 in the ANTPNG2D

Acts 11 in the AS21

Acts 11 in the BAGH

Acts 11 in the BBPNG

Acts 11 in the BBT1E

Acts 11 in the BDS

Acts 11 in the BEV

Acts 11 in the BHAD

Acts 11 in the BIB

Acts 11 in the BLPT

Acts 11 in the BNT

Acts 11 in the BNTABOOT

Acts 11 in the BNTLV

Acts 11 in the BOATCB

Acts 11 in the BOATCB2

Acts 11 in the BOBCV

Acts 11 in the BOCNT

Acts 11 in the BOECS

Acts 11 in the BOGWICC

Acts 11 in the BOHCB

Acts 11 in the BOHCV

Acts 11 in the BOHLNT

Acts 11 in the BOHNTLTAL

Acts 11 in the BOILNTAP

Acts 11 in the BOITCV

Acts 11 in the BOKCV

Acts 11 in the BOKCV2

Acts 11 in the BOKHWOG

Acts 11 in the BOKSSV

Acts 11 in the BOLCB

Acts 11 in the BOLCB2

Acts 11 in the BOMCV

Acts 11 in the BONAV

Acts 11 in the BONCB

Acts 11 in the BONLT

Acts 11 in the BONUT2

Acts 11 in the BOPLNT

Acts 11 in the BOSCB

Acts 11 in the BOSNC

Acts 11 in the BOTLNT

Acts 11 in the BOVCB

Acts 11 in the BOYCB

Acts 11 in the BPBB

Acts 11 in the BPH

Acts 11 in the BSB

Acts 11 in the CCB

Acts 11 in the CUV

Acts 11 in the CUVS

Acts 11 in the DBT

Acts 11 in the DGDNT

Acts 11 in the DHNT

Acts 11 in the DNT

Acts 11 in the ELBE

Acts 11 in the EMTV

Acts 11 in the ESV

Acts 11 in the FBV

Acts 11 in the FEB

Acts 11 in the GGMNT

Acts 11 in the GNT

Acts 11 in the HARY

Acts 11 in the HNT

Acts 11 in the IRVA

Acts 11 in the IRVB

Acts 11 in the IRVG

Acts 11 in the IRVH

Acts 11 in the IRVK

Acts 11 in the IRVM

Acts 11 in the IRVM2

Acts 11 in the IRVO

Acts 11 in the IRVP

Acts 11 in the IRVT

Acts 11 in the IRVT2

Acts 11 in the IRVU

Acts 11 in the ISVN

Acts 11 in the JSNT

Acts 11 in the KAPI

Acts 11 in the KBT1ETNIK

Acts 11 in the KBV

Acts 11 in the KJV

Acts 11 in the KNFD

Acts 11 in the LBA

Acts 11 in the LBLA

Acts 11 in the LNT

Acts 11 in the LSV

Acts 11 in the MAAL

Acts 11 in the MBV

Acts 11 in the MBV2

Acts 11 in the MHNT

Acts 11 in the MKNFD

Acts 11 in the MNG

Acts 11 in the MNT

Acts 11 in the MNT2

Acts 11 in the MRS1T

Acts 11 in the NAA

Acts 11 in the NASB

Acts 11 in the NBLA

Acts 11 in the NBS

Acts 11 in the NBVTP

Acts 11 in the NET2

Acts 11 in the NIV11

Acts 11 in the NNT

Acts 11 in the NNT2

Acts 11 in the NNT3

Acts 11 in the PDDPT

Acts 11 in the PFNT

Acts 11 in the RMNT

Acts 11 in the SBIAS

Acts 11 in the SBIBS

Acts 11 in the SBIBS2

Acts 11 in the SBICS

Acts 11 in the SBIDS

Acts 11 in the SBIGS

Acts 11 in the SBIHS

Acts 11 in the SBIIS

Acts 11 in the SBIIS2

Acts 11 in the SBIIS3

Acts 11 in the SBIKS

Acts 11 in the SBIKS2

Acts 11 in the SBIMS

Acts 11 in the SBIOS

Acts 11 in the SBIPS

Acts 11 in the SBISS

Acts 11 in the SBITS

Acts 11 in the SBITS2

Acts 11 in the SBITS3

Acts 11 in the SBITS4

Acts 11 in the SBIUS

Acts 11 in the SBIVS

Acts 11 in the SBT

Acts 11 in the SBT1E

Acts 11 in the SCHL

Acts 11 in the SNT

Acts 11 in the SUSU

Acts 11 in the SUSU2

Acts 11 in the SYNO

Acts 11 in the TBIAOTANT

Acts 11 in the TBT1E

Acts 11 in the TBT1E2

Acts 11 in the TFTIP

Acts 11 in the TFTU

Acts 11 in the TGNTATF3T

Acts 11 in the THAI

Acts 11 in the TNFD

Acts 11 in the TNT

Acts 11 in the TNTIK

Acts 11 in the TNTIL

Acts 11 in the TNTIN

Acts 11 in the TNTIP

Acts 11 in the TNTIZ

Acts 11 in the TOMA

Acts 11 in the TTENT

Acts 11 in the UBG

Acts 11 in the UGV

Acts 11 in the UGV2

Acts 11 in the UGV3

Acts 11 in the VBL

Acts 11 in the VDCC

Acts 11 in the YALU

Acts 11 in the YAPE

Acts 11 in the YBVTP

Acts 11 in the ZBP