Acts 3 (BOICB)

1 Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere nʼoge ekpere nʼelekere atọ nke ehihie. 2 Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma. 3 Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịba nʼụlọnsọ ukwu ahụ, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ. 4 Ma Pita na Jọn legidere ya anya, Pita sịrị, “Lee anyị anya.” 5 O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye. 6 Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.” 7 O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike. 8 Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke. 9 Mmadụ niile hụrụ ya ka ọ na-agagharị na-eto Chineke, 10 ha ghọtara na ọ bụ ya bụ onye ahụ na-anọ nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ahụ, nke a na-akpọ ọnụ ụzọ ama ọma na-arịọ arịrịọ. Ọ gbagwojuru ha anya nke ukwuu, gbakwa ha gharịị ihe mere ya. 11 Ma dị ka o jidere Pita na Jọn aka, ndị mmadụ niile jiri mgbagwoju anya gbara ọsọ bịakwute ha nʼakụkụ ụlọnsọ ahụ ebe a na-akpọ mgbe ụlọ Solomọn. 12 Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ gwara igwe mmadụ ahụ, “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a ji eju unu anya? Gịnị mere unu ji ele anyị anya dịka a ga-asị na ọ bụ site nʼike nke anyị maọbụ nʼịdị nsọ anyị ka anyị jiri mee ka nwoke a gawa ije? 13 Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb, Chineke nke nna anyị ha, ebuliela onye na-ejere ya ozi, bụ Jisọs elu, onye unu nyefere ka e gbuo, ma gọnarịkwa ya nʼihu Pailet, nʼagbanyeghị na o kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa. 14 Unu gọnarịrị onye ahụ dị nsọ bụrụkwa onye ezi omume, ma rịọ ka a hapụrụ unu ogbu mmadụ. 15 Unu gburu onye ahụ na-enye ndụ, ma Chineke akpọlitela ya site nʼọnwụ. Anyị bụ ndị akaebe ihe ndị a. 16 Ọ bụ site nʼokwukwe nʼaha ya, ọ bụ aha ya naanị mere nwoke a ka ọ dị ike onye nke unu na-ahụ ma marakwa. Okwukwe nʼime Jisọs mere ka ahụ ya zuo oke nʼihu unu niile. 17 “Ugbu a ụmụnna m, amaara m na unu kpara agwa na-amaghị ama, dịka ndị ndu unu sikwara kpaa. 18 Ma Chineke siri otu a mezuo ihe o kwuru site nʼọnụ ndị amụma niile na Kraịst ya aghaghị ịhụ ahụhụ. 19 Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ mmehie unu, 20 ka enyekwa unu ntute nke ime mmụọ nke sitere nʼihu Onyenwe anyị, ma zitekwara unu Kraịst ahụ, bụ onye ahọpụtara nye unu, nke bụ Jisọs. 21 Onye eluigwe na-aghaghị ịnabata tutu ruo oge ahụ Chineke ga-eweghachi ihe niile nʼọnọdụ ha, dịka o kwere na nkwa nʼogologo oge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ. 22 Mosis sịrị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke ga-eme ka onye amụma ga-adị ka m biliere unu site nʼetiti ụmụ nne unu, unu aghaghị ige ntị nʼihe niile ọ ga-agwa unu. 23 Onye ọbụla jụrụ ige onye amụma ahụ ntị, ka a ga-ekewapụ kpamkpam site nʼetiti ndị ya ma bibiekwa ya.’ 24 “Nʼezie ndị amụma niile site na Samuel na ndị ọzọ so ya nʼazụ, bukwara amụma banyere ụbọchị ndị a. 25 Ma unu bụ ndị nketa nke ndị amụma, nakwa nke ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na nna nna unu gbara, mgbe ọ gwara Ebraham, ‘Site na mkpụrụ gị ka a ga-agọzi mba niile nke ụwa.’ 26 Mgbe Chineke kpọlitere onyeozi ya, o buuru ụzọ zitere unu ya, ka ọ gọzie unu site nʼime ka onye ọbụla nʼime unu chegharịa site nʼụzọ ọjọọ ya.”

In Other Versions

Acts 3 in the ANGEFD

Acts 3 in the ANTPNG2D

Acts 3 in the AS21

Acts 3 in the BAGH

Acts 3 in the BBPNG

Acts 3 in the BBT1E

Acts 3 in the BDS

Acts 3 in the BEV

Acts 3 in the BHAD

Acts 3 in the BIB

Acts 3 in the BLPT

Acts 3 in the BNT

Acts 3 in the BNTABOOT

Acts 3 in the BNTLV

Acts 3 in the BOATCB

Acts 3 in the BOATCB2

Acts 3 in the BOBCV

Acts 3 in the BOCNT

Acts 3 in the BOECS

Acts 3 in the BOGWICC

Acts 3 in the BOHCB

Acts 3 in the BOHCV

Acts 3 in the BOHLNT

Acts 3 in the BOHNTLTAL

Acts 3 in the BOILNTAP

Acts 3 in the BOITCV

Acts 3 in the BOKCV

Acts 3 in the BOKCV2

Acts 3 in the BOKHWOG

Acts 3 in the BOKSSV

Acts 3 in the BOLCB

Acts 3 in the BOLCB2

Acts 3 in the BOMCV

Acts 3 in the BONAV

Acts 3 in the BONCB

Acts 3 in the BONLT

Acts 3 in the BONUT2

Acts 3 in the BOPLNT

Acts 3 in the BOSCB

Acts 3 in the BOSNC

Acts 3 in the BOTLNT

Acts 3 in the BOVCB

Acts 3 in the BOYCB

Acts 3 in the BPBB

Acts 3 in the BPH

Acts 3 in the BSB

Acts 3 in the CCB

Acts 3 in the CUV

Acts 3 in the CUVS

Acts 3 in the DBT

Acts 3 in the DGDNT

Acts 3 in the DHNT

Acts 3 in the DNT

Acts 3 in the ELBE

Acts 3 in the EMTV

Acts 3 in the ESV

Acts 3 in the FBV

Acts 3 in the FEB

Acts 3 in the GGMNT

Acts 3 in the GNT

Acts 3 in the HARY

Acts 3 in the HNT

Acts 3 in the IRVA

Acts 3 in the IRVB

Acts 3 in the IRVG

Acts 3 in the IRVH

Acts 3 in the IRVK

Acts 3 in the IRVM

Acts 3 in the IRVM2

Acts 3 in the IRVO

Acts 3 in the IRVP

Acts 3 in the IRVT

Acts 3 in the IRVT2

Acts 3 in the IRVU

Acts 3 in the ISVN

Acts 3 in the JSNT

Acts 3 in the KAPI

Acts 3 in the KBT1ETNIK

Acts 3 in the KBV

Acts 3 in the KJV

Acts 3 in the KNFD

Acts 3 in the LBA

Acts 3 in the LBLA

Acts 3 in the LNT

Acts 3 in the LSV

Acts 3 in the MAAL

Acts 3 in the MBV

Acts 3 in the MBV2

Acts 3 in the MHNT

Acts 3 in the MKNFD

Acts 3 in the MNG

Acts 3 in the MNT

Acts 3 in the MNT2

Acts 3 in the MRS1T

Acts 3 in the NAA

Acts 3 in the NASB

Acts 3 in the NBLA

Acts 3 in the NBS

Acts 3 in the NBVTP

Acts 3 in the NET2

Acts 3 in the NIV11

Acts 3 in the NNT

Acts 3 in the NNT2

Acts 3 in the NNT3

Acts 3 in the PDDPT

Acts 3 in the PFNT

Acts 3 in the RMNT

Acts 3 in the SBIAS

Acts 3 in the SBIBS

Acts 3 in the SBIBS2

Acts 3 in the SBICS

Acts 3 in the SBIDS

Acts 3 in the SBIGS

Acts 3 in the SBIHS

Acts 3 in the SBIIS

Acts 3 in the SBIIS2

Acts 3 in the SBIIS3

Acts 3 in the SBIKS

Acts 3 in the SBIKS2

Acts 3 in the SBIMS

Acts 3 in the SBIOS

Acts 3 in the SBIPS

Acts 3 in the SBISS

Acts 3 in the SBITS

Acts 3 in the SBITS2

Acts 3 in the SBITS3

Acts 3 in the SBITS4

Acts 3 in the SBIUS

Acts 3 in the SBIVS

Acts 3 in the SBT

Acts 3 in the SBT1E

Acts 3 in the SCHL

Acts 3 in the SNT

Acts 3 in the SUSU

Acts 3 in the SUSU2

Acts 3 in the SYNO

Acts 3 in the TBIAOTANT

Acts 3 in the TBT1E

Acts 3 in the TBT1E2

Acts 3 in the TFTIP

Acts 3 in the TFTU

Acts 3 in the TGNTATF3T

Acts 3 in the THAI

Acts 3 in the TNFD

Acts 3 in the TNT

Acts 3 in the TNTIK

Acts 3 in the TNTIL

Acts 3 in the TNTIN

Acts 3 in the TNTIP

Acts 3 in the TNTIZ

Acts 3 in the TOMA

Acts 3 in the TTENT

Acts 3 in the UBG

Acts 3 in the UGV

Acts 3 in the UGV2

Acts 3 in the UGV3

Acts 3 in the VBL

Acts 3 in the VDCC

Acts 3 in the YALU

Acts 3 in the YAPE

Acts 3 in the YBVTP

Acts 3 in the ZBP