Colossians 1 (BOICB)

1 Pọl, onye e mere onyeozi Kraịst Jisọs, site nʼọchịchọ Chineke, ya na nwanna anyị Timoti, 2 Na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị, bụ ụmụnna ndị dị nsọ na ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị dịrị unu. 3 Mgbe ọbụla anyị na-ekpere unu ekpere anyị na-ekele Chineke onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele. 4 Nʼihi na anyị anụla ihe banyere okwukwe unu nʼime Kraịst Jisọs, na otu unu si hụ ndị nsọ niile nʼanya. 5 Okwukwe na ịhụnanya nke na-esite nʼolileanya nke a kwadobere unu nʼeluigwe, nke unu nụrụla nʼokwu nke eziokwu ahụ, bụ oziọma, 6 nke bịaruterela unu. Nʼezie, dị ka o si dị nʼụwa niile, ọ na-amị mkpụrụ na-etokwa, dị ka o si eme nʼetiti unu, site nʼụbọchị unu nụrụ ma ghọtakwa amara nke Chineke nʼeziokwu. 7 Dị ka unu siri mụta nʼaka Epafras, onye anyị hụrụ nʼanya na onye anyị na ya na-ejekọ ozi. Ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼijere Kraịst ozi nʼaha unu. 8 O meela ka anyị mara ụdị ịhụnanya unu nwere nʼime Mmụọ. 9 Nʼihi nke a, site nʼụbọchị anyị nụrụ ihe banyere ya, anyị esepụghị aka ikpere unu ekpere. Anyị na-arịọ ka unu jupụta nʼamamihe nke uche ya, nʼime nghọta ma amamihe nke mmụọ niile. 10 Ka unu si otu a bie ndụ dị ka Onyenwe anyị chọrọ. Ka unu bụrụkwa ndị na-eme ihe ọma mgbe niile, ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ nʼụzọ ọbụla, na ndị na-eto eto nʼihe banyere ịma Chineke mgbe niile. 11 Ebe a na-eme ka unu dị ike nʼime ike niile, dị ka ike nke ebube ya si dị. Ka unu nwee ndidi na ogologo ntachiobi, 12 na-enyenụ Nna ekele site nʼọṅụ, onye mere ka anyị kwesi iketa oke nʼihe nketa nke ndị nsọ nʼime alaeze nke ìhè. 13 Nʼihi na ọ napụtara anyị site nʼike nke ọchịchịrị, bịa kpọfee anyị nʼalaeze nke Ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya. 14 Onye anyị si nʼime ya nwee nzọpụta, nke bụ mgbaghara mmehie niile. 15 Ọ bụ nnọọ onyinyo Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya, bụrụkwa onye mbụ a mụrụ nʼihe niile e kere eke. 16 Nʼihi na nʼime ya ka e ji kee ihe niile dị nʼụwa na nke dị nʼeluigwe, na ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya, ma ocheeze niile, ike niile, ịchị isi niile na ike ọchịchị niile. E kere ihe niile site nʼaka ya nakwa nʼihi ya. 17 Ya onwe ya nọ tupu ekee ihe niile, ọ bụkwa nʼime ya ka ejikọtara ihe niile nʼotu. 18 Ọ bụ ya bụ isi nke anụ ahụ ahụ bụ chọọchị. Ọ bụ ya bụ mmalite, onye mbụ a mụrụ nʼetiti ndị niile ga-esi nʼọnwụ bilie. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisi mbụ nʼime ihe niile. 19 Nʼihi na ọ bụ nʼime ya ka ọ masịrị ozuzu oke ya ibi. 20 Ọ bụ site na ya ka o ji mee ka ihe niile bịaghachikwute ya. E mere ka udo dịrị nʼetiti ya na ihe niile, maọbụ ihe dị nʼụwa, maọbụ nke dị na nʼeluigwe site na ọbara ọ wụsiri nʼelu obe. 21 Unu onwe unu bụ ndị e mere ndị mba ọzọ site nʼebe Chineke nọ, na ndị iro nʼuche unu nʼihi ajọ omume niile unu. 22 Ma ugbu a, o kpezierela unu site na-anụ ahụ Kraịst, sitekwa nʼọnwụ ya, iji chee unu nʼihu ya dịka ndị dị nsọ, na ndị na-enweghị ịta ụta, na ihe ebubo ọbụla megide ha. 23 Ma ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwukwe unu, bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ, ndị guzosiri ike, ndị na-ewezugaghị onwe ha site nʼolileanya ahụ dịrị unu nʼoziọma ahụ. Nke a bụ oziọma ahụ unu nụrụ, nke ekwusakwara nye ihe niile e kere eke nʼokpuru eluigwe, nke e mere mụ onwe m bụ Pọl, onyeozi ya. 24 Ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi ahụhụ ndị a nke m na-ahụ nʼihi unu, ana m emezu ihe fọdụrụ nʼahụhụ ahụ Kraịst tara nʼihi anụ ahụ ya bụ chọọchị. 25 Emeela ka m bụrụ onyeozi chọọchị ya site nʼikike Chineke nyere m, ikwusara unu okwu Chineke nʼozuzu oke ya. 26 Nke bụ ihe omimi ahụ, nke e zoro ezo site nʼoge ahụ nakwa ọgbọ niile ndị a gara aga, ma ugbu a e mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị nsọ Chineke. 27 Ọ bụ ha ka Chineke họpụtara ime ka amata akụ nke ebube nke ihe omimi a nʼetiti ndị mba ọzọ, nke bụ Kraịst nʼime unu, onye bụ olileanya nke ebube ahụ. 28 Ọ bụ ya ka anyị na-ekwusa, na-adụ onye ọbụla ọdụ, na-akụzikwara onye ọbụla ihe site nʼamamihe niile. Nʼihi na anyị chọrọ iche mmadụ niile ọbụla nʼihu ya dị ka ndị zuruoke nʼime Kraịst. 29 Nʼihi nke a ka m na-adọgbu onwe m nʼọrụ, dị ka ike ya dị ukwuu nke na-arụ ọrụ si dị m nʼime.

In Other Versions

Colossians 1 in the ANGEFD

Colossians 1 in the ANTPNG2D

Colossians 1 in the AS21

Colossians 1 in the BAGH

Colossians 1 in the BBPNG

Colossians 1 in the BBT1E

Colossians 1 in the BDS

Colossians 1 in the BEV

Colossians 1 in the BHAD

Colossians 1 in the BIB

Colossians 1 in the BLPT

Colossians 1 in the BNT

Colossians 1 in the BNTABOOT

Colossians 1 in the BNTLV

Colossians 1 in the BOATCB

Colossians 1 in the BOATCB2

Colossians 1 in the BOBCV

Colossians 1 in the BOCNT

Colossians 1 in the BOECS

Colossians 1 in the BOGWICC

Colossians 1 in the BOHCB

Colossians 1 in the BOHCV

Colossians 1 in the BOHLNT

Colossians 1 in the BOHNTLTAL

Colossians 1 in the BOILNTAP

Colossians 1 in the BOITCV

Colossians 1 in the BOKCV

Colossians 1 in the BOKCV2

Colossians 1 in the BOKHWOG

Colossians 1 in the BOKSSV

Colossians 1 in the BOLCB

Colossians 1 in the BOLCB2

Colossians 1 in the BOMCV

Colossians 1 in the BONAV

Colossians 1 in the BONCB

Colossians 1 in the BONLT

Colossians 1 in the BONUT2

Colossians 1 in the BOPLNT

Colossians 1 in the BOSCB

Colossians 1 in the BOSNC

Colossians 1 in the BOTLNT

Colossians 1 in the BOVCB

Colossians 1 in the BOYCB

Colossians 1 in the BPBB

Colossians 1 in the BPH

Colossians 1 in the BSB

Colossians 1 in the CCB

Colossians 1 in the CUV

Colossians 1 in the CUVS

Colossians 1 in the DBT

Colossians 1 in the DGDNT

Colossians 1 in the DHNT

Colossians 1 in the DNT

Colossians 1 in the ELBE

Colossians 1 in the EMTV

Colossians 1 in the ESV

Colossians 1 in the FBV

Colossians 1 in the FEB

Colossians 1 in the GGMNT

Colossians 1 in the GNT

Colossians 1 in the HARY

Colossians 1 in the HNT

Colossians 1 in the IRVA

Colossians 1 in the IRVB

Colossians 1 in the IRVG

Colossians 1 in the IRVH

Colossians 1 in the IRVK

Colossians 1 in the IRVM

Colossians 1 in the IRVM2

Colossians 1 in the IRVO

Colossians 1 in the IRVP

Colossians 1 in the IRVT

Colossians 1 in the IRVT2

Colossians 1 in the IRVU

Colossians 1 in the ISVN

Colossians 1 in the JSNT

Colossians 1 in the KAPI

Colossians 1 in the KBT1ETNIK

Colossians 1 in the KBV

Colossians 1 in the KJV

Colossians 1 in the KNFD

Colossians 1 in the LBA

Colossians 1 in the LBLA

Colossians 1 in the LNT

Colossians 1 in the LSV

Colossians 1 in the MAAL

Colossians 1 in the MBV

Colossians 1 in the MBV2

Colossians 1 in the MHNT

Colossians 1 in the MKNFD

Colossians 1 in the MNG

Colossians 1 in the MNT

Colossians 1 in the MNT2

Colossians 1 in the MRS1T

Colossians 1 in the NAA

Colossians 1 in the NASB

Colossians 1 in the NBLA

Colossians 1 in the NBS

Colossians 1 in the NBVTP

Colossians 1 in the NET2

Colossians 1 in the NIV11

Colossians 1 in the NNT

Colossians 1 in the NNT2

Colossians 1 in the NNT3

Colossians 1 in the PDDPT

Colossians 1 in the PFNT

Colossians 1 in the RMNT

Colossians 1 in the SBIAS

Colossians 1 in the SBIBS

Colossians 1 in the SBIBS2

Colossians 1 in the SBICS

Colossians 1 in the SBIDS

Colossians 1 in the SBIGS

Colossians 1 in the SBIHS

Colossians 1 in the SBIIS

Colossians 1 in the SBIIS2

Colossians 1 in the SBIIS3

Colossians 1 in the SBIKS

Colossians 1 in the SBIKS2

Colossians 1 in the SBIMS

Colossians 1 in the SBIOS

Colossians 1 in the SBIPS

Colossians 1 in the SBISS

Colossians 1 in the SBITS

Colossians 1 in the SBITS2

Colossians 1 in the SBITS3

Colossians 1 in the SBITS4

Colossians 1 in the SBIUS

Colossians 1 in the SBIVS

Colossians 1 in the SBT

Colossians 1 in the SBT1E

Colossians 1 in the SCHL

Colossians 1 in the SNT

Colossians 1 in the SUSU

Colossians 1 in the SUSU2

Colossians 1 in the SYNO

Colossians 1 in the TBIAOTANT

Colossians 1 in the TBT1E

Colossians 1 in the TBT1E2

Colossians 1 in the TFTIP

Colossians 1 in the TFTU

Colossians 1 in the TGNTATF3T

Colossians 1 in the THAI

Colossians 1 in the TNFD

Colossians 1 in the TNT

Colossians 1 in the TNTIK

Colossians 1 in the TNTIL

Colossians 1 in the TNTIN

Colossians 1 in the TNTIP

Colossians 1 in the TNTIZ

Colossians 1 in the TOMA

Colossians 1 in the TTENT

Colossians 1 in the UBG

Colossians 1 in the UGV

Colossians 1 in the UGV2

Colossians 1 in the UGV3

Colossians 1 in the VBL

Colossians 1 in the VDCC

Colossians 1 in the YALU

Colossians 1 in the YAPE

Colossians 1 in the YBVTP

Colossians 1 in the ZBP