Ezekiel 27 (BOICB)
1 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere Taịa, 3 sị ya, gị oke obodo dị nʼọnụ oke osimiri, onye bụ onye ahịa nke mba niile dị nʼọnụ osimiri. ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru:“ ‘Gị onwe gị, bụ Taịa, na-asị,“Ezuru m oke nʼịma mma.” 4 I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri.Ndị wuru gị emeekwala ka ịma mma gị zuo oke. 5 Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gịsitere nʼosisi junipa nke si Senia;ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọnka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike. 6 Osisi ook nke si Bashanka e ji mee ụmara gị niile.Osisi e si Saiprọs bubataka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma. 7 Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata,ka e ji mee ọkọlọtọ gị.Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo,nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata. 8 Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị.Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri. 9 Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị.Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ.Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya hana-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị. 10 “ ‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya, na Put,jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị.Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị,na-ewetara gị ebube. 11 Ndị ikom Avad, na Helekbụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile.Ndị ikom Gamadna-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike.Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị,ime ka ịma mma gị zuo oke. 12 “ ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ. 13 “ ‘Ndị Griis, Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ. 14 “ ‘Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere ihe ha zụrụ. 15 “ ‘Ndị ahịa si na Dedan bụkwa ndị ahịa gị. Otu a kwa ọtụtụ ndị bi nʼọnụ mmiri bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ọdụ, na osisi eboni kwụọ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị. 16 “ ‘Ndị Aram ka gị na ha zụrụ ahịa nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa gị. Ha na-ejikwa nkume dị oke ọnụ tọkwọisi na akwa e sijiri esiji odo odo, na akwa a kpara nke ọma, na ezi akwa ọcha, na koral, na nkume oke ọnụahịa rubi na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị. 17 “ ‘Ndị Juda na ndị Izrel niile bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wiiti nke si nʼobodo Minit, ya na shuga, na mmanụ aṅụ, na mmanụ, na mmanụ otite na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị. 18 “ ‘Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị ị nwere ire ere. Ọ bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta, 19 na mmanya a gbara nʼudu nʼudu nke si Ụzal, na igwe nwupụrụ enwupụ, na kashia, na kalamus, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị. 20 “ ‘Dedan bụ onye ahịa gị nʼakwa a na-agbasa nʼelu ịnyịnya anọkwasị ọdụ. 21 “ ‘Arebịa na ụmụ eze niile nke Keda bụkwa ndị ahịa gị. Ọ bụ ụmụ atụrụ, na ebule, na mkpi, ka gị na ha nʼazụrịta na-erekwa. 22 “ ‘Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ. 23 “ ‘Ndị Haran, Kanne na Eden, na ndị ahịa Sheba, Ashọ na Kilmad, bụ ndị gị na ha zụkọrọ ahịa. 24 Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị. 25 “ ‘Ụgbọ mmiri niile nke Tashishbụ ndị na-ebu ihe ahịa gị.I jupụtara nʼihe ahịa,gị obodo dị nʼetiti mmiri. 26 Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gịna-ebuba gị nʼosimiri.Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụga-etiwasị gị nʼetiti osimiri. 27 Akụ gị niile, na ngwa ahịa gị niile, na ihe ịzụ ahịa gị niile,na ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ mmiri gị, na ndị na-anya ụgbọ mmiri, ma ndị na-edozi ụgbọ mmiri gị,ma ndị na-azụ ahịa gị, ma ndị agha gị niile,ha na ndị niile nọ nʼime ụgbọ gịka mmiri ga-eri nʼetiti mmiri,nʼụbọchị ahụ ụgbọ gị ga-emikpu. 28 Ala niile dị nʼọnụ mmiri ga-ama jijijimgbe ndị ọka ụgbọ mmiri gị ga-eti mkpu akwa. 29 Ndị niile na-anya ụgbọ mmiri,na ndị ọka ụgbọ niile nke oke osimiri,ga-esitekwa nʼụgbọ harịdata guzo nʼelu ala. 30 Ha ga-eti mkpu akwa,ha ga-akwa akwa nke ukwuu,werekwa aja wụkwasị onwe ha nʼisi,na-atụrụkwa onwe ha na ntụ. 31 Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha,yirikwa akwa mkpe,kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha.Ha ga-etikwa aka ha nʼobi. 32 Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị,nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị,“Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa,nke osimiri gbara gburugburu?” 33 Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị,e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ.E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gịmee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya. 34 Ugbu a, mmiri e riela gị,ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ.Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile,na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi. 35 Ihe ndị a niile ga-eju ndị bi nʼala ọnụ mmiriosimiri niile anya.Ndị eze ha niile tụkwara egwu nke ukwuu;ihu ha gbarụkwara agbarụ site nʼegwu. 36 Ndị ahịa nke mba dị iche iche na-efufe isi ha,nʼihi na ihe mere gị dị egwu.Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ”