Hebrews 10 (BOICB)

1 Iwu ahụ bụ naanị onyinyo na-egosi ihe ọma gaje ịbịa. Nʼihi ya, o zughị oke nʼonwe ya isite nʼaja ndị ahụ a na-achụ mgbe mgbe kwa afọ, mee ka ndị ahụ na-abịaru nso ife ofufe zuo oke. 2 Ma ọ bụghị otu a, ọ bụ na a gabeghị akwụsị ịchụ aja ndị a? Ọ bụrụ na a sachapụla njọ ndị na-efe ofufe na mbụ, akọnuche ha agaghịkwa ama ha ikpe mmehie ha. 3 Ma nke bụ eziokwu bụ na ihe aja ndị a na-eme bụ ichetara ha mmehie ha kwa afọ niile. 4 Nʼihi na ọ bụ ihe na-apụghị ime eme na ọbara oke ehi na nke ụmụ ewu dị iche iche ga-asachapụ mmehie. 5 Ya mere mgbe Kraịst bịara nʼụwa, ọ sịrị,“Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọkama ị kwadoro ahụ nye m. 6 Aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie,ha abụghị ihe dị ezi mma nye gị. 7 Mgbe ahụ ka m sịrị, ‘Lee, abịala m Chineke m, ime ihe ị na-achọ.Nke a bụkwa ihe e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.’ ” 8 O kwuru na mbụ, “Aja dị iche iche, na onyinye, na aja nsure ọkụ na aja mmehie adịghị atọ gị ụtọ, ha adịghịkwa amasị gị” (a chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị). 9 O kwukwara ọzọ, “Lee abịala m ime uche gị.” Ọ kagburu aja nke mbụ ahụ ma were aja nke abụọ dochie nʼọnọdụ ya. 10 Site nʼime uche Chineke, e mere ka anyị dị nsọ site nʼaja Jisọs Kraịst ji onwe ya chụọ naanị otu ugboro. 11 Onye nchụaja ọbụla na-eguzo kwa ụbọchị na-efe ofufe, na-achụkwa otu aja ahụ ugboro ugboro, bụ aja nke na-enweghị ike ịsachapụ mmehie. 12 Ma mgbe Kraịst chụchara naanị otu aja ahụ, otu ugboro nʼihi mmehie niile, ọ nọdụrụ ala nʼaka nri Chineke. 13 Ebe ahụ ka ọ nọ ugbu a na-eche ka ndị iro ya niile bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya. 14 Nʼihi na o sitela nʼotu aja mee ka ndị ahụ a na-eme ka ha dịrị nsọ zuo oke mgbe niile. 15 Mmụọ nsọ na-agbakwara anyị ama banyere ihe ndị a mgbe o buru ụzọ kwuo: 16 “Nke a bụ ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ha ga-agbamgbe oge ndị ahụ gasịrị, ka Onyenwe anyị kwuru.Aga m etinye iwu m nʼobi ha.Aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.” 17 O kwukwara sị,“Agaghị m echetakwa mmehie hana mmebi iwu ha niile ọzọ.” 18 Ya mere, ebe ọ bụ na a gbagharala mmehie ndị a, ọ dịkwaghị mkpa ịchụ ajọ ọzọ maka mgbaghara mmehie. 19 Nʼihi nke a, ụmụnna m, ebe anyị nwere nkwuwa okwu ịbanye nʼEbe Kachasị Nsọ site nʼọbara Jisọs, 20 bụ ụzọ ọhụrụ nke o meghere nye anyị, nke dị ọhụrụ ma dịkwa ndụ site nʼakwa mgbochi ahụ nke bụ ahụ ya, 21 ebe anyị nwekwara onye nchụaja dị ukwuu, nke na-elekọta ụlọ Chineke, 22 ka anyị bịaruo nso site nʼobi dị ọcha, na ntụkwasị obi zuru ezu nke okwukwe, ka anyị bụrụ ndị a sachara obi ha site nʼakọnuche rụrụ arụ, ka anyị bụrụkwa ndị e ji mmiri dị ezigbo ọcha sachaa ahụ anyị. 23 Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi. 24 Ka anyị tụgharịa uche otu anyị ga-esi kpalie ibe anyị nʼịhụnanya na ezi ọrụ. 25 Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso. 26 Ọ bụrụ na anyị akpachapụ anya na-anọgide na mmehie mgbe anyị matachara eziokwu ahụ, o nwekwaghị aja ọzọ fọdụrụ a ga-achụ banyere mmehie niile. 27 Kama naanị ikpe dị oke egwu, nke ga-adị ka ọkụ na-ere ike ike, nke ga-erechapụ ndị niile bụ ndị iro. 28 Onye ọbụla dara iwu Mosis, na-anwụ na-enweghị ebere, site nʼakaebe mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara megide ya. 29 Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ụdị ahụhụ unu chere na a ga-enye onye lelịrị Ọkpara Chineke, gịnị ka a ga-eme onye merụrụ ọbara nke ọgbụgba ndụ nke e ji doo ya nsọ, na onye kpasuru mmụọ nke amara ahụ iwe? 30 Nʼihi na anyị maa onye ahụ kwurunụ, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ọzọkwa, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.” 31 Ọ bụ ihe dị oke egwu ịdaba nʼaka Chineke dị ndụ. 32 Ma chetakwanụ ụbọchị mbụ ndị ahụ, mgbe unu natachara ìhè, unu nọgidesikwara ike nʼagbanyeghị oke ahụhụ niile unu tara. 33 Mgbe ụfọdụ, a kparịrị unu nʼihu ọha, unu natakwara mkpagbu. Nʼoge ọzọ, unu soro ndị e si otu a mesoo mmeso. 34 Unu were obi ebere soro ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ taa ahụhụ, unu jikwa ọṅụ nabata ya mgbe a nakọrọchara unu ihe niile unu nwere, nʼihi na unu onwe unu matara na unu nwere ihe ka mma, nke na-anọgide. 35 Ya mere, unu ahapụkwala ntụkwasị obi unu ahụ, nʼihi na ọ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu. 36 Nʼihi ya, unu kwesiri inwe ndidi ka ọ ga-abụ na mgbe unu mere uche Chineke unu ga-anata ihe e kwere na nkwa. 37 Nʼihi,“Na oge na-adịghị anya,onye ahụ nke na-abịa ga-abịaọ gaghị anọkwa ọdụ.” 38 Ma,“Onye ezi omume nkem ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.Mkpụrụobi m agaghị e nwee mmasịnʼime onye ọbụla na-alaghachi azụ.” 39 Ma anyị abụghị ndị na-alaghachi azụ si otu a laa nʼiyi. Kama anyị dịnyere ndị nwere okwukwe, bụrụkwa ndị a zọpụtara.

In Other Versions

Hebrews 10 in the ANGEFD

Hebrews 10 in the ANTPNG2D

Hebrews 10 in the AS21

Hebrews 10 in the BAGH

Hebrews 10 in the BBPNG

Hebrews 10 in the BBT1E

Hebrews 10 in the BDS

Hebrews 10 in the BEV

Hebrews 10 in the BHAD

Hebrews 10 in the BIB

Hebrews 10 in the BLPT

Hebrews 10 in the BNT

Hebrews 10 in the BNTABOOT

Hebrews 10 in the BNTLV

Hebrews 10 in the BOATCB

Hebrews 10 in the BOATCB2

Hebrews 10 in the BOBCV

Hebrews 10 in the BOCNT

Hebrews 10 in the BOECS

Hebrews 10 in the BOGWICC

Hebrews 10 in the BOHCB

Hebrews 10 in the BOHCV

Hebrews 10 in the BOHLNT

Hebrews 10 in the BOHNTLTAL

Hebrews 10 in the BOILNTAP

Hebrews 10 in the BOITCV

Hebrews 10 in the BOKCV

Hebrews 10 in the BOKCV2

Hebrews 10 in the BOKHWOG

Hebrews 10 in the BOKSSV

Hebrews 10 in the BOLCB

Hebrews 10 in the BOLCB2

Hebrews 10 in the BOMCV

Hebrews 10 in the BONAV

Hebrews 10 in the BONCB

Hebrews 10 in the BONLT

Hebrews 10 in the BONUT2

Hebrews 10 in the BOPLNT

Hebrews 10 in the BOSCB

Hebrews 10 in the BOSNC

Hebrews 10 in the BOTLNT

Hebrews 10 in the BOVCB

Hebrews 10 in the BOYCB

Hebrews 10 in the BPBB

Hebrews 10 in the BPH

Hebrews 10 in the BSB

Hebrews 10 in the CCB

Hebrews 10 in the CUV

Hebrews 10 in the CUVS

Hebrews 10 in the DBT

Hebrews 10 in the DGDNT

Hebrews 10 in the DHNT

Hebrews 10 in the DNT

Hebrews 10 in the ELBE

Hebrews 10 in the EMTV

Hebrews 10 in the ESV

Hebrews 10 in the FBV

Hebrews 10 in the FEB

Hebrews 10 in the GGMNT

Hebrews 10 in the GNT

Hebrews 10 in the HARY

Hebrews 10 in the HNT

Hebrews 10 in the IRVA

Hebrews 10 in the IRVB

Hebrews 10 in the IRVG

Hebrews 10 in the IRVH

Hebrews 10 in the IRVK

Hebrews 10 in the IRVM

Hebrews 10 in the IRVM2

Hebrews 10 in the IRVO

Hebrews 10 in the IRVP

Hebrews 10 in the IRVT

Hebrews 10 in the IRVT2

Hebrews 10 in the IRVU

Hebrews 10 in the ISVN

Hebrews 10 in the JSNT

Hebrews 10 in the KAPI

Hebrews 10 in the KBT1ETNIK

Hebrews 10 in the KBV

Hebrews 10 in the KJV

Hebrews 10 in the KNFD

Hebrews 10 in the LBA

Hebrews 10 in the LBLA

Hebrews 10 in the LNT

Hebrews 10 in the LSV

Hebrews 10 in the MAAL

Hebrews 10 in the MBV

Hebrews 10 in the MBV2

Hebrews 10 in the MHNT

Hebrews 10 in the MKNFD

Hebrews 10 in the MNG

Hebrews 10 in the MNT

Hebrews 10 in the MNT2

Hebrews 10 in the MRS1T

Hebrews 10 in the NAA

Hebrews 10 in the NASB

Hebrews 10 in the NBLA

Hebrews 10 in the NBS

Hebrews 10 in the NBVTP

Hebrews 10 in the NET2

Hebrews 10 in the NIV11

Hebrews 10 in the NNT

Hebrews 10 in the NNT2

Hebrews 10 in the NNT3

Hebrews 10 in the PDDPT

Hebrews 10 in the PFNT

Hebrews 10 in the RMNT

Hebrews 10 in the SBIAS

Hebrews 10 in the SBIBS

Hebrews 10 in the SBIBS2

Hebrews 10 in the SBICS

Hebrews 10 in the SBIDS

Hebrews 10 in the SBIGS

Hebrews 10 in the SBIHS

Hebrews 10 in the SBIIS

Hebrews 10 in the SBIIS2

Hebrews 10 in the SBIIS3

Hebrews 10 in the SBIKS

Hebrews 10 in the SBIKS2

Hebrews 10 in the SBIMS

Hebrews 10 in the SBIOS

Hebrews 10 in the SBIPS

Hebrews 10 in the SBISS

Hebrews 10 in the SBITS

Hebrews 10 in the SBITS2

Hebrews 10 in the SBITS3

Hebrews 10 in the SBITS4

Hebrews 10 in the SBIUS

Hebrews 10 in the SBIVS

Hebrews 10 in the SBT

Hebrews 10 in the SBT1E

Hebrews 10 in the SCHL

Hebrews 10 in the SNT

Hebrews 10 in the SUSU

Hebrews 10 in the SUSU2

Hebrews 10 in the SYNO

Hebrews 10 in the TBIAOTANT

Hebrews 10 in the TBT1E

Hebrews 10 in the TBT1E2

Hebrews 10 in the TFTIP

Hebrews 10 in the TFTU

Hebrews 10 in the TGNTATF3T

Hebrews 10 in the THAI

Hebrews 10 in the TNFD

Hebrews 10 in the TNT

Hebrews 10 in the TNTIK

Hebrews 10 in the TNTIL

Hebrews 10 in the TNTIN

Hebrews 10 in the TNTIP

Hebrews 10 in the TNTIZ

Hebrews 10 in the TOMA

Hebrews 10 in the TTENT

Hebrews 10 in the UBG

Hebrews 10 in the UGV

Hebrews 10 in the UGV2

Hebrews 10 in the UGV3

Hebrews 10 in the VBL

Hebrews 10 in the VDCC

Hebrews 10 in the YALU

Hebrews 10 in the YAPE

Hebrews 10 in the YBVTP

Hebrews 10 in the ZBP