Hebrews 13 (BOICB)

1 Ka ịhụnanya unu nwere nʼetiti unu na-adịgide. 2 Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nʼihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị. 3 Chetanụ ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ dị ka a ga-asị na unu so ha nọdụ nʼụlọ mkpọrọ. Chetakwanụ ndị a na-ata ahụhụ, dịka a ga-asị na unu onwe unu so ha na-ahụ ahụhụ nʼahụ unu. 4 Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe. 5 Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola,“Agaghị m ahapụ gị.O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.” 6 Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo,“Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu.Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?” 7 Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha. 8 Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 9 Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu. Nʼihi na ọ bụ ihe dị mma ka e were amara mee ka obi sie ike, ọ bụghị site nʼidebe iwu banyere nri nke na-enweghị uru ọ bara ndị na-edebe ya. 10 Anyị nwere ebe ịchụ aja, ebe ndị niile na-eje ozi ha nʼụlọ ikwu a enweghị ike iri aja a chụrụ nʼelu ya. 11 Onyeisi nchụaja na-ewebata ọbara ụmụ anụ ndị ahụ nʼEbe Kachasị Nsọ dịka aja maka mmehie, ma a na-erepịa anụ ahụ ha ọkụ na mpụga ụlọ ikwu. 12 Nʼotu aka ahụ, Jisọs nʼonwe ya tara ahụhụ na mpụga ọnụ ụzọ ama obodo ka o jiri ọbara ya mee ka ndị nke ya dị nsọ. 13 Ya mere, ka anyị gakwuru ya nʼazụ ụlọ ikwu soro ya die mkparị o diri. 14 Nʼihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, ma anyị na-ele anya obodo nke gaje ịbịa. 15 Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya. 16 Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ. 17 Ka unu na-ekwenyere ndị ndu unu, dokwaanụ onwe unu nʼokpuru ha. Nʼihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụobi unu dịka ndị ga-aza azịza. Meenụ nke a ka ha were ọṅụ na-eje ozi ha, ma ọ bụghị site nʼobi mwute nʼihi na nke a agaghị abara unu uru. 18 Na-ekperenụ anyị ekpere, nʼihi na o doro anyị anya na anyị nwere akọnuche dị ọcha na-achọkwa ibi ndụ nwere ugwu nʼụzọ niile. 19 Ana m arịọsị unu ya ike, ka unu mee nke a, ka m nwee ike ịlọghachikwute unu ọsịịsọ. 20 Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ, 21 mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 22 Ụmụnna m, arịọọ m unu, ka unu were ntachiobi nụrụ okwu agbamume m gwara unu nʼime akwụkwọ a na-etoghị ogologo. 23 Ana m eme ka unu mata na nwanna anyị Timoti esitela nʼụlọ mkpọrọ pụta. Mụ na ya ga-esoro bịa leta unu ma ọ bụrụ na ọ bịa nʼebe a na mgbe na-adịghị anya. 24 Keleerenụ m ndịisi unu niile na ndị nsọ niile.Ndị si Itali na-ezitere unu ekele ha. 25 Ka amara dịnyere unu niile.

In Other Versions

Hebrews 13 in the ANGEFD

Hebrews 13 in the ANTPNG2D

Hebrews 13 in the AS21

Hebrews 13 in the BAGH

Hebrews 13 in the BBPNG

Hebrews 13 in the BBT1E

Hebrews 13 in the BDS

Hebrews 13 in the BEV

Hebrews 13 in the BHAD

Hebrews 13 in the BIB

Hebrews 13 in the BLPT

Hebrews 13 in the BNT

Hebrews 13 in the BNTABOOT

Hebrews 13 in the BNTLV

Hebrews 13 in the BOATCB

Hebrews 13 in the BOATCB2

Hebrews 13 in the BOBCV

Hebrews 13 in the BOCNT

Hebrews 13 in the BOECS

Hebrews 13 in the BOGWICC

Hebrews 13 in the BOHCB

Hebrews 13 in the BOHCV

Hebrews 13 in the BOHLNT

Hebrews 13 in the BOHNTLTAL

Hebrews 13 in the BOILNTAP

Hebrews 13 in the BOITCV

Hebrews 13 in the BOKCV

Hebrews 13 in the BOKCV2

Hebrews 13 in the BOKHWOG

Hebrews 13 in the BOKSSV

Hebrews 13 in the BOLCB

Hebrews 13 in the BOLCB2

Hebrews 13 in the BOMCV

Hebrews 13 in the BONAV

Hebrews 13 in the BONCB

Hebrews 13 in the BONLT

Hebrews 13 in the BONUT2

Hebrews 13 in the BOPLNT

Hebrews 13 in the BOSCB

Hebrews 13 in the BOSNC

Hebrews 13 in the BOTLNT

Hebrews 13 in the BOVCB

Hebrews 13 in the BOYCB

Hebrews 13 in the BPBB

Hebrews 13 in the BPH

Hebrews 13 in the BSB

Hebrews 13 in the CCB

Hebrews 13 in the CUV

Hebrews 13 in the CUVS

Hebrews 13 in the DBT

Hebrews 13 in the DGDNT

Hebrews 13 in the DHNT

Hebrews 13 in the DNT

Hebrews 13 in the ELBE

Hebrews 13 in the EMTV

Hebrews 13 in the ESV

Hebrews 13 in the FBV

Hebrews 13 in the FEB

Hebrews 13 in the GGMNT

Hebrews 13 in the GNT

Hebrews 13 in the HARY

Hebrews 13 in the HNT

Hebrews 13 in the IRVA

Hebrews 13 in the IRVB

Hebrews 13 in the IRVG

Hebrews 13 in the IRVH

Hebrews 13 in the IRVK

Hebrews 13 in the IRVM

Hebrews 13 in the IRVM2

Hebrews 13 in the IRVO

Hebrews 13 in the IRVP

Hebrews 13 in the IRVT

Hebrews 13 in the IRVT2

Hebrews 13 in the IRVU

Hebrews 13 in the ISVN

Hebrews 13 in the JSNT

Hebrews 13 in the KAPI

Hebrews 13 in the KBT1ETNIK

Hebrews 13 in the KBV

Hebrews 13 in the KJV

Hebrews 13 in the KNFD

Hebrews 13 in the LBA

Hebrews 13 in the LBLA

Hebrews 13 in the LNT

Hebrews 13 in the LSV

Hebrews 13 in the MAAL

Hebrews 13 in the MBV

Hebrews 13 in the MBV2

Hebrews 13 in the MHNT

Hebrews 13 in the MKNFD

Hebrews 13 in the MNG

Hebrews 13 in the MNT

Hebrews 13 in the MNT2

Hebrews 13 in the MRS1T

Hebrews 13 in the NAA

Hebrews 13 in the NASB

Hebrews 13 in the NBLA

Hebrews 13 in the NBS

Hebrews 13 in the NBVTP

Hebrews 13 in the NET2

Hebrews 13 in the NIV11

Hebrews 13 in the NNT

Hebrews 13 in the NNT2

Hebrews 13 in the NNT3

Hebrews 13 in the PDDPT

Hebrews 13 in the PFNT

Hebrews 13 in the RMNT

Hebrews 13 in the SBIAS

Hebrews 13 in the SBIBS

Hebrews 13 in the SBIBS2

Hebrews 13 in the SBICS

Hebrews 13 in the SBIDS

Hebrews 13 in the SBIGS

Hebrews 13 in the SBIHS

Hebrews 13 in the SBIIS

Hebrews 13 in the SBIIS2

Hebrews 13 in the SBIIS3

Hebrews 13 in the SBIKS

Hebrews 13 in the SBIKS2

Hebrews 13 in the SBIMS

Hebrews 13 in the SBIOS

Hebrews 13 in the SBIPS

Hebrews 13 in the SBISS

Hebrews 13 in the SBITS

Hebrews 13 in the SBITS2

Hebrews 13 in the SBITS3

Hebrews 13 in the SBITS4

Hebrews 13 in the SBIUS

Hebrews 13 in the SBIVS

Hebrews 13 in the SBT

Hebrews 13 in the SBT1E

Hebrews 13 in the SCHL

Hebrews 13 in the SNT

Hebrews 13 in the SUSU

Hebrews 13 in the SUSU2

Hebrews 13 in the SYNO

Hebrews 13 in the TBIAOTANT

Hebrews 13 in the TBT1E

Hebrews 13 in the TBT1E2

Hebrews 13 in the TFTIP

Hebrews 13 in the TFTU

Hebrews 13 in the TGNTATF3T

Hebrews 13 in the THAI

Hebrews 13 in the TNFD

Hebrews 13 in the TNT

Hebrews 13 in the TNTIK

Hebrews 13 in the TNTIL

Hebrews 13 in the TNTIN

Hebrews 13 in the TNTIP

Hebrews 13 in the TNTIZ

Hebrews 13 in the TOMA

Hebrews 13 in the TTENT

Hebrews 13 in the UBG

Hebrews 13 in the UGV

Hebrews 13 in the UGV2

Hebrews 13 in the UGV3

Hebrews 13 in the VBL

Hebrews 13 in the VDCC

Hebrews 13 in the YALU

Hebrews 13 in the YAPE

Hebrews 13 in the YBVTP

Hebrews 13 in the ZBP