Isaiah 29 (BOICB)

1 Ahụhụ ga-adịrị gị, gị bụ Ariel, Ariel,gị obodo ebe Devid bi.Gbakọnyenụ otu afọ nʼafọ ọzọnke unu ga-eji rie oriri, mee mmemme. 2 Ma aga m akpagbu Ariel,ọ ga-eru ụjụ, ma bee akwa,ọ ga-adị ka ala ebe ịchụ aja. 3 Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu,aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburudokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị. 4 Nʼọnọdụ mweda nʼala, ị ga-ekwu okwu site nʼala,okwu ọnụ gị ga-esikwa nʼuzuzu pụta.Olu gị ga-ada ka nke onye mmụọ site nʼala,ọ bụ site nʼuzuzu ka okwu ọnụ gị na-ada ntakịrị ntakịrị ga-esi pụta. 5 Ma igwe ndị iro gị ga-aghọ ntụ,igwe ndị na-adịghị eme obi ebere ga-adịkwa ka igbugbo ọka nke ifufe na-ebufu.Mgbe ahụ, na mberede, 6 mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYỊ,Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji egbe eluigwe na ala ọma jijijina oke ifufe na oke ụzụ, na ọkụ na-erepịa erepịa, bịakwute ha. 7 Mba niile ahụ, ndị na-ebuso Ariel agha,bụ ndị na-ebuso ya na ebe ya e wusiri ike agha,ga-efu dịka nrọ,onye na-arahụ ụra nʼabalị rọrọ. 8 Dịka mgbe onye agụụ na-agụ, nke na-arọ nrọ ebe ọ na-eri nri,ma agụụ nọkwa na-agụ ya mgbe o si nʼụra teta.Dịka onye agụụ mmiri na-agụ, nke nọ na nrọ hụ mmiri ọ na-aṅụ,ma teta nʼụra chọpụta na akpịrị na-akpọsị ya nkụ ike, na-adakwa mba.E, otu a ka ọ ga-adịmgbe igwe ndị agha mba ahụ niile ga-ebuso ugwu Zayọn agha. 9 Ka ọ gbagwojuo unu anya. Ka o jukwa unu anya.Kpuonụ onwe unu ìsì ka unu ghara ịhụ ụzọ.Ṅagharịanụ ma ọ bụghị site na mmanya unu ṅụrụ,sọọnụ ngọngọ ma ọ bụghị site na mmanya na-aba nʼanya. 10 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ awụkwasịla unu mmụọ nke oke ụra.O mechiela anya ndị amụma unu niile,kpuchie isi ndị niile na-ahụ ọhụ. 11 Ihe ndị a niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu dịka akwụkwọ a kara akara. Mgbe e weere ya nye onye ma akwụkwọ ka ọ gụọ, ọ ga-asị, “Enweghị m ike, nʼihi na a kaala ya akara.” 12 Mgbe e weere ya nye onye na-amaghị akwụkwọ, ọ ga-asị, “Ewela iwe, amaghị m agụ.” 13 Onyenwe anyị sịrị,“Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso,ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m,ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.Ofufe ha na-efe m, bụ nkegbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha. 14 Ya mere, otu ugboro ọzọ, aga m eme ndị a ihe oke iju anyajiri ihe ịtụnanya tụkwasị nʼelu ihe ịtụnanya,amamihe nke ndị maara ihe ga-ala nʼiyi,nghọta nke ndị nwere nghọta ga-agba barịị.” 15 Ahụhụ ga-adịrị ndị na-echena ha na-ezonarị Onyenwe anyị nzube ha,ndị na-agbalịsị ike ime ihe ha zubere na nzuzo, ma na-asịrịta onwe ha,“Chineke agaghị ahụ anyị. Ọ maghị ihe anyị na-eme!” 16 Lee ka unu si ekpu ihe ihu nʼala,ka a ga-asị na ọkpụ ite dị ka ụrọ e ji akpụ ite.Ihe mmadụ kpụrụ o nwere ike ịtụgharị gwa onye kpụrụ ya, sị,“Ị kpụghị m”?Ka ite o nwere ike ị sị ọkpụ ite,“Ị ghọtaghị ihe ọbụla”? 17 Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe,ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa? 18 Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ,ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha,hụkwa ụzọ ọzọ. 19 Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọnke ONYENWE ANYỊ Onye dị nsọ nke Izrel na-enye. 20 Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa;ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa,ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha, 21 bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara,ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya,ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka. 22 Ya mere, nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb,“Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ.Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ. 23 Mgbe ha hụrụ ụmụ ha,bụ ọrụ aka m abụọ, nʼetiti ha,ha ga-edo aha m nsọ,ha ga-ekwupụta, nabatakwa ịdị nsọ nke Onye nsọ Jekọb,ha ga-eguzokwa nʼihu Chineke Izrel nʼegwu na nʼịma jijiji. 24 Ndị na-akpafu nʼime mmụọ ha ga-enweta nghọta,ndị ntamu ga-achọkwa ka ha mụta ihe.”

In Other Versions

Isaiah 29 in the ANGEFD

Isaiah 29 in the ANTPNG2D

Isaiah 29 in the AS21

Isaiah 29 in the BAGH

Isaiah 29 in the BBPNG

Isaiah 29 in the BBT1E

Isaiah 29 in the BDS

Isaiah 29 in the BEV

Isaiah 29 in the BHAD

Isaiah 29 in the BIB

Isaiah 29 in the BLPT

Isaiah 29 in the BNT

Isaiah 29 in the BNTABOOT

Isaiah 29 in the BNTLV

Isaiah 29 in the BOATCB

Isaiah 29 in the BOATCB2

Isaiah 29 in the BOBCV

Isaiah 29 in the BOCNT

Isaiah 29 in the BOECS

Isaiah 29 in the BOGWICC

Isaiah 29 in the BOHCB

Isaiah 29 in the BOHCV

Isaiah 29 in the BOHLNT

Isaiah 29 in the BOHNTLTAL

Isaiah 29 in the BOILNTAP

Isaiah 29 in the BOITCV

Isaiah 29 in the BOKCV

Isaiah 29 in the BOKCV2

Isaiah 29 in the BOKHWOG

Isaiah 29 in the BOKSSV

Isaiah 29 in the BOLCB

Isaiah 29 in the BOLCB2

Isaiah 29 in the BOMCV

Isaiah 29 in the BONAV

Isaiah 29 in the BONCB

Isaiah 29 in the BONLT

Isaiah 29 in the BONUT2

Isaiah 29 in the BOPLNT

Isaiah 29 in the BOSCB

Isaiah 29 in the BOSNC

Isaiah 29 in the BOTLNT

Isaiah 29 in the BOVCB

Isaiah 29 in the BOYCB

Isaiah 29 in the BPBB

Isaiah 29 in the BPH

Isaiah 29 in the BSB

Isaiah 29 in the CCB

Isaiah 29 in the CUV

Isaiah 29 in the CUVS

Isaiah 29 in the DBT

Isaiah 29 in the DGDNT

Isaiah 29 in the DHNT

Isaiah 29 in the DNT

Isaiah 29 in the ELBE

Isaiah 29 in the EMTV

Isaiah 29 in the ESV

Isaiah 29 in the FBV

Isaiah 29 in the FEB

Isaiah 29 in the GGMNT

Isaiah 29 in the GNT

Isaiah 29 in the HARY

Isaiah 29 in the HNT

Isaiah 29 in the IRVA

Isaiah 29 in the IRVB

Isaiah 29 in the IRVG

Isaiah 29 in the IRVH

Isaiah 29 in the IRVK

Isaiah 29 in the IRVM

Isaiah 29 in the IRVM2

Isaiah 29 in the IRVO

Isaiah 29 in the IRVP

Isaiah 29 in the IRVT

Isaiah 29 in the IRVT2

Isaiah 29 in the IRVU

Isaiah 29 in the ISVN

Isaiah 29 in the JSNT

Isaiah 29 in the KAPI

Isaiah 29 in the KBT1ETNIK

Isaiah 29 in the KBV

Isaiah 29 in the KJV

Isaiah 29 in the KNFD

Isaiah 29 in the LBA

Isaiah 29 in the LBLA

Isaiah 29 in the LNT

Isaiah 29 in the LSV

Isaiah 29 in the MAAL

Isaiah 29 in the MBV

Isaiah 29 in the MBV2

Isaiah 29 in the MHNT

Isaiah 29 in the MKNFD

Isaiah 29 in the MNG

Isaiah 29 in the MNT

Isaiah 29 in the MNT2

Isaiah 29 in the MRS1T

Isaiah 29 in the NAA

Isaiah 29 in the NASB

Isaiah 29 in the NBLA

Isaiah 29 in the NBS

Isaiah 29 in the NBVTP

Isaiah 29 in the NET2

Isaiah 29 in the NIV11

Isaiah 29 in the NNT

Isaiah 29 in the NNT2

Isaiah 29 in the NNT3

Isaiah 29 in the PDDPT

Isaiah 29 in the PFNT

Isaiah 29 in the RMNT

Isaiah 29 in the SBIAS

Isaiah 29 in the SBIBS

Isaiah 29 in the SBIBS2

Isaiah 29 in the SBICS

Isaiah 29 in the SBIDS

Isaiah 29 in the SBIGS

Isaiah 29 in the SBIHS

Isaiah 29 in the SBIIS

Isaiah 29 in the SBIIS2

Isaiah 29 in the SBIIS3

Isaiah 29 in the SBIKS

Isaiah 29 in the SBIKS2

Isaiah 29 in the SBIMS

Isaiah 29 in the SBIOS

Isaiah 29 in the SBIPS

Isaiah 29 in the SBISS

Isaiah 29 in the SBITS

Isaiah 29 in the SBITS2

Isaiah 29 in the SBITS3

Isaiah 29 in the SBITS4

Isaiah 29 in the SBIUS

Isaiah 29 in the SBIVS

Isaiah 29 in the SBT

Isaiah 29 in the SBT1E

Isaiah 29 in the SCHL

Isaiah 29 in the SNT

Isaiah 29 in the SUSU

Isaiah 29 in the SUSU2

Isaiah 29 in the SYNO

Isaiah 29 in the TBIAOTANT

Isaiah 29 in the TBT1E

Isaiah 29 in the TBT1E2

Isaiah 29 in the TFTIP

Isaiah 29 in the TFTU

Isaiah 29 in the TGNTATF3T

Isaiah 29 in the THAI

Isaiah 29 in the TNFD

Isaiah 29 in the TNT

Isaiah 29 in the TNTIK

Isaiah 29 in the TNTIL

Isaiah 29 in the TNTIN

Isaiah 29 in the TNTIP

Isaiah 29 in the TNTIZ

Isaiah 29 in the TOMA

Isaiah 29 in the TTENT

Isaiah 29 in the UBG

Isaiah 29 in the UGV

Isaiah 29 in the UGV2

Isaiah 29 in the UGV3

Isaiah 29 in the VBL

Isaiah 29 in the VDCC

Isaiah 29 in the YALU

Isaiah 29 in the YAPE

Isaiah 29 in the YBVTP

Isaiah 29 in the ZBP