Isaiah 54 (BOICB)
1 “Bụọ abụ, gị nwanyị aga,gị onye na-amụtaghị nwa;tie mkpu ọṅụ, tiwakwaa olu abụ,gị onye ime nwa na-emetụbeghị;nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụkarịa ụmụ nke nwanyị nwere di,”Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 2 “Mee ka ebe ụlọ ikwu gị saa mbara,gbasapụ akwa mgbochi ụlọ ikwu gị,egbochila gbasapụ aka;mee ka ụdọ gị dị ogologo,meekwa ka o sie ike nke ọma. 3 Nʼihi na nʼaka nri na nʼaka ekpe ka ị ga-agbasa gaa;ụmụ gị ga-achụpụ mba dị iche iche site nʼala ha,bichikwaa nʼobodo ha niile dakpọsịrị adakpọsị, nke tọgbọrọ nʼefu. 4 “Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ.Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala.Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị,na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị. 5 Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di.Aha ya bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile;Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị,Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya. 6 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-akpọghachi gịdịka a ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke ọ na-ewutakwa nʼime mmụọ yabụ nwunye alụtara na nwantakịrị,naanị ka ọ bụrụ onye ajụrụ ajụ,” ka Chineke gị na-ekwu. 7 “Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị.Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị 8 Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe mzonarị gị ihu m,ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ, onye mgbapụta gị kwuru. 9 “Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ,bibie ndụ ndị dị nʼime ya,ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ.Agakwaghị m abasiri gị mba ike. 10 Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile,wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha,ma obi ebere m agaghị esi nʼebe ị nọ pụọ,agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,”ka ONYENWE ANYỊ, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru. 11 “Gị, onye a na-emekpa ahụ, onye oke ikuku ụwa a na-ebugharị, nke onye ọbụla na-adịghị akasị obi,lee, aga m e ji nkume tọkwọisi wugharịa gị,jirikwa nkume ọma safaia dị oke ọnụahịa tọọ ntọala gị niile. 12 Aga m eji nkume rubi wugharịa akụkụ ụlọ gị niile,jiri nkume na-egbu nweghenweghe wuo ọnụ ụzọ ama gị niile.Aga m ejikwa nkume dị oke ọnụahịa wuo mgbidi obodo gị. 13 Ụmụ gị niile ga-abụ ndị ONYENWE ANYỊ ga-akụziri ihe.Udo ha ga-adịkwa ukwu. 14 Nʼezi omume ka a ga-eme ka ị guzosie ike.Mmegbu ga-adịkwa anya site nʼebe ị nọ,nʼihi ya, ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla.Ọ dịghị ihe egwu ga-abịaru gị nso,nʼihi na a ga-ewezuga ha site nʼebe ị nọ. 15 Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa ịlụso gị ọgụ, ọ siteghị nʼaka m;onye ọbụla nke na-alụso gị ọgụ ga-abụ onye e meriri emeri. 16 “Lee, ọ bụ mụ onwe m kere ọkpụ ụzụnke na-eji icheku afụ ọkụo ji akpụ ihe agha nke mbibi.Ọ bụkwa m kere ndị agha ahụ mbibi bụ ọrụ ha. 17 Nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị ihe agha a kpụrụ megide gị nke ga-adị ire.Ọzọ, ị ga-emeri ndị niile kpọrọ gị ikpe mmegide.Nʼihi na nke a bụ ihe nketa dịrị ndị ohu ONYENWE ANYỊ.Mkpepụta ha na-esite na m.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.
In Other Versions
Isaiah 54 in the ANGEFD
Isaiah 54 in the ANTPNG2D
Isaiah 54 in the AS21
Isaiah 54 in the BAGH
Isaiah 54 in the BBPNG
Isaiah 54 in the BBT1E
Isaiah 54 in the BDS
Isaiah 54 in the BEV
Isaiah 54 in the BHAD
Isaiah 54 in the BIB
Isaiah 54 in the BLPT
Isaiah 54 in the BNT
Isaiah 54 in the BNTABOOT
Isaiah 54 in the BNTLV
Isaiah 54 in the BOATCB
Isaiah 54 in the BOATCB2
Isaiah 54 in the BOBCV
Isaiah 54 in the BOCNT
Isaiah 54 in the BOECS
Isaiah 54 in the BOGWICC
Isaiah 54 in the BOHCB
Isaiah 54 in the BOHCV
Isaiah 54 in the BOHLNT
Isaiah 54 in the BOHNTLTAL
Isaiah 54 in the BOILNTAP
Isaiah 54 in the BOITCV
Isaiah 54 in the BOKCV
Isaiah 54 in the BOKCV2
Isaiah 54 in the BOKHWOG
Isaiah 54 in the BOKSSV
Isaiah 54 in the BOLCB
Isaiah 54 in the BOLCB2
Isaiah 54 in the BOMCV
Isaiah 54 in the BONAV
Isaiah 54 in the BONCB
Isaiah 54 in the BONLT
Isaiah 54 in the BONUT2
Isaiah 54 in the BOPLNT
Isaiah 54 in the BOSCB
Isaiah 54 in the BOSNC
Isaiah 54 in the BOTLNT
Isaiah 54 in the BOVCB
Isaiah 54 in the BOYCB
Isaiah 54 in the BPBB
Isaiah 54 in the BPH
Isaiah 54 in the BSB
Isaiah 54 in the CCB
Isaiah 54 in the CUV
Isaiah 54 in the CUVS
Isaiah 54 in the DBT
Isaiah 54 in the DGDNT
Isaiah 54 in the DHNT
Isaiah 54 in the DNT
Isaiah 54 in the ELBE
Isaiah 54 in the EMTV
Isaiah 54 in the ESV
Isaiah 54 in the FBV
Isaiah 54 in the FEB
Isaiah 54 in the GGMNT
Isaiah 54 in the GNT
Isaiah 54 in the HARY
Isaiah 54 in the HNT
Isaiah 54 in the IRVA
Isaiah 54 in the IRVB
Isaiah 54 in the IRVG
Isaiah 54 in the IRVH
Isaiah 54 in the IRVK
Isaiah 54 in the IRVM
Isaiah 54 in the IRVM2
Isaiah 54 in the IRVO
Isaiah 54 in the IRVP
Isaiah 54 in the IRVT
Isaiah 54 in the IRVT2
Isaiah 54 in the IRVU
Isaiah 54 in the ISVN
Isaiah 54 in the JSNT
Isaiah 54 in the KAPI
Isaiah 54 in the KBT1ETNIK
Isaiah 54 in the KBV
Isaiah 54 in the KJV
Isaiah 54 in the KNFD
Isaiah 54 in the LBA
Isaiah 54 in the LBLA
Isaiah 54 in the LNT
Isaiah 54 in the LSV
Isaiah 54 in the MAAL
Isaiah 54 in the MBV
Isaiah 54 in the MBV2
Isaiah 54 in the MHNT
Isaiah 54 in the MKNFD
Isaiah 54 in the MNG
Isaiah 54 in the MNT
Isaiah 54 in the MNT2
Isaiah 54 in the MRS1T
Isaiah 54 in the NAA
Isaiah 54 in the NASB
Isaiah 54 in the NBLA
Isaiah 54 in the NBS
Isaiah 54 in the NBVTP
Isaiah 54 in the NET2
Isaiah 54 in the NIV11
Isaiah 54 in the NNT
Isaiah 54 in the NNT2
Isaiah 54 in the NNT3
Isaiah 54 in the PDDPT
Isaiah 54 in the PFNT
Isaiah 54 in the RMNT
Isaiah 54 in the SBIAS
Isaiah 54 in the SBIBS
Isaiah 54 in the SBIBS2
Isaiah 54 in the SBICS
Isaiah 54 in the SBIDS
Isaiah 54 in the SBIGS
Isaiah 54 in the SBIHS
Isaiah 54 in the SBIIS
Isaiah 54 in the SBIIS2
Isaiah 54 in the SBIIS3
Isaiah 54 in the SBIKS
Isaiah 54 in the SBIKS2
Isaiah 54 in the SBIMS
Isaiah 54 in the SBIOS
Isaiah 54 in the SBIPS
Isaiah 54 in the SBISS
Isaiah 54 in the SBITS
Isaiah 54 in the SBITS2
Isaiah 54 in the SBITS3
Isaiah 54 in the SBITS4
Isaiah 54 in the SBIUS
Isaiah 54 in the SBIVS
Isaiah 54 in the SBT
Isaiah 54 in the SBT1E
Isaiah 54 in the SCHL
Isaiah 54 in the SNT
Isaiah 54 in the SUSU
Isaiah 54 in the SUSU2
Isaiah 54 in the SYNO
Isaiah 54 in the TBIAOTANT
Isaiah 54 in the TBT1E
Isaiah 54 in the TBT1E2
Isaiah 54 in the TFTIP
Isaiah 54 in the TFTU
Isaiah 54 in the TGNTATF3T
Isaiah 54 in the THAI
Isaiah 54 in the TNFD
Isaiah 54 in the TNT
Isaiah 54 in the TNTIK
Isaiah 54 in the TNTIL
Isaiah 54 in the TNTIN
Isaiah 54 in the TNTIP
Isaiah 54 in the TNTIZ
Isaiah 54 in the TOMA
Isaiah 54 in the TTENT
Isaiah 54 in the UBG
Isaiah 54 in the UGV
Isaiah 54 in the UGV2
Isaiah 54 in the UGV3
Isaiah 54 in the VBL
Isaiah 54 in the VDCC
Isaiah 54 in the YALU
Isaiah 54 in the YAPE
Isaiah 54 in the YBVTP
Isaiah 54 in the ZBP