Isaiah 59 (BOICB)

1 Nʼezie, aka Onyenwe anyị adịghị mkpụmkpụ nke na o nweghị ike ịzọpụta,ntị ya adịghịkwa arọ nke na o nweghị ike ịnụ ihe. 2 Kama mmehie unu ekewapụla unusite nʼebe Chineke unu nọ;mmehie niile unu ezokwala ihu ya site nʼebe unu nọ,nke mere na ọ chọkwaghị ige ntị ọzọ. 3 Nʼihi na aka unu jupụtara na ntụpọ ọbara,mkpịsịaka unu bụkwa nke mmehie merụrụ.Egbugbere ọnụ unu ekwuola okwu ụgha,ire unu na-atamukwa ihe ọjọọ. 4 Ọ dịghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi,ọ dịkwaghị onye na-eji ikwesi ntụkwasị obi kpee ikpe.Ha na-adabere nʼịrụ ụka nʼenweghị isi, ha na-ekwu okwu ụgha,ha na-atụrụ ime okwu na ụka mụọkwa ajọ ihe. 5 Ha na-avụ akwa ajụala,na-akpakwa akwụ udide.Onye ọbụla riri akwa ha ga-anwụ,mgbe ọbụla otu kụwara, ọ bụ agwọ ajụala na-esi nʼime ya apụta. 6 Akwụ udide ha abaghị uru iji mee uwe,ha enweghị ike iji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha.Ọrụ ha niile bụ ajọ ọrụ,omume ihe ike jupụtara ha nʼaka. 7 Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie,ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere.Ha na-achụso echiche ajọ ihe,ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile. 8 Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ,ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso.Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ.Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo. 9 Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ,ezi omume adịghị erute anyị nso.Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ.Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị. 10 Anyị na-asọgharị ìsì na mgbidi dịka ndị na-enweghị anya,na-asọgharị isi dịka ndị na-enweghị anya;anyị na-ada na-akpọbi ukwu nʼetiti ehihie dịka a ga-asị na ọ bụ oge chi ojiji,nʼetiti ndị nwere ezi ndụ, anyị nọ ka ndị nwụrụ anwụ. 11 Anyị na-agbọ ụja dịka bịa;anyị na-akwasị akwa ike dịka nduru nʼeru ụjụ.Anyị na-ele anya ikpe ziri ezi, ma ọ dịghị eru anyị aka;anyị na-ele anya nzọpụta, ma ọ dị anya nʼebe anyị nọ. 12 Nʼihi na mmehie anyị amụbaala nʼihu Onyenwe anyị;ọ na-agbakwa ama megide anyị.E, anyị makwaara ụdị ndị mmehie anyị bụ,nʼihi na mmehie anyị dịkwa nʼihu anyị mgbe niile. 13 Anyị maara nnupu isi anyị na ngọnarị anyị gọnarịrị ONYENWE ANYỊ;anyị esitela nʼiso ONYENWE ANYỊ Chineke anyị wezuga onwe anyị,nọgide na-akpali mmegbu na nnupu isi.Okwu ọnụ anyị bụ okwu ụgha, nke anyị si nʼobi anyị tụpụta. 14 Ụlọ ikpe anyị niile adịghị achọ onye ezi omume;anyị amaghị ihe a na-akpọ ikpe ziri ezi.Eziokwu asọọla ngọngọ nʼama niile,ihe ziri ezi apụghị ịbata. 15 E, eziokwu alaala;onye ọbụla kwa nke na-achọ ibi ndụ ọma na-etinye onwe ya na nsogbu. ONYENWE ANYỊ lere anya hụ ihe ọjọọ ndị a niile, nke na-enyeghị ya obi ụtọ;ọ hụkwara na ikpe ziri ezi adịghị. 16 Ọ hụrụ na anyị enweghị onye inyeaka ọbụla;o wutere ya na ọ dịghị onye na-arịọrọ anyị arịrịọ.Ọ bụ ya mere o ji bata site nʼike aka ya na nʼezi omume ya,bịa ịzọpụta anyị. 17 Ọ na-eyikwasị ezi omume dịka ngwa agha ikpuchi obi ya.Okpu nke nzọpụta ka ọ na-eyikwasịkwa nʼisi ya.Ọ bụkwa uwe ịbọ ọbọ na nke ekworona ịnụ ọkụ na obi ka o ji kpuchie onwe ya. 18 Ọ ga-akwụghachi ndị iro yadịka ajọ omume ha niile si dị.Iwe ọkụ yaka ọ ga-eji megide ndị iro ya niilebi na mba dị anya. 19 Site nʼọdịda anyanwụ, ndị mmadụ ga-asọpụrụ aha ONYENWE ANYỊ,sitekwa nʼọwụwa anyanwụ, ha ga-atụ egwu ebube ya.Nʼihi na ọ ga-abịa dịka idee mmirinke nkume, ONYENWE ANYỊ na-agba na-aga. 20 “Onye mgbapụta ga-abịa na Zayọn;ọ ga-abịakwute ụmụ Jekọb ndị na-esite na mmehie ha chegharịa.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 21 “Ma mụ onwe m, nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha,” ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu. “Mmụọ m, nke dị nʼahụ gị, na okwu m niile nke m tinyere nʼọnụ gị, agaghị apụ nʼegbugbere ọnụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ ụmụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ agbụrụ gị. Ha ga-adịgide site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi,” ka ONYENWE ANYỊ kwuru.

In Other Versions

Isaiah 59 in the ANGEFD

Isaiah 59 in the ANTPNG2D

Isaiah 59 in the AS21

Isaiah 59 in the BAGH

Isaiah 59 in the BBPNG

Isaiah 59 in the BBT1E

Isaiah 59 in the BDS

Isaiah 59 in the BEV

Isaiah 59 in the BHAD

Isaiah 59 in the BIB

Isaiah 59 in the BLPT

Isaiah 59 in the BNT

Isaiah 59 in the BNTABOOT

Isaiah 59 in the BNTLV

Isaiah 59 in the BOATCB

Isaiah 59 in the BOATCB2

Isaiah 59 in the BOBCV

Isaiah 59 in the BOCNT

Isaiah 59 in the BOECS

Isaiah 59 in the BOGWICC

Isaiah 59 in the BOHCB

Isaiah 59 in the BOHCV

Isaiah 59 in the BOHLNT

Isaiah 59 in the BOHNTLTAL

Isaiah 59 in the BOILNTAP

Isaiah 59 in the BOITCV

Isaiah 59 in the BOKCV

Isaiah 59 in the BOKCV2

Isaiah 59 in the BOKHWOG

Isaiah 59 in the BOKSSV

Isaiah 59 in the BOLCB

Isaiah 59 in the BOLCB2

Isaiah 59 in the BOMCV

Isaiah 59 in the BONAV

Isaiah 59 in the BONCB

Isaiah 59 in the BONLT

Isaiah 59 in the BONUT2

Isaiah 59 in the BOPLNT

Isaiah 59 in the BOSCB

Isaiah 59 in the BOSNC

Isaiah 59 in the BOTLNT

Isaiah 59 in the BOVCB

Isaiah 59 in the BOYCB

Isaiah 59 in the BPBB

Isaiah 59 in the BPH

Isaiah 59 in the BSB

Isaiah 59 in the CCB

Isaiah 59 in the CUV

Isaiah 59 in the CUVS

Isaiah 59 in the DBT

Isaiah 59 in the DGDNT

Isaiah 59 in the DHNT

Isaiah 59 in the DNT

Isaiah 59 in the ELBE

Isaiah 59 in the EMTV

Isaiah 59 in the ESV

Isaiah 59 in the FBV

Isaiah 59 in the FEB

Isaiah 59 in the GGMNT

Isaiah 59 in the GNT

Isaiah 59 in the HARY

Isaiah 59 in the HNT

Isaiah 59 in the IRVA

Isaiah 59 in the IRVB

Isaiah 59 in the IRVG

Isaiah 59 in the IRVH

Isaiah 59 in the IRVK

Isaiah 59 in the IRVM

Isaiah 59 in the IRVM2

Isaiah 59 in the IRVO

Isaiah 59 in the IRVP

Isaiah 59 in the IRVT

Isaiah 59 in the IRVT2

Isaiah 59 in the IRVU

Isaiah 59 in the ISVN

Isaiah 59 in the JSNT

Isaiah 59 in the KAPI

Isaiah 59 in the KBT1ETNIK

Isaiah 59 in the KBV

Isaiah 59 in the KJV

Isaiah 59 in the KNFD

Isaiah 59 in the LBA

Isaiah 59 in the LBLA

Isaiah 59 in the LNT

Isaiah 59 in the LSV

Isaiah 59 in the MAAL

Isaiah 59 in the MBV

Isaiah 59 in the MBV2

Isaiah 59 in the MHNT

Isaiah 59 in the MKNFD

Isaiah 59 in the MNG

Isaiah 59 in the MNT

Isaiah 59 in the MNT2

Isaiah 59 in the MRS1T

Isaiah 59 in the NAA

Isaiah 59 in the NASB

Isaiah 59 in the NBLA

Isaiah 59 in the NBS

Isaiah 59 in the NBVTP

Isaiah 59 in the NET2

Isaiah 59 in the NIV11

Isaiah 59 in the NNT

Isaiah 59 in the NNT2

Isaiah 59 in the NNT3

Isaiah 59 in the PDDPT

Isaiah 59 in the PFNT

Isaiah 59 in the RMNT

Isaiah 59 in the SBIAS

Isaiah 59 in the SBIBS

Isaiah 59 in the SBIBS2

Isaiah 59 in the SBICS

Isaiah 59 in the SBIDS

Isaiah 59 in the SBIGS

Isaiah 59 in the SBIHS

Isaiah 59 in the SBIIS

Isaiah 59 in the SBIIS2

Isaiah 59 in the SBIIS3

Isaiah 59 in the SBIKS

Isaiah 59 in the SBIKS2

Isaiah 59 in the SBIMS

Isaiah 59 in the SBIOS

Isaiah 59 in the SBIPS

Isaiah 59 in the SBISS

Isaiah 59 in the SBITS

Isaiah 59 in the SBITS2

Isaiah 59 in the SBITS3

Isaiah 59 in the SBITS4

Isaiah 59 in the SBIUS

Isaiah 59 in the SBIVS

Isaiah 59 in the SBT

Isaiah 59 in the SBT1E

Isaiah 59 in the SCHL

Isaiah 59 in the SNT

Isaiah 59 in the SUSU

Isaiah 59 in the SUSU2

Isaiah 59 in the SYNO

Isaiah 59 in the TBIAOTANT

Isaiah 59 in the TBT1E

Isaiah 59 in the TBT1E2

Isaiah 59 in the TFTIP

Isaiah 59 in the TFTU

Isaiah 59 in the TGNTATF3T

Isaiah 59 in the THAI

Isaiah 59 in the TNFD

Isaiah 59 in the TNT

Isaiah 59 in the TNTIK

Isaiah 59 in the TNTIL

Isaiah 59 in the TNTIN

Isaiah 59 in the TNTIP

Isaiah 59 in the TNTIZ

Isaiah 59 in the TOMA

Isaiah 59 in the TTENT

Isaiah 59 in the UBG

Isaiah 59 in the UGV

Isaiah 59 in the UGV2

Isaiah 59 in the UGV3

Isaiah 59 in the VBL

Isaiah 59 in the VDCC

Isaiah 59 in the YALU

Isaiah 59 in the YAPE

Isaiah 59 in the YBVTP

Isaiah 59 in the ZBP