Isaiah 63 (BOICB)

1 Onye bụ onye a si nʼEdọm na-abịa,onye si Bozra, nke uwe ya dị ọbara ọbara?Onye bụ onye a, yi uwe mara oke mma,onye na-azọ ije dịka ịba ụba nke ike ya si dị? “Ọ bu mụ onwe m, onye na-ekwu okwu nʼezi omume,onye dị ike ịzọpụta!” 2 Gịnị mere uwe gị ji na-acha ọbara ọbara,dịka uwe onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị? 3 “Azọchaala m ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị, naanị m zọchara ya;o nweghị onye sị na mba niile dị iche iche bịa nyere m aka.Azọchara m ha nʼiwe m,zọpịasịakwa ha nʼime oke ọnụma m;ọbara ha gbasasịrị nʼuwe m,ma metọsịa uwe m niile. 4 Nʼihi na ọ bụ ụbọchị m ji abọ ọbọ;afọ mgbapụta m kwadoro eruola. 5 Elere m anya ma o nweghị onye bịara inyere m aka.O juru m anya, jukwa m ọnụ, na o nweghị onye pụtara inyere m aka.Nʼihi ya, aka m wetara m mmeri.Ọ bụkwa ọnụma juru m obi gbara m ume imezu ya. 6 Nʼiwe m, azọpịara mba niile dị iche iche;esitere m nʼọnụma juru m obi zọpịasịa ha.Emekwara ka ọbara ndụ ha bụrụ ihe a wụsiri nʼala.” 7 Aga m ekwupụta ihe banyere ịhụnanya Onyenwe anyị.Aga m eto ya nʼihi ihe niile o mere.Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị mma ya nʼebe Izrel nọ,e, nʼihi ọtụtụ ihe ọma o merenʼihi mmeso ọma niile o mesoro ụlọ Izrel,nke ọ na-emeso ha dịka obi ebere ya na ọmịiko ya si dị. 8 Nʼihi na Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a bụ nke m;e, ha agakwaghị agọnarị m ọzọ.”Ya mere, ọ ghọọrọ ha Onye nzọpụta. 9 Nʼime mkpagbu ha niile, a kpagbukwara ya onwe ya,ọ bụkwa mmụọ ozi nke ihu ya zọpụtara ha.Nʼime ịhụnanya ya na obi ebere ya, ọ gbapụtara ha,bulie ha elu, kuru haogologo ụbọchị ndị a niile ndị gara aga. 10 Ma ha nupuru isi megide ya,meekwa ka obi jọọ Mmụọ Nsọ ya njọ.Ọ bụ ya mere o ji ghọọ onye iro ha,lụsokwa ha ọgụ nʼonwe ya. 11 Mgbe ahụ, ndị ya chetara ụbọchị ndị ahụ gara aga,ụbọchị Mosis na ndị nke ya.Olee ebe onye ahụ nọ nke mere ka ha si nʼoke osimiri rigopụta,ya na onye ọzụzụ atụrụ nke igwe atụrụ ya?Olee ebe onye ahụ tinyereMmụọ Nsọ ya nʼetiti ha nọ. 12 Olee onye ahụ ike yamere ka osimiri kewaa abụọ nʼihu ha,mgbe Mosis weliri aka ya elu,meekwa ka aha ya dịgide ruo ebighị ebi? 13 Onye duuru ha gafee mmiri dị oke omimi?Dịka ịnyịnya na-agba ọsọ nʼọzara,ike agwụghị ha. 14 Dịka ehi na-ata ahịhịa na ndagwurugwu,Mmụọ ONYENWE ANYỊ nyere ha izuike.Otu a ka i si duo ndị gị,ime ka aha gị bụrụ ihe a na-asọpụrụ asọpụrụ. 15 Onyenwe anyị, biko site nʼeluigwe,ebe obibi nsọ gị, lee anyị anya.Olee ebe nʼịnụ ọkụ nʼobi na ike gị dị?Olee ebe obi ebere gị na ọmịiko gị dịkwa? 16 Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị,a sịkwarị na Ebraham amaghị anyịmaọbụ Izrel agọnarị anyị,gị onwe gị, ONYENWE ANYỊ, bụ Nna anyị,onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie. 17 ONYENWE ANYỊ, gịnị mere i ji na-eme ka anyị si nʼụzọ gị kpafuona-eme ka obi anyị sie ike otu a, na anyị adịghị atụ egwu gị?Lọghachi nʼihi ndị ohu gị,nʼihi ebo ndị ahụ bụ ihe nketa gị. 18 Ọ bụ naanị nwa oge nta ka ndị gị nwetara ebe nsọ gị,ma ugbu a, ndị iro anyị azọdala ebe nsọ gị. 19 Anyị bụ nke gị site na mgbe ochie,ma ị naghị achị nʼebe ha nọ,ha bụ ndị a na-akpọkwasịghịkwa aha gị.

In Other Versions

Isaiah 63 in the ANGEFD

Isaiah 63 in the ANTPNG2D

Isaiah 63 in the AS21

Isaiah 63 in the BAGH

Isaiah 63 in the BBPNG

Isaiah 63 in the BBT1E

Isaiah 63 in the BDS

Isaiah 63 in the BEV

Isaiah 63 in the BHAD

Isaiah 63 in the BIB

Isaiah 63 in the BLPT

Isaiah 63 in the BNT

Isaiah 63 in the BNTABOOT

Isaiah 63 in the BNTLV

Isaiah 63 in the BOATCB

Isaiah 63 in the BOATCB2

Isaiah 63 in the BOBCV

Isaiah 63 in the BOCNT

Isaiah 63 in the BOECS

Isaiah 63 in the BOGWICC

Isaiah 63 in the BOHCB

Isaiah 63 in the BOHCV

Isaiah 63 in the BOHLNT

Isaiah 63 in the BOHNTLTAL

Isaiah 63 in the BOILNTAP

Isaiah 63 in the BOITCV

Isaiah 63 in the BOKCV

Isaiah 63 in the BOKCV2

Isaiah 63 in the BOKHWOG

Isaiah 63 in the BOKSSV

Isaiah 63 in the BOLCB

Isaiah 63 in the BOLCB2

Isaiah 63 in the BOMCV

Isaiah 63 in the BONAV

Isaiah 63 in the BONCB

Isaiah 63 in the BONLT

Isaiah 63 in the BONUT2

Isaiah 63 in the BOPLNT

Isaiah 63 in the BOSCB

Isaiah 63 in the BOSNC

Isaiah 63 in the BOTLNT

Isaiah 63 in the BOVCB

Isaiah 63 in the BOYCB

Isaiah 63 in the BPBB

Isaiah 63 in the BPH

Isaiah 63 in the BSB

Isaiah 63 in the CCB

Isaiah 63 in the CUV

Isaiah 63 in the CUVS

Isaiah 63 in the DBT

Isaiah 63 in the DGDNT

Isaiah 63 in the DHNT

Isaiah 63 in the DNT

Isaiah 63 in the ELBE

Isaiah 63 in the EMTV

Isaiah 63 in the ESV

Isaiah 63 in the FBV

Isaiah 63 in the FEB

Isaiah 63 in the GGMNT

Isaiah 63 in the GNT

Isaiah 63 in the HARY

Isaiah 63 in the HNT

Isaiah 63 in the IRVA

Isaiah 63 in the IRVB

Isaiah 63 in the IRVG

Isaiah 63 in the IRVH

Isaiah 63 in the IRVK

Isaiah 63 in the IRVM

Isaiah 63 in the IRVM2

Isaiah 63 in the IRVO

Isaiah 63 in the IRVP

Isaiah 63 in the IRVT

Isaiah 63 in the IRVT2

Isaiah 63 in the IRVU

Isaiah 63 in the ISVN

Isaiah 63 in the JSNT

Isaiah 63 in the KAPI

Isaiah 63 in the KBT1ETNIK

Isaiah 63 in the KBV

Isaiah 63 in the KJV

Isaiah 63 in the KNFD

Isaiah 63 in the LBA

Isaiah 63 in the LBLA

Isaiah 63 in the LNT

Isaiah 63 in the LSV

Isaiah 63 in the MAAL

Isaiah 63 in the MBV

Isaiah 63 in the MBV2

Isaiah 63 in the MHNT

Isaiah 63 in the MKNFD

Isaiah 63 in the MNG

Isaiah 63 in the MNT

Isaiah 63 in the MNT2

Isaiah 63 in the MRS1T

Isaiah 63 in the NAA

Isaiah 63 in the NASB

Isaiah 63 in the NBLA

Isaiah 63 in the NBS

Isaiah 63 in the NBVTP

Isaiah 63 in the NET2

Isaiah 63 in the NIV11

Isaiah 63 in the NNT

Isaiah 63 in the NNT2

Isaiah 63 in the NNT3

Isaiah 63 in the PDDPT

Isaiah 63 in the PFNT

Isaiah 63 in the RMNT

Isaiah 63 in the SBIAS

Isaiah 63 in the SBIBS

Isaiah 63 in the SBIBS2

Isaiah 63 in the SBICS

Isaiah 63 in the SBIDS

Isaiah 63 in the SBIGS

Isaiah 63 in the SBIHS

Isaiah 63 in the SBIIS

Isaiah 63 in the SBIIS2

Isaiah 63 in the SBIIS3

Isaiah 63 in the SBIKS

Isaiah 63 in the SBIKS2

Isaiah 63 in the SBIMS

Isaiah 63 in the SBIOS

Isaiah 63 in the SBIPS

Isaiah 63 in the SBISS

Isaiah 63 in the SBITS

Isaiah 63 in the SBITS2

Isaiah 63 in the SBITS3

Isaiah 63 in the SBITS4

Isaiah 63 in the SBIUS

Isaiah 63 in the SBIVS

Isaiah 63 in the SBT

Isaiah 63 in the SBT1E

Isaiah 63 in the SCHL

Isaiah 63 in the SNT

Isaiah 63 in the SUSU

Isaiah 63 in the SUSU2

Isaiah 63 in the SYNO

Isaiah 63 in the TBIAOTANT

Isaiah 63 in the TBT1E

Isaiah 63 in the TBT1E2

Isaiah 63 in the TFTIP

Isaiah 63 in the TFTU

Isaiah 63 in the TGNTATF3T

Isaiah 63 in the THAI

Isaiah 63 in the TNFD

Isaiah 63 in the TNT

Isaiah 63 in the TNTIK

Isaiah 63 in the TNTIL

Isaiah 63 in the TNTIN

Isaiah 63 in the TNTIP

Isaiah 63 in the TNTIZ

Isaiah 63 in the TOMA

Isaiah 63 in the TTENT

Isaiah 63 in the UBG

Isaiah 63 in the UGV

Isaiah 63 in the UGV2

Isaiah 63 in the UGV3

Isaiah 63 in the VBL

Isaiah 63 in the VDCC

Isaiah 63 in the YALU

Isaiah 63 in the YAPE

Isaiah 63 in the YBVTP

Isaiah 63 in the ZBP