Jeremiah 10 (BOICB)

1 Nụrụnụ ihe ONYENWE ANYỊ na-agwa unu, ụmụ Izrel. 2 Nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“Unu amụtala ụzọ ndị mba ọzọ,unu atụkwala ụjọ ihe ịrịbama niile nke na-apụta ihe na mbara eluigwe,ọ bụ ezie na ndị mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ. 3 Nʼihi na omenaala ndị mmadụ ahụ abaghị uru.Ha na-aba nʼọhịa gbute osisi,nke onye ǹka osisi na-eji anyụike pịara ha ihe. 4 Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma,jiri mkpirisi igwe na ǹtu kụọ ya ka o sie ike,ka ọ ghara ịda. 5 Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ,ha adịghị ekwu okwu.A na-ebugharị ha nʼakanʼihi na ha adịghị eje ije.Unu atụla ha egwu,nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ,ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.” 6 O nweghị onye dịka gị, ONYENWE ANYỊ.Ị dị ukwuu.Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike. 7 Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu?Ọ bụ gị bụ eze mba niile.Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu.Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile,na nʼalaeze niile,ọ dịghị onye dịka gị. 8 Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu.Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe. 9 A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma,site na Ụfaz bubata ọlaedo.Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mmaka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo.Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile. 10 Ma naanị ONYENWE ANYỊ bụ Chineke nʼezie.Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi.Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji.Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ. 11 “Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’ ” 12 Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa.Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya,ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile. 13 Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa.Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie.Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo,na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya niile na-ewepụta ifufe. 14 Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ.Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ.Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ;ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha. 15 Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo,mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi. 16 Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a,nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile,tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya. ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya. 17 Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a,nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu. 18 Nʼihi na ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“Nʼoge a, aga m amafundị niile bi nʼala a.M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha,meekwa ka ndị iro ha jide ha.” 19 Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ.Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ.Ma ana m akasị onwe m obi na-asị,“Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.” 20 Ebibiela ụlọ ikwu m,e tibisiala ụdọ ya niile.Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya.Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m,maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike. 21 Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche.Ha adịghị ajụta ase site nʼaka ONYENWE ANYỊ,ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma,igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala. 22 Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa,oke ụzụ nke ọgbaaghara site nʼala dị nʼugwu,ime ka obodo niile nke Juda tọgbọrọ nʼefu,ghọọkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa. 23 O ONYENWE ANYỊ, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya,na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso. 24 Ya mere, ONYENWE ANYỊ, site nʼụzọ nke ikpe ziri ezi dọọ m aka na ntị,ma ọ bụghị site nʼiwe gị,ma ọ bụghị ya, ị ga-eme ka m ghọọ ihe efu. 25 Wụkwasị ọnụma gị nʼelu mba niile dị iche ichebụ ndị na-amaghị gị,wụkwasịkwa ya ndị ahụ niile na-adịghị akpọku aha gị.Nʼihi na ha eripịala Jekọb,ha eripịala ya kpamkpam,bibiekwa ebe obibi ya.

In Other Versions

Jeremiah 10 in the ANGEFD

Jeremiah 10 in the ANTPNG2D

Jeremiah 10 in the AS21

Jeremiah 10 in the BAGH

Jeremiah 10 in the BBPNG

Jeremiah 10 in the BBT1E

Jeremiah 10 in the BDS

Jeremiah 10 in the BEV

Jeremiah 10 in the BHAD

Jeremiah 10 in the BIB

Jeremiah 10 in the BLPT

Jeremiah 10 in the BNT

Jeremiah 10 in the BNTABOOT

Jeremiah 10 in the BNTLV

Jeremiah 10 in the BOATCB

Jeremiah 10 in the BOATCB2

Jeremiah 10 in the BOBCV

Jeremiah 10 in the BOCNT

Jeremiah 10 in the BOECS

Jeremiah 10 in the BOGWICC

Jeremiah 10 in the BOHCB

Jeremiah 10 in the BOHCV

Jeremiah 10 in the BOHLNT

Jeremiah 10 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 10 in the BOILNTAP

Jeremiah 10 in the BOITCV

Jeremiah 10 in the BOKCV

Jeremiah 10 in the BOKCV2

Jeremiah 10 in the BOKHWOG

Jeremiah 10 in the BOKSSV

Jeremiah 10 in the BOLCB

Jeremiah 10 in the BOLCB2

Jeremiah 10 in the BOMCV

Jeremiah 10 in the BONAV

Jeremiah 10 in the BONCB

Jeremiah 10 in the BONLT

Jeremiah 10 in the BONUT2

Jeremiah 10 in the BOPLNT

Jeremiah 10 in the BOSCB

Jeremiah 10 in the BOSNC

Jeremiah 10 in the BOTLNT

Jeremiah 10 in the BOVCB

Jeremiah 10 in the BOYCB

Jeremiah 10 in the BPBB

Jeremiah 10 in the BPH

Jeremiah 10 in the BSB

Jeremiah 10 in the CCB

Jeremiah 10 in the CUV

Jeremiah 10 in the CUVS

Jeremiah 10 in the DBT

Jeremiah 10 in the DGDNT

Jeremiah 10 in the DHNT

Jeremiah 10 in the DNT

Jeremiah 10 in the ELBE

Jeremiah 10 in the EMTV

Jeremiah 10 in the ESV

Jeremiah 10 in the FBV

Jeremiah 10 in the FEB

Jeremiah 10 in the GGMNT

Jeremiah 10 in the GNT

Jeremiah 10 in the HARY

Jeremiah 10 in the HNT

Jeremiah 10 in the IRVA

Jeremiah 10 in the IRVB

Jeremiah 10 in the IRVG

Jeremiah 10 in the IRVH

Jeremiah 10 in the IRVK

Jeremiah 10 in the IRVM

Jeremiah 10 in the IRVM2

Jeremiah 10 in the IRVO

Jeremiah 10 in the IRVP

Jeremiah 10 in the IRVT

Jeremiah 10 in the IRVT2

Jeremiah 10 in the IRVU

Jeremiah 10 in the ISVN

Jeremiah 10 in the JSNT

Jeremiah 10 in the KAPI

Jeremiah 10 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 10 in the KBV

Jeremiah 10 in the KJV

Jeremiah 10 in the KNFD

Jeremiah 10 in the LBA

Jeremiah 10 in the LBLA

Jeremiah 10 in the LNT

Jeremiah 10 in the LSV

Jeremiah 10 in the MAAL

Jeremiah 10 in the MBV

Jeremiah 10 in the MBV2

Jeremiah 10 in the MHNT

Jeremiah 10 in the MKNFD

Jeremiah 10 in the MNG

Jeremiah 10 in the MNT

Jeremiah 10 in the MNT2

Jeremiah 10 in the MRS1T

Jeremiah 10 in the NAA

Jeremiah 10 in the NASB

Jeremiah 10 in the NBLA

Jeremiah 10 in the NBS

Jeremiah 10 in the NBVTP

Jeremiah 10 in the NET2

Jeremiah 10 in the NIV11

Jeremiah 10 in the NNT

Jeremiah 10 in the NNT2

Jeremiah 10 in the NNT3

Jeremiah 10 in the PDDPT

Jeremiah 10 in the PFNT

Jeremiah 10 in the RMNT

Jeremiah 10 in the SBIAS

Jeremiah 10 in the SBIBS

Jeremiah 10 in the SBIBS2

Jeremiah 10 in the SBICS

Jeremiah 10 in the SBIDS

Jeremiah 10 in the SBIGS

Jeremiah 10 in the SBIHS

Jeremiah 10 in the SBIIS

Jeremiah 10 in the SBIIS2

Jeremiah 10 in the SBIIS3

Jeremiah 10 in the SBIKS

Jeremiah 10 in the SBIKS2

Jeremiah 10 in the SBIMS

Jeremiah 10 in the SBIOS

Jeremiah 10 in the SBIPS

Jeremiah 10 in the SBISS

Jeremiah 10 in the SBITS

Jeremiah 10 in the SBITS2

Jeremiah 10 in the SBITS3

Jeremiah 10 in the SBITS4

Jeremiah 10 in the SBIUS

Jeremiah 10 in the SBIVS

Jeremiah 10 in the SBT

Jeremiah 10 in the SBT1E

Jeremiah 10 in the SCHL

Jeremiah 10 in the SNT

Jeremiah 10 in the SUSU

Jeremiah 10 in the SUSU2

Jeremiah 10 in the SYNO

Jeremiah 10 in the TBIAOTANT

Jeremiah 10 in the TBT1E

Jeremiah 10 in the TBT1E2

Jeremiah 10 in the TFTIP

Jeremiah 10 in the TFTU

Jeremiah 10 in the TGNTATF3T

Jeremiah 10 in the THAI

Jeremiah 10 in the TNFD

Jeremiah 10 in the TNT

Jeremiah 10 in the TNTIK

Jeremiah 10 in the TNTIL

Jeremiah 10 in the TNTIN

Jeremiah 10 in the TNTIP

Jeremiah 10 in the TNTIZ

Jeremiah 10 in the TOMA

Jeremiah 10 in the TTENT

Jeremiah 10 in the UBG

Jeremiah 10 in the UGV

Jeremiah 10 in the UGV2

Jeremiah 10 in the UGV3

Jeremiah 10 in the VBL

Jeremiah 10 in the VDCC

Jeremiah 10 in the YALU

Jeremiah 10 in the YAPE

Jeremiah 10 in the YBVTP

Jeremiah 10 in the ZBP