Jeremiah 31 (BOICB)

1 “Nʼoge ahụ,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara ya, sị, “Aga m abụ Chineke nke agbụrụ Izrel niile. Ha ga-abụkwa ndị m.” 2 Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“Ndị ahụ gbanarịrị mma aghaga-ahụta ihuọma nʼọzara.Aga m abịa iwetara Izrel izuike.” 3 ONYENWE ANYỊ mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị,“Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya;Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso. 4 Aga m ewulikwa gị elu ọzọ,e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọsoro ndị ọṅụ juru obi tee egwu. 5 Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogigenʼelu ugwu Sameria.Ndị ọrụ ubi kụrụ yaga-erikwa mkpụrụ si na ya. 6 Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọnʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha,‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn,ka anyị jee nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke anyị.’ ” 7 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb,tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu.Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ,‘ONYENWE ANYỊ, biko, zọpụta ndị gị,bụ ndị Izrel fọdụrụ.’ 8 Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha;aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha.Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ,na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme.Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu! 9 Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta,ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha.Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi,nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha,nʼihi na aghọọlara m Izrel nna,Ifrem bụkwa ọkpara m. 10 “Nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ, unu mba niile;kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile.Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha.Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. 11 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-agbapụta Jekọb,ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike. 12 Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ,ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe ONYENWE ANYỊ nyere ha,dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ,na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi.Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile;ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ. 13 Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ,ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ.Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ,aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute. 14 Aga m emekwa ka afọ jubiga ndị nchụaja oke nʼihi ịdị ukwuu nke onyinye ha ga-enweta,afọ ezi ihe m ga-ejukwa ndị m,”otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 15 Ihe ndị a bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru,“A nụrụ otu olu na Rema,iru ụjụ na oke ịkwa akwa.Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya,o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya,nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.” 16 Ma otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa,jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri,nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara.“Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa. 17 Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri.“Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha. 18 “Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị,‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike.Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị.Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa,nʼihi na ị bụ ONYENWE ANYỊ na Chineke m. 19 Mgbe m kpafuru,echegharịrị m.Mgbe m ghọtakwara,e tiri m aka nʼobi m,ihere mere m, ọ wutekwara mnʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’ 20 Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke,onye ihe ya na-atọ m ụtọ?Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya,ma anọkwa m na-echeta ya.Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike.Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 21 “Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama,manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama.Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile,bụ okporoụzọ unu ga-eso.Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,laghachi nʼobodo gị ndị a. 22 Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị,gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel?Nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa;nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu.” 23 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘ONYENWE ANYỊ gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’ 24 Ndị mmadụ ga-ebikọta ọnụ na Juda na nʼobodo niile dị nʼime ya, ma ndị na-arụ ọrụ ubi, ma ndị na-elekọta igwe ewu na atụrụ ha. 25 Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ.” 26 Nʼoge a, esi m nʼụra teta, lee anya gburugburu m. Ụra m rahụrụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu. 27 Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda. 28 Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 29 “Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa,“ ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha,ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’ 30 Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji. 31 “Lee, oge na-abịa,” ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara,“mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrịnʼetiti mụ na ụlọ Izrel,nakwa ụlọ Juda. 32 Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụmụ na nna nna ha gbara,mgbe ahụ m jidere ha nʼakasite nʼala Ijipt dupụta ha,nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m,ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 33 “Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agbamgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara.“Aga m etinye iwu m nʼime obi ha,aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.Aga m abụ Chineke ha,ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. 34 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara ONYENWE ANYỊ,’nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.“Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.” 35 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,bụ onye ahụ họpụtara anyanwụmee ka ọ na-enye ihe nʼehihie,onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwuka ha na-enye ihe nʼanyasị,onye na-akpali oke osimiri,na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ.Aha ya bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile. 36 Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara,“Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa,ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị,ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.” 37 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe,na ịdị omimi nke ntọala ụwa,ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel,nʼihi ihe niile ha mere.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 38 “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, mgbe a ga-ewugharị obodo a nye m, site nʼụlọ elu Hananel ruo nʼọnụ ụzọ ama Akụkụ. 39 Ịdị ogologo nke eriri ọtụtụ a ga-eji tụọ ya ga-adị ka site nʼihu ọnụ ụzọ ama ahụ ruo nʼugwu Gareb, gaakwa ruo Goa. 40 Ndagwurugwu ahụ niile ebe a tụnyere ozu ndị mmadụ, na ebe e kpofuru ntụ, na mgbada ugwu ahụ niile ebe e doziri edozi maka ịkụ ihe, ruo na ndagwurugwu iyi Kidrọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama ịnyịnya, ga-aghọkwa ebe dị nsọ nye ONYENWE ANYỊ. A gaghị ehopukwa obodo ahụ ọzọ, maọbụ tikpọọ ya.”

In Other Versions

Jeremiah 31 in the ANGEFD

Jeremiah 31 in the ANTPNG2D

Jeremiah 31 in the AS21

Jeremiah 31 in the BAGH

Jeremiah 31 in the BBPNG

Jeremiah 31 in the BBT1E

Jeremiah 31 in the BDS

Jeremiah 31 in the BEV

Jeremiah 31 in the BHAD

Jeremiah 31 in the BIB

Jeremiah 31 in the BLPT

Jeremiah 31 in the BNT

Jeremiah 31 in the BNTABOOT

Jeremiah 31 in the BNTLV

Jeremiah 31 in the BOATCB

Jeremiah 31 in the BOATCB2

Jeremiah 31 in the BOBCV

Jeremiah 31 in the BOCNT

Jeremiah 31 in the BOECS

Jeremiah 31 in the BOGWICC

Jeremiah 31 in the BOHCB

Jeremiah 31 in the BOHCV

Jeremiah 31 in the BOHLNT

Jeremiah 31 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 31 in the BOILNTAP

Jeremiah 31 in the BOITCV

Jeremiah 31 in the BOKCV

Jeremiah 31 in the BOKCV2

Jeremiah 31 in the BOKHWOG

Jeremiah 31 in the BOKSSV

Jeremiah 31 in the BOLCB

Jeremiah 31 in the BOLCB2

Jeremiah 31 in the BOMCV

Jeremiah 31 in the BONAV

Jeremiah 31 in the BONCB

Jeremiah 31 in the BONLT

Jeremiah 31 in the BONUT2

Jeremiah 31 in the BOPLNT

Jeremiah 31 in the BOSCB

Jeremiah 31 in the BOSNC

Jeremiah 31 in the BOTLNT

Jeremiah 31 in the BOVCB

Jeremiah 31 in the BOYCB

Jeremiah 31 in the BPBB

Jeremiah 31 in the BPH

Jeremiah 31 in the BSB

Jeremiah 31 in the CCB

Jeremiah 31 in the CUV

Jeremiah 31 in the CUVS

Jeremiah 31 in the DBT

Jeremiah 31 in the DGDNT

Jeremiah 31 in the DHNT

Jeremiah 31 in the DNT

Jeremiah 31 in the ELBE

Jeremiah 31 in the EMTV

Jeremiah 31 in the ESV

Jeremiah 31 in the FBV

Jeremiah 31 in the FEB

Jeremiah 31 in the GGMNT

Jeremiah 31 in the GNT

Jeremiah 31 in the HARY

Jeremiah 31 in the HNT

Jeremiah 31 in the IRVA

Jeremiah 31 in the IRVB

Jeremiah 31 in the IRVG

Jeremiah 31 in the IRVH

Jeremiah 31 in the IRVK

Jeremiah 31 in the IRVM

Jeremiah 31 in the IRVM2

Jeremiah 31 in the IRVO

Jeremiah 31 in the IRVP

Jeremiah 31 in the IRVT

Jeremiah 31 in the IRVT2

Jeremiah 31 in the IRVU

Jeremiah 31 in the ISVN

Jeremiah 31 in the JSNT

Jeremiah 31 in the KAPI

Jeremiah 31 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 31 in the KBV

Jeremiah 31 in the KJV

Jeremiah 31 in the KNFD

Jeremiah 31 in the LBA

Jeremiah 31 in the LBLA

Jeremiah 31 in the LNT

Jeremiah 31 in the LSV

Jeremiah 31 in the MAAL

Jeremiah 31 in the MBV

Jeremiah 31 in the MBV2

Jeremiah 31 in the MHNT

Jeremiah 31 in the MKNFD

Jeremiah 31 in the MNG

Jeremiah 31 in the MNT

Jeremiah 31 in the MNT2

Jeremiah 31 in the MRS1T

Jeremiah 31 in the NAA

Jeremiah 31 in the NASB

Jeremiah 31 in the NBLA

Jeremiah 31 in the NBS

Jeremiah 31 in the NBVTP

Jeremiah 31 in the NET2

Jeremiah 31 in the NIV11

Jeremiah 31 in the NNT

Jeremiah 31 in the NNT2

Jeremiah 31 in the NNT3

Jeremiah 31 in the PDDPT

Jeremiah 31 in the PFNT

Jeremiah 31 in the RMNT

Jeremiah 31 in the SBIAS

Jeremiah 31 in the SBIBS

Jeremiah 31 in the SBIBS2

Jeremiah 31 in the SBICS

Jeremiah 31 in the SBIDS

Jeremiah 31 in the SBIGS

Jeremiah 31 in the SBIHS

Jeremiah 31 in the SBIIS

Jeremiah 31 in the SBIIS2

Jeremiah 31 in the SBIIS3

Jeremiah 31 in the SBIKS

Jeremiah 31 in the SBIKS2

Jeremiah 31 in the SBIMS

Jeremiah 31 in the SBIOS

Jeremiah 31 in the SBIPS

Jeremiah 31 in the SBISS

Jeremiah 31 in the SBITS

Jeremiah 31 in the SBITS2

Jeremiah 31 in the SBITS3

Jeremiah 31 in the SBITS4

Jeremiah 31 in the SBIUS

Jeremiah 31 in the SBIVS

Jeremiah 31 in the SBT

Jeremiah 31 in the SBT1E

Jeremiah 31 in the SCHL

Jeremiah 31 in the SNT

Jeremiah 31 in the SUSU

Jeremiah 31 in the SUSU2

Jeremiah 31 in the SYNO

Jeremiah 31 in the TBIAOTANT

Jeremiah 31 in the TBT1E

Jeremiah 31 in the TBT1E2

Jeremiah 31 in the TFTIP

Jeremiah 31 in the TFTU

Jeremiah 31 in the TGNTATF3T

Jeremiah 31 in the THAI

Jeremiah 31 in the TNFD

Jeremiah 31 in the TNT

Jeremiah 31 in the TNTIK

Jeremiah 31 in the TNTIL

Jeremiah 31 in the TNTIN

Jeremiah 31 in the TNTIP

Jeremiah 31 in the TNTIZ

Jeremiah 31 in the TOMA

Jeremiah 31 in the TTENT

Jeremiah 31 in the UBG

Jeremiah 31 in the UGV

Jeremiah 31 in the UGV2

Jeremiah 31 in the UGV3

Jeremiah 31 in the VBL

Jeremiah 31 in the VDCC

Jeremiah 31 in the YALU

Jeremiah 31 in the YAPE

Jeremiah 31 in the YBVTP

Jeremiah 31 in the ZBP