Jeremiah 50 (BOICB)

1 Okwu ONYENWE ANYỊ nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Babilọn na banyere ala ndị Babilọn. 2 “Kwusaa ya na mba niile, mee ka a nụrụ ya;bulie ọkọlọtọ mgbe a na-ekwusa ya.Kwupụta ihe niile, ezokwala ihe ọbụla, kama kwusaa ya sị,‘A ga-adọta Babilọn nʼagha.Ihere ga-emesịa mee Bel;otu a kwa, egwu ga-ejupụta Maduk obi.A ga-eme ka ihere mee oyiyi ya niile a kpụrụ akpụ;oke egwu ga-ejidekwa arụsị ya niile.’ 3 Otu mba, nke si nʼakụkụ ugwu, ga-ebuso ya agha,mee ala ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu.Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya,nʼihi na mmadụ na anụmanụ ga-esi nʼime ya gbalaga. 4 “Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara,ndị Izrel na ndị Juda ga-ejikọta onwe ha nʼotu.Ha niile ga-eji anya mmiri pụọ ịchọ ONYENWE ANYỊ Chineke ha. 5 Ha ga-ajụ ajụjụ, banyere ụzọ e si eje Zayọn.Mgbe ahụ, ha ga-eche ihu ha ijeru nʼebe ahụ.Ha niile ga-abịakwa were onwe ha nyefee nʼaka ONYENWE ANYỊ,nʼime ọgbụgba ndụ ebighị ebi,nke a na-agaghị echefu echefu. 6 “Ndị m akpafuola dịka atụrụ furu efu.Ndị ọzụzụ atụrụ ha eduhiela ha,mee ka ha na-awagharị nʼugwu ukwu niile.Ha na-akpagharị nʼelu ugwu ukwu, ma nʼelu ugwu nta.Ha echefuokwala ebe izuike nke ha. 7 Nʼihi ya, ndị niile chọtara ha na-eripịa ha.Ndị iro ha na-ekwukwa sị, ‘Ikpe amaghị anyịnʼihi na ha emehiela megide ONYENWE ANYỊ, onye bụ ezi ebe ịta nri ha,na onye bụkwa olileanya nke nna nna ha.’ 8 “Sinụ na Babilọn gbalaga;sitekwanụ nʼala Babilọn pụọ,dịrịnụ ka mkpi na-edu igwe ewu na atụrụ. 9 Nʼihi na aga m akpali ọtụtụ mba dị ike site nʼala dị nʼugwu,ndị ga-ejikọta onwe ha ibuso Babilọn agha.Ha ga-edo onwe ha nʼusoro imegide ya;ọ bụkwa nʼakụkụ ugwu ka ha ga-esi dọta ya nʼagha.Àkụ ha ga-agba ga-adị ka àkụ nke onye bụ dike nʼagha na onye ọka ịgba ụta na-agba.Ha agaghị agba aka lọta. 10 Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha.Afọ ga-ejukwa ndị niile bụ ndị ga-akwata ya.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 11 “Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ,gị onye bibiri ihe nketa m,ị wugharịrị dịka nwa ehi nke na-azọcha ọka,bee akwa dịka oke ịnyịnya. 12 Ihere ga-eme nne unu,e, a ga-eme ka oke ihere mee nne mụrụ unu.Ọ ga-abụkwa mba dịkarịsịrị ala nʼetiti mba niile,bụrụkwa ọzara, ala kpọrọ nkụ na ala uzuzu. 13 Nʼihi iwe dị ukwuu nke ONYENWE ANYỊ, ọ dịghị onye ga-ebikwa nʼala Babilọn ọzọ,nʼihi na a ga-ebibi ya kpamkpam.Ndị niile si nʼakụkụ ya na-agafe ka ọ ga-eju anya.Ha ga-akparị ya nʼihi ọnya niile dị ya nʼahụ. 14 “Doonụ onwe unu nʼusoro gburugburu obodo Babilọn,unu ndị niile na-agba ụta.Gbaanụ ya ụta. Unu echela banyere àkụ ole unu ga-agbapụnʼihi na o mehiela megide ONYENWE ANYỊ. 15 Kpọọnụ mkpu agha megide ya, site nʼakụkụ niile!Ọ chiliela aka ya elu. Lee, ụlọ elu ya e wusiri ike adaala,a kwatuokwala mgbidi ya niile.Ebe ọ bụ na ONYENWE ANYỊ na-abọrọ onwe ya ọbọ nʼahụ Babilọn,bọọnụ ya ọbọ.Meenụ ya dịka o si mee ndị ọzọ. 16 Site na Babilọn wezuga onye na-agha mkpụrụna onye ji mma owuwe ihe ubi na-ewe ihe ubi.Ka onye ọbụla laghachikwuru ndị nke ya,ka onye ọbụla gbalaakwa nʼala nke aka ya,nʼihi mma agha nke onye na-emegbu emegbu. 17 “Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị,nke ọdụm chụsasịrị.Onye bu ụzọ ripịa yabụ eze Asịrịa.Onye ikpeazụ gwepịara ọkpụkpụ yabụ Nebukadneza, eze Babilọn.” 18 Nʼihi ya, ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru,“Aga m ata eze Babilọn, na ndị ala ya ahụhụ,dịka m si taa eze Asịrịa ahụhụ. 19 Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha.Ha ga-atakwa nri na Kamel na Bashan.Ọ bụkwa nʼugwu Ifrem na Gileadka afọ ga-ejukwa ha. 20 Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri,“a ga-achọ ajọọ omume nke Izrel,ma ọ dịghị nke a ga-achọta.A ga-achọkwa mmehie niile nke Juda,ma o nweghị nke a ga-achọta,nʼihi na aga m agbaghara ndị ahụ m mere ka ha fọdụ mmehie ha. 21 “Busonụ ala Merataim agha,busokwanụ ndị bi na Pekod agha.Chụọ ha ọsọ, gbuchapụ ma bibiekwa ha niile kpamkpam.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri.“Mezuonụ ihe niile m nyere unu nʼiwu. 22 A na-anụ ụzụ agha nʼala ahụ,a na-anụ ụzụ oke mbibi. 23 Lee ka e si gbajie,ma tipịa mkpirisi igwe ahụ na-esupịa ụwa niile.Lee ka Babilọn si tọgbọrọ nʼefunʼetiti mba niile nke ụwa. 24 Esiiri m gị ọnya, gị Babilọn;ị makwara nʼọnya ahụ tupu ị mata na ọnya ahụ dị.A chọtala gị, jidekwa gị,nʼihi na i doola onwe gị ibuso ONYENWE ANYỊ agha. 25 ONYENWE ANYỊ emegheela ụlọakụ ngwa agha ya,site nʼime ya wepụta ngwa agha nke ọnụma ya.Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niilenwere ọrụ ọ ga-arụ nʼala Babilọn. 26 Sitenụ nʼebe dị anya bịa buso ya agha.Kụkapunụ ọba ya niile,tụkọtanụ ha ọnụ dịka akpa ọka dị ukwuu, nke atụkọtara nʼelu ibe ha.Bibienụ ya kpamkpam,ka ihe ọbụla ghakwara ịfọdụrụ ya. 27 Gbuonụ ụmụ oke ehi ya niile,ka ha niile gaa nʼebe ụlọ igbu anụAhụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ụbọchị ahụ a kara aka banyere ha abịala,bụ oge a ga-eji taa ha ahụhụ. 28 Geenụ ntị nʼihe ndị na-agbalaga na-ekwu, bụ ndị si na Babilọn na-agbapụ ọsọ.Ha na-ekwusa na Zayọnotu ONYENWE ANYỊ Chineke anyị si bọọ ọbọ,otu o si abọ ọbọ nʼihi ụlọnsọ ukwu ya. 29 “Kpọkọtanụ ndị na-agba ụta maka imegide Babilọn,bụ ndị niile na-agba ụta.Maanụ ụlọ ikwu, gbaa ya gburugburu;unu ekwela ka onye ọbụla si nʼime ya gbapụ.Kwụghachi ya ụgwọ dịka ọrụ ya si dị,dịka ihe niile ahụ o mere si dị meenụ ya otu ahụ.Nʼihi na o buliela onwe ya elu megide ONYENWE ANYỊ,bụ Onye nsọ nke Izrel. 30 Nʼihi ya, ụmụ okorobịa ya ga-ada nʼokporoụzọ ama niile.A ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 31 “Lee, edoola m onwe m imegide gị, gị onye nganga.”Otu a ka Onyenwe anyị, bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.“Nʼihi na ụbọchị gị abịala,bụ oge ahụ a ga-ata gị ahụhụ. 32 Onye nganga ahụ ga-asọ ngọngọ daa,ma o nweghị onye ga-enyere ya aka ka o bilitekwa.Aga m esunye obodo ya niile ọkụ,nke ga-erechapụ ndị niile gbara ya gburugburu.” 33 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru:“A na-emegbu nnọọ ndị Izrel,nʼotu aka ahụkwa, ndị Juda.Ndị dọtara ha nʼagha jidesiri ha aka ike.Ha adịghị ahapụ ha ka ha laa. 34 Ma Onye mgbapụta ha dị ike. ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile bụkwa aha ya.Ọ ga-eji ike ya niile kpepụta ọnụ ha,ime ka ala ha nweekwa izuike,ma meekwa ka ndị bi na Babilọn ghara inwe izuike. 35 “Mma agha ga-ebili megide ndị Babilọn niile,”otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara,“na ndị ahụ niile bi na Babilọnma megidekwa ndịisi ọchịchị niile na ndị ahụ niile maara ihe. 36 Mma agha ga-ebili megide ndị amụma ụgha ha niile.Ha ga-aghọ ndị nzuzu.Mma agha ga-ebili megide ndị bụ dike nʼagha.Obi ha ga-ejupụtakwa nʼoke egwu. 37 Mma agha ga-ebili megide ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha,na ndị mba ọzọ niile nọ nʼetiti ha.Ha ga-aghọkwa ndị inyom.Mma agha ga-ebilikwa megide akụ ha niile.A ga-alụta ha niile nʼagha. 38 Okpomọkụ ga-abịakwasị mmiri ha niilemee ka ha taa.Nʼihi na ala ha bụ ala arụsị:arụsị ha niile ga-ayịkwa ara nʼihi oke egwu nke ga-abịakwasị ha. 39 “Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ.Ikwighịkwighị ga-ebikwa nʼebe ahụ.Mmadụ ọbụla agaghị ebikwa nʼime ya ọzọ.O nweghị onye ga-ebikwa nʼime ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 40 Dịka m si kwatuo Sọdọm na Gọmọra,ya na obodo niile gbara ya gburugburu,”otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.“Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ;nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.” 41 “Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa;mba dị ukwuu na ọtụtụ ndị ezeka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa. 42 Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe;ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-enweghị obi ebere.Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri,dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha.Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha,ibuso gị agha, Ada Babilọn. 43 Eze Babilọn nụrụ akụkọ banyere ude ha,akụkọ mere ka ike gwụrụ aka ya abụọ kpamkpam.Oke ihe mgbu ejidela ya,ihe mgbu dịka nke nwanyị ime na-eme. 44 Lee, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdanna-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ,nʼotu ntabi anya ka m ga-esi nʼala ya chụpụ Babilọn.Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka?Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu?Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?” 45 Nʼihi ya, nụrụ ihe ONYENWE ANYỊ kwadobere megide Babilọn,nụrụkwa ihe o zubere megide ala ndị Babilọn.A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ.Ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a. 46 Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda Babilọn,iti mkpu akwa ya ga-adakwa ụda nʼetiti mba niile dị iche iche.

In Other Versions

Jeremiah 50 in the ANGEFD

Jeremiah 50 in the ANTPNG2D

Jeremiah 50 in the AS21

Jeremiah 50 in the BAGH

Jeremiah 50 in the BBPNG

Jeremiah 50 in the BBT1E

Jeremiah 50 in the BDS

Jeremiah 50 in the BEV

Jeremiah 50 in the BHAD

Jeremiah 50 in the BIB

Jeremiah 50 in the BLPT

Jeremiah 50 in the BNT

Jeremiah 50 in the BNTABOOT

Jeremiah 50 in the BNTLV

Jeremiah 50 in the BOATCB

Jeremiah 50 in the BOATCB2

Jeremiah 50 in the BOBCV

Jeremiah 50 in the BOCNT

Jeremiah 50 in the BOECS

Jeremiah 50 in the BOGWICC

Jeremiah 50 in the BOHCB

Jeremiah 50 in the BOHCV

Jeremiah 50 in the BOHLNT

Jeremiah 50 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 50 in the BOILNTAP

Jeremiah 50 in the BOITCV

Jeremiah 50 in the BOKCV

Jeremiah 50 in the BOKCV2

Jeremiah 50 in the BOKHWOG

Jeremiah 50 in the BOKSSV

Jeremiah 50 in the BOLCB

Jeremiah 50 in the BOLCB2

Jeremiah 50 in the BOMCV

Jeremiah 50 in the BONAV

Jeremiah 50 in the BONCB

Jeremiah 50 in the BONLT

Jeremiah 50 in the BONUT2

Jeremiah 50 in the BOPLNT

Jeremiah 50 in the BOSCB

Jeremiah 50 in the BOSNC

Jeremiah 50 in the BOTLNT

Jeremiah 50 in the BOVCB

Jeremiah 50 in the BOYCB

Jeremiah 50 in the BPBB

Jeremiah 50 in the BPH

Jeremiah 50 in the BSB

Jeremiah 50 in the CCB

Jeremiah 50 in the CUV

Jeremiah 50 in the CUVS

Jeremiah 50 in the DBT

Jeremiah 50 in the DGDNT

Jeremiah 50 in the DHNT

Jeremiah 50 in the DNT

Jeremiah 50 in the ELBE

Jeremiah 50 in the EMTV

Jeremiah 50 in the ESV

Jeremiah 50 in the FBV

Jeremiah 50 in the FEB

Jeremiah 50 in the GGMNT

Jeremiah 50 in the GNT

Jeremiah 50 in the HARY

Jeremiah 50 in the HNT

Jeremiah 50 in the IRVA

Jeremiah 50 in the IRVB

Jeremiah 50 in the IRVG

Jeremiah 50 in the IRVH

Jeremiah 50 in the IRVK

Jeremiah 50 in the IRVM

Jeremiah 50 in the IRVM2

Jeremiah 50 in the IRVO

Jeremiah 50 in the IRVP

Jeremiah 50 in the IRVT

Jeremiah 50 in the IRVT2

Jeremiah 50 in the IRVU

Jeremiah 50 in the ISVN

Jeremiah 50 in the JSNT

Jeremiah 50 in the KAPI

Jeremiah 50 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 50 in the KBV

Jeremiah 50 in the KJV

Jeremiah 50 in the KNFD

Jeremiah 50 in the LBA

Jeremiah 50 in the LBLA

Jeremiah 50 in the LNT

Jeremiah 50 in the LSV

Jeremiah 50 in the MAAL

Jeremiah 50 in the MBV

Jeremiah 50 in the MBV2

Jeremiah 50 in the MHNT

Jeremiah 50 in the MKNFD

Jeremiah 50 in the MNG

Jeremiah 50 in the MNT

Jeremiah 50 in the MNT2

Jeremiah 50 in the MRS1T

Jeremiah 50 in the NAA

Jeremiah 50 in the NASB

Jeremiah 50 in the NBLA

Jeremiah 50 in the NBS

Jeremiah 50 in the NBVTP

Jeremiah 50 in the NET2

Jeremiah 50 in the NIV11

Jeremiah 50 in the NNT

Jeremiah 50 in the NNT2

Jeremiah 50 in the NNT3

Jeremiah 50 in the PDDPT

Jeremiah 50 in the PFNT

Jeremiah 50 in the RMNT

Jeremiah 50 in the SBIAS

Jeremiah 50 in the SBIBS

Jeremiah 50 in the SBIBS2

Jeremiah 50 in the SBICS

Jeremiah 50 in the SBIDS

Jeremiah 50 in the SBIGS

Jeremiah 50 in the SBIHS

Jeremiah 50 in the SBIIS

Jeremiah 50 in the SBIIS2

Jeremiah 50 in the SBIIS3

Jeremiah 50 in the SBIKS

Jeremiah 50 in the SBIKS2

Jeremiah 50 in the SBIMS

Jeremiah 50 in the SBIOS

Jeremiah 50 in the SBIPS

Jeremiah 50 in the SBISS

Jeremiah 50 in the SBITS

Jeremiah 50 in the SBITS2

Jeremiah 50 in the SBITS3

Jeremiah 50 in the SBITS4

Jeremiah 50 in the SBIUS

Jeremiah 50 in the SBIVS

Jeremiah 50 in the SBT

Jeremiah 50 in the SBT1E

Jeremiah 50 in the SCHL

Jeremiah 50 in the SNT

Jeremiah 50 in the SUSU

Jeremiah 50 in the SUSU2

Jeremiah 50 in the SYNO

Jeremiah 50 in the TBIAOTANT

Jeremiah 50 in the TBT1E

Jeremiah 50 in the TBT1E2

Jeremiah 50 in the TFTIP

Jeremiah 50 in the TFTU

Jeremiah 50 in the TGNTATF3T

Jeremiah 50 in the THAI

Jeremiah 50 in the TNFD

Jeremiah 50 in the TNT

Jeremiah 50 in the TNTIK

Jeremiah 50 in the TNTIL

Jeremiah 50 in the TNTIN

Jeremiah 50 in the TNTIP

Jeremiah 50 in the TNTIZ

Jeremiah 50 in the TOMA

Jeremiah 50 in the TTENT

Jeremiah 50 in the UBG

Jeremiah 50 in the UGV

Jeremiah 50 in the UGV2

Jeremiah 50 in the UGV3

Jeremiah 50 in the VBL

Jeremiah 50 in the VDCC

Jeremiah 50 in the YALU

Jeremiah 50 in the YAPE

Jeremiah 50 in the YBVTP

Jeremiah 50 in the ZBP