Jeremiah 8 (BOICB)

1 “ ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, nʼoge ahụ a ga-esi nʼili ha wezuga ọkpụkpụ ndị eze, na ọkpụkpụ ndịisi ọchịchị Juda, na ọkpụkpụ ndị nchụaja na ndị amụma, na ọkpụkpụ ndị niile bi na Jerusalem. 2 A ga-agbasapụ ha nye anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, bụ ihe ndị ahụ niile ha hụrụ nʼanya na ihe ha na-akpọ isiala nye. Bụkwa ihe ndị ahụ ha na-agbaso, nke ha na-ajụta ase site nʼaka ha, na-efekwa. A gaghị ekpokọta ọkpụkpụ ndị a niile, maọbụ lie ha nʼala. Kama ha ga-aghasara nʼala dịka unyi. 3 Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’ 4 “Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru:“ ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ?Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ? 5 Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha?Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ?Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike;ha jụrụ ịtụgharị. 6 Aṅaala m ntị,ma anụbeghị m ka ihe ọma ọbụla si ha nʼọnụ na-apụta.O nweghị onye nʼime ha chegharịrị tie aka nʼobi sị,“Gịnị bụ ihe a m mere?”Kama onye ọbụla na-agbaso ụzọ nke aka ya,dịka ịnyịnya nke na-agbaba nʼọgbọ agha. 7 Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwemaara oge ya a kara aka.Nduru, na eleke, na okwolomakwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ.Ma ndị m amaghịihe ONYENWE ANYỊ chọrọ site nʼaka ha. 8 “ ‘Unu si aṅaa kwuo, “Ndị maara ihe ka anyị bụ,nʼihi na iwu ONYENWE ANYỊ dị nʼaka anyị,”ebe ọ bụ na mkpisi akwụkwọ aghụghọ ndị ode akwụkwọ unuadịghị akọwa iwu ya otu o kwesiri? 9 A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe;a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya.Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu ONYENWE ANYỊ,ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere? 10 Ya mere, aga m akpọnye ndị ikom ọzọ nwunye ha,werekwa ubi ha nyefee nʼaka ndị ọrụ ubi ọzọ.Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta,ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha.Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụajana-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ. 11 Ha na-ekechi ọnya ndị mdịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ.Ha na-asị, “Udo dị, udo dị,”mgbe udo na-adịghị. 12 Ihere o mere ha nʼihi omume arụ ha niile?Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị;nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere.Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada;ha ga-asọ ngọngọ mgbe e nyere ha ntaramahụhụ.Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru. 13 “ ‘Aga m anapụ ha ihe owuwe ubi niile ha nwetara,otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara.Ha agaghị enwekwa mkpụrụ vaịnị,maọbụ mkpụrụ osisi fiig nʼelu osisi fiig ha.Akwụkwọ osisi ndị a niile ga-akpọnwụ.A ga-anapụkwa haihe niile m nyere ha.’ ” 14 Gịnị ka unu na-eme nʼebe a unu nọdụrụ ala?Kwakọtaanụ ihe unu niile.Ngwa, ka anyị gbapụnụ ọsọ gaa nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ikenọdụ nʼebe ahụ nwụọ!Nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke anyị amaala anyị ikpe ọnwụ.O nyela anyị mmiri e tinyere nsi ka anyị ṅụọ,nʼihi na anyị emehiela megide ya. 15 Anyị lere anya udo,ma o nweghị ihe ọma ọbụla anyị hụrụ.Anyị lere anya ọgwụgwọ ọrịa anyị,maọbụ naanị ihe egwu ka anyị hụrụ. 16 E sitere na Dannụ ụda ịma imi ịnyịnya ndị iro.Ala a niile mara jijijimgbe ha nụrụ akwa nke ịnyịnya ndị ahụ dị ike.Ha na-abịa ịla ala a na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka hana-abịa ime obodo a na ndị bi nʼime ya. 17 “Lee, ana m ezibata agwọ ọjọọ, ndị na-atagbu atagbu, nʼetiti unu.Ajụala nke ọ dịkwaghị ụra ga-arata ha.Ana m ezibata ha ka ha taa unu.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 18 Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na m hụrụ onye ga-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m,nʼihi na obi m na-ada mba nʼime m. 19 Gee ntị nụrụ akwa ndị mka ọ na-ada site nʼebe dị anya. “ONYENWE ANYỊ, ọ sitela na Zayọn pụọ?Ọ pụtara na Eze ha anọkwaghị nʼebe ahụ?” “Gịnị mere ha ji site nʼoyiyi a tụrụ atụ,na arụsị ndị mba ọzọ ha na-efe kpasuo m iwe?” 20 “Oge owuwe ihe ubi agafeela,leekwa na ọkọchị agabigakwala,ma a zọpụtabeghị anyị.” 21 Ebe ọ bụ na a zọpịara ndị m, ọ bụkwa m ka azọpịara.Anam eru ụjụ, oke egwu jisikwara m aka ike. 22 Ọ pụtara na o nweghị mmanụ otite na-eme ka ọnya laa dị na Gilead?Ọ bụ na e nwekwaghị dibịa nọ nʼebe ahụ?Gịnị mere o nweghị ọgwụgwọ dịrị ndị mnʼihi mmerụ ahụ ha niile?

In Other Versions

Jeremiah 8 in the ANGEFD

Jeremiah 8 in the ANTPNG2D

Jeremiah 8 in the AS21

Jeremiah 8 in the BAGH

Jeremiah 8 in the BBPNG

Jeremiah 8 in the BBT1E

Jeremiah 8 in the BDS

Jeremiah 8 in the BEV

Jeremiah 8 in the BHAD

Jeremiah 8 in the BIB

Jeremiah 8 in the BLPT

Jeremiah 8 in the BNT

Jeremiah 8 in the BNTABOOT

Jeremiah 8 in the BNTLV

Jeremiah 8 in the BOATCB

Jeremiah 8 in the BOATCB2

Jeremiah 8 in the BOBCV

Jeremiah 8 in the BOCNT

Jeremiah 8 in the BOECS

Jeremiah 8 in the BOGWICC

Jeremiah 8 in the BOHCB

Jeremiah 8 in the BOHCV

Jeremiah 8 in the BOHLNT

Jeremiah 8 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 8 in the BOILNTAP

Jeremiah 8 in the BOITCV

Jeremiah 8 in the BOKCV

Jeremiah 8 in the BOKCV2

Jeremiah 8 in the BOKHWOG

Jeremiah 8 in the BOKSSV

Jeremiah 8 in the BOLCB

Jeremiah 8 in the BOLCB2

Jeremiah 8 in the BOMCV

Jeremiah 8 in the BONAV

Jeremiah 8 in the BONCB

Jeremiah 8 in the BONLT

Jeremiah 8 in the BONUT2

Jeremiah 8 in the BOPLNT

Jeremiah 8 in the BOSCB

Jeremiah 8 in the BOSNC

Jeremiah 8 in the BOTLNT

Jeremiah 8 in the BOVCB

Jeremiah 8 in the BOYCB

Jeremiah 8 in the BPBB

Jeremiah 8 in the BPH

Jeremiah 8 in the BSB

Jeremiah 8 in the CCB

Jeremiah 8 in the CUV

Jeremiah 8 in the CUVS

Jeremiah 8 in the DBT

Jeremiah 8 in the DGDNT

Jeremiah 8 in the DHNT

Jeremiah 8 in the DNT

Jeremiah 8 in the ELBE

Jeremiah 8 in the EMTV

Jeremiah 8 in the ESV

Jeremiah 8 in the FBV

Jeremiah 8 in the FEB

Jeremiah 8 in the GGMNT

Jeremiah 8 in the GNT

Jeremiah 8 in the HARY

Jeremiah 8 in the HNT

Jeremiah 8 in the IRVA

Jeremiah 8 in the IRVB

Jeremiah 8 in the IRVG

Jeremiah 8 in the IRVH

Jeremiah 8 in the IRVK

Jeremiah 8 in the IRVM

Jeremiah 8 in the IRVM2

Jeremiah 8 in the IRVO

Jeremiah 8 in the IRVP

Jeremiah 8 in the IRVT

Jeremiah 8 in the IRVT2

Jeremiah 8 in the IRVU

Jeremiah 8 in the ISVN

Jeremiah 8 in the JSNT

Jeremiah 8 in the KAPI

Jeremiah 8 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 8 in the KBV

Jeremiah 8 in the KJV

Jeremiah 8 in the KNFD

Jeremiah 8 in the LBA

Jeremiah 8 in the LBLA

Jeremiah 8 in the LNT

Jeremiah 8 in the LSV

Jeremiah 8 in the MAAL

Jeremiah 8 in the MBV

Jeremiah 8 in the MBV2

Jeremiah 8 in the MHNT

Jeremiah 8 in the MKNFD

Jeremiah 8 in the MNG

Jeremiah 8 in the MNT

Jeremiah 8 in the MNT2

Jeremiah 8 in the MRS1T

Jeremiah 8 in the NAA

Jeremiah 8 in the NASB

Jeremiah 8 in the NBLA

Jeremiah 8 in the NBS

Jeremiah 8 in the NBVTP

Jeremiah 8 in the NET2

Jeremiah 8 in the NIV11

Jeremiah 8 in the NNT

Jeremiah 8 in the NNT2

Jeremiah 8 in the NNT3

Jeremiah 8 in the PDDPT

Jeremiah 8 in the PFNT

Jeremiah 8 in the RMNT

Jeremiah 8 in the SBIAS

Jeremiah 8 in the SBIBS

Jeremiah 8 in the SBIBS2

Jeremiah 8 in the SBICS

Jeremiah 8 in the SBIDS

Jeremiah 8 in the SBIGS

Jeremiah 8 in the SBIHS

Jeremiah 8 in the SBIIS

Jeremiah 8 in the SBIIS2

Jeremiah 8 in the SBIIS3

Jeremiah 8 in the SBIKS

Jeremiah 8 in the SBIKS2

Jeremiah 8 in the SBIMS

Jeremiah 8 in the SBIOS

Jeremiah 8 in the SBIPS

Jeremiah 8 in the SBISS

Jeremiah 8 in the SBITS

Jeremiah 8 in the SBITS2

Jeremiah 8 in the SBITS3

Jeremiah 8 in the SBITS4

Jeremiah 8 in the SBIUS

Jeremiah 8 in the SBIVS

Jeremiah 8 in the SBT

Jeremiah 8 in the SBT1E

Jeremiah 8 in the SCHL

Jeremiah 8 in the SNT

Jeremiah 8 in the SUSU

Jeremiah 8 in the SUSU2

Jeremiah 8 in the SYNO

Jeremiah 8 in the TBIAOTANT

Jeremiah 8 in the TBT1E

Jeremiah 8 in the TBT1E2

Jeremiah 8 in the TFTIP

Jeremiah 8 in the TFTU

Jeremiah 8 in the TGNTATF3T

Jeremiah 8 in the THAI

Jeremiah 8 in the TNFD

Jeremiah 8 in the TNT

Jeremiah 8 in the TNTIK

Jeremiah 8 in the TNTIL

Jeremiah 8 in the TNTIN

Jeremiah 8 in the TNTIP

Jeremiah 8 in the TNTIZ

Jeremiah 8 in the TOMA

Jeremiah 8 in the TTENT

Jeremiah 8 in the UBG

Jeremiah 8 in the UGV

Jeremiah 8 in the UGV2

Jeremiah 8 in the UGV3

Jeremiah 8 in the VBL

Jeremiah 8 in the VDCC

Jeremiah 8 in the YALU

Jeremiah 8 in the YAPE

Jeremiah 8 in the YBVTP

Jeremiah 8 in the ZBP