John 17 (BOICB)
1 Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o leliri anya nʼeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto. 2 I nyela ya ikike nʼebe mmadụ niile nọ, na ike inye ndị niile i nyere ya ndụ ebighị ebi. 3 Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa. 4 Enyere m gị otuto nʼụwa site nʼịrụzu ọrụ niile ị nyere m ka m rụọ. 5 Ma ugbu a, Nna, nye m otuto nʼihu gị, ụdị otuto ahụ m nwere nʼihu gị tupu e kee ụwa. 6 “Emere m ka ndị ahụ i siri nʼụwa kponye m mara aha gị. Ha bụ ndị nke gị, i nyere m ha, ha debekwara okwu gị. 7 Ugbu a, ha amarala na ihe niile i nyere m si nʼaka gị bịa. 8 Ma ugbu a, enyela m ha okwu ahụ i nyere m, ha nabatakwara ya, marakwa nʼeziokwu na-esi m nʼebe ị nọ bịa. Ha kwenyekwara na ọ bụ gị zitere m. 9 Ana m ekpere ha ekpere, ọ bụghị nʼihi ụwa ka m na-ekpe ekpere. Kama ana m ekpe ekpere banyere ndị ahụ i nyere m, nʼihi na ha bụkwa ndị nke gị. 10 Ihe niile m nwere bụ nke gị, ihe niile i nwere bụkwa nke m. E sitere na ha mee ka otuto m pụta ìhè. 11 Ugbu a, anọghịkwa nʼime ụwa, ma ha ka nọ nʼime ụwa, ana m alaghachikwute gị. Ya mere, Nna dị nsọ, chebe ha nke ọma site nʼike nke aha gị, bụ aha nke ahụ i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu. 12 Mgbe mụ na ha nọ nʼụwa, echebere m ha site nʼaha gị nke i nyere m. Echebekwara m ha, o nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha lara nʼiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa nke ịla nʼiyi, ka e mezuo ihe akwụkwọ nsọ kwuru. 13 “Ma ugbu a, ana m alọghachikwute gị, ma ana m ekwu ihe ndị a nʼụwa ugbu a ka ha nwee nʼọṅụ m, nʼebe o zuruoke nʼime ha. 14 Enyela m ha okwu gị. Ma nʼihi ya, ụwa akpọọla ha asị. Nʼihi na ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa. 15 Ekpeghị m ekpere ka iwepụ ha nʼụwa, kama ka ịnapụta ha site nʼaka ajọ onye ahụ. 16 Ha onwe ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụkwaghị onye nke ụwa. 17 Were eziokwu doo ha nsọ, okwu gị bụ eziokwu. 18 Dị ka i siri zite m nʼụwa, otu a ka m na-ezipụkwa ha nʼụwa. 19 Ọ bụkwa nʼihi ha ka m jiri debe onwe m nsọ, ka ha onwe ha bụrụkwa ndị e doro nsọ nʼeziokwu. 20 “Ekpeghị m ekpere a nʼihi ndị a naanị. Kama ana m ekpekwa ekpere a nʼihi ndị niile ga-ekwere na mụ, site nʼokwu ha. 21 Ka ha niile bụrụ otu, Nna, dị ka ị nọ nʼime m mụ a nọrọ nʼime gị. Ka ha nọrọkwa nʼime anyị ka ụwa kwere na ọ bụ gị zitere m. 22 Enyere m ha otuto nke i nyere m, ka ha bụrụ otu dị ka anyị onwe anyị si bụrụ otu; 23 Mụ onwe m nʼime ha, gị onwe gị nʼime m. Ka e mee ka ha bụrụ otu nʼụzọ zuruoke, ka ụwa matakwa na ọ bụ gị zitere m, na ị hụkwara ha nʼanya dị ka ị si hụ m nʼanya. 24 “Nna, achọrọ m ka ndị niile i nyere m soro m nọrọ ebe m nọ. Ka ha hụ otuto m nke i nyere m nʼihi na ị hụrụ m nʼanya tupu atọọ ntọala nke ụwa. 25 “Nna onye ezi omume, ụwa amaghị gị. Ma amaara m gị. Ndị a matakwara na ọ bụ gị zitere m. 26 Emekwara m ka ha mara aha gị. Aga m agakwa nʼihu ime ka ha mara ya. Ka ịhụnanya ahụ i nwere nʼebe m nọ dịgide nʼime ha, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime ha.”
In Other Versions
John 17 in the ANGEFD
John 17 in the ANTPNG2D
John 17 in the AS21
John 17 in the BAGH
John 17 in the BBPNG
John 17 in the BBT1E
John 17 in the BDS
John 17 in the BEV
John 17 in the BHAD
John 17 in the BIB
John 17 in the BLPT
John 17 in the BNT
John 17 in the BNTABOOT
John 17 in the BNTLV
John 17 in the BOATCB
John 17 in the BOATCB2
John 17 in the BOBCV
John 17 in the BOCNT
John 17 in the BOECS
John 17 in the BOGWICC
John 17 in the BOHCB
John 17 in the BOHCV
John 17 in the BOHLNT
John 17 in the BOHNTLTAL
John 17 in the BOILNTAP
John 17 in the BOITCV
John 17 in the BOKCV
John 17 in the BOKCV2
John 17 in the BOKHWOG
John 17 in the BOKSSV
John 17 in the BOLCB
John 17 in the BOLCB2
John 17 in the BOMCV
John 17 in the BONAV
John 17 in the BONCB
John 17 in the BONLT
John 17 in the BONUT2
John 17 in the BOPLNT
John 17 in the BOSCB
John 17 in the BOSNC
John 17 in the BOTLNT
John 17 in the BOVCB
John 17 in the BOYCB
John 17 in the BPBB
John 17 in the BPH
John 17 in the BSB
John 17 in the CCB
John 17 in the CUV
John 17 in the CUVS
John 17 in the DBT
John 17 in the DGDNT
John 17 in the DHNT
John 17 in the DNT
John 17 in the ELBE
John 17 in the EMTV
John 17 in the ESV
John 17 in the FBV
John 17 in the FEB
John 17 in the GGMNT
John 17 in the GNT
John 17 in the HARY
John 17 in the HNT
John 17 in the IRVA
John 17 in the IRVB
John 17 in the IRVG
John 17 in the IRVH
John 17 in the IRVK
John 17 in the IRVM
John 17 in the IRVM2
John 17 in the IRVO
John 17 in the IRVP
John 17 in the IRVT
John 17 in the IRVT2
John 17 in the IRVU
John 17 in the ISVN
John 17 in the JSNT
John 17 in the KAPI
John 17 in the KBT1ETNIK
John 17 in the KBV
John 17 in the KJV
John 17 in the KNFD
John 17 in the LBA
John 17 in the LBLA
John 17 in the LNT
John 17 in the LSV
John 17 in the MAAL
John 17 in the MBV
John 17 in the MBV2
John 17 in the MHNT
John 17 in the MKNFD
John 17 in the MNG
John 17 in the MNT
John 17 in the MNT2
John 17 in the MRS1T
John 17 in the NAA
John 17 in the NASB
John 17 in the NBLA
John 17 in the NBS
John 17 in the NBVTP
John 17 in the NET2
John 17 in the NIV11
John 17 in the NNT
John 17 in the NNT2
John 17 in the NNT3
John 17 in the PDDPT
John 17 in the PFNT
John 17 in the RMNT
John 17 in the SBIAS
John 17 in the SBIBS
John 17 in the SBIBS2
John 17 in the SBICS
John 17 in the SBIDS
John 17 in the SBIGS
John 17 in the SBIHS
John 17 in the SBIIS
John 17 in the SBIIS2
John 17 in the SBIIS3
John 17 in the SBIKS
John 17 in the SBIKS2
John 17 in the SBIMS
John 17 in the SBIOS
John 17 in the SBIPS
John 17 in the SBISS
John 17 in the SBITS
John 17 in the SBITS2
John 17 in the SBITS3
John 17 in the SBITS4
John 17 in the SBIUS
John 17 in the SBIVS
John 17 in the SBT
John 17 in the SBT1E
John 17 in the SCHL
John 17 in the SNT
John 17 in the SUSU
John 17 in the SUSU2
John 17 in the SYNO
John 17 in the TBIAOTANT
John 17 in the TBT1E
John 17 in the TBT1E2
John 17 in the TFTIP
John 17 in the TFTU
John 17 in the TGNTATF3T
John 17 in the THAI
John 17 in the TNFD
John 17 in the TNT
John 17 in the TNTIK
John 17 in the TNTIL
John 17 in the TNTIN
John 17 in the TNTIP
John 17 in the TNTIZ
John 17 in the TOMA
John 17 in the TTENT
John 17 in the UBG
John 17 in the UGV
John 17 in the UGV2
John 17 in the UGV3
John 17 in the VBL
John 17 in the VDCC
John 17 in the YALU
John 17 in the YAPE
John 17 in the YBVTP
John 17 in the ZBP