John 6 (BOICB)

1 Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gafere nʼofe nke ọzọ nke osimiri Galili (nke a na-akpọkwa osimiri Tiberịas). 2 Oke igwe mmadụ sooro ya, nʼihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ na-arụ nʼahụ ndị ọrịa. 3 Jisọs rigooro nʼelu ugwu nọdụ ala ya na ndị na-eso ụzọ ya. 4 Nʼoge a, mmemme oriri Ngabiga ndị Juu na-abịa nso. 5 Mgbe Jisọs leliri anya elu hụ oke igwe mmadụ na-abịakwute ya, ọ sịrị Filip, “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?” 6 Ọ jụrụ nke a naanị iji nwalee ya, ya onwe ya mararị ihe ọ ga-eme. 7 Filip zara ya, “Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị.” 8 Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara, 9 “Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?” 10 Jisọs sịrị, “Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.” E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise. 11 Ya mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ. 12 Mgbe ha niile rijuchara afọ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi.” 13 Ya mere, ha tụtụkọtara ha, kpojuo nkata iri na abụọ, bụ iberibe si nʼogbe achịcha balị ise nke ndị ahụ rifọrọ. 14 Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.” 15 Mgbe Jisọs matara na ha chọrọ ịbịa dọkpụrụ ya nʼike chie ya eze, ọ hapụrụ ha ga nʼugwu naanị ya, nʼonwe ya. 16 Mgbe o ruru nʼuhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya rịdara gaa nʼọnụ mmiri, 17 ebe ha banyere nʼotu ụgbọ mmiri, malite ịgabiga osimiri gawa nʼofe Kapanọm. Nʼoge a ọchịchịrị agbaala ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha. 18 Ebili mmiri maliri elu nʼihi nʼoke ifufe bidoro na-efe. 19 Ha akwọọla ụgbọ ihe dịka kilomita ise maọbụ isii, mgbe ha hụrụ Jisọs ka ọ na-aga ije nʼelu mmiri ahụ na-abịa nso nʼụgbọ mmiri ha. Oke egwu tụkwara ha. 20 Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m.” 21 Mgbe ahụ, ha nabatara ya nʼime ụgbọ ahụ, ọ dịkwaghị anya ụgbọ ha bịaruru nʼelu ala ebe ha na-aga. 22 Nʼechi ya, igwe mmadụ ahụ nọdụrụ nʼofe ọzọ nke ọnụ mmiri ahụ chọpụtara na ọ bụ naanị otu ụgbọ mmiri nta bịara nʼebe ahụ, na Jisọs esoghị ndị na-eso ụzọ ya banye nʼime ya, kama na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya ka ụgbọ mmiri ahụ buuru pụọ. 23 Mgbe ahụ ụfọdụ ụgbọ mmiri si Tiberịas bịara kwụsị nso nso ebe ahụ ndị mmadụ nọ rie achịcha mgbe Onyenwe anyị nyechara ekele maka ya. 24 Ma mgbe igwe mmadụ ahụ ghọtara na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị nʼebe ahụ, ha banyere nʼụgbọ mmiri nta ndị ahụ kwọfee gawa Kapanọm ịchọ Jisọs. 25 Mgbe ha hụrụ ya nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ, ha sịrị ya, “Onye ozizi, olee mgbe i jiri bịa nʼebe a?” 26 Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ihe unu ji na-achọ m abụghị nʼihi na unu hụrụ ihe ịrịbama m mere, kama na unu riri achịcha rijuokwa afọ. 27 Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.” 28 Mgbe ahụ, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?” 29 Jisọs zara sị ha, “Ọrụ Chineke bụ nke a, ikwere nʼonye ahụ o zitere.” 30 Ya mere ha sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị ga-egosi anyị nke anyị ga-ahụ ma kwere na gị? Kedụ ọrụ ị ga-arụ? 31 Nna nna anyị ha riri mánà nʼọzara; dị ka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘O sitere nʼeluigwe nye ha achịcha ka ha rie.’” 32 Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụghị Mosis nyere unu achịcha ahụ site nʼeluigwe, kama ọ bụ Nna m na-enye unu ezi achịcha ahụ site nʼeluigwe. 33 Nʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ.” 34 Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, nye anyị ụdị achịcha a site ugbu a gawa.” 35 Jisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ. 36 Ma agwa m unu, unu ahụla m ma unu ekweghịkwa. 37 Onye ọbụla Nna ahụ nyere m ga-abịakwute m, onye ọbụla na-abịakwute m, agaghị m achụpụ ya. 38 Nʼihi na esi m nʼeluigwe rịdata nʼụwa ime uche onye ahụ zitere m, ọ bụghị ime uche nke m. 39 Nke a bụkwa uche onye ahụ zitere m, na o nweghị onye ọbụla o nyere m ga-efunarị m, kama m ga-eme ka ha site nʼọnwụ bilie nʼụbọchị ikpeazụ. 40 Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.” 41 Nʼihi nke a, ndị Juu bidoro itamu ntamu megide ya nʼihi na ọ sịrị, “Abụ m achịcha ahụ siri nʼeluigwe rịdata.” 42 Ha sịrị, “Onye a ọ bụghị Jisọs, nwa Josef, bụ onye anyị matara nne na nna ya? Oleekwanụ otu o si ekwu ugbu a sị, ‘Esi m nʼeluigwe rịdata’?” 43 Jisọs zara sị ha, “Unu atamula nʼetiti onwe unu. 44 O nweghị onye nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụghị na Nna ahụ zitere m kpọtara ya, aga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ. 45 E dere ya nʼakwụkwọ ndị amụma, ‘Ha niile ga-abụ ndị Chineke ga-akụziri ihe.’ Onye ọbụla nke gere Nna ahụ ntị ma mụtakwa ihe site na ya na-abịakwute m. 46 O nweghị onye ọbụla hụrụla Nna ahụ karịakwa onye ahụ sitere na Chineke, naanị ya hụrụla Nna ahụ. 47 Nʼeze, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla kwerenụ nwere ndụ ebighị ebi. 48 Abụ m achịcha nke ndụ. 49 Nna nna unu ha riri mánà ahụ nʼime ọzara ma mecha nwụọ. 50 Ma nke a bụ achịcha ahụ nke si nʼeluigwe bịa, nke mmadụ pụrụ iri ma ghara ịnwụ anwụ. 51 Abụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa.” 52 Mgbe ahụ, ndị Juu bidoro na-arụrịta ụka ike nʼetiti onwe ha sị, “Olee otu nwoke a ga-esi nye anyị anụ ahụ ya ka anyị rie?” 53 Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, naanị ma unu riri anụ ahụ Nwa nke Mmadụ ma ṅụọkwa ọbara ya, unu agaghị enwe ndụ nʼime onwe unu. 54 Onye ọbụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. A ga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ ahụ. 55 Nʼihi na anụ ahụ m bụ ezigbo nri, ọbara m bụkwa ezigbo ihe ọṅụṅụ. 56 Onye ọbụla na-eri anụ ahụ m na-aṅụkwa ọbara m na-anọgide nʼime m mụ onwe m kwa nʼime ya. 57 Dị ka Nna ahụ dị ndụ zitere m, ana m adịkwa ndụ nʼihi Nna ahụ, otu a ka onye na-eri m ga-adịkwa ndụ site na m. 58 Nke a bụ achịcha ahụ si nʼeluigwe bịa. Nna nna unu ha riri mánà ma nwụkwaa, ma onye ọbụla na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” 59 O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-akụzi ihe nʼụlọ ekpere dị na Kapanọm. 60 Mgbe ọtụtụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya ha nụrụ nke a, ha sịrị, “Nke a bụ ozizi siri ike, onye nwere ike ịnabata ya?” 61 Ebe Jisọs matara na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu maka nke a ọ sịrị ha, “Nke a ọ na-ewute unu? 62 Gịnị ka unu ga-ekwu ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-arịgo ebe ọ nọrịị na mbụ. 63 Ọ bụ Mmụọ ahụ na-enye ndụ; anụ ahụ abaghị uru ọbụla, okwu ndị m gwara unu bụ mmụọ bụrụkwa ndụ. 64 Ma nʼetiti unu, ọ dị ụfọdụ na-ekwenyeghị.” Nʼihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ nʼime ha na-ekwenyeghị, matakwa onye ahụ nke ga-arara ya nye. 65 Ọ sịrị, “Ọ bụ nke a mere m jiri gwa unu na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m enyeghị ya ike.” 66 Nʼihi nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, kwụsị iso ya. 67 Jisọs sịrị mmadụ iri na abụọ ahụ, “Unu chọkwara iso ha pụọ?” 68 Saimọn Pita zara ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi. 69 Anyị kweere marakwa na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.” 70 Jisọs zara ha, “Ọ bụghị m họpụtara unu mmadụ iri na abụọ? Ma otu onye nʼime unu bụ ekwensu!” 71 Ọ na-ekwu banyere Judas nwa Saimọn Iskarịọt, onye nʼagbanyeghị na ọ bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ, bụ onye ga-arara ya nye.

In Other Versions

John 6 in the ANGEFD

John 6 in the ANTPNG2D

John 6 in the AS21

John 6 in the BAGH

John 6 in the BBPNG

John 6 in the BBT1E

John 6 in the BDS

John 6 in the BEV

John 6 in the BHAD

John 6 in the BIB

John 6 in the BLPT

John 6 in the BNT

John 6 in the BNTABOOT

John 6 in the BNTLV

John 6 in the BOATCB

John 6 in the BOATCB2

John 6 in the BOBCV

John 6 in the BOCNT

John 6 in the BOECS

John 6 in the BOGWICC

John 6 in the BOHCB

John 6 in the BOHCV

John 6 in the BOHLNT

John 6 in the BOHNTLTAL

John 6 in the BOILNTAP

John 6 in the BOITCV

John 6 in the BOKCV

John 6 in the BOKCV2

John 6 in the BOKHWOG

John 6 in the BOKSSV

John 6 in the BOLCB

John 6 in the BOLCB2

John 6 in the BOMCV

John 6 in the BONAV

John 6 in the BONCB

John 6 in the BONLT

John 6 in the BONUT2

John 6 in the BOPLNT

John 6 in the BOSCB

John 6 in the BOSNC

John 6 in the BOTLNT

John 6 in the BOVCB

John 6 in the BOYCB

John 6 in the BPBB

John 6 in the BPH

John 6 in the BSB

John 6 in the CCB

John 6 in the CUV

John 6 in the CUVS

John 6 in the DBT

John 6 in the DGDNT

John 6 in the DHNT

John 6 in the DNT

John 6 in the ELBE

John 6 in the EMTV

John 6 in the ESV

John 6 in the FBV

John 6 in the FEB

John 6 in the GGMNT

John 6 in the GNT

John 6 in the HARY

John 6 in the HNT

John 6 in the IRVA

John 6 in the IRVB

John 6 in the IRVG

John 6 in the IRVH

John 6 in the IRVK

John 6 in the IRVM

John 6 in the IRVM2

John 6 in the IRVO

John 6 in the IRVP

John 6 in the IRVT

John 6 in the IRVT2

John 6 in the IRVU

John 6 in the ISVN

John 6 in the JSNT

John 6 in the KAPI

John 6 in the KBT1ETNIK

John 6 in the KBV

John 6 in the KJV

John 6 in the KNFD

John 6 in the LBA

John 6 in the LBLA

John 6 in the LNT

John 6 in the LSV

John 6 in the MAAL

John 6 in the MBV

John 6 in the MBV2

John 6 in the MHNT

John 6 in the MKNFD

John 6 in the MNG

John 6 in the MNT

John 6 in the MNT2

John 6 in the MRS1T

John 6 in the NAA

John 6 in the NASB

John 6 in the NBLA

John 6 in the NBS

John 6 in the NBVTP

John 6 in the NET2

John 6 in the NIV11

John 6 in the NNT

John 6 in the NNT2

John 6 in the NNT3

John 6 in the PDDPT

John 6 in the PFNT

John 6 in the RMNT

John 6 in the SBIAS

John 6 in the SBIBS

John 6 in the SBIBS2

John 6 in the SBICS

John 6 in the SBIDS

John 6 in the SBIGS

John 6 in the SBIHS

John 6 in the SBIIS

John 6 in the SBIIS2

John 6 in the SBIIS3

John 6 in the SBIKS

John 6 in the SBIKS2

John 6 in the SBIMS

John 6 in the SBIOS

John 6 in the SBIPS

John 6 in the SBISS

John 6 in the SBITS

John 6 in the SBITS2

John 6 in the SBITS3

John 6 in the SBITS4

John 6 in the SBIUS

John 6 in the SBIVS

John 6 in the SBT

John 6 in the SBT1E

John 6 in the SCHL

John 6 in the SNT

John 6 in the SUSU

John 6 in the SUSU2

John 6 in the SYNO

John 6 in the TBIAOTANT

John 6 in the TBT1E

John 6 in the TBT1E2

John 6 in the TFTIP

John 6 in the TFTU

John 6 in the TGNTATF3T

John 6 in the THAI

John 6 in the TNFD

John 6 in the TNT

John 6 in the TNTIK

John 6 in the TNTIL

John 6 in the TNTIN

John 6 in the TNTIP

John 6 in the TNTIZ

John 6 in the TOMA

John 6 in the TTENT

John 6 in the UBG

John 6 in the UGV

John 6 in the UGV2

John 6 in the UGV3

John 6 in the VBL

John 6 in the VDCC

John 6 in the YALU

John 6 in the YAPE

John 6 in the YBVTP

John 6 in the ZBP