Jude 1 (BOICB)

1 Jud, odibo Jisọs Kraịst, na nwanne Jemis, Na-edegara ndị niile a kpọrọ, ndị ahụrụ nʼanya nʼime Chineke, bụ Nna, na ndị nọkwa nʼokpuru nchebe Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a: 2 Ka ebere na udo na ịhụnanya bara unu ụba. 3 Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ na-anụ m ọkụ nʼobi idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nʼotu, ma ahụrụ m mkpa ọ dị idere unu akwụkwọ a, ịrịọ unu ka unu guzosie ike buo agha ichebe okwukwe ahụ, nke e nyefere ndị nsọ nʼaka idebe. 4 Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe. 5 Ọ bụ ezie na unu maa ihe ndị a niile, ma achọrọ m ichetara unu otu Onyenwe anyị si zọpụta ndị ya site nʼala Ijipt, ma mesịa laa ndị niile na-ekweghị ekwe nʼiyi. 6 Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu. 7 Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi. 8 Nʼụzọ dị otu a kwa, ndị a na-emerụ anụ ahụ ha nʼirọ nrọ ha, na-ajụkwa ike ọchịchị niile, ma na-ekwulukwa ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ. 9 Ma Maikel onyeisi ndị mmụọ ozi, mgbe o guzogidere ekwensu na-arụrịtakwa ụka banyere ozu Mosis, ya onwe ya enweghị anya ike ịma ya ikpe nʼihi okwu nkwulu, kama ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị baara gị mba.” 10 Ma ndị a na-ekwulu ihe niile ọbụla ha na-aghọtaghị. Dịka ụmụ anụmanụ a na-azụghị azụ, ha na-eme ihe ọbụla dị ha mma nʼanya si otu a na-ala onwe ha nʼiyi. 11 Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha soro nzọ ụkwụ Ken, nyefee onwe ha na ndahie Belam nʼihi ihe nrite nʼuru, ma laa nʼiyi na nnupu isi Kora. 12 Ndị a bụ ihe ntụpọ nʼetiti unu nʼoge mmemme oriri ịhụnanya unu, ha na-eso unu na-erikọ nri na-atụghị egwu ọbụla. Ha bụ ndị na-elekọta naanị onwe ha. Ha dị ka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri, nke ifufe na-ebugharị. Ha bụ osisi a na-ahụ nʼoge ọkọchị nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke e si na mgbọrọgwụ ya hoputa, nke nwụrụ anwụ ugboro abụọ. 13 Ha bụ ebili mmiri na-amagharị nʼosimiri, nke na-asọpụta ihere ha dịka ụfụfụ, kpakpando na-awagharị awagharị, bụ ndị nke a kwadooro ebe kachasị ịgba ọchịchịrị ruo ebighị ebi. 14 Ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka Enọk, onye bụ agbụrụ nke asaa site nʼAdam buru nʼamụma banyere ha sị, “Lee! Onyenwe anyị na-abịa, ya na puku kwụrụ puku ndị nsọ ya. 15 Ọ na-abịa ikpe mmadụ niile ikpe, na ịtụ ha niile mmehie ajọ omume niile ha nʼanya, bụ nke ha mere nʼụzọ na-ezighị ezi. Tinyere okwu ọjọọ niile nke ndị mmehie ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.” 16 Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu oge niile, ndị o nweghị ihe ọbụla na-adị ha mma. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ. Ha na-anya isi banyere onwe ha, na-aja ndị ọzọ mma; ka ha nwee ike nweta ihe ha na-achọ nʼaka ha. 17 Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, chetanụ ihe ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kwuru na ha ga-emezu. 18 Nʼihi na ha sịrị unu, “Nʼọgwụgwụ oge ahụ, ndị na-eji ihe niile na-emere ihe ọchị ga-adị. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ. 19 Ọ bụ ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị na-enweghị Mmụọ Nsọ nʼime ha, bụ ndị na-eweta nkewa nʼetiti unu.” 20 Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, nọgidenụ na-ewuli onwe unu elu na ntọala okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ. Na-ekpekwanụ ekpere nʼime Mmụọ Nsọ. 21 Doonụ onwe unu nʼokpuru ịhụnanya Chineke, dịka unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke na-eduba na ndụ ebighị ebi. 22 Gosinụ ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ ebere. 23 Zọpụtanụ ndị ọzọ site nʼịgụpụta ha nʼọkụ. Nʼebe ndị ọzọ nọ gosinụ ha obi ebere, kama jirinụ ịtụ egwu mee nke a, kpọọnụ ọ bụladị uwe nke anụ ahụ mmehie merụrụ asị. 24 Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ ichebe unu, ka unu ghara ịda, onye pụrụ ịkpọbata unu nʼihu ya dị ebube nʼọnọdụ enweghị ntụpọ ọbụla nʼoke ọṅụ 25 ka otuto, na ịdị ukwuu, na ike, na ikike ọchịchị; dịrị Onye naanị ya bụ Chineke, Onye nzọpụta anyị, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, tupu nʼọgbọ niile ebido, ka ọ dịrị ya ugbu a, na mgbe niile ebighị ebi. Amen.

In Other Versions

Jude 1 in the ANGEFD

Jude 1 in the ANTPNG2D

Jude 1 in the AS21

Jude 1 in the BAGH

Jude 1 in the BBPNG

Jude 1 in the BBT1E

Jude 1 in the BDS

Jude 1 in the BEV

Jude 1 in the BHAD

Jude 1 in the BIB

Jude 1 in the BLPT

Jude 1 in the BNT

Jude 1 in the BNTABOOT

Jude 1 in the BNTLV

Jude 1 in the BOATCB

Jude 1 in the BOATCB2

Jude 1 in the BOBCV

Jude 1 in the BOCNT

Jude 1 in the BOECS

Jude 1 in the BOGWICC

Jude 1 in the BOHCB

Jude 1 in the BOHCV

Jude 1 in the BOHLNT

Jude 1 in the BOHNTLTAL

Jude 1 in the BOILNTAP

Jude 1 in the BOITCV

Jude 1 in the BOKCV

Jude 1 in the BOKCV2

Jude 1 in the BOKHWOG

Jude 1 in the BOKSSV

Jude 1 in the BOLCB

Jude 1 in the BOLCB2

Jude 1 in the BOMCV

Jude 1 in the BONAV

Jude 1 in the BONCB

Jude 1 in the BONLT

Jude 1 in the BONUT2

Jude 1 in the BOPLNT

Jude 1 in the BOSCB

Jude 1 in the BOSNC

Jude 1 in the BOTLNT

Jude 1 in the BOVCB

Jude 1 in the BOYCB

Jude 1 in the BPBB

Jude 1 in the BPH

Jude 1 in the BSB

Jude 1 in the CCB

Jude 1 in the CUV

Jude 1 in the CUVS

Jude 1 in the DBT

Jude 1 in the DGDNT

Jude 1 in the DHNT

Jude 1 in the DNT

Jude 1 in the ELBE

Jude 1 in the EMTV

Jude 1 in the ESV

Jude 1 in the FBV

Jude 1 in the FEB

Jude 1 in the GGMNT

Jude 1 in the GNT

Jude 1 in the HARY

Jude 1 in the HNT

Jude 1 in the IRVA

Jude 1 in the IRVB

Jude 1 in the IRVG

Jude 1 in the IRVH

Jude 1 in the IRVK

Jude 1 in the IRVM

Jude 1 in the IRVM2

Jude 1 in the IRVO

Jude 1 in the IRVP

Jude 1 in the IRVT

Jude 1 in the IRVT2

Jude 1 in the IRVU

Jude 1 in the ISVN

Jude 1 in the JSNT

Jude 1 in the KAPI

Jude 1 in the KBT1ETNIK

Jude 1 in the KBV

Jude 1 in the KJV

Jude 1 in the KNFD

Jude 1 in the LBA

Jude 1 in the LBLA

Jude 1 in the LNT

Jude 1 in the LSV

Jude 1 in the MAAL

Jude 1 in the MBV

Jude 1 in the MBV2

Jude 1 in the MHNT

Jude 1 in the MKNFD

Jude 1 in the MNG

Jude 1 in the MNT

Jude 1 in the MNT2

Jude 1 in the MRS1T

Jude 1 in the NAA

Jude 1 in the NASB

Jude 1 in the NBLA

Jude 1 in the NBS

Jude 1 in the NBVTP

Jude 1 in the NET2

Jude 1 in the NIV11

Jude 1 in the NNT

Jude 1 in the NNT2

Jude 1 in the NNT3

Jude 1 in the PDDPT

Jude 1 in the PFNT

Jude 1 in the RMNT

Jude 1 in the SBIAS

Jude 1 in the SBIBS

Jude 1 in the SBIBS2

Jude 1 in the SBICS

Jude 1 in the SBIDS

Jude 1 in the SBIGS

Jude 1 in the SBIHS

Jude 1 in the SBIIS

Jude 1 in the SBIIS2

Jude 1 in the SBIIS3

Jude 1 in the SBIKS

Jude 1 in the SBIKS2

Jude 1 in the SBIMS

Jude 1 in the SBIOS

Jude 1 in the SBIPS

Jude 1 in the SBISS

Jude 1 in the SBITS

Jude 1 in the SBITS2

Jude 1 in the SBITS3

Jude 1 in the SBITS4

Jude 1 in the SBIUS

Jude 1 in the SBIVS

Jude 1 in the SBT

Jude 1 in the SBT1E

Jude 1 in the SCHL

Jude 1 in the SNT

Jude 1 in the SUSU

Jude 1 in the SUSU2

Jude 1 in the SYNO

Jude 1 in the TBIAOTANT

Jude 1 in the TBT1E

Jude 1 in the TBT1E2

Jude 1 in the TFTIP

Jude 1 in the TFTU

Jude 1 in the TGNTATF3T

Jude 1 in the THAI

Jude 1 in the TNFD

Jude 1 in the TNT

Jude 1 in the TNTIK

Jude 1 in the TNTIL

Jude 1 in the TNTIN

Jude 1 in the TNTIP

Jude 1 in the TNTIZ

Jude 1 in the TOMA

Jude 1 in the TTENT

Jude 1 in the UBG

Jude 1 in the UGV

Jude 1 in the UGV2

Jude 1 in the UGV3

Jude 1 in the VBL

Jude 1 in the VDCC

Jude 1 in the YALU

Jude 1 in the YAPE

Jude 1 in the YBVTP

Jude 1 in the ZBP