Lamentations 3 (BOICB)

1 Abụ m onye hụrụla ahụhụ sitena mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe ONYENWE ANYỊ. 2 O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịanʼọchịchịrị kama nʼìhè. 3 Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m,mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile. 4 O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ,ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ. 5 O busola m agha,jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu. 6 O meela ka m biri nʼọchịchịrịdịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga. 7 Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ;o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị. 8 Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya,ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka. 9 O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile,o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ. 10 Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche,na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya, 11 o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ,hapụ m na-enweghị onye inyeaka. 12 Ọ dọọla ụta yamee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata. 13 O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ yagbapuo m obi. 14 Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile;ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile. 15 O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ,meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ. 16 O meela ka m jiri okwute tajisie eze m,o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m. 17 Enweghị m udo,echezọkwaala m ihe ọganihu bụ. 18 Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa.Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka ONYENWE ANYỊ nweta.” 19 Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m,ya na ihe ilu na oluilu. 20 Mgbe m na-echeta ya,obi m na-ada mba nʼime m. 21 Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi mnke na-eme ka m nwee olileanya. 22 Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke ONYENWE ANYỊ na-emeghị ka anyị gwụsịa,nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ. 23 Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile;ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike. 24 Mkpụrụobi m na-ekwu, “ONYENWE ANYỊ bụ oke m,nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.” 25 ONYENWE ANYỊ dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya,e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike. 26 Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọchere nzọpụta nke ONYENWE ANYỊ. 27 Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị yamgbe ọ bụ okorobịa. 28 Ya nọrọkwa duu naanị ya,nʼihi na ọ bụ ONYENWE ANYỊ bokwasịrị ya ibu ahụ. 29 Ya tinye ihu ya nʼaja,nʼihi na olileanya nwere ike dịrị. 30 Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya,ya kwerekwa ka ihe ihere ju ya afọ. 31 Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruomgbe ebighị ebi. 32 Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya,nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu. 33 Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ,maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ. 34 Iji ụkwụ zọgbuondị mkpọrọ nọ nʼala ahụ 35 ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya akanʼihu Onye kachasị ihe niile elu, 36 ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ.Ọ bụ na Onyenwe anyị agaghị ahụ ihe ndị a? 37 Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị irema ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ? 38 Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile eluka ihe ọma na ihe ọjọọ si abịa? 39 Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamumgbe ọ na-ahụ ahụhụ nʼihi mmehie ya? 40 Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya.Ka anyị lọghachikwutenụ ONYENWE ANYỊ. 41 Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nyeChineke nọ nʼeluigwe, sị: 42 “Anyị emehiela, nupu isi,ma ị gbagharabeghị. 43 “I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ.I gbuola anyị, jụ imere anyị ebere. 44 I jiri igwe ojii kpuchie onwe gịka ekpere anyị ghara irute gị. 45 I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụnʼetiti mba niile. 46 “Ndị iro anyị niile asaghepụla ọnụ hamegide anyị. 47 Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche,na mbibi na ịla nʼiyi.” 48 Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụtanʼihi ndị m a lara nʼiyi. 49 Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụtana-akwụsịghị akwụsị, 50 tutu ruo mgbe ONYENWE ANYỊ ga-esite nʼeluigweledata anya ma hụ. 51 Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu,nʼihi ọnọdụ nke ndị inyom niile nọ nʼime obodo m. 52 Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla,na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ. 53 Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulusite nʼịtụ m nkume. 54 Mmiri kpuchiri m isi,echere m na-efuola m. 55 Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị,gị ONYENWE ANYỊ. 56 Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị.Nụrụ arịrịọ inyeaka nke m na-arịọ gị.” 57 Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị.Ị sịrị, “Atụla egwu.” 58 Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m,gị gbapụtara ndụ m. 59 ONYENWE ANYỊ, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m.Kpechitere m ọnụ m. 60 Ị hụla ịbọ ọbọ ha niilena nzube niile ha na-ezube megide m. 61 ONYENWE ANYỊ, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha mna nzube niile ha na-ezube megide m. 62 Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro mmegide m ogologo ụbọchị niile. 63 Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala.Ha ji abụ na-akọcha m. 64 ONYENWE ANYỊ, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha,nʼihi ihe niile aka ha rụpụtara. 65 Jiri ihe mkpudo kpuchie obi ha.Meekwa ka ịbụ ọnụ gị dịkwasị ha. 66 Site nʼiwe gị chụọ ha ọsọ. Laakwa ha nʼiyi nʼiwe gị,ka ha ghara ịdịkwa nʼokpuru eluigwe nke ONYENWE ANYỊ ọzọ.

In Other Versions

Lamentations 3 in the ANGEFD

Lamentations 3 in the ANTPNG2D

Lamentations 3 in the AS21

Lamentations 3 in the BAGH

Lamentations 3 in the BBPNG

Lamentations 3 in the BBT1E

Lamentations 3 in the BDS

Lamentations 3 in the BEV

Lamentations 3 in the BHAD

Lamentations 3 in the BIB

Lamentations 3 in the BLPT

Lamentations 3 in the BNT

Lamentations 3 in the BNTABOOT

Lamentations 3 in the BNTLV

Lamentations 3 in the BOATCB

Lamentations 3 in the BOATCB2

Lamentations 3 in the BOBCV

Lamentations 3 in the BOCNT

Lamentations 3 in the BOECS

Lamentations 3 in the BOGWICC

Lamentations 3 in the BOHCB

Lamentations 3 in the BOHCV

Lamentations 3 in the BOHLNT

Lamentations 3 in the BOHNTLTAL

Lamentations 3 in the BOILNTAP

Lamentations 3 in the BOITCV

Lamentations 3 in the BOKCV

Lamentations 3 in the BOKCV2

Lamentations 3 in the BOKHWOG

Lamentations 3 in the BOKSSV

Lamentations 3 in the BOLCB

Lamentations 3 in the BOLCB2

Lamentations 3 in the BOMCV

Lamentations 3 in the BONAV

Lamentations 3 in the BONCB

Lamentations 3 in the BONLT

Lamentations 3 in the BONUT2

Lamentations 3 in the BOPLNT

Lamentations 3 in the BOSCB

Lamentations 3 in the BOSNC

Lamentations 3 in the BOTLNT

Lamentations 3 in the BOVCB

Lamentations 3 in the BOYCB

Lamentations 3 in the BPBB

Lamentations 3 in the BPH

Lamentations 3 in the BSB

Lamentations 3 in the CCB

Lamentations 3 in the CUV

Lamentations 3 in the CUVS

Lamentations 3 in the DBT

Lamentations 3 in the DGDNT

Lamentations 3 in the DHNT

Lamentations 3 in the DNT

Lamentations 3 in the ELBE

Lamentations 3 in the EMTV

Lamentations 3 in the ESV

Lamentations 3 in the FBV

Lamentations 3 in the FEB

Lamentations 3 in the GGMNT

Lamentations 3 in the GNT

Lamentations 3 in the HARY

Lamentations 3 in the HNT

Lamentations 3 in the IRVA

Lamentations 3 in the IRVB

Lamentations 3 in the IRVG

Lamentations 3 in the IRVH

Lamentations 3 in the IRVK

Lamentations 3 in the IRVM

Lamentations 3 in the IRVM2

Lamentations 3 in the IRVO

Lamentations 3 in the IRVP

Lamentations 3 in the IRVT

Lamentations 3 in the IRVT2

Lamentations 3 in the IRVU

Lamentations 3 in the ISVN

Lamentations 3 in the JSNT

Lamentations 3 in the KAPI

Lamentations 3 in the KBT1ETNIK

Lamentations 3 in the KBV

Lamentations 3 in the KJV

Lamentations 3 in the KNFD

Lamentations 3 in the LBA

Lamentations 3 in the LBLA

Lamentations 3 in the LNT

Lamentations 3 in the LSV

Lamentations 3 in the MAAL

Lamentations 3 in the MBV

Lamentations 3 in the MBV2

Lamentations 3 in the MHNT

Lamentations 3 in the MKNFD

Lamentations 3 in the MNG

Lamentations 3 in the MNT

Lamentations 3 in the MNT2

Lamentations 3 in the MRS1T

Lamentations 3 in the NAA

Lamentations 3 in the NASB

Lamentations 3 in the NBLA

Lamentations 3 in the NBS

Lamentations 3 in the NBVTP

Lamentations 3 in the NET2

Lamentations 3 in the NIV11

Lamentations 3 in the NNT

Lamentations 3 in the NNT2

Lamentations 3 in the NNT3

Lamentations 3 in the PDDPT

Lamentations 3 in the PFNT

Lamentations 3 in the RMNT

Lamentations 3 in the SBIAS

Lamentations 3 in the SBIBS

Lamentations 3 in the SBIBS2

Lamentations 3 in the SBICS

Lamentations 3 in the SBIDS

Lamentations 3 in the SBIGS

Lamentations 3 in the SBIHS

Lamentations 3 in the SBIIS

Lamentations 3 in the SBIIS2

Lamentations 3 in the SBIIS3

Lamentations 3 in the SBIKS

Lamentations 3 in the SBIKS2

Lamentations 3 in the SBIMS

Lamentations 3 in the SBIOS

Lamentations 3 in the SBIPS

Lamentations 3 in the SBISS

Lamentations 3 in the SBITS

Lamentations 3 in the SBITS2

Lamentations 3 in the SBITS3

Lamentations 3 in the SBITS4

Lamentations 3 in the SBIUS

Lamentations 3 in the SBIVS

Lamentations 3 in the SBT

Lamentations 3 in the SBT1E

Lamentations 3 in the SCHL

Lamentations 3 in the SNT

Lamentations 3 in the SUSU

Lamentations 3 in the SUSU2

Lamentations 3 in the SYNO

Lamentations 3 in the TBIAOTANT

Lamentations 3 in the TBT1E

Lamentations 3 in the TBT1E2

Lamentations 3 in the TFTIP

Lamentations 3 in the TFTU

Lamentations 3 in the TGNTATF3T

Lamentations 3 in the THAI

Lamentations 3 in the TNFD

Lamentations 3 in the TNT

Lamentations 3 in the TNTIK

Lamentations 3 in the TNTIL

Lamentations 3 in the TNTIN

Lamentations 3 in the TNTIP

Lamentations 3 in the TNTIZ

Lamentations 3 in the TOMA

Lamentations 3 in the TTENT

Lamentations 3 in the UBG

Lamentations 3 in the UGV

Lamentations 3 in the UGV2

Lamentations 3 in the UGV3

Lamentations 3 in the VBL

Lamentations 3 in the VDCC

Lamentations 3 in the YALU

Lamentations 3 in the YAPE

Lamentations 3 in the YBVTP

Lamentations 3 in the ZBP