Matthew 12 (BOICB)

1 Nʼoge ahụ, Jisọs sitere nʼubi a kụrụ ọka na-agafe nʼụbọchị izuike. Ma ebe agụụ na-agụ ndị na-eso ụzọ ya, ha malitere ịghọ ogbe ọka, na ịta mkpụrụ ya. 2 Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Lee, ndị na-eso ụzọ gị na-eme ihe na-ezighị ezi ime nʼụbọchị izuike!” 3 Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtaghị ihe Devid na ndị ya na ha soo mere mgbe agụụ na-agụ ha? 4 Otu o si banye nʼụlọ Chineke, ya na ndị so ya, rie achịcha a na-eche nʼihu Chineke, nke na-ezighị ezi nʼiwu ka ha rie, kama ọ dịịrị naanị ndị nchụaja iri ya. 5 Ka ọ bụ na unu agụtabeghị ebe e dere ya nʼime akwụkwọ iwu Mosis na ndị nchụaja na-emerụ ụbọchị izuike nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma ọ dịghị onye na-ata ha ụta? 6 Ma ana m agwa unu na onye dị ukwuu karịa ụlọnsọ ukwu nọ nʼebe a. 7 Ọ bụrụ na unu ghọtara ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’ Unu agaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe. 8 Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ụbọchị izuike.” 9 O sitere nʼebe ahụ pụọ banye nʼụlọ nzukọ ha. 10 Nʼebe a ka ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị nọ nʼebe ahụ jụrụ ya ajụjụ sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ mmadụ nʼụbọchị izuike?” 11 Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu nwere otu atụrụ danyere nʼime olulu nʼụbọchị izuike gịnị ka ọ ga-eme? Ọ ga-ahapụ ya nʼebe ahụ? Ọ gaghị ejide ya dọpụta ya? 12 Mmadụ ọ dịghị mkpa karịa atụrụ? Ya mere, o ziri ezi nʼiwu bụ ịrụ ọrụ ọma nʼụbọchị izuike.” 13 Mgbe ahụ ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” Nwoke ahụ setịpụrụ aka ya. Aka ahụ dịkwara ya mma dị ka aka nke ọzọ. 14 Nʼihi nke a ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ, ga gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya. 15 Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube ime, o sitere nʼebe ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịa nrịa ha niile. 16 Ma o nyere ha iwu ka ha hapụ ịgwa ndị ọzọ onye ọ bụ. 17 Nke a bụ ka emezuo okwu ahụ Aịzaya onye amụma kwuru, 18 “Onye a bụ onye na-ejere m ozi, onye m họpụtara.Onye m hụkwara nʼanya. O bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ.Aga m etinye Mmụọ m nʼime ya.Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka. 19 Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghị etisikwa mkpu ike.O nweghị onye ga-anụ olu okwu ya nʼezi. 20 Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara nʼala,maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị,tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi merie. 21 Ọ bụkwa nʼaha ya ka mba niile dị nʼụwa ga-atụkwasị olileanya ha.” 22 Emesịa, ha kpọtaara ya otu nwoke kpuru ìsì ma daakwa ogbi. Ọ bụkwa onye mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ gwọrọ ya, mee ka nwoke ahụ hụ ụzọ, bidokwa ikwu okwu. 23 Ihe a juru igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ anya. Nʼihi ya, ha kwuru sị, “Nwoke a, ọ ga-abụ Nwa Devid?” 24 Mgbe ndị Farisii nụrụ nke a, ha sịrị, “Nwoke a chụpụrụ mmụọ ọjọọ a nʼihi na Belzebub, eze ndị mmụọ ọjọọ, nyere ya ike ịchụpụ ya.” 25 Ma ebe ọ matara ihe ha na-eche nʼobi ha. Ọ gwara ha okwu sị, “Alaeze ọbụla kewara megide onwe ya ga-ada. Obodo o bụla maọbụ ezinaụlọ ọbụla kewara megide onwe ya agaghị eguzo. 26 Ọ bụrụ na ekwensu achụpụ ekwensu, o kewala megide onwe ya. Oleekwanụ otu alaeze ya ga-esi guzo. 27 Dị ka unu kwuru, ọ bụrụ na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nʼike Belzebub, ọ bụ nʼike onye ka ụmụ unu ndị ikom na-achụpụ ha? Ya mere, ọ bụ ụmụ unu ga-ekpe unu ikpe nʼihi okwu a unu kwuru. 28 Ma ọ bụrụ na m na-esite nʼike Mmụọ nke Chineke na-achụpụ mmụọ ọjọọ, matakwanụ na alaeze Chineke abịala nʼetiti unu. 29 “Ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ịbanye nʼụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo niile dị nʼụlọ ahụ. Ma o nwere ike ime nke a ma ọ bụrụ na ọ ga-eburu ụzọ kee nwoke ahụ agbụ? Mgbe o kesịrị ya agbụ, o nwere ike ịbanye kwakọtaa ngwongwo niile dị nʼụlọ nwoke ahụ. 30 “Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa. 31 Ya mere, ana m agwa unu sị, na a ga-agbaghara mmehie na nkwulu niile. Ma agaghị agbaghara nkwulu ekwuluru Mmụọ Nsọ. 32 Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwu megide Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya, nʼọgbọ a maọbụ nʼọgbọ nke na-abịa. 33 “Ọ bụrụ na e mee ka osisi too nke ọma, ọ ga-amịta mkpụrụ ọma, ma ọ bụrụ na o toghị nke ọma, ọ ga-amịta mkpụrụ ọjọọ. Nʼihi na a na-amata osisi ọbụla site na mkpụrụ ya. 34 Ụmụ ajụala, olee otu unu ga-esi kwuo okwu dị mma, ebe obi unu dị njọ? Nʼihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nʼobi pụta. 35 Ezi mmadụ na-esi nʼezi akụ ya wepụta ihe dị mma, ma ajọ mmadụ na-esitekwa nʼajọ akụ ya wepụta ajọọ ihe. 36 Ma ana m agwa unu sị, nʼụbọchị ikpe ahụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ, banyere okwu niile na-enweghị isi o kwuru. 37 Nʼihi na ọ bụ site nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe mara, sitekwa nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe na-amaghị.” 38 Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ozizi iwu na ndị Farisii gwara Jisọs sị ya, “Onye nkuzi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ihe ịrịbama.” 39 Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụ naanị ajọ ọgbọ nke na-enweghị okwukwe ga-achọkwa ka e gosi ha ihe ịrịbama. Ma ọ dịkwaghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịbama Jona onye amụma. 40 Nʼihi na dị ka Jona nọrọ ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼafọ azụ dị ukwuu, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi nọọkwa ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼobi nke ala. 41 Ndị ikom Ninive ga-eso ọgbọ a bilie nʼụbọchị ikpe maa ya ikpe. Nʼihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkwusa Jona. Ma lee onye karịrị Jona ukwuu nọ nʼebe a. 42 Nʼụbọchị ikpe ahụ kwa, eze nwanyị nke Ndịda ga-eso ọgbọ a bilie boo ya ebubo. Ọ ga-amakwa unu ikpe. Nʼihi na o siri nʼebe dị ụwa sọtụrụ bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn. Ma ugbu a onye ahụ dị ukwuu karịa Solomọn nọ nʼebe a, ma unu jụrụ i kwere na ya. 43 “Mgbe mmụọ na-adịghị ọcha si nʼime mmadụ pụọ, ọ na-agabiga nʼọzara ebe mmiri na-adịghị ịchọ ebe izuike, ma ọ naghị achọta ya. 44 Mgbe ahụ, ọ na-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m, ebe m si pụta.’ Mgbe ọ lọghachiri, ọ na-achọpụta na a zachara ụlọ ahụ dozie ya, ọ dịkwaghị onye bichiri nʼime ya. 45 Mgbe ahụ, ọ na-apụ gaa chọta mmụọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya onwe ya. Ha niile na-abata bịa biri nʼime onye ahụ. Mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ. Otu a ka ọ ga-adịrị ndị bi nʼọgbọ a jọrọ njọ.” 46 Mgbe ọ nọ na-agwa igwe mmadụ ahụ okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara guzoro nʼezi na-eche ka ha gwa ya okwu. 47 Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ gwara ya okwu sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na-achọ ịhụ gị nʼezi. Ha chọrọ ịgwa gị okwu.” 48 Ma ọ zara onye ahụ gwara ya okwu sị, “Onye bụ nne m? Olee ndị bụ ụmụnne m ndị nwoke?” 49 Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka, sị, “Lee, ndị a bụ nne m na ụmụnne m ndị nwoke. 50 Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe Nna m bi nʼeluigwe chọrọ, bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, nakwa nne m.”

In Other Versions

Matthew 12 in the ANGEFD

Matthew 12 in the ANTPNG2D

Matthew 12 in the AS21

Matthew 12 in the BAGH

Matthew 12 in the BBPNG

Matthew 12 in the BBT1E

Matthew 12 in the BDS

Matthew 12 in the BEV

Matthew 12 in the BHAD

Matthew 12 in the BIB

Matthew 12 in the BLPT

Matthew 12 in the BNT

Matthew 12 in the BNTABOOT

Matthew 12 in the BNTLV

Matthew 12 in the BOATCB

Matthew 12 in the BOATCB2

Matthew 12 in the BOBCV

Matthew 12 in the BOCNT

Matthew 12 in the BOECS

Matthew 12 in the BOGWICC

Matthew 12 in the BOHCB

Matthew 12 in the BOHCV

Matthew 12 in the BOHLNT

Matthew 12 in the BOHNTLTAL

Matthew 12 in the BOILNTAP

Matthew 12 in the BOITCV

Matthew 12 in the BOKCV

Matthew 12 in the BOKCV2

Matthew 12 in the BOKHWOG

Matthew 12 in the BOKSSV

Matthew 12 in the BOLCB

Matthew 12 in the BOLCB2

Matthew 12 in the BOMCV

Matthew 12 in the BONAV

Matthew 12 in the BONCB

Matthew 12 in the BONLT

Matthew 12 in the BONUT2

Matthew 12 in the BOPLNT

Matthew 12 in the BOSCB

Matthew 12 in the BOSNC

Matthew 12 in the BOTLNT

Matthew 12 in the BOVCB

Matthew 12 in the BOYCB

Matthew 12 in the BPBB

Matthew 12 in the BPH

Matthew 12 in the BSB

Matthew 12 in the CCB

Matthew 12 in the CUV

Matthew 12 in the CUVS

Matthew 12 in the DBT

Matthew 12 in the DGDNT

Matthew 12 in the DHNT

Matthew 12 in the DNT

Matthew 12 in the ELBE

Matthew 12 in the EMTV

Matthew 12 in the ESV

Matthew 12 in the FBV

Matthew 12 in the FEB

Matthew 12 in the GGMNT

Matthew 12 in the GNT

Matthew 12 in the HARY

Matthew 12 in the HNT

Matthew 12 in the IRVA

Matthew 12 in the IRVB

Matthew 12 in the IRVG

Matthew 12 in the IRVH

Matthew 12 in the IRVK

Matthew 12 in the IRVM

Matthew 12 in the IRVM2

Matthew 12 in the IRVO

Matthew 12 in the IRVP

Matthew 12 in the IRVT

Matthew 12 in the IRVT2

Matthew 12 in the IRVU

Matthew 12 in the ISVN

Matthew 12 in the JSNT

Matthew 12 in the KAPI

Matthew 12 in the KBT1ETNIK

Matthew 12 in the KBV

Matthew 12 in the KJV

Matthew 12 in the KNFD

Matthew 12 in the LBA

Matthew 12 in the LBLA

Matthew 12 in the LNT

Matthew 12 in the LSV

Matthew 12 in the MAAL

Matthew 12 in the MBV

Matthew 12 in the MBV2

Matthew 12 in the MHNT

Matthew 12 in the MKNFD

Matthew 12 in the MNG

Matthew 12 in the MNT

Matthew 12 in the MNT2

Matthew 12 in the MRS1T

Matthew 12 in the NAA

Matthew 12 in the NASB

Matthew 12 in the NBLA

Matthew 12 in the NBS

Matthew 12 in the NBVTP

Matthew 12 in the NET2

Matthew 12 in the NIV11

Matthew 12 in the NNT

Matthew 12 in the NNT2

Matthew 12 in the NNT3

Matthew 12 in the PDDPT

Matthew 12 in the PFNT

Matthew 12 in the RMNT

Matthew 12 in the SBIAS

Matthew 12 in the SBIBS

Matthew 12 in the SBIBS2

Matthew 12 in the SBICS

Matthew 12 in the SBIDS

Matthew 12 in the SBIGS

Matthew 12 in the SBIHS

Matthew 12 in the SBIIS

Matthew 12 in the SBIIS2

Matthew 12 in the SBIIS3

Matthew 12 in the SBIKS

Matthew 12 in the SBIKS2

Matthew 12 in the SBIMS

Matthew 12 in the SBIOS

Matthew 12 in the SBIPS

Matthew 12 in the SBISS

Matthew 12 in the SBITS

Matthew 12 in the SBITS2

Matthew 12 in the SBITS3

Matthew 12 in the SBITS4

Matthew 12 in the SBIUS

Matthew 12 in the SBIVS

Matthew 12 in the SBT

Matthew 12 in the SBT1E

Matthew 12 in the SCHL

Matthew 12 in the SNT

Matthew 12 in the SUSU

Matthew 12 in the SUSU2

Matthew 12 in the SYNO

Matthew 12 in the TBIAOTANT

Matthew 12 in the TBT1E

Matthew 12 in the TBT1E2

Matthew 12 in the TFTIP

Matthew 12 in the TFTU

Matthew 12 in the TGNTATF3T

Matthew 12 in the THAI

Matthew 12 in the TNFD

Matthew 12 in the TNT

Matthew 12 in the TNTIK

Matthew 12 in the TNTIL

Matthew 12 in the TNTIN

Matthew 12 in the TNTIP

Matthew 12 in the TNTIZ

Matthew 12 in the TOMA

Matthew 12 in the TTENT

Matthew 12 in the UBG

Matthew 12 in the UGV

Matthew 12 in the UGV2

Matthew 12 in the UGV3

Matthew 12 in the VBL

Matthew 12 in the VDCC

Matthew 12 in the YALU

Matthew 12 in the YAPE

Matthew 12 in the YBVTP

Matthew 12 in the ZBP