Matthew 18 (BOICB)

1 Nʼoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ajụjụ sị, “Olee onye dị ukwuu karịa ibe ya nʼalaeze eluigwe?” 2 Ọ kpọrọ otu nwantakịrị, onye o mere ka o guzoro nʼetiti ha, 3 ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu agbanweghị ma dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba nʼalaeze eluigwe. 4 Onye ọbụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị a bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nʼalaeze eluigwe. 5 Onye ọbụla nabatara nwantakịrị dị otu a nʼihi m, bụ onye nabatara m. 6 “Ma ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu emee ka otu nʼime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, jehie nʼokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume igwe nri nʼolu, tụnye ya nʼoke osimiri ka mmiri rie ya. 7 Ahụhụ ga-adịrị ụwa nʼihi ihe ndị na-eme ka mmadụ jehie. Ihe ndị na-eme ka mmadụ daba nʼọnwụnwa aghaghị ịbịa, ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke ọ ga-esite nʼaka ya bịa. 8 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na aka gị maọbụ ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufukwaa ya. Ọ kaara gị mma inwe ọrụsị maọbụ daa ngwụrọ baa na ndụ, karịa na ị ga-enwe aka abụọ maọbụ ụkwụ abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ebighị ebi. 9 Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa na ndụ, karịa inwe anya abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ. 10 “Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nʼime ụmụntakịrị ndị a anya. Nʼihi na nʼeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nʼihu Nna m mgbe niile. 11 Nʼihi na Nwa nke mmadụ bịara ịzọpụta ndị furu efu. 12 “Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na ọ dị onye nwere narị atụrụ, ma otu nʼime ha akpafuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu fọdụrụ pụọ jegharịa nʼugwu na ndịda niile, ịchọ atụrụ ahụ kpafuru akpafu? 13 Ọ bụrụkwa na ọ chọta ya, gịnị ka ọ ga-eme? Nʼezie, agwa m unu, ọ ga-aṅụrị oke ọnụ nʼihi otu atụrụ a karịa iri atụrụ itoolu na itoolu ndị ọzọ ahụ na-agahieghị ụzọ. 14 Ya mere, ọ bụghị nzube Nna m nke bi nʼeluigwe ka otu nʼime ụmụnta ndị a ala nʼiyi. 15 “Ọ bụrụ na nwanna gị emehie megide gị, jekwuru ya ebe naanị gị na ya nọ, tụọ ya mmehie nʼanya. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritela nwanna gị nʼuru. 16 Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye maọbụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nʼebe ọ nọ, ‘ka okwu ọbụla ekwuru bụrụ nke mmadụ abụọ maọbụ atọ ga-agba akaebe banyere ya.’ 17 Ọ bụrụ na o geghị ha ntị, gwa ndị chọọchị, ma ọ bụrụ na o geghịkwa ọ bụladị ndị chọọchị ntị, were ya dị ka onye mba ọzọ maọbụ onye ọna ụtụ. 18 “Nʼezie, asị m unu, na ihe ọbụla unu kere agbụ nʼụwa a, e keela ya rịị agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla kwa unu tọpụrụ nʼụwa, a tọpụkwala ya rịị nʼeluigwe. 19 “Ọzọ, ana m agwa unu nʼezie a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nʼetiti unu ekwekọrịta nʼụwa banyere ihe ọbụla unu na-arịọ nʼekpere Nna m bi nʼeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ. 20 Nʼihi na ebe ọbụla mmadụ abụọ maọbụ atọ zukọtara nʼaha m, mụ onwe m nọ nʼetiti ha.” 21 Mgbe ahụ Pita bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugboro ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ bụ ugboro asaa?” 22 Jisọs zara sị ya, “Ọ bụghị ugboro asaa. Kama ị ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa ụzọ asaa. 23 “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị ọrụ ya gụzie ego ya ha ji. 24 Mgbe ha malitere na-apịazi, a kpọtaara eze ahụ otu onye nke ji ya ụgwọ ruru puku talenti iri. 25 Nwoke ahụ enweghị ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Nna ya ukwu nyere iwu ka e refuo ya na nwunye ya na ụmụ ya, na ihe niile o nwere, ka akwụghachi ụgwọ o ji. 26 “Ma ohu ahụ dara nʼala, gbukwaa ikpere ya nʼala, rịọ ya arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachiobi nʼebe m nọ. Aga m akwụghachikwa gị ụgwọ niile m ji gị.’ 27 Nna ukwu onye ọrụ ahụ nwere ọmịiko nʼebe ọ nọ, meere ya ebere. Ọ sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ. 28 “Ma mgbe ohu ahụ sitere nʼebe ahụ pụọ, ọ hụrụ otu ohu ibe ya ji ya ụgwọ otu narị denarị. O jidere ya nʼaka ike, machie ya aka nʼakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a.’ 29 “Ya mere, ohu ibe ya ahụ dara nʼala nʼihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Enyi m, biko nwee ntachiobi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’ 30 “Ma o kwenyeghị, kama ọ gara tụba ya nʼụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ niile o ji ya. 31 Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe mere, o wutere ha nke ukwuu. Ha jekwuru Nna ha ukwu kọọrọ ya ihe niile ndị a. 32 “Nʼihi nke a Nna ya ukwu kpọrọ ohu ahụ sị ya, ‘Ohu obi ọjọọ! Agbaghara m gị ụgwọ ahụ niile i ji, nʼihi na ị rịọrọ m arịrịọ. 33 Ọ bụ na ị kwesighị inwe obi ebere nʼebe ohu ibe gị nọ, dị ka m si mere gị ebere?’ 34 Nʼihi iwe, Nna ya ukwuu nyefere ya nʼaka ndị nche na-eche ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ, ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji. 35 “Otu a ka Nna m bi nʼeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu ejighị obi unu niile gbaghara ụmụnna unu.”

In Other Versions

Matthew 18 in the ANGEFD

Matthew 18 in the ANTPNG2D

Matthew 18 in the AS21

Matthew 18 in the BAGH

Matthew 18 in the BBPNG

Matthew 18 in the BBT1E

Matthew 18 in the BDS

Matthew 18 in the BEV

Matthew 18 in the BHAD

Matthew 18 in the BIB

Matthew 18 in the BLPT

Matthew 18 in the BNT

Matthew 18 in the BNTABOOT

Matthew 18 in the BNTLV

Matthew 18 in the BOATCB

Matthew 18 in the BOATCB2

Matthew 18 in the BOBCV

Matthew 18 in the BOCNT

Matthew 18 in the BOECS

Matthew 18 in the BOGWICC

Matthew 18 in the BOHCB

Matthew 18 in the BOHCV

Matthew 18 in the BOHLNT

Matthew 18 in the BOHNTLTAL

Matthew 18 in the BOILNTAP

Matthew 18 in the BOITCV

Matthew 18 in the BOKCV

Matthew 18 in the BOKCV2

Matthew 18 in the BOKHWOG

Matthew 18 in the BOKSSV

Matthew 18 in the BOLCB

Matthew 18 in the BOLCB2

Matthew 18 in the BOMCV

Matthew 18 in the BONAV

Matthew 18 in the BONCB

Matthew 18 in the BONLT

Matthew 18 in the BONUT2

Matthew 18 in the BOPLNT

Matthew 18 in the BOSCB

Matthew 18 in the BOSNC

Matthew 18 in the BOTLNT

Matthew 18 in the BOVCB

Matthew 18 in the BOYCB

Matthew 18 in the BPBB

Matthew 18 in the BPH

Matthew 18 in the BSB

Matthew 18 in the CCB

Matthew 18 in the CUV

Matthew 18 in the CUVS

Matthew 18 in the DBT

Matthew 18 in the DGDNT

Matthew 18 in the DHNT

Matthew 18 in the DNT

Matthew 18 in the ELBE

Matthew 18 in the EMTV

Matthew 18 in the ESV

Matthew 18 in the FBV

Matthew 18 in the FEB

Matthew 18 in the GGMNT

Matthew 18 in the GNT

Matthew 18 in the HARY

Matthew 18 in the HNT

Matthew 18 in the IRVA

Matthew 18 in the IRVB

Matthew 18 in the IRVG

Matthew 18 in the IRVH

Matthew 18 in the IRVK

Matthew 18 in the IRVM

Matthew 18 in the IRVM2

Matthew 18 in the IRVO

Matthew 18 in the IRVP

Matthew 18 in the IRVT

Matthew 18 in the IRVT2

Matthew 18 in the IRVU

Matthew 18 in the ISVN

Matthew 18 in the JSNT

Matthew 18 in the KAPI

Matthew 18 in the KBT1ETNIK

Matthew 18 in the KBV

Matthew 18 in the KJV

Matthew 18 in the KNFD

Matthew 18 in the LBA

Matthew 18 in the LBLA

Matthew 18 in the LNT

Matthew 18 in the LSV

Matthew 18 in the MAAL

Matthew 18 in the MBV

Matthew 18 in the MBV2

Matthew 18 in the MHNT

Matthew 18 in the MKNFD

Matthew 18 in the MNG

Matthew 18 in the MNT

Matthew 18 in the MNT2

Matthew 18 in the MRS1T

Matthew 18 in the NAA

Matthew 18 in the NASB

Matthew 18 in the NBLA

Matthew 18 in the NBS

Matthew 18 in the NBVTP

Matthew 18 in the NET2

Matthew 18 in the NIV11

Matthew 18 in the NNT

Matthew 18 in the NNT2

Matthew 18 in the NNT3

Matthew 18 in the PDDPT

Matthew 18 in the PFNT

Matthew 18 in the RMNT

Matthew 18 in the SBIAS

Matthew 18 in the SBIBS

Matthew 18 in the SBIBS2

Matthew 18 in the SBICS

Matthew 18 in the SBIDS

Matthew 18 in the SBIGS

Matthew 18 in the SBIHS

Matthew 18 in the SBIIS

Matthew 18 in the SBIIS2

Matthew 18 in the SBIIS3

Matthew 18 in the SBIKS

Matthew 18 in the SBIKS2

Matthew 18 in the SBIMS

Matthew 18 in the SBIOS

Matthew 18 in the SBIPS

Matthew 18 in the SBISS

Matthew 18 in the SBITS

Matthew 18 in the SBITS2

Matthew 18 in the SBITS3

Matthew 18 in the SBITS4

Matthew 18 in the SBIUS

Matthew 18 in the SBIVS

Matthew 18 in the SBT

Matthew 18 in the SBT1E

Matthew 18 in the SCHL

Matthew 18 in the SNT

Matthew 18 in the SUSU

Matthew 18 in the SUSU2

Matthew 18 in the SYNO

Matthew 18 in the TBIAOTANT

Matthew 18 in the TBT1E

Matthew 18 in the TBT1E2

Matthew 18 in the TFTIP

Matthew 18 in the TFTU

Matthew 18 in the TGNTATF3T

Matthew 18 in the THAI

Matthew 18 in the TNFD

Matthew 18 in the TNT

Matthew 18 in the TNTIK

Matthew 18 in the TNTIL

Matthew 18 in the TNTIN

Matthew 18 in the TNTIP

Matthew 18 in the TNTIZ

Matthew 18 in the TOMA

Matthew 18 in the TTENT

Matthew 18 in the UBG

Matthew 18 in the UGV

Matthew 18 in the UGV2

Matthew 18 in the UGV3

Matthew 18 in the VBL

Matthew 18 in the VDCC

Matthew 18 in the YALU

Matthew 18 in the YAPE

Matthew 18 in the YBVTP

Matthew 18 in the ZBP