Matthew 22 (BOICB)

1 Jisọs gwara ha okwu ọzọ nʼilu sị, 2 “Alaeze eluigwe dị ka otu eze, nke kwadoro oke oriri ọlụlụ di na nwunye, nʼihi nwa ya nwoke. 3 O zipụrụ ndị ohu ya ka ha gaa chetara ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa. Ma ha niile achọghị ịbịa. 4 “O zipụkwara ndị ohu ya ọzọ na-ejere ya ozi ka ha gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ oriri sị, ‘E dozichaala ihe oriri ugbu a, egburu m oke ehi, na anụ ọzọ gbara abụba. Edoziela ihe niile. Bịanụ nʼoriri ọlụlụ di na nwunye.’ 5 “Ma ndị ahụ niile a kpọrọ oriri gawaara mkpa ha nʼihi na ha akpọghị ya ihe ọbụla. Otu onye gara nʼala ubi ya, nke ọzọ nʼụlọ ahịa ya. 6 Ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mee ha ihe ihere ma gbukwaa ha. 7 Onye eze ahụ were iwe nke ukwuu, zipụ ndị agha ya ka ha gaa laa ndị ogbu mmadụ ahụ nʼiyi, rechapụkwa obodo ha nʼọkụ. 8 “Mgbe ahụ ọ gwara ndị ohu ya sị, ‘E doziela m oriri ọlụlụ di na nwunye, ma ndị a kpọrọ oku ekwesighị ekwesi. 9 Ugbu a, gaanụ nʼakụkụ ụzọ niile, kpọbatanụ ndị niile unu hụrụ, ka ha bịa nʼoriri ọlụlụ di na nwunye a.’ 10 Ndị ohu ahụ pụrụ gaa nʼokporoụzọ niile kpọbata mmadụ niile ha hụrụ. Ha kpọbatara ndị bụ ezi mmadụ na ndị bụ ajọ mmadụ. Ụlọ oriri ahụ jupụtakwara na ndị a kpọrọ. 11 “Ma mgbe eze ahụ batara ileta ndị niile nọ na nri, ọ hụrụ otu nwoke nke na-eyighị uwe ọlụlụ nwunye. 12 Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, ‘Enyi m, i si aṅaa bata nʼebe a mgbe ị na-eyighị uwe ọlụlụ di na nwunye?’ O mechiri ọnụ ya nʼihi na o nweghị ihe ọ ga-asa. 13 “Eze ahụ nyere ndị ozi ya iwu sị ha, ‘Keenụ ya eriri, aka na ụkwụ, tụpụkwanụ ya nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’ 14 “Nʼihi na akpọrọ ọtụtụ mmadụ oku, maọbụ mmadụ ole na ole ka a họọrọ.” 15 Mgbe ahụ ndị Farisii zukọtara na-achọ ụzọ ha ga-esi mee ka o kwuhie ọnụ ka ha site na ya jide ya. 16 Ha zigara ndị na-eso ụzọ ha na ndị nʼotu Herọd ka ha jụọ ya sị, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu, na ị na-ezikwa ụzọ Chineke nʼeziokwu. Ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ. 17 Ugbu a gwa anyị, gịnị bụ uche gị? O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?” 18 Ebe Jisọs maara ihe ọjọọ ha bu nʼobi, ọ zara sị ha, “Ndị ihu abụọ! Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? 19 Gosinụ m ego e ji akwụ ụgwọ ụtụ.” Ha wetaara ya otu mkpụrụ ego. 20 Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye ka e sekwasịrị onyinyo ya nʼelu ego a? Aha onye kwa dị nʼokpuru onyinyo a?” 21 Ha zara sị ya, “Ọ bụ nke Siza.”Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma. Nyenụ Siza ihe ruuru Siza, ma nyekwanụ Chineke ihe niile bụ nke ruuru Chineke.” 22 Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbagwojuru ha anya, nʼihi ya, ha hapụrụ ya pụọ. 23 Nʼụbọchị ahụ kwa, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya ịghụ ya ọnụ. 24 Onye ozizi, “Mosis kwuru sị, ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ka ọ mụtara nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ nwa. 25 Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa nʼetiti anyị. Onye nke mbụ lụrụ nwunye, nwụọ, ma ebe ọ dịghị ụmụ ọ mụtara, ọ hapụrụ nwanne ya nwunye ya. 26 Otu a ka nke abụọ mekwara, ma nke atọ, ruo na nke asaa. 27 Nʼikpeazụ, nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara. 28 Ugbu a, nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka nwanyị a ga-abụ, ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ndị a lụtụchara ya mgbe ọ nọ nʼụwa?” 29 Jisọs zara ha sị, “Unu na-ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu. Unu aghọtakwaghị ụdị ike Chineke nwere. 30 Nʼihi na mbilite nʼọnwụ, ịlụ di na nwunye agaghị adịkwa, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe. 31 Ma nʼihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ọ bụ na unu agụtabeghị ihe Chineke gwara unu sị, 32 Mụ onwe m bụ Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ.” 33 Mgbe igwe mmadụ ahụ nụrụ nke a, ozizi ya juru ha anya. 34 Ma mgbe ndị Farisii nụrụ na ọ emeela ka ndị Sadusii mechie ọnụ ha, ha gbakọtara otu ebe. 35 Otu onye nʼime ha, bụ onye ozizi iwu bịara jụọ ya ajụjụ iji nwaa ya: 36 “Onye ozizi, olee iwu nke kachasị mkpa nʼime iwu niile?” 37 Ọ zara sị ya, “ ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nʼanya site nʼobi gị niile na site na mkpụrụobi gị niile, na site nʼuche gị niile.’ 38 Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu niile. 39 Iwu ọzọ na-eso nke a nʼịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka i si hụ onwe gị nʼanya.’ 40 Iwu ndị ọzọ niile na ihe niile ndị amụma kwuru dabeere nʼebe iwu abụọ ndị a nọ.” 41 Mgbe ndị Farisii gbakọrọ nʼotu ebe, Jisọs jụrụ ha, 42 “Gịnị ka unu na-eche banyere Kraịst? Nwa onye ka ọ bụ?”Ha zara sị ya, “Ọ bụ nwa Devid.” 43 Ọ sịrị ha, “Gịnị mekwaranụ Devid site na ntụziaka nke Mmụọ Nsọ jiri kpọọ ya ‘Onyenwe m’? Nʼihi na ọ sịrị, 44 “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị ya, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’ 45 Ọ bụrụ na Devid kpọrọ ya ‘Onyenwe anyị,’ oleekwanụ otu o si bụrụkwa nwa ya?” 46 Ọ dịghị onye pụrụ ịsa ya okwu. Sitekwa nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị onye ọbụla nwere anya ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.

In Other Versions

Matthew 22 in the ANGEFD

Matthew 22 in the ANTPNG2D

Matthew 22 in the AS21

Matthew 22 in the BAGH

Matthew 22 in the BBPNG

Matthew 22 in the BBT1E

Matthew 22 in the BDS

Matthew 22 in the BEV

Matthew 22 in the BHAD

Matthew 22 in the BIB

Matthew 22 in the BLPT

Matthew 22 in the BNT

Matthew 22 in the BNTABOOT

Matthew 22 in the BNTLV

Matthew 22 in the BOATCB

Matthew 22 in the BOATCB2

Matthew 22 in the BOBCV

Matthew 22 in the BOCNT

Matthew 22 in the BOECS

Matthew 22 in the BOGWICC

Matthew 22 in the BOHCB

Matthew 22 in the BOHCV

Matthew 22 in the BOHLNT

Matthew 22 in the BOHNTLTAL

Matthew 22 in the BOILNTAP

Matthew 22 in the BOITCV

Matthew 22 in the BOKCV

Matthew 22 in the BOKCV2

Matthew 22 in the BOKHWOG

Matthew 22 in the BOKSSV

Matthew 22 in the BOLCB

Matthew 22 in the BOLCB2

Matthew 22 in the BOMCV

Matthew 22 in the BONAV

Matthew 22 in the BONCB

Matthew 22 in the BONLT

Matthew 22 in the BONUT2

Matthew 22 in the BOPLNT

Matthew 22 in the BOSCB

Matthew 22 in the BOSNC

Matthew 22 in the BOTLNT

Matthew 22 in the BOVCB

Matthew 22 in the BOYCB

Matthew 22 in the BPBB

Matthew 22 in the BPH

Matthew 22 in the BSB

Matthew 22 in the CCB

Matthew 22 in the CUV

Matthew 22 in the CUVS

Matthew 22 in the DBT

Matthew 22 in the DGDNT

Matthew 22 in the DHNT

Matthew 22 in the DNT

Matthew 22 in the ELBE

Matthew 22 in the EMTV

Matthew 22 in the ESV

Matthew 22 in the FBV

Matthew 22 in the FEB

Matthew 22 in the GGMNT

Matthew 22 in the GNT

Matthew 22 in the HARY

Matthew 22 in the HNT

Matthew 22 in the IRVA

Matthew 22 in the IRVB

Matthew 22 in the IRVG

Matthew 22 in the IRVH

Matthew 22 in the IRVK

Matthew 22 in the IRVM

Matthew 22 in the IRVM2

Matthew 22 in the IRVO

Matthew 22 in the IRVP

Matthew 22 in the IRVT

Matthew 22 in the IRVT2

Matthew 22 in the IRVU

Matthew 22 in the ISVN

Matthew 22 in the JSNT

Matthew 22 in the KAPI

Matthew 22 in the KBT1ETNIK

Matthew 22 in the KBV

Matthew 22 in the KJV

Matthew 22 in the KNFD

Matthew 22 in the LBA

Matthew 22 in the LBLA

Matthew 22 in the LNT

Matthew 22 in the LSV

Matthew 22 in the MAAL

Matthew 22 in the MBV

Matthew 22 in the MBV2

Matthew 22 in the MHNT

Matthew 22 in the MKNFD

Matthew 22 in the MNG

Matthew 22 in the MNT

Matthew 22 in the MNT2

Matthew 22 in the MRS1T

Matthew 22 in the NAA

Matthew 22 in the NASB

Matthew 22 in the NBLA

Matthew 22 in the NBS

Matthew 22 in the NBVTP

Matthew 22 in the NET2

Matthew 22 in the NIV11

Matthew 22 in the NNT

Matthew 22 in the NNT2

Matthew 22 in the NNT3

Matthew 22 in the PDDPT

Matthew 22 in the PFNT

Matthew 22 in the RMNT

Matthew 22 in the SBIAS

Matthew 22 in the SBIBS

Matthew 22 in the SBIBS2

Matthew 22 in the SBICS

Matthew 22 in the SBIDS

Matthew 22 in the SBIGS

Matthew 22 in the SBIHS

Matthew 22 in the SBIIS

Matthew 22 in the SBIIS2

Matthew 22 in the SBIIS3

Matthew 22 in the SBIKS

Matthew 22 in the SBIKS2

Matthew 22 in the SBIMS

Matthew 22 in the SBIOS

Matthew 22 in the SBIPS

Matthew 22 in the SBISS

Matthew 22 in the SBITS

Matthew 22 in the SBITS2

Matthew 22 in the SBITS3

Matthew 22 in the SBITS4

Matthew 22 in the SBIUS

Matthew 22 in the SBIVS

Matthew 22 in the SBT

Matthew 22 in the SBT1E

Matthew 22 in the SCHL

Matthew 22 in the SNT

Matthew 22 in the SUSU

Matthew 22 in the SUSU2

Matthew 22 in the SYNO

Matthew 22 in the TBIAOTANT

Matthew 22 in the TBT1E

Matthew 22 in the TBT1E2

Matthew 22 in the TFTIP

Matthew 22 in the TFTU

Matthew 22 in the TGNTATF3T

Matthew 22 in the THAI

Matthew 22 in the TNFD

Matthew 22 in the TNT

Matthew 22 in the TNTIK

Matthew 22 in the TNTIL

Matthew 22 in the TNTIN

Matthew 22 in the TNTIP

Matthew 22 in the TNTIZ

Matthew 22 in the TOMA

Matthew 22 in the TTENT

Matthew 22 in the UBG

Matthew 22 in the UGV

Matthew 22 in the UGV2

Matthew 22 in the UGV3

Matthew 22 in the VBL

Matthew 22 in the VDCC

Matthew 22 in the YALU

Matthew 22 in the YAPE

Matthew 22 in the YBVTP

Matthew 22 in the ZBP