Matthew 5 (BOICB)

1 Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, 2 o bido ikuziri ha ihe.Ọ sịrị: 3 “Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. 4 Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ, nʼihi na a ga-akasị ha obi. 5 Ngọzị na-adịrị ndị dị nwayọọ nʼobi, nʼihi na ha ga-eketa ụwa. 6 Ngọzị na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, nʼihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju. 7 Ngọzị na-adịrị ndị na-eme obi ebere, nʼihi na ha ka a ga-emere ebere. 8 Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi, nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya. 9 Ngọzị na-adịrị ndị na-eme ka udo dị nʼetiti mmadụ na ibe ya, nʼihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke. 10 Ngọzị na-adịrị ndị a na-emegbu nʼihi ezi omume, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. 11 “Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu, na-emegbu unu, ma na-ekwukwa okwu ọjọọ na ụgha niile dị iche iche megide unu nʼihi m. 12 Ṅụrịanụ ọnụ, nwekwanụ obi ụtọ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na nʼụzọ dị otu a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ. 13 “Unu bụ nnu nke ụwa, ma ọ bụrụ na nnu adịghị atọkwa ụtọ, a ga-eji gịnị mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ọ bakwaghị uru ọbụla, ma ọ bụghị naanị itufu ya, ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ. 14 “Unu bụ ihe nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nʼelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo. 15 Ndị mmadụ adịghị amụnye oriọna dọnye ya nʼokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba oriọna, ka o nye ndị niile nọ nʼụlọ ahụ ìhè. 16 Ya mere, kwerenụ ka ìhè unu nwuo nye mmadụ niile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu nke bi nʼeluigwe. 17 “Unu echela na m bịara ịkagbu iwu Mosis, maọbụ ozizi ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha. 18 Nʼezie, agwa m unu, na tutu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị otu mkpụrụ edemede ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, nke a ga-esi nʼIwu a wepụ ruo mgbe ha niile ga emezu. 19 Nʼihi ya, onye ọbụla nke ga-emebi otu nʼime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, ma kuziekwara ndị ọzọ ime otu ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi ụmụ mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu ndị ahụ nʼonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nʼalaeze eluigwe. 20 Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị ịba nʼalaeze eluigwe ma ọlị. 21 “Unu nụrụ na-agwara ndị mmadụ nʼoge gara aga, sị, ‘Onye egbula mmadụ, onye ọbụla gburu mmadụ a ga-ekpe ya ikpe.’ 22 Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘Raka,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’ na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ. 23 “Ya mere, ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nʼebe ịchụ aja, ma cheta nʼebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nʼudo, 24 hapụ onyinye gị nʼebe ịchụ aja, laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu mere udo, laghachi bịa nye onyinye gị. 25 “Mee ọsịịsọ ka gị na onye kpọ gị eje ụlọ ikpe kpezie, mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nʼaka ọkaikpe, onye ga-enyefe gị nʼaka ndị nche, ma eleghị anya etinye gị nʼụlọ mkpọrọ. 26 Nʼezie, agwa m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri kobo niile i ji. 27 “Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Akwala iko.’ 28 Ma asị m unu, onye ọbụla lere nwanyị anya site na-agụụ ịkwa iko emeelarị mmehie ịkwa iko nʼime obi ya megide nwanyị ahụ. 29 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị baa nʼalaeze karịa na i ji ahụ zuruoke baa nʼọkụ ala mmụọ. 30 Ọ bụrụ na aka nri gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị ma baa nʼalaeze eluigwe, karịa na i ji ahụ zuruoke ma baa nʼọkụ ala mmụọ. 31 “E kwukwara sị, ‘Onye ọbụla chọrọ ịgbara nwunye ya alụkwaghị m, ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya.’ 32 Ma asị m unu, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ma ọ bụghị nʼihi ịkwa iko, ọ na-etinye nwanyị ahụ nʼọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko. 33 “Ọzọkwa, unu nụrụ na a gwara ndị mmadụ nʼoge gara aga sị, ‘Aṅụla iyi ụgha, kama mezuo ihe niile unu ṅụrụ nʼiyi nye Onyenwe anyị.’ 34 Ma asị m unu aṅụla iyi ọbụla. Ejikwala eluigwe aṅụ iyi nʼihi na eluigwe bụ ebe ocheeze Chineke dị. 35 Ejikwala ụwa aṅụ iyi nʼihi na ụwa bụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya. Ejikwala Jerusalem aṅụ iyi nʼihi na ọ bụ obodo Eze ukwu ahụ. 36 Ejikwala isi gị aṅụ iyi nʼihi na ị pụghị ime ka otu agịrị isi gị dị ọcha maọbụ dị oji. 37 Aṅụla iyi ọbụla. Kama ka okwu unu bụrụ ‘E’ maọbụ ‘Ee’; ihe ọbụla gafere nke a sitere nʼaka ajọ onye ahụ. 38 “Unu anụla na e kwuru sị, ‘Ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze.’ 39 Ma ana m asị unu eguzogidela onye bụ ajọ onye. Kama ọ bụrụ na mmadụ amaa gị ụra na ntị aka nri, tụgharịara ya ntị nke ọzọ. 40 Ọ bụrụ na mmadụ agbaa gị akwụkwọ nʼụlọikpe, ka ọ nara gị uwe ime gị, nyekwa ya uwe nke elu gị. 41 Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼike chọọ ka i soro ya gaa puku nzọ ụkwụ atọ, soro ya gaa puku nzọ ụkwụ isii. 42 Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka i binye ha ego. 43 “Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya, ma kpọkwanụ ndị iro unu asị.’ 44 Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nʼanya, kpekwaaranụ ndị na-esogbu unu ekpere. 45 Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke Nna unu bi nʼeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọrọ ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume. 46 Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-emekwa otu a. 47 Ọ bụrụkwa na unu na-ekele naanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọbụla dị iche nʼebe unu na ndị ọzọ nọ. Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ. 48 Ya mere, unu kwesiri izuoke nʼịrụ ọrụ ọma, dịka Nna unu bi nʼeluigwe si zukwaa oke.

In Other Versions

Matthew 5 in the ANGEFD

Matthew 5 in the ANTPNG2D

Matthew 5 in the AS21

Matthew 5 in the BAGH

Matthew 5 in the BBPNG

Matthew 5 in the BBT1E

Matthew 5 in the BDS

Matthew 5 in the BEV

Matthew 5 in the BHAD

Matthew 5 in the BIB

Matthew 5 in the BLPT

Matthew 5 in the BNT

Matthew 5 in the BNTABOOT

Matthew 5 in the BNTLV

Matthew 5 in the BOATCB

Matthew 5 in the BOATCB2

Matthew 5 in the BOBCV

Matthew 5 in the BOCNT

Matthew 5 in the BOECS

Matthew 5 in the BOGWICC

Matthew 5 in the BOHCB

Matthew 5 in the BOHCV

Matthew 5 in the BOHLNT

Matthew 5 in the BOHNTLTAL

Matthew 5 in the BOILNTAP

Matthew 5 in the BOITCV

Matthew 5 in the BOKCV

Matthew 5 in the BOKCV2

Matthew 5 in the BOKHWOG

Matthew 5 in the BOKSSV

Matthew 5 in the BOLCB

Matthew 5 in the BOLCB2

Matthew 5 in the BOMCV

Matthew 5 in the BONAV

Matthew 5 in the BONCB

Matthew 5 in the BONLT

Matthew 5 in the BONUT2

Matthew 5 in the BOPLNT

Matthew 5 in the BOSCB

Matthew 5 in the BOSNC

Matthew 5 in the BOTLNT

Matthew 5 in the BOVCB

Matthew 5 in the BOYCB

Matthew 5 in the BPBB

Matthew 5 in the BPH

Matthew 5 in the BSB

Matthew 5 in the CCB

Matthew 5 in the CUV

Matthew 5 in the CUVS

Matthew 5 in the DBT

Matthew 5 in the DGDNT

Matthew 5 in the DHNT

Matthew 5 in the DNT

Matthew 5 in the ELBE

Matthew 5 in the EMTV

Matthew 5 in the ESV

Matthew 5 in the FBV

Matthew 5 in the FEB

Matthew 5 in the GGMNT

Matthew 5 in the GNT

Matthew 5 in the HARY

Matthew 5 in the HNT

Matthew 5 in the IRVA

Matthew 5 in the IRVB

Matthew 5 in the IRVG

Matthew 5 in the IRVH

Matthew 5 in the IRVK

Matthew 5 in the IRVM

Matthew 5 in the IRVM2

Matthew 5 in the IRVO

Matthew 5 in the IRVP

Matthew 5 in the IRVT

Matthew 5 in the IRVT2

Matthew 5 in the IRVU

Matthew 5 in the ISVN

Matthew 5 in the JSNT

Matthew 5 in the KAPI

Matthew 5 in the KBT1ETNIK

Matthew 5 in the KBV

Matthew 5 in the KJV

Matthew 5 in the KNFD

Matthew 5 in the LBA

Matthew 5 in the LBLA

Matthew 5 in the LNT

Matthew 5 in the LSV

Matthew 5 in the MAAL

Matthew 5 in the MBV

Matthew 5 in the MBV2

Matthew 5 in the MHNT

Matthew 5 in the MKNFD

Matthew 5 in the MNG

Matthew 5 in the MNT

Matthew 5 in the MNT2

Matthew 5 in the MRS1T

Matthew 5 in the NAA

Matthew 5 in the NASB

Matthew 5 in the NBLA

Matthew 5 in the NBS

Matthew 5 in the NBVTP

Matthew 5 in the NET2

Matthew 5 in the NIV11

Matthew 5 in the NNT

Matthew 5 in the NNT2

Matthew 5 in the NNT3

Matthew 5 in the PDDPT

Matthew 5 in the PFNT

Matthew 5 in the RMNT

Matthew 5 in the SBIAS

Matthew 5 in the SBIBS

Matthew 5 in the SBIBS2

Matthew 5 in the SBICS

Matthew 5 in the SBIDS

Matthew 5 in the SBIGS

Matthew 5 in the SBIHS

Matthew 5 in the SBIIS

Matthew 5 in the SBIIS2

Matthew 5 in the SBIIS3

Matthew 5 in the SBIKS

Matthew 5 in the SBIKS2

Matthew 5 in the SBIMS

Matthew 5 in the SBIOS

Matthew 5 in the SBIPS

Matthew 5 in the SBISS

Matthew 5 in the SBITS

Matthew 5 in the SBITS2

Matthew 5 in the SBITS3

Matthew 5 in the SBITS4

Matthew 5 in the SBIUS

Matthew 5 in the SBIVS

Matthew 5 in the SBT

Matthew 5 in the SBT1E

Matthew 5 in the SCHL

Matthew 5 in the SNT

Matthew 5 in the SUSU

Matthew 5 in the SUSU2

Matthew 5 in the SYNO

Matthew 5 in the TBIAOTANT

Matthew 5 in the TBT1E

Matthew 5 in the TBT1E2

Matthew 5 in the TFTIP

Matthew 5 in the TFTU

Matthew 5 in the TGNTATF3T

Matthew 5 in the THAI

Matthew 5 in the TNFD

Matthew 5 in the TNT

Matthew 5 in the TNTIK

Matthew 5 in the TNTIL

Matthew 5 in the TNTIN

Matthew 5 in the TNTIP

Matthew 5 in the TNTIZ

Matthew 5 in the TOMA

Matthew 5 in the TTENT

Matthew 5 in the UBG

Matthew 5 in the UGV

Matthew 5 in the UGV2

Matthew 5 in the UGV3

Matthew 5 in the VBL

Matthew 5 in the VDCC

Matthew 5 in the YALU

Matthew 5 in the YAPE

Matthew 5 in the YBVTP

Matthew 5 in the ZBP