Psalms 105 (BOICB)

1 Nyenụ ONYENWE ANYỊ otuto, kwupụtakwa aha ya.Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ. 2 Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto;kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile. 3 Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya;ka obi ndị niile na-achọ ONYENWE ANYỊ ṅụrịa. 4 Na-achọnụ ONYENWE ANYỊ na ike ya,chọọnụ ihu ya mgbe niile. 5 Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ,ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta, 6 unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya,unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara. 7 Ya onwe ya bụ ONYENWE ANYỊ Chineke anyị;ikpe ya dị nʼụwa niile. 8 Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi,bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ, 9 ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbarana iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik. 10 O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ,ma nʼebe Izrel nọ, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi: 11 “Aga m enye gị ala Kenandịka oke i ga-eketa.” 12 Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ,nʼezie ha dị ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼime ya. 13 Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa na mba ọzọ,sitekwa nʼotu alaeze gaa alaeze ọzọ. 14 O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ;ọ baara ndị eze mba nʼihi ha; 15 sị, “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka;unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.” 16 O zitere ụnwụ nʼala ahụ,bibie ụzọ niile ha si enweta ihe oriri; 17 o zipụrụ otu nwoke ka ọ gaa nʼihu ha,Josef, onye e refuru dịka ohu. 18 Ha ji mkpọrọ igwe merụọ ya ahụ nʼụkwụ,nyanyekwa ya mkpọrọ igwe nʼolu, 19 tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru,tutu ruo mgbe okwu ONYENWE ANYỊ nwapụtara ya dịka onye eziokwu. 20 Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya,onye ahụ na-achị ndị dị iche iche mere ka o nwere onwe ya. 21 O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya,onye na-achị ihe niile o nwere, 22 ikuziri ụmụ eze ndị ikom dịka o si masị ya,na izi ndị okenye ya amamihe. 23 Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt;Jekọb bikwara nʼala Ham dịka onye si mba ọzọ bịa. 24 ONYENWE ANYỊ mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu;o mere ka ndị ya dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị iro ha, 25 ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị,ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya. 26 O zipụrụ Mosis, ohu ya,na Erọn, onye ọ họpụtara. 27 Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha,ọrụ ebube ya dị iche iche nʼala Ham. 28 O zipụrụ ọchịchịrị, mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị,nʼihi na ha nupuru isi megide okwu ya. 29 O mere ka mmiri ha niile ghọọ ọbara,nke mere ka azụ niile dị nʼime ya nwụsịa. 30 Ala ha niile jupụtara nʼawọọ bụladị nʼime ọnụụlọ ndina nke ndị na-achị achị. 31 O kwuru okwu, igwe ijiji na anwụ ntadị iche iche ejupụta nʼala ha niile. 32 Nʼọnọdụ mmiri ozuzo, o zitere hamkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe nʼala ha niile; 33 o tijisịrị osisi vaịnị na osisi fiig niile ha,kwatusịakwa osisi niile dị nʼala ha. 34 O kwuru okwu, igurube na ụkpanaa na-apụghị ịgụta ọnụ jupụtara ebe niile; 35 ha richapụrụ ihe niile bụ ahịhịa ndụ dị nʼala ahụ,ripịakwa mkpụrụ niile ha kụrụ nʼubi ha. 36 Mgbe ahụ, o gburu ndị niile e buru ụzọ mụọ nʼala ahụ,mkpụrụ mbụ nke ndị ikom ha. 37 Ọ kpọpụtara ụmụ Izrel, ndị chịịrị ọlaọcha na ọlaedo,ọ dịghị otu onye nʼime ebo ya niile nke ahụ na-esighị ike. 38 Obi dị Ijipt ụtọ mgbe ha pụrụ,nʼihi na oke egwu ndị Izrel dakwasịrị ha. 39 Ọ gbasara igwe ojii dịka ihe mkpuchi,na ọkụ na-enye ìhè nʼabalị. 40 Ha rịọrọ ya, o zitere ha ụmụ nnụnụ kweel,jirikwa achịcha si nʼeluigwe nyejuo ha afọ. 41 O tiwara nkume ahụ, mmiri sọpụtara;ọ sọgharịrị nʼime ọzara dịka iyi. 42 Nʼihi na o chetara nkwa ya dị nsọ,nke o kwere ohu ya Ebraham. 43 O ji aṅụrị dupụta ndị ya,jirikwa ọnọdụ iti mkpu ọṅụ dupụta ndị ya ọ họpụtara; 44 o nyere ha ala niile nke mba dị iche iche,ha ghọrọ ndị nnweta nke ihe ndị ọzọ rụpụta, 45 ka ha nwee ike debe ụkpụrụ ya niilema na-erubekwa isi nʼiwu ya niile. Toonu ONYENWE ANYỊ.

In Other Versions

Psalms 105 in the ANGEFD

Psalms 105 in the ANTPNG2D

Psalms 105 in the AS21

Psalms 105 in the BAGH

Psalms 105 in the BBPNG

Psalms 105 in the BBT1E

Psalms 105 in the BDS

Psalms 105 in the BEV

Psalms 105 in the BHAD

Psalms 105 in the BIB

Psalms 105 in the BLPT

Psalms 105 in the BNT

Psalms 105 in the BNTABOOT

Psalms 105 in the BNTLV

Psalms 105 in the BOATCB

Psalms 105 in the BOATCB2

Psalms 105 in the BOBCV

Psalms 105 in the BOCNT

Psalms 105 in the BOECS

Psalms 105 in the BOGWICC

Psalms 105 in the BOHCB

Psalms 105 in the BOHCV

Psalms 105 in the BOHLNT

Psalms 105 in the BOHNTLTAL

Psalms 105 in the BOILNTAP

Psalms 105 in the BOITCV

Psalms 105 in the BOKCV

Psalms 105 in the BOKCV2

Psalms 105 in the BOKHWOG

Psalms 105 in the BOKSSV

Psalms 105 in the BOLCB

Psalms 105 in the BOLCB2

Psalms 105 in the BOMCV

Psalms 105 in the BONAV

Psalms 105 in the BONCB

Psalms 105 in the BONLT

Psalms 105 in the BONUT2

Psalms 105 in the BOPLNT

Psalms 105 in the BOSCB

Psalms 105 in the BOSNC

Psalms 105 in the BOTLNT

Psalms 105 in the BOVCB

Psalms 105 in the BOYCB

Psalms 105 in the BPBB

Psalms 105 in the BPH

Psalms 105 in the BSB

Psalms 105 in the CCB

Psalms 105 in the CUV

Psalms 105 in the CUVS

Psalms 105 in the DBT

Psalms 105 in the DGDNT

Psalms 105 in the DHNT

Psalms 105 in the DNT

Psalms 105 in the ELBE

Psalms 105 in the EMTV

Psalms 105 in the ESV

Psalms 105 in the FBV

Psalms 105 in the FEB

Psalms 105 in the GGMNT

Psalms 105 in the GNT

Psalms 105 in the HARY

Psalms 105 in the HNT

Psalms 105 in the IRVA

Psalms 105 in the IRVB

Psalms 105 in the IRVG

Psalms 105 in the IRVH

Psalms 105 in the IRVK

Psalms 105 in the IRVM

Psalms 105 in the IRVM2

Psalms 105 in the IRVO

Psalms 105 in the IRVP

Psalms 105 in the IRVT

Psalms 105 in the IRVT2

Psalms 105 in the IRVU

Psalms 105 in the ISVN

Psalms 105 in the JSNT

Psalms 105 in the KAPI

Psalms 105 in the KBT1ETNIK

Psalms 105 in the KBV

Psalms 105 in the KJV

Psalms 105 in the KNFD

Psalms 105 in the LBA

Psalms 105 in the LBLA

Psalms 105 in the LNT

Psalms 105 in the LSV

Psalms 105 in the MAAL

Psalms 105 in the MBV

Psalms 105 in the MBV2

Psalms 105 in the MHNT

Psalms 105 in the MKNFD

Psalms 105 in the MNG

Psalms 105 in the MNT

Psalms 105 in the MNT2

Psalms 105 in the MRS1T

Psalms 105 in the NAA

Psalms 105 in the NASB

Psalms 105 in the NBLA

Psalms 105 in the NBS

Psalms 105 in the NBVTP

Psalms 105 in the NET2

Psalms 105 in the NIV11

Psalms 105 in the NNT

Psalms 105 in the NNT2

Psalms 105 in the NNT3

Psalms 105 in the PDDPT

Psalms 105 in the PFNT

Psalms 105 in the RMNT

Psalms 105 in the SBIAS

Psalms 105 in the SBIBS

Psalms 105 in the SBIBS2

Psalms 105 in the SBICS

Psalms 105 in the SBIDS

Psalms 105 in the SBIGS

Psalms 105 in the SBIHS

Psalms 105 in the SBIIS

Psalms 105 in the SBIIS2

Psalms 105 in the SBIIS3

Psalms 105 in the SBIKS

Psalms 105 in the SBIKS2

Psalms 105 in the SBIMS

Psalms 105 in the SBIOS

Psalms 105 in the SBIPS

Psalms 105 in the SBISS

Psalms 105 in the SBITS

Psalms 105 in the SBITS2

Psalms 105 in the SBITS3

Psalms 105 in the SBITS4

Psalms 105 in the SBIUS

Psalms 105 in the SBIVS

Psalms 105 in the SBT

Psalms 105 in the SBT1E

Psalms 105 in the SCHL

Psalms 105 in the SNT

Psalms 105 in the SUSU

Psalms 105 in the SUSU2

Psalms 105 in the SYNO

Psalms 105 in the TBIAOTANT

Psalms 105 in the TBT1E

Psalms 105 in the TBT1E2

Psalms 105 in the TFTIP

Psalms 105 in the TFTU

Psalms 105 in the TGNTATF3T

Psalms 105 in the THAI

Psalms 105 in the TNFD

Psalms 105 in the TNT

Psalms 105 in the TNTIK

Psalms 105 in the TNTIL

Psalms 105 in the TNTIN

Psalms 105 in the TNTIP

Psalms 105 in the TNTIZ

Psalms 105 in the TOMA

Psalms 105 in the TTENT

Psalms 105 in the UBG

Psalms 105 in the UGV

Psalms 105 in the UGV2

Psalms 105 in the UGV3

Psalms 105 in the VBL

Psalms 105 in the VDCC

Psalms 105 in the YALU

Psalms 105 in the YAPE

Psalms 105 in the YBVTP

Psalms 105 in the ZBP