Psalms 68 (BOICB)

undefined Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Abụ Ọma. Otu Abụ. 1 Ka Chineke bilie, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị;ka ndị iro ya site nʼihu ya gbalaga. 2 Dịka ikuku si achụsa anwụrụ ọkụ, sikwa otu a chụsaa ha.Dịka mmanụ na-ehi ụra si agbaze nʼọkụ,ka ndị na-eme ihe ọjọọ laa nʼiyi nʼihu Chineke. 3 Ka ndị ezi omume bụrụ ndị nwere obi ụtọ,ma ṅụrịa nʼihu Chineke;ka ha bụrụ ndị nwere obi ụtọ, jupụtakwa nʼọṅụ. 4 Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto,toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya, ONYENWE ANYỊ bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya. 5 Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha,onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ. 6 Chineke na-eme ka ndị naanị ha nọ nwee ezinaụlọ,ọ na-eji ịbụ abụ dupụta ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ,ma ndị nnupu isi ka ọ na-eme ka ha biri, nʼala kpọrọ nkụ. 7 Mgbe i buteere ndị gị ụzọ, O Chineke,mgbe i gabigara nʼala tọgbọrọ nʼefu, Sela 8 elu ụwa mara jijiji, eluigwe wụpụrụ mmiri ozuzo,nʼihu Chineke, Onye Saịnaị,nʼihu Chineke, Chineke nke Izrel. 9 I nyere mmiri ozuzo nʼebe ọ dị ukwuu, O Chineke,i tutere ihe nketa gị nke ike gwụrụ. 10 Ndị gị biri nʼime ya,site nʼoke akụnụba gị, O Chineke, ị rọpụtaara ndị ogbenye mkpa ha. 11 Onyenwe anyị kpọsara okwu ahụ,ọnụọgụgụ ndị inyom kwusara ya bụ igwe dị ọtụtụ; 12 ndị eze na ndị agha ha ji ọsọ gbalaa;ndị mmadụ kere ihe a dọtara nʼagha, nʼime ọmụma ụlọ ikwu. 13 Ọ bụladị mgbe ị na-arahụ ụra nʼetiti ọgba atụrụ,nku abụọ nke nduru m bụ ihe e ji ọlaọcha kpuchie,jirikwa ọlaedo nke na-enwuke kpuchie abụba ya. 14 Mgbe Onye pụrụ ime ihe niile chụsasịrị ndị eze bi nʼala a,ọ dị ka snoo dara nʼelu Zalmon. 15 Ugwu Bashan, ugwu mara mma nke ukwuu,ugwu Bashan, ugwu nwere nʼelu ya ọtụtụ ugwu dị iche iche. 16 Gị ugwu nwere ọtụtụ ugwu, gịnị mere i ji ele anya site nʼekworonʼugwu Chineke họọrọ ị bụ ebe ọ ga-anọ chịa,ebe ONYENWE ANYỊ nʼonwe ya ga-ebi, ruo ebighị ebi? 17 Ọnụọgụgụ ụgbọ agha Chineke dị iri puku kwụrụ puku, a pụghị ịgụta ha;ha dịkwa puku kwụrụ puku;Onyenwe anyị sitere Saịnaị bata nʼụlọnsọ ya. 18 Mgbe i rigoro gaa nʼelu,i duuru ndị a dọtara nʼagha;ị natara onyinye dị iche iche nʼaka ndị mmadụ,ọ bụladị nʼaka ndị na-enupu isi,ka gị, O ONYENWE ANYỊ Chineke, biri nʼebe ahụ. 19 Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke anyị, na Onye Nzọpụta anyị,Onye na-ebu ibu arọ anyị ụbọchị niile. Sela 20 Chineke anyị bụ Chineke na-azọpụta;mgbapụta pụọ nʼọnwụ na-esite nʼaka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ. 21 Nʼezie, Chineke ga-egwepịa isi ndị iro ya niile,isi ndị niile na-aga nʼihu ibi ndụ mmehie. 22 Onyenwe anyị kwuru sị, “Aga m esite na Bashan kpọlata ha,aga m adọpụta ha site nʼebe omimi nke osimiri, 23 ka unu nwee ike saa ụkwụ unu nʼime ọbara ndị iro unu,ka ire nkịta unu niile ketakwa oke nke ha.” 24 O Chineke, ahụla igwe ahịrị mmadụ ndị na-eso gị,bụ igwe ahịrị mmadụ nke so Chineke m, na Eze m na-aba nʼebe nsọ ahụ. 25 Ndị na-abụ abụ nọ nʼihu, ndị na-eti egwu, na-eso ha nʼazụ;ụmụ agbọghọ na-akpọ ụbọ sokwa ha. 26 Too Chineke nʼetiti nzukọ ukwuu ahụ;toonu ONYENWE ANYỊ nʼetiti nzukọ ụmụ Izrel. 27 Lee Benjamin bụ agbụrụ dịkarịsịrị nta, ka ọ na-edu ha,lekwaa igwe ụmụ ndị eze Judana nke Zebụlọn na Naftalị. 28 O Chineke, kpọlite ike gị;mee ka ike gị pụta ìhè, O Chineke, dịka i mere na mbụ. 29 Nʼihi ụlọnsọ ukwu gị nke dị na Jerusalem,ndị eze ga-ewetara gị onyinye dị iche iche. 30 Baara anụ ọhịa ahụ zoro nʼetiti riidi mba,igwe oke ehi nọ nʼetiti ụmụ ehi nke mba niile.Site na nweda nʼala, ka o wetara gị ogbe ọlaọcha.Chụsasịa mba niile, bụ ndị na-enwe mmasị nʼibu agha. 31 Ndị nnọchi anya obodo, ga-esite nʼIjipt bịa,Kush ga-etinye onwe ya nʼokpuru Chineke. 32 Bụkuo Chineke abụ, unu alaeze niile nke ụwa,bụkuo Onyenwe anyị abụ otuto, Sela 33 Bụọ abụ nye onye na-agba ịnyịnya nʼeluigwe, e, ọ bụladị eluigwe nke dịrị site na mgbe ochie,onye olu ike ya dịka egbe eluigwe. 34 Kwusaa ike Chineke,onye ịdị ukwuu nke ịma mma ya na-ekpuchi Izrel,onye ike ya dị nʼeluigwe. 35 O Chineke, ị dị oke egwu nʼime ụlọnsọ gị;Chineke nke Izrel na-enye ndị ya ume na ike. Toonu Chineke!

In Other Versions

Psalms 68 in the ANGEFD

Psalms 68 in the ANTPNG2D

Psalms 68 in the AS21

Psalms 68 in the BAGH

Psalms 68 in the BBPNG

Psalms 68 in the BBT1E

Psalms 68 in the BDS

Psalms 68 in the BEV

Psalms 68 in the BHAD

Psalms 68 in the BIB

Psalms 68 in the BLPT

Psalms 68 in the BNT

Psalms 68 in the BNTABOOT

Psalms 68 in the BNTLV

Psalms 68 in the BOATCB

Psalms 68 in the BOATCB2

Psalms 68 in the BOBCV

Psalms 68 in the BOCNT

Psalms 68 in the BOECS

Psalms 68 in the BOGWICC

Psalms 68 in the BOHCB

Psalms 68 in the BOHCV

Psalms 68 in the BOHLNT

Psalms 68 in the BOHNTLTAL

Psalms 68 in the BOILNTAP

Psalms 68 in the BOITCV

Psalms 68 in the BOKCV

Psalms 68 in the BOKCV2

Psalms 68 in the BOKHWOG

Psalms 68 in the BOKSSV

Psalms 68 in the BOLCB

Psalms 68 in the BOLCB2

Psalms 68 in the BOMCV

Psalms 68 in the BONAV

Psalms 68 in the BONCB

Psalms 68 in the BONLT

Psalms 68 in the BONUT2

Psalms 68 in the BOPLNT

Psalms 68 in the BOSCB

Psalms 68 in the BOSNC

Psalms 68 in the BOTLNT

Psalms 68 in the BOVCB

Psalms 68 in the BOYCB

Psalms 68 in the BPBB

Psalms 68 in the BPH

Psalms 68 in the BSB

Psalms 68 in the CCB

Psalms 68 in the CUV

Psalms 68 in the CUVS

Psalms 68 in the DBT

Psalms 68 in the DGDNT

Psalms 68 in the DHNT

Psalms 68 in the DNT

Psalms 68 in the ELBE

Psalms 68 in the EMTV

Psalms 68 in the ESV

Psalms 68 in the FBV

Psalms 68 in the FEB

Psalms 68 in the GGMNT

Psalms 68 in the GNT

Psalms 68 in the HARY

Psalms 68 in the HNT

Psalms 68 in the IRVA

Psalms 68 in the IRVB

Psalms 68 in the IRVG

Psalms 68 in the IRVH

Psalms 68 in the IRVK

Psalms 68 in the IRVM

Psalms 68 in the IRVM2

Psalms 68 in the IRVO

Psalms 68 in the IRVP

Psalms 68 in the IRVT

Psalms 68 in the IRVT2

Psalms 68 in the IRVU

Psalms 68 in the ISVN

Psalms 68 in the JSNT

Psalms 68 in the KAPI

Psalms 68 in the KBT1ETNIK

Psalms 68 in the KBV

Psalms 68 in the KJV

Psalms 68 in the KNFD

Psalms 68 in the LBA

Psalms 68 in the LBLA

Psalms 68 in the LNT

Psalms 68 in the LSV

Psalms 68 in the MAAL

Psalms 68 in the MBV

Psalms 68 in the MBV2

Psalms 68 in the MHNT

Psalms 68 in the MKNFD

Psalms 68 in the MNG

Psalms 68 in the MNT

Psalms 68 in the MNT2

Psalms 68 in the MRS1T

Psalms 68 in the NAA

Psalms 68 in the NASB

Psalms 68 in the NBLA

Psalms 68 in the NBS

Psalms 68 in the NBVTP

Psalms 68 in the NET2

Psalms 68 in the NIV11

Psalms 68 in the NNT

Psalms 68 in the NNT2

Psalms 68 in the NNT3

Psalms 68 in the PDDPT

Psalms 68 in the PFNT

Psalms 68 in the RMNT

Psalms 68 in the SBIAS

Psalms 68 in the SBIBS

Psalms 68 in the SBIBS2

Psalms 68 in the SBICS

Psalms 68 in the SBIDS

Psalms 68 in the SBIGS

Psalms 68 in the SBIHS

Psalms 68 in the SBIIS

Psalms 68 in the SBIIS2

Psalms 68 in the SBIIS3

Psalms 68 in the SBIKS

Psalms 68 in the SBIKS2

Psalms 68 in the SBIMS

Psalms 68 in the SBIOS

Psalms 68 in the SBIPS

Psalms 68 in the SBISS

Psalms 68 in the SBITS

Psalms 68 in the SBITS2

Psalms 68 in the SBITS3

Psalms 68 in the SBITS4

Psalms 68 in the SBIUS

Psalms 68 in the SBIVS

Psalms 68 in the SBT

Psalms 68 in the SBT1E

Psalms 68 in the SCHL

Psalms 68 in the SNT

Psalms 68 in the SUSU

Psalms 68 in the SUSU2

Psalms 68 in the SYNO

Psalms 68 in the TBIAOTANT

Psalms 68 in the TBT1E

Psalms 68 in the TBT1E2

Psalms 68 in the TFTIP

Psalms 68 in the TFTU

Psalms 68 in the TGNTATF3T

Psalms 68 in the THAI

Psalms 68 in the TNFD

Psalms 68 in the TNT

Psalms 68 in the TNTIK

Psalms 68 in the TNTIL

Psalms 68 in the TNTIN

Psalms 68 in the TNTIP

Psalms 68 in the TNTIZ

Psalms 68 in the TOMA

Psalms 68 in the TTENT

Psalms 68 in the UBG

Psalms 68 in the UGV

Psalms 68 in the UGV2

Psalms 68 in the UGV3

Psalms 68 in the VBL

Psalms 68 in the VDCC

Psalms 68 in the YALU

Psalms 68 in the YAPE

Psalms 68 in the YBVTP

Psalms 68 in the ZBP