Revelation 7 (BOICB)

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nʼakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọbụla ghara ife nʼelu ala, na nʼelu osimiri, na nʼelu osisi. 2 Mgbe ahụ, ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼọwụwa anyanwụ na-apụta, akara Chineke dị ndụ dịkwa nʼaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri, 3 na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha.” 4 Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel. 5 Ndị a kara akara site nʼebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).Ndị si nʼebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ (12,000).Ndị si nʼebo Gad dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). 6 E sitere nʼebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).Ndị sitekwara nʼebo Naftalị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).E sitere nʼebo Manase họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). 7 Ndị si nʼebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).Ndị sitere nʼebo Livayị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).Ndị si nʼebo Isaka dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). 8 E sitere nʼebo Zebụlọn họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).Ndị si nʼebo Josef dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).Ndị sikwa nʼebo Benjamin dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). 9 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m oke igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nke onye ọbụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche na ndị niile na asụsụ dị iche iche, na-eguzo nʼihu ocheeze ahụ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe ọcha, jirikwa igu nkwụ nʼaka ha. 10 Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị,“Nzọpụta dịrị Chineke anyị,onye na-anọkwasị nʼocheeze ahụ,dịkwara Nwa atụrụ ahụ.” 11 Ndị mmụọ ozi niile ahụ guzoro ocheeze ahụ gburugburu, ha na ndị okenye ahụ na anụ anọ ahụ dị ndụ. Ha dara, kpuo ihu ha nʼala nʼihu ocheeze ahụ feekwa Chineke ofufe, 12 na-asị,“Amen!Ngọzị niile na otuto niile,na amamihe niile na ekele niile na nsọpụrụ niilena ike niile na ume niile,dịrị Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.Amen.” 13 Mgbe ahụ, otu nʼime ndị okenye ahụ zara m sị, “Ị maara ndị ahụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ, ebee ka ha siri pụta?” 14 Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.”Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Nwa Atụrụ ahụ. 15 Ọ bụ nke a mere,“ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chinekena-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya.Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụga-ekpuchikwa ha. 16 ‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ.Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla.Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ. 17 Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha;‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’‘Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’”

In Other Versions

Revelation 7 in the ANGEFD

Revelation 7 in the ANTPNG2D

Revelation 7 in the AS21

Revelation 7 in the BAGH

Revelation 7 in the BBPNG

Revelation 7 in the BBT1E

Revelation 7 in the BDS

Revelation 7 in the BEV

Revelation 7 in the BHAD

Revelation 7 in the BIB

Revelation 7 in the BLPT

Revelation 7 in the BNT

Revelation 7 in the BNTABOOT

Revelation 7 in the BNTLV

Revelation 7 in the BOATCB

Revelation 7 in the BOATCB2

Revelation 7 in the BOBCV

Revelation 7 in the BOCNT

Revelation 7 in the BOECS

Revelation 7 in the BOGWICC

Revelation 7 in the BOHCB

Revelation 7 in the BOHCV

Revelation 7 in the BOHLNT

Revelation 7 in the BOHNTLTAL

Revelation 7 in the BOILNTAP

Revelation 7 in the BOITCV

Revelation 7 in the BOKCV

Revelation 7 in the BOKCV2

Revelation 7 in the BOKHWOG

Revelation 7 in the BOKSSV

Revelation 7 in the BOLCB

Revelation 7 in the BOLCB2

Revelation 7 in the BOMCV

Revelation 7 in the BONAV

Revelation 7 in the BONCB

Revelation 7 in the BONLT

Revelation 7 in the BONUT2

Revelation 7 in the BOPLNT

Revelation 7 in the BOSCB

Revelation 7 in the BOSNC

Revelation 7 in the BOTLNT

Revelation 7 in the BOVCB

Revelation 7 in the BOYCB

Revelation 7 in the BPBB

Revelation 7 in the BPH

Revelation 7 in the BSB

Revelation 7 in the CCB

Revelation 7 in the CUV

Revelation 7 in the CUVS

Revelation 7 in the DBT

Revelation 7 in the DGDNT

Revelation 7 in the DHNT

Revelation 7 in the DNT

Revelation 7 in the ELBE

Revelation 7 in the EMTV

Revelation 7 in the ESV

Revelation 7 in the FBV

Revelation 7 in the FEB

Revelation 7 in the GGMNT

Revelation 7 in the GNT

Revelation 7 in the HARY

Revelation 7 in the HNT

Revelation 7 in the IRVA

Revelation 7 in the IRVB

Revelation 7 in the IRVG

Revelation 7 in the IRVH

Revelation 7 in the IRVK

Revelation 7 in the IRVM

Revelation 7 in the IRVM2

Revelation 7 in the IRVO

Revelation 7 in the IRVP

Revelation 7 in the IRVT

Revelation 7 in the IRVT2

Revelation 7 in the IRVU

Revelation 7 in the ISVN

Revelation 7 in the JSNT

Revelation 7 in the KAPI

Revelation 7 in the KBT1ETNIK

Revelation 7 in the KBV

Revelation 7 in the KJV

Revelation 7 in the KNFD

Revelation 7 in the LBA

Revelation 7 in the LBLA

Revelation 7 in the LNT

Revelation 7 in the LSV

Revelation 7 in the MAAL

Revelation 7 in the MBV

Revelation 7 in the MBV2

Revelation 7 in the MHNT

Revelation 7 in the MKNFD

Revelation 7 in the MNG

Revelation 7 in the MNT

Revelation 7 in the MNT2

Revelation 7 in the MRS1T

Revelation 7 in the NAA

Revelation 7 in the NASB

Revelation 7 in the NBLA

Revelation 7 in the NBS

Revelation 7 in the NBVTP

Revelation 7 in the NET2

Revelation 7 in the NIV11

Revelation 7 in the NNT

Revelation 7 in the NNT2

Revelation 7 in the NNT3

Revelation 7 in the PDDPT

Revelation 7 in the PFNT

Revelation 7 in the RMNT

Revelation 7 in the SBIAS

Revelation 7 in the SBIBS

Revelation 7 in the SBIBS2

Revelation 7 in the SBICS

Revelation 7 in the SBIDS

Revelation 7 in the SBIGS

Revelation 7 in the SBIHS

Revelation 7 in the SBIIS

Revelation 7 in the SBIIS2

Revelation 7 in the SBIIS3

Revelation 7 in the SBIKS

Revelation 7 in the SBIKS2

Revelation 7 in the SBIMS

Revelation 7 in the SBIOS

Revelation 7 in the SBIPS

Revelation 7 in the SBISS

Revelation 7 in the SBITS

Revelation 7 in the SBITS2

Revelation 7 in the SBITS3

Revelation 7 in the SBITS4

Revelation 7 in the SBIUS

Revelation 7 in the SBIVS

Revelation 7 in the SBT

Revelation 7 in the SBT1E

Revelation 7 in the SCHL

Revelation 7 in the SNT

Revelation 7 in the SUSU

Revelation 7 in the SUSU2

Revelation 7 in the SYNO

Revelation 7 in the TBIAOTANT

Revelation 7 in the TBT1E

Revelation 7 in the TBT1E2

Revelation 7 in the TFTIP

Revelation 7 in the TFTU

Revelation 7 in the TGNTATF3T

Revelation 7 in the THAI

Revelation 7 in the TNFD

Revelation 7 in the TNT

Revelation 7 in the TNTIK

Revelation 7 in the TNTIL

Revelation 7 in the TNTIN

Revelation 7 in the TNTIP

Revelation 7 in the TNTIZ

Revelation 7 in the TOMA

Revelation 7 in the TTENT

Revelation 7 in the UBG

Revelation 7 in the UGV

Revelation 7 in the UGV2

Revelation 7 in the UGV3

Revelation 7 in the VBL

Revelation 7 in the VDCC

Revelation 7 in the YALU

Revelation 7 in the YAPE

Revelation 7 in the YBVTP

Revelation 7 in the ZBP