Romans 6 (BOICB)
1 Gịnị ọzọkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-anọgide nʼime mmehie ka amara na-aba ụba? 2 E e! O kwesighị! Olee otu anyị ga-esi na-adị ndụ nʼime mmehie, mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị? 3 Ọ bụ na unu amataghị na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtakwara anyị na ya nʼọnwụ. 4 Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ. 5 Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ. 6 Nʼihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ nke ochie anyị na Kraịst nʼelu obe, iji mee ka anụ ahụ nke mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nʼiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nʼịbụ ohu nke mmehie. 7 Nʼihi na onye nwụrụ anwụ agụọla ya dịka onye nwere onwe ya site nʼebe mmehie dị. 8 Ọ bụrụkwa nʼeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ. 9 Nʼihi na anyị maara na ebe e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọbụla nʼebe ọ nọ ọzọ. 10 Ọ nwụrụ naanị otu mgbe nʼihi mmehie. Ma ndụ ọ na-adị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke. 11 Ya mere, gụọ onwe unu ugbu a dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dịka ndị dị ndụ nʼebe Chineke nọ nʼime Kraịst, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị. 12 Unu ekwela ka mmehie na-achị eze nʼahụ unu ọzọ, nke ga-eme ka unu na-erubere agụụ nke anụ ahụ isi. 13 Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume. 14 Nʼihi na unu ekwesighị ị bụ ohu mmehie, ebe ọ bụ na unu anọkwaghị nʼokpuru iwu ọzọ, kama unu nọ nʼokpuru amara. 15 Gịnịkwa? Anyị ga-eme mmehie nʼihi na anyị anọghị nʼokpuru iwu kama nʼokpuru amara? Mba! O kwesighị. 16 Ọ bụ na unu amataghị na mgbe unu weere onwe unu nye mmadụ irubere ya isi dịka ohu, unu bụ ohu nye onye ahụ unu na-erubere isi, maọbụ ohu nye mmehie nke na-eduba nʼọnwụ, ma ọ bụkwanụ irube isi nke na-eduba nʼezi omume? 17 Ma ekele dịrị Chineke nʼihi na ọ bụ ezie na unu bụrịị ohu nye mmehie, ma ugbu a, unu ejirila obi unu niile kpebie ịnabatara onwe unu ozizi ahụ e nyefere nʼaka unu. 18 Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie, unu abụrụla ndị ohu ezi omume. 19 Ana m eji ihe ịmaatụ site na ndụ a na-ebi kwa ụbọchị, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ mmadụ. Ya mere, dịka unu si were ahụ unu dị iche iche nye ịbụ ohu adịghị ọcha na ajọ omume nke na-abawanye ụba, sitekwanụ otu a were ha nye ugbu a ka ha bụrụ ohu ezi omume nke na-eduba nʼịdị nsọ. 20 Mgbe unu bụ ohu mmehie, o nweghị ihe megidere unu ime ezi omume. 21 Ma gịnị bụ uru unu nwetara nʼoge ahụ site nʼọrụ ahụ niile unu rụrụ, bụ ihe ndị ahụ na-eme ka ihere mee unu? Ihe ndị ahụ na-eduba nʼọnwụ. 22 Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi. 23 Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.
In Other Versions
Romans 6 in the ANGEFD
Romans 6 in the ANTPNG2D
Romans 6 in the AS21
Romans 6 in the BAGH
Romans 6 in the BBPNG
Romans 6 in the BBT1E
Romans 6 in the BDS
Romans 6 in the BEV
Romans 6 in the BHAD
Romans 6 in the BIB
Romans 6 in the BLPT
Romans 6 in the BNT
Romans 6 in the BNTABOOT
Romans 6 in the BNTLV
Romans 6 in the BOATCB
Romans 6 in the BOATCB2
Romans 6 in the BOBCV
Romans 6 in the BOCNT
Romans 6 in the BOECS
Romans 6 in the BOGWICC
Romans 6 in the BOHCB
Romans 6 in the BOHCV
Romans 6 in the BOHLNT
Romans 6 in the BOHNTLTAL
Romans 6 in the BOILNTAP
Romans 6 in the BOITCV
Romans 6 in the BOKCV
Romans 6 in the BOKCV2
Romans 6 in the BOKHWOG
Romans 6 in the BOKSSV
Romans 6 in the BOLCB
Romans 6 in the BOLCB2
Romans 6 in the BOMCV
Romans 6 in the BONAV
Romans 6 in the BONCB
Romans 6 in the BONLT
Romans 6 in the BONUT2
Romans 6 in the BOPLNT
Romans 6 in the BOSCB
Romans 6 in the BOSNC
Romans 6 in the BOTLNT
Romans 6 in the BOVCB
Romans 6 in the BOYCB
Romans 6 in the BPBB
Romans 6 in the BPH
Romans 6 in the BSB
Romans 6 in the CCB
Romans 6 in the CUV
Romans 6 in the CUVS
Romans 6 in the DBT
Romans 6 in the DGDNT
Romans 6 in the DHNT
Romans 6 in the DNT
Romans 6 in the ELBE
Romans 6 in the EMTV
Romans 6 in the ESV
Romans 6 in the FBV
Romans 6 in the FEB
Romans 6 in the GGMNT
Romans 6 in the GNT
Romans 6 in the HARY
Romans 6 in the HNT
Romans 6 in the IRVA
Romans 6 in the IRVB
Romans 6 in the IRVG
Romans 6 in the IRVH
Romans 6 in the IRVK
Romans 6 in the IRVM
Romans 6 in the IRVM2
Romans 6 in the IRVO
Romans 6 in the IRVP
Romans 6 in the IRVT
Romans 6 in the IRVT2
Romans 6 in the IRVU
Romans 6 in the ISVN
Romans 6 in the JSNT
Romans 6 in the KAPI
Romans 6 in the KBT1ETNIK
Romans 6 in the KBV
Romans 6 in the KJV
Romans 6 in the KNFD
Romans 6 in the LBA
Romans 6 in the LBLA
Romans 6 in the LNT
Romans 6 in the LSV
Romans 6 in the MAAL
Romans 6 in the MBV
Romans 6 in the MBV2
Romans 6 in the MHNT
Romans 6 in the MKNFD
Romans 6 in the MNG
Romans 6 in the MNT
Romans 6 in the MNT2
Romans 6 in the MRS1T
Romans 6 in the NAA
Romans 6 in the NASB
Romans 6 in the NBLA
Romans 6 in the NBS
Romans 6 in the NBVTP
Romans 6 in the NET2
Romans 6 in the NIV11
Romans 6 in the NNT
Romans 6 in the NNT2
Romans 6 in the NNT3
Romans 6 in the PDDPT
Romans 6 in the PFNT
Romans 6 in the RMNT
Romans 6 in the SBIAS
Romans 6 in the SBIBS
Romans 6 in the SBIBS2
Romans 6 in the SBICS
Romans 6 in the SBIDS
Romans 6 in the SBIGS
Romans 6 in the SBIHS
Romans 6 in the SBIIS
Romans 6 in the SBIIS2
Romans 6 in the SBIIS3
Romans 6 in the SBIKS
Romans 6 in the SBIKS2
Romans 6 in the SBIMS
Romans 6 in the SBIOS
Romans 6 in the SBIPS
Romans 6 in the SBISS
Romans 6 in the SBITS
Romans 6 in the SBITS2
Romans 6 in the SBITS3
Romans 6 in the SBITS4
Romans 6 in the SBIUS
Romans 6 in the SBIVS
Romans 6 in the SBT
Romans 6 in the SBT1E
Romans 6 in the SCHL
Romans 6 in the SNT
Romans 6 in the SUSU
Romans 6 in the SUSU2
Romans 6 in the SYNO
Romans 6 in the TBIAOTANT
Romans 6 in the TBT1E
Romans 6 in the TBT1E2
Romans 6 in the TFTIP
Romans 6 in the TFTU
Romans 6 in the TGNTATF3T
Romans 6 in the THAI
Romans 6 in the TNFD
Romans 6 in the TNT
Romans 6 in the TNTIK
Romans 6 in the TNTIL
Romans 6 in the TNTIN
Romans 6 in the TNTIP
Romans 6 in the TNTIZ
Romans 6 in the TOMA
Romans 6 in the TTENT
Romans 6 in the UBG
Romans 6 in the UGV
Romans 6 in the UGV2
Romans 6 in the UGV3
Romans 6 in the VBL
Romans 6 in the VDCC
Romans 6 in the YALU
Romans 6 in the YAPE
Romans 6 in the YBVTP
Romans 6 in the ZBP