1 John 4 (BOICB)

1 Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na Chineke, nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa. 2 Otu a ka unu ga-esi mata Mmụọ nke Chineke: Mmụọ ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs Kraịst abịala nʼanụ ahụ sitere na Chineke. 3 Ma mmụọ ọbụla nke na-adịghị ekwupụta Jisọs esiteghị na Chineke, mmụọ dị otu a bụ nke onye ahụ na-emegide Kraịst nke unu nụrụ na ọ ga-abịa, ma ugbu a ọ bịala nʼụwa. 4 Ụmụntakịrị m, unu bụ ndị sitere na Chineke, unu emeriekwala ha nʼihi na onye ahụ nke bi nʼime unu dị ukwuu karịa onye ahụ nọ nʼime ụwa. 5 Nʼihi na ndị a si nʼime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ naanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị. 6 Anyị sitere na Chineke, onye ọbụla maara Chineke na-ege anyị ntị, ma onye ọbụla na-esiteghị na Chineke anaghị ege anyị ntị. Ọ bụ otu a ka anyị si amata mmụọ eziokwu na mmụọ nke okwu ụgha. 7 Ndị m hụrụ nʼanya, o kwesiri ka anyị hụrịtaa onwe anyị nʼanya, nʼihi na ịhụnanya na-esi nʼebe Chineke nọ abịa. Onye ọbụla nwere ịhụnanya bụ onye amụrụ site na Chineke, ọ makwara Chineke. 8 Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, nʼihi na Chineke bụ ịhụnanya. 9 E siri otu a mee ka ịhụnanya Chineke nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya. 10 Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, ọ bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na ọ hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị. 11 Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya. 12 O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị. 13 O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nʼime anyị igosi anyị na o bi nʼime anyị, na anyị bikwa nʼime ya. 14 Ma anyị onwe anyị ahụla ma na-agbakwa ama na Nna ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta nke ụwa. 15 Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke. 16 Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ.Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a. 17 Nʼụzọ dị otu a, a na-eme ka ịhụnanya zuo oke nʼetiti anyị, ka anyị nwee ike inwe nkwuwa okwu nʼụbọchị ikpe ahụ, nʼihi na dịka ya onwe ya dị, otu a ka anyị onwe anyị dịkwa nʼụwa nke a. 18 Ịtụ egwu adịghị nʼebe ịhụnanya dị, kama ịhụnanya zuruoke na-achụpụ egwu nʼihi na egwu na ntaramahụhụ na-arụkọ ọrụ, onye ọbụla nke na-atụ egwu bụ onye na-ezubeghị oke nʼịhụnanya. 19 Anyị hụrụ ya nʼanya nʼihi na o buru ụzọ hụ anyị nʼanya. 20 Onye ọbụla na-asị, “Ahụrụ m Chineke nʼanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ onye ụgha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nʼanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ pụghị ịhụ Chineke nʼanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya. 21 Iwu o nyere anyị bụ, “Onye ọbụla hụrụ Chineke nʼanya aghakwaghị ịhụ nwanna ya nʼanya.”

In Other Versions

1 John 4 in the ANGEFD

1 John 4 in the ANTPNG2D

1 John 4 in the AS21

1 John 4 in the BAGH

1 John 4 in the BBPNG

1 John 4 in the BBT1E

1 John 4 in the BDS

1 John 4 in the BEV

1 John 4 in the BHAD

1 John 4 in the BIB

1 John 4 in the BLPT

1 John 4 in the BNT

1 John 4 in the BNTABOOT

1 John 4 in the BNTLV

1 John 4 in the BOATCB

1 John 4 in the BOATCB2

1 John 4 in the BOBCV

1 John 4 in the BOCNT

1 John 4 in the BOECS

1 John 4 in the BOGWICC

1 John 4 in the BOHCB

1 John 4 in the BOHCV

1 John 4 in the BOHLNT

1 John 4 in the BOHNTLTAL

1 John 4 in the BOILNTAP

1 John 4 in the BOITCV

1 John 4 in the BOKCV

1 John 4 in the BOKCV2

1 John 4 in the BOKHWOG

1 John 4 in the BOKSSV

1 John 4 in the BOLCB

1 John 4 in the BOLCB2

1 John 4 in the BOMCV

1 John 4 in the BONAV

1 John 4 in the BONCB

1 John 4 in the BONLT

1 John 4 in the BONUT2

1 John 4 in the BOPLNT

1 John 4 in the BOSCB

1 John 4 in the BOSNC

1 John 4 in the BOTLNT

1 John 4 in the BOVCB

1 John 4 in the BOYCB

1 John 4 in the BPBB

1 John 4 in the BPH

1 John 4 in the BSB

1 John 4 in the CCB

1 John 4 in the CUV

1 John 4 in the CUVS

1 John 4 in the DBT

1 John 4 in the DGDNT

1 John 4 in the DHNT

1 John 4 in the DNT

1 John 4 in the ELBE

1 John 4 in the EMTV

1 John 4 in the ESV

1 John 4 in the FBV

1 John 4 in the FEB

1 John 4 in the GGMNT

1 John 4 in the GNT

1 John 4 in the HARY

1 John 4 in the HNT

1 John 4 in the IRVA

1 John 4 in the IRVB

1 John 4 in the IRVG

1 John 4 in the IRVH

1 John 4 in the IRVK

1 John 4 in the IRVM

1 John 4 in the IRVM2

1 John 4 in the IRVO

1 John 4 in the IRVP

1 John 4 in the IRVT

1 John 4 in the IRVT2

1 John 4 in the IRVU

1 John 4 in the ISVN

1 John 4 in the JSNT

1 John 4 in the KAPI

1 John 4 in the KBT1ETNIK

1 John 4 in the KBV

1 John 4 in the KJV

1 John 4 in the KNFD

1 John 4 in the LBA

1 John 4 in the LBLA

1 John 4 in the LNT

1 John 4 in the LSV

1 John 4 in the MAAL

1 John 4 in the MBV

1 John 4 in the MBV2

1 John 4 in the MHNT

1 John 4 in the MKNFD

1 John 4 in the MNG

1 John 4 in the MNT

1 John 4 in the MNT2

1 John 4 in the MRS1T

1 John 4 in the NAA

1 John 4 in the NASB

1 John 4 in the NBLA

1 John 4 in the NBS

1 John 4 in the NBVTP

1 John 4 in the NET2

1 John 4 in the NIV11

1 John 4 in the NNT

1 John 4 in the NNT2

1 John 4 in the NNT3

1 John 4 in the PDDPT

1 John 4 in the PFNT

1 John 4 in the RMNT

1 John 4 in the SBIAS

1 John 4 in the SBIBS

1 John 4 in the SBIBS2

1 John 4 in the SBICS

1 John 4 in the SBIDS

1 John 4 in the SBIGS

1 John 4 in the SBIHS

1 John 4 in the SBIIS

1 John 4 in the SBIIS2

1 John 4 in the SBIIS3

1 John 4 in the SBIKS

1 John 4 in the SBIKS2

1 John 4 in the SBIMS

1 John 4 in the SBIOS

1 John 4 in the SBIPS

1 John 4 in the SBISS

1 John 4 in the SBITS

1 John 4 in the SBITS2

1 John 4 in the SBITS3

1 John 4 in the SBITS4

1 John 4 in the SBIUS

1 John 4 in the SBIVS

1 John 4 in the SBT

1 John 4 in the SBT1E

1 John 4 in the SCHL

1 John 4 in the SNT

1 John 4 in the SUSU

1 John 4 in the SUSU2

1 John 4 in the SYNO

1 John 4 in the TBIAOTANT

1 John 4 in the TBT1E

1 John 4 in the TBT1E2

1 John 4 in the TFTIP

1 John 4 in the TFTU

1 John 4 in the TGNTATF3T

1 John 4 in the THAI

1 John 4 in the TNFD

1 John 4 in the TNT

1 John 4 in the TNTIK

1 John 4 in the TNTIL

1 John 4 in the TNTIN

1 John 4 in the TNTIP

1 John 4 in the TNTIZ

1 John 4 in the TOMA

1 John 4 in the TTENT

1 John 4 in the UBG

1 John 4 in the UGV

1 John 4 in the UGV2

1 John 4 in the UGV3

1 John 4 in the VBL

1 John 4 in the VDCC

1 John 4 in the YALU

1 John 4 in the YAPE

1 John 4 in the YBVTP

1 John 4 in the ZBP