Isaiah 51 (BOICB)
1 Geenụ m ntị, unu ndị niile na-agbaso ezi omume,ndị na-achọ ONYENWE ANYỊ!Legidenụ oke nkume ahụ e sitere na ya wapụta unu anya.E, legidenụ ọgba nkume ahụ e si nʼime ya gwupụta unu anya! 2 Legidenụ Ebraham bụ nna ununa Sera anya, bụ ndị mụrụ unu.Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya,ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba. 3 ONYENWE ANYỊ aghaghị ịkasị Zayọn obi,werekwa obi ebere leta ebe ya niile e tikpọrọ etikpọ,ọ ga-eme ala ọzara ya niile ka ọ dịka Iden,ala ya nke niile ihe na-adịghị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke ONYENWE ANYỊ.Ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼime ya,inye ekele na ụda abụ ụtọ dị iche iche ga-adịkwa. 4 Ndị m, geenụ m ntị;ṅaa ntị, gị Izrel mba nkem,nʼihi na iwu m ga-esi nʼọnụ m pụọ;ikpe ikpe ziri ezi m ga-aghọkwara mba niile ìhè. 5 Ezi omume m na-abịaru unu nso ọsịịsọ,nzọpụta m na-adịkwa nso.Aga m achịkwa mba niile.Mba dị anya ga na-ele anya ọbịbịa m;ha ga na-ele anya nzọpụta nke m ga-azọpụta ha. 6 Welienụ anya unu lee anya nʼelu,leekwanụ anya nʼụwa,nʼihi na mbara eluigwe ga-agba barịị fuo, dịka anwụrụ ọkụ;ụwa ga-aka nka dịka akwa,ndị bi nʼime ya ga-anwụkwa dịka ijiji.Ma nzọpụta m ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,ezi omume m ga-adịgidekwa, ọ gaghị agwụ agwụ. 7 Geenụ m ntị, unu niile ndị maara ihe ọma,unu ndị na-anabata iwu m nʼobi unu.Unu atụla egwu ihe ndị mmadụ ga-asị unu,unu atụkwala egwu nkwutọ ha ga-ekwutọ unu. 8 Nʼihi na nla ga-eri ha dịka o si eri akwa.Ikpuru ga-erichapụ ha dịka o si eri ajị anụ.Ma ezi omume m, na obi ebere, ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.Nzọpụta m ga-adịkwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 9 Teta, teta, yikwasị onwe gị ike,gị aka ONYENWE ANYỊ,bilie, dịka ụbọchị ndị gara aga,dịka ọgbọ nke mgbe ochie.Ọ bụghị gị gbubisịrị Rehabma dụgbukwaa anụ ọjọọ ahụ? 10 Ọ bụghị gị mere ka osimiri taa?Mmiri ahụ dị omimi.Ọ bụghị gị mekwara ka okporoụzọ dịrị nʼetiti ya,ebe ndị ahụ ị gbapụtara si gafee? 11 Ndị ahụ ONYENWE ANYỊ gbapụtara ga-alọtakwa.Ha ga-eji abụ bata na Zayọn;ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha,oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha,iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga. 12 “Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi.Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ,ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa, 13 na ị na-echefu ONYENWE ANYỊ bụ onye kere unu,onye na-esetipụ eluigwe,onye tọkwara ntọala niile nke ụwa;na-ebi ndụ ịtụ oke egwu ụbọchị niilenʼihi oke iwe nke onye mkpagbu ahụ,onye nke kpebiri ibibi unu?Ma olee ebe oke iwe nke onye mkpagbu ahụ dị? 14 Nʼoge na-adịghị anya, a ga-agbapụta ndị mkpọrọ egwu mere ka ha rudata ala.Ha agaghị anwụ nʼime olulu,nri agakwaghị akọ ha. 15 Nʼihi na abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu,onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya. 16 Etinyela m okwu m nʼọnụ gị,chebekwa gị nʼọbụaka m.Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya,dokwaa ntọala nke ụwa.Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’ ” 17 Teta, teta,bilie gị Jerusalem,gị onye ṅụrụ site nʼaka ONYENWE ANYỊ,bụ iko nke oke iwe ya.Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụnke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa. 18 Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ,nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme,maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọo kwesiri ịgbaso. 19 Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị.Onye ga-akasị gị obi?Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha,onye ga-akasị gị obi? 20 Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba.Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile,dịka mgbada ọnya mara.Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma ONYENWE ANYỊna ịba mba nke Chineke gị. 21 Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu,ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya. 22 Lee ihe ONYENWE ANYỊ kwuru,bụ Chineke unu, onye ihe banyere ndị ya na-emetụ nʼobi.“Lee, aga m esite nʼaka gịwezuga iko ahụ mere ka ị dagbugharịa,ị gaghị aṅụkwasite nʼiko ọnụma ahụ ọzọ. 23 Ma m ga-etinye ya nʼaka ndị ahụ na-akpagbu gị,bụ ndị sịrị gị,‘makpuru nʼala ka anyị gaa ije nʼelu ahụ gị.’I mere azụ gị ka ọ dị ka ala, dịka okporoụzọebe ndị mmadụ si aga ije.”