Job 3 (BOICB)

1 Nʼikpeazụ, onye kwuru okwu bụ Job nʼonwe ya. O kwuru okwu bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ. 2 Job sịrị: 3 “Ka ụbọchị ahụ amụrụ m bụrụ ụbọchị lara nʼiyi;ya na abalị ahụ e kwuru sị, ‘Atụrụ ime nwa nwoke.’ 4 Ụbọchị ahụ, ka ọ ghọọ ọchịchịrị:ka Chineke site nʼelu ghara ịjụ ase ya;ka ìhè gharakwa ịmụkwasị ya. 5 Ka ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ gbara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị nke aka ya,ka igwe ojii kpuchigidekwa ya,ka ọchịchịrị kpuchie ya nʼebe ọ dị ukwuu. 6 Abalị ahụ, ka oke ọchịchịrị kpuchie ya,ka a kachapụ ya, ka ọ hapụ ịbụkwa ụbọchị a ga-agụkọ ya na ụbọchị ndị ọzọ nʼafọ,ka ọ ghara dịka otu ụbọchị nke na-adị nʼọnwa. 7 Ka abalị ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị tọgbọrọ nʼefu,ka a ghara ịnụ mkpu ọṅụ ọbụla nʼime ya. 8 Ka ndị ahụ na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ụbọchị ahụ ọnụ,bụ ndị ahụ jikeere ịkpọte Leviatan. 9 Ka kpakpando ụtụtụ ya gbaa ọchịchịrị,ka o lee anya ìhè na-efu,ka ọ ghara ihu mgbubere anya nke chi ọbụbọ, 10 nʼihi na o mechighị akpanwa nne m,i zonarịkwa anya m nsogbu. 11 “Gịnị mere m ji hapụ ịnwụ mgbe ahụ nne m mụpụtara m,kubie ume mgbe m si nʼime akpanwa pụta? 12 Gịnị mere ikpere ji dịrị ịnabata m?Gịnị mere ara ji dịrị i ji zụọ m? 13 Nʼihi na ugbu a, agara m idina nʼudo;agaara m anọ nʼụra na izuike, 14 mụ na ndị eze na ndị ọchịchị nke ụwa,ndị rụkwaara onwe ha ebe obibi dị iche iche nke tọgbọọrọ nʼefu ugbu a, 15 mụ na ụmụ ndị ikom eze, ndị nwere ọlaedo,ndị jikwa ọlaọcha kpojuo ụlọ ha. 16 Ọ bụ gịnị mere e zofughị m nʼala dịka nwantakịrị a mụkworo amụkwo,dịka nwa ọhụrụ nke na-ahụghị ìhè nke ụbọchị anya? 17 Nʼebe ahụ ka ndị na-emebi iwu na-akwụsị iweta ọgbaaghara,nʼebe ahụ ka ndị ike gwụrụ na-ezu ike. 18 Ebe ahụ ka ndị nọ nʼagbụ na-enwere onwe ha,ha adịghị anụkwa ịba mba nke ndị na-eji aka ike achị ha. 19 Ebe ahụ ka ndị ukwu na ndị nta nọ;ebe ahụ kwa ka ohu na-enwere onwe ya kpamkpam site nʼaka onye nwe ya. 20 “Nʼihi gịnị ka e ji enye ndị nọ nʼọnọdụ nhụju anya ìhè?Gịnị bụ uru ndụ nye onye mkpụrụobi ya jupụtara nʼihe ilu? 21 Gịnị bụ uru ya nye ndị na-echere ọnwụ ma ọ dịghị abịa,ee, ndị na-achọsi ọnwụ ike karịa akụ e zoro ezo, 22 ndị jupụtara nʼọṅụ,na-aṅụrị ọṅụ mgbe ha rịdaruru nʼili? 23 Gịnị mere e ji enye mmadụ ndụ;bụ onye ahụ ụzọ ya zoro ezo,onye Chineke mechibidoro ụzọ? 24 Nʼihi na ịma ọsụ aghọọla ihe oriri m kwa ụbọchị;ịsụ ude m na-awụpụtakwa dịka mmiri. 25 Ihe m tụrụ egwu ya abịakwasịla m,ihe m tụrụ ụjọ ya bụ ihe bịakwasịrị m. 26 Enweghị m udo, anọkwaghị m jụụ,enweghị m izuike, naanị ọgbaaghara.”

In Other Versions

Job 3 in the ANGEFD

Job 3 in the ANTPNG2D

Job 3 in the AS21

Job 3 in the BAGH

Job 3 in the BBPNG

Job 3 in the BBT1E

Job 3 in the BDS

Job 3 in the BEV

Job 3 in the BHAD

Job 3 in the BIB

Job 3 in the BLPT

Job 3 in the BNT

Job 3 in the BNTABOOT

Job 3 in the BNTLV

Job 3 in the BOATCB

Job 3 in the BOATCB2

Job 3 in the BOBCV

Job 3 in the BOCNT

Job 3 in the BOECS

Job 3 in the BOGWICC

Job 3 in the BOHCB

Job 3 in the BOHCV

Job 3 in the BOHLNT

Job 3 in the BOHNTLTAL

Job 3 in the BOILNTAP

Job 3 in the BOITCV

Job 3 in the BOKCV

Job 3 in the BOKCV2

Job 3 in the BOKHWOG

Job 3 in the BOKSSV

Job 3 in the BOLCB

Job 3 in the BOLCB2

Job 3 in the BOMCV

Job 3 in the BONAV

Job 3 in the BONCB

Job 3 in the BONLT

Job 3 in the BONUT2

Job 3 in the BOPLNT

Job 3 in the BOSCB

Job 3 in the BOSNC

Job 3 in the BOTLNT

Job 3 in the BOVCB

Job 3 in the BOYCB

Job 3 in the BPBB

Job 3 in the BPH

Job 3 in the BSB

Job 3 in the CCB

Job 3 in the CUV

Job 3 in the CUVS

Job 3 in the DBT

Job 3 in the DGDNT

Job 3 in the DHNT

Job 3 in the DNT

Job 3 in the ELBE

Job 3 in the EMTV

Job 3 in the ESV

Job 3 in the FBV

Job 3 in the FEB

Job 3 in the GGMNT

Job 3 in the GNT

Job 3 in the HARY

Job 3 in the HNT

Job 3 in the IRVA

Job 3 in the IRVB

Job 3 in the IRVG

Job 3 in the IRVH

Job 3 in the IRVK

Job 3 in the IRVM

Job 3 in the IRVM2

Job 3 in the IRVO

Job 3 in the IRVP

Job 3 in the IRVT

Job 3 in the IRVT2

Job 3 in the IRVU

Job 3 in the ISVN

Job 3 in the JSNT

Job 3 in the KAPI

Job 3 in the KBT1ETNIK

Job 3 in the KBV

Job 3 in the KJV

Job 3 in the KNFD

Job 3 in the LBA

Job 3 in the LBLA

Job 3 in the LNT

Job 3 in the LSV

Job 3 in the MAAL

Job 3 in the MBV

Job 3 in the MBV2

Job 3 in the MHNT

Job 3 in the MKNFD

Job 3 in the MNG

Job 3 in the MNT

Job 3 in the MNT2

Job 3 in the MRS1T

Job 3 in the NAA

Job 3 in the NASB

Job 3 in the NBLA

Job 3 in the NBS

Job 3 in the NBVTP

Job 3 in the NET2

Job 3 in the NIV11

Job 3 in the NNT

Job 3 in the NNT2

Job 3 in the NNT3

Job 3 in the PDDPT

Job 3 in the PFNT

Job 3 in the RMNT

Job 3 in the SBIAS

Job 3 in the SBIBS

Job 3 in the SBIBS2

Job 3 in the SBICS

Job 3 in the SBIDS

Job 3 in the SBIGS

Job 3 in the SBIHS

Job 3 in the SBIIS

Job 3 in the SBIIS2

Job 3 in the SBIIS3

Job 3 in the SBIKS

Job 3 in the SBIKS2

Job 3 in the SBIMS

Job 3 in the SBIOS

Job 3 in the SBIPS

Job 3 in the SBISS

Job 3 in the SBITS

Job 3 in the SBITS2

Job 3 in the SBITS3

Job 3 in the SBITS4

Job 3 in the SBIUS

Job 3 in the SBIVS

Job 3 in the SBT

Job 3 in the SBT1E

Job 3 in the SCHL

Job 3 in the SNT

Job 3 in the SUSU

Job 3 in the SUSU2

Job 3 in the SYNO

Job 3 in the TBIAOTANT

Job 3 in the TBT1E

Job 3 in the TBT1E2

Job 3 in the TFTIP

Job 3 in the TFTU

Job 3 in the TGNTATF3T

Job 3 in the THAI

Job 3 in the TNFD

Job 3 in the TNT

Job 3 in the TNTIK

Job 3 in the TNTIL

Job 3 in the TNTIN

Job 3 in the TNTIP

Job 3 in the TNTIZ

Job 3 in the TOMA

Job 3 in the TTENT

Job 3 in the UBG

Job 3 in the UGV

Job 3 in the UGV2

Job 3 in the UGV3

Job 3 in the VBL

Job 3 in the VDCC

Job 3 in the YALU

Job 3 in the YAPE

Job 3 in the YBVTP

Job 3 in the ZBP