Mark 12 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ọ bidoro ịgwa ndị ahụ okwu nʼilu sị, “Otu nwoke kụrụ mkpụrụ vaịnị nʼubi ya, jiri mgbidi gbaa ubi ahụ gburugburu. O gwuru ebe ịnara mmanya si na mkpụrụ vaịnị, wuokwa ụlọ elu. Mgbe o mesịrị, o nyefere ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọrụ ubi ilekọta ya ma gaa obodo ọzọ. 2 Mgbe oge ịghọ mkpụrụ ruru, o zipụrụ otu onye ohu ya ka o jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata ha ụfọdụ nʼime mkpụrụ vaịnị ahụ. 3 Ma ha jidere ya tie ya ihe, zilaga ya nʼaka efu. 4 Emesịkwa, o zigakwara onye ohu ọzọ. Ma ha tiwara ya isi, mee ya ihe ihere. 5 O zigakwara onye ọzọ, ma ha gburu ya. O zigakwara ọtụtụ ndị ozi, ma ha gburu ụfọdụ, tie ndị ọzọ ihe. 6 “O nwere naanị otu onye ọzọ fọdụrụ nke ọ ga-eziga, nke bụ ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya. Nʼikpeazụ o zigara ya, buru nʼuche na ha ga-asọpụrụ ọkpara ya. 7 “Ma ndị na-elekọta ubi ahụ sịrịtara onwe ha, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’ 8 Ha jidere ya gbuo ya, tufee ozu ya nʼazụ mgbidi ubi vaịnị ahụ. 9 “Gịnị ka unu chere onyenwe ubi vaịnị ahụ ga-eme? Ọ ga-abịa laa ndị ajọ mmadụ ahụ nʼiyi. Ọ ga-enyefekwa ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọzọ. 10 Ọ bụ na unu agụbeghị akwụkwọ nsọ a na-asị, “ ‘Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ abụrụla nkume isi ntọala ụlọ. 11 Ọ bụ Onyenwe anyị rụrụ nke a, ọ dịkwa ịtụnanya nʼanya anyị’?” 12 Mgbe ahụ ndịisi nchụaja, ndị nkuzi iwu na ndị okenye chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼihi na ha matara na ilu ahụ ọ tụrụ megidere ha. Ma ha tụrụ egwu igwe ndị mmadụ ahụ, ya mere ha hapụrụ ya pụọ. 13 Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ site nʼotu ndị Farisii na ndị otu Herọd, ile ma ha ga-esite nʼokwu ọnụ ya jide ya. 14 Ha bịakwutere ya, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye eziokwu, ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ, kama ị na-ezi ụzọ Chineke nʼụzọ eziokwu. O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza ka ọ bụ na o zighị ezi? 15 Anyị kwesiri ịkwụ ya ka ọ bụ anyị ekwesighị?”Ma ebe ọ maara ihu abụọ ha, ya mere ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? Wetaranụ m otu mkpụrụ ego ka m lee ya anya.” 16 Ha wepụtara otu mkpụrụ ego, Ọ sịrị, “Onye nwe onyinyo a? Aha onye ka e bikwasịrị nʼego a?”Ha zara sị, “Ọ bụ nke Siza.” 17 Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nyenụ Siza ihe bụ nke ya, nyekwanụ Chineke ihe bụ nke ya.”Ọsịsa ya jụkwara ha anya. 18 Ụfọdụ ndị Sadusii bụ ndị sịrị na mbilite nʼọnwụ adịghị bịakwutere ya jụọ ya sị, 19 “Onye ozizi, Mosis nyere anyị iwu na ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, na nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwunye nwoke ahụ, mụta ụmụ nʼaha nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ. 20 Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, nke mbụ lụrụ nwunye ma ọ nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ọbụla. 21 Nke abụọ lụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ma ya onwe ya nwụkwara na-amụtaghị nwa. 22 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha asaa mụtara nwa ọbụla, nʼikpeazụ nwanyị ahụ nwụkwara. 23 Nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka ọ ga-abụ, ebe ụmụnne asaa ndị a lụtụchara ya?” 24 Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu adịghị ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, maọbụ ike Chineke? 25 Mgbe ha ga-esite nʼọnwụ bilie, ọlụlụ di na nwunye agaghị a dị; kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe. 26 Ma nʼokwu banyere ndị nwụrụ anwụ isite nʼọnwụ bilie, ọ bụ na unu agụtabeghị nʼakwụkwọ Mosis ebe e dere maka ọhịa ahụ na-ere ọkụ, na otu Chineke si gwa ya, Abụ m Chineke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. 27 Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ kama nke ndị dị ndụ. Nʼebe ahụ ka unu dahiere nke ukwuu.” 28 Otu nʼime ndị ozizi iwu bịara nʼoge ahụ ha na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na o nyere ha ezi ọsịsa, ọ jụrụ ya sị, “Nʼime iwu niile olee nke kachasị mkpa?” 29 Jisọs zara ya sị, “Nke kachasị mkpa bụ nke a, ‘Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu. 30 Were obi gị niile na mkpụrụobi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya.’ 31 Nke abụọ ya bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’ Ọ dịghị iwu ọzọ dị nke karịrị ndị a.” 32 Onye ode akwụkwọ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, nʼezie, ị zara nke ọma na Chineke bụ otu, na enweghịkwa chi ọzọ dị karịa ya. 33 Ịhụ ya nʼanya site nʼiji obi gị niile, na nghọta gị niile, nakwa iji ike gị niile, nʼịhụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị, kachasị onyinye aja nsure ọkụ na ịchụ aja niile.” 34 Mgbe Jisọs hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Site na mgbe ahụ ọ dịkwaghị onye ọbụla nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ. 35 Mgbe Jisọs nọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ, ọ kwuru sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji sị na Kraịst bụ nwa Devid? 36 Devid nʼonwe ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ kwuo sị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’ 37 Devid nʼonwe ya kpọrọ ya Onyenwe anyị. Oleekwanụ ụzọ o si bụrụ nwa ya?”Igwe mmadụ ahụ jiri obi ụtọ na-ege ya ntị. 38 Dịka ọ na-ezi ihe, ọ siri, “Lezienụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ. Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, na ịnara ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa. 39 Ndị ọ na-amasịkwa ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nakwa nʼoche pụrụ iche na mmemme oriri ọbụla. 40 Ha na-eripịa ihe niile dị nʼụlọ ndị inyom ndị di ha nwụrụ anwụ, nʼekpe ogologo ekpere ka a hụta ha. Ndị dị otu a ka a ga-ata ahụhụ dị ukwuu.” 41 Ọ nọdụrụ ala na ncherita ihu ebe igbe onyinye dị, sị ebe ahụ na-ahụ otu igwe mmadụ ahụ si etinye ego ha nʼime igbe onyinye. Ọtụtụ ndị ọgaranya tụnyere ego buru ibu. 42 Otu nwanyị bụ ogbenye, nke di ya nwụrụ anwụ, bịara tinye mkpụrụ ego ọla abụọ nke pụtara otu peni. 43 Ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nʼezie agwa m unu, nwanyị a di ya nwụrụ anwụ, bụkwa ogbenye, etinyela ego nʼime igbe onyinye a karịa ndị ọzọ. 44 Nʼihi na ndị ọzọ sitere nʼịba ụba nke ego ha nwere tinye, ma nwanyị a sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o nwere, ọ bụladị ihe niile o ji biri.”

In Other Versions

Mark 12 in the ANGEFD

Mark 12 in the ANTPNG2D

Mark 12 in the AS21

Mark 12 in the BAGH

Mark 12 in the BBPNG

Mark 12 in the BBT1E

Mark 12 in the BDS

Mark 12 in the BEV

Mark 12 in the BHAD

Mark 12 in the BIB

Mark 12 in the BLPT

Mark 12 in the BNT

Mark 12 in the BNTABOOT

Mark 12 in the BNTLV

Mark 12 in the BOATCB

Mark 12 in the BOATCB2

Mark 12 in the BOBCV

Mark 12 in the BOCNT

Mark 12 in the BOECS

Mark 12 in the BOGWICC

Mark 12 in the BOHCB

Mark 12 in the BOHCV

Mark 12 in the BOHLNT

Mark 12 in the BOHNTLTAL

Mark 12 in the BOILNTAP

Mark 12 in the BOITCV

Mark 12 in the BOKCV

Mark 12 in the BOKCV2

Mark 12 in the BOKHWOG

Mark 12 in the BOKSSV

Mark 12 in the BOLCB

Mark 12 in the BOLCB2

Mark 12 in the BOMCV

Mark 12 in the BONAV

Mark 12 in the BONCB

Mark 12 in the BONLT

Mark 12 in the BONUT2

Mark 12 in the BOPLNT

Mark 12 in the BOSCB

Mark 12 in the BOSNC

Mark 12 in the BOTLNT

Mark 12 in the BOVCB

Mark 12 in the BOYCB

Mark 12 in the BPBB

Mark 12 in the BPH

Mark 12 in the BSB

Mark 12 in the CCB

Mark 12 in the CUV

Mark 12 in the CUVS

Mark 12 in the DBT

Mark 12 in the DGDNT

Mark 12 in the DHNT

Mark 12 in the DNT

Mark 12 in the ELBE

Mark 12 in the EMTV

Mark 12 in the ESV

Mark 12 in the FBV

Mark 12 in the FEB

Mark 12 in the GGMNT

Mark 12 in the GNT

Mark 12 in the HARY

Mark 12 in the HNT

Mark 12 in the IRVA

Mark 12 in the IRVB

Mark 12 in the IRVG

Mark 12 in the IRVH

Mark 12 in the IRVK

Mark 12 in the IRVM

Mark 12 in the IRVM2

Mark 12 in the IRVO

Mark 12 in the IRVP

Mark 12 in the IRVT

Mark 12 in the IRVT2

Mark 12 in the IRVU

Mark 12 in the ISVN

Mark 12 in the JSNT

Mark 12 in the KAPI

Mark 12 in the KBT1ETNIK

Mark 12 in the KBV

Mark 12 in the KJV

Mark 12 in the KNFD

Mark 12 in the LBA

Mark 12 in the LBLA

Mark 12 in the LNT

Mark 12 in the LSV

Mark 12 in the MAAL

Mark 12 in the MBV

Mark 12 in the MBV2

Mark 12 in the MHNT

Mark 12 in the MKNFD

Mark 12 in the MNG

Mark 12 in the MNT

Mark 12 in the MNT2

Mark 12 in the MRS1T

Mark 12 in the NAA

Mark 12 in the NASB

Mark 12 in the NBLA

Mark 12 in the NBS

Mark 12 in the NBVTP

Mark 12 in the NET2

Mark 12 in the NIV11

Mark 12 in the NNT

Mark 12 in the NNT2

Mark 12 in the NNT3

Mark 12 in the PDDPT

Mark 12 in the PFNT

Mark 12 in the RMNT

Mark 12 in the SBIAS

Mark 12 in the SBIBS

Mark 12 in the SBIBS2

Mark 12 in the SBICS

Mark 12 in the SBIDS

Mark 12 in the SBIGS

Mark 12 in the SBIHS

Mark 12 in the SBIIS

Mark 12 in the SBIIS2

Mark 12 in the SBIIS3

Mark 12 in the SBIKS

Mark 12 in the SBIKS2

Mark 12 in the SBIMS

Mark 12 in the SBIOS

Mark 12 in the SBIPS

Mark 12 in the SBISS

Mark 12 in the SBITS

Mark 12 in the SBITS2

Mark 12 in the SBITS3

Mark 12 in the SBITS4

Mark 12 in the SBIUS

Mark 12 in the SBIVS

Mark 12 in the SBT

Mark 12 in the SBT1E

Mark 12 in the SCHL

Mark 12 in the SNT

Mark 12 in the SUSU

Mark 12 in the SUSU2

Mark 12 in the SYNO

Mark 12 in the TBIAOTANT

Mark 12 in the TBT1E

Mark 12 in the TBT1E2

Mark 12 in the TFTIP

Mark 12 in the TFTU

Mark 12 in the TGNTATF3T

Mark 12 in the THAI

Mark 12 in the TNFD

Mark 12 in the TNT

Mark 12 in the TNTIK

Mark 12 in the TNTIL

Mark 12 in the TNTIN

Mark 12 in the TNTIP

Mark 12 in the TNTIZ

Mark 12 in the TOMA

Mark 12 in the TTENT

Mark 12 in the UBG

Mark 12 in the UGV

Mark 12 in the UGV2

Mark 12 in the UGV3

Mark 12 in the VBL

Mark 12 in the VDCC

Mark 12 in the YALU

Mark 12 in the YAPE

Mark 12 in the YBVTP

Mark 12 in the ZBP