Mark 3 (BOICB)

1 Nʼoge ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere, otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọkwa nʼebe ahụ. 2 Ụfọdụ ha nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ya ọrịa nʼụbọchị izuike. 3 Ma ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị, “Bilie guzoro nʼetiti ebe a.” 4 Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Olee nke ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike: ọ bụ ime ezi ihe ka ọ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?” Ma ha gbachiri nkịtị. 5 O lere ha anya nʼiwe, o wutere ya nʼihi na obi ha kpọrọ nkụ. Ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” O setịpụrụ aka ya, aka ya dizikwara nke ọma. 6 Ngwangwa, ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ nʼiwe. Gaa soro ndị otu Herọd gbaa izu otu ha ga-esi laa ya nʼiyi. 7 Ma Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sitere nʼebe ahụ pụọ gaa nọdụ nʼakụkụ osimiri. Igwe mmadụ ndị sitere na Galili sooro ya. 8 Mgbe ha nụrụ ihe niile ọ na-eme, ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya site na Judịa, na Jerusalem, na Idumia na obodo ndị dị nʼofe Jọdan, na gburugburu Taịa na Saịdọn. 9 Nʼihi ịdị ukwuu nke igwe mmadụ ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha debere ya ụgbọ mmiri nta nso ka ọ banye, iji gbochie igwe mmadụ ahụ ịkpagbu ya. 10 Nʼihi na ọ gwọọla ọtụtụ ndị ọrịa, nke mere na ndị bu ọrịa dị iche iche na-agbalịsị ike ịmetụ ya aka. 11 Mgbe ọbụla kwa ndị mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ha hụrụ ya, ha na-ada nʼala nʼihu ya na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke!” 12 Ma ọ na-enyesi ha iwu ike ka ha hapụ ịkọwa onye ọ bụ. 13 Ọ rigooro nʼelu ugwu ma kpọrọ ndị ọ chọrọ nye onwe ya. Ha bịakwutekwara ya. 14 Ọ họpụtara mmadụ iri na abụọ ndị ya na ha ga-anọ, mee ha ndị ozi. Ndị ọ ga-ezipụ ikwusa oziọma, 15 nakwa ndị ga-enwe ikike ịchụpụ mmụọ ọjọọ. 16 Ndị a bụ mmadụ iri na abụọ ndị ọ họpụtara. Saimọn (onye ọ kpọrọ Pita). 17 Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya (ndị ọ gụgharịrị aha Boanajis, nke pụtara “ụmụ egbe eluigwe”), 18 Andru,Filip,Batalomi,Matiu,Tọmọs,Jemis nwa Alfiọs,Tadiọs,Saimọn onye a na-akpọ Zilọt, 19 na Judas Iskarịọt, onye raara ya nye. 20 Emesịa, ọ lọtara nʼụlọ, ma igwe mmadụ gbakọtakwara ọzọ nke mere na ha enweghị ohere iri nri. 21 Mgbe ndị ikwu ya nụrụ nke a, ha bịara gbalịa idulata ya nʼụlọ ha, nʼihi na ndị mmadụ na-asị, “Isi adịghị ya mma.” 22 Ma ndị ozizi iwu si Jerusalem bịa sịrị, “Mmụọ Belzebub bi nʼime ya! Ọ bụkwa nʼike onyeisi ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.” 23 Ma ọ kpọrọ ha jiri ilu gwa ha okwu sị, “Ekwensu ọ pụrụ ịchụpụ ekwensu? 24 Ọ bụrụ na alaeze ekewa megide onwe ya alaeze ahụ apụghị iguzo. 25 Ọ bụrụ na ezinaụlọ ekewa megide onwe ya, ezinaụlọ ahụ apụghị iguzo. 26 Ọ bụrụkwa na ekwensu ebilie megide onwe ya si otu a nwee nkewa, o nweghị ike iguzo; kama ọgwụgwụ oge ya abịala nso. 27 Nʼezie, ọ dịghị onye nwere ike ịbanye nʼụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo ya niile, ma o bughị ụzọ kee nwoke ahụ siri ike agbụ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe ike ịbanye nʼụlọ ya, zukọrọ ngwongwo ya niile. 28 Nʼezie agwa m unu, na a ga-agbaghara ụmụ mmadụ mmehie na nkwulu niile nke ha kwuru. 29 Ma onye ọbụla ga-ekwulu Mmụọ Nsọ, enweghị ike ịgbaghara ya. Ọ bụ onye ikpe mmehie ebighị ebi mara.” 30 O kwuru nke a nʼihi na ha na-asị, “Mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya.” 31 Mgbe ahụ, nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke bịara, guzoro nʼezi. Ha ziri ozi ka a kpọọ ya. 32 Igwe mmadụ gbara ya gburugburu mgbe ahụ gwara ya sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na ndị nwanyị guzo nʼezi. Ha chọrọ ịhụ gị.” 33 Ọ zara sị, “Onye bụ nne m, ndị ole bụkwa ụmụnne m ndị nwoke?” 34 Mgbe ahụ, o lere ndị nọ ya gburugburu anya ma sị, “Ndị a bụ nne m, na ụmụnne m ndị nwoke! 35 Onye ọbụla na-eme uche Chineke bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.”

In Other Versions

Mark 3 in the ANGEFD

Mark 3 in the ANTPNG2D

Mark 3 in the AS21

Mark 3 in the BAGH

Mark 3 in the BBPNG

Mark 3 in the BBT1E

Mark 3 in the BDS

Mark 3 in the BEV

Mark 3 in the BHAD

Mark 3 in the BIB

Mark 3 in the BLPT

Mark 3 in the BNT

Mark 3 in the BNTABOOT

Mark 3 in the BNTLV

Mark 3 in the BOATCB

Mark 3 in the BOATCB2

Mark 3 in the BOBCV

Mark 3 in the BOCNT

Mark 3 in the BOECS

Mark 3 in the BOGWICC

Mark 3 in the BOHCB

Mark 3 in the BOHCV

Mark 3 in the BOHLNT

Mark 3 in the BOHNTLTAL

Mark 3 in the BOILNTAP

Mark 3 in the BOITCV

Mark 3 in the BOKCV

Mark 3 in the BOKCV2

Mark 3 in the BOKHWOG

Mark 3 in the BOKSSV

Mark 3 in the BOLCB

Mark 3 in the BOLCB2

Mark 3 in the BOMCV

Mark 3 in the BONAV

Mark 3 in the BONCB

Mark 3 in the BONLT

Mark 3 in the BONUT2

Mark 3 in the BOPLNT

Mark 3 in the BOSCB

Mark 3 in the BOSNC

Mark 3 in the BOTLNT

Mark 3 in the BOVCB

Mark 3 in the BOYCB

Mark 3 in the BPBB

Mark 3 in the BPH

Mark 3 in the BSB

Mark 3 in the CCB

Mark 3 in the CUV

Mark 3 in the CUVS

Mark 3 in the DBT

Mark 3 in the DGDNT

Mark 3 in the DHNT

Mark 3 in the DNT

Mark 3 in the ELBE

Mark 3 in the EMTV

Mark 3 in the ESV

Mark 3 in the FBV

Mark 3 in the FEB

Mark 3 in the GGMNT

Mark 3 in the GNT

Mark 3 in the HARY

Mark 3 in the HNT

Mark 3 in the IRVA

Mark 3 in the IRVB

Mark 3 in the IRVG

Mark 3 in the IRVH

Mark 3 in the IRVK

Mark 3 in the IRVM

Mark 3 in the IRVM2

Mark 3 in the IRVO

Mark 3 in the IRVP

Mark 3 in the IRVT

Mark 3 in the IRVT2

Mark 3 in the IRVU

Mark 3 in the ISVN

Mark 3 in the JSNT

Mark 3 in the KAPI

Mark 3 in the KBT1ETNIK

Mark 3 in the KBV

Mark 3 in the KJV

Mark 3 in the KNFD

Mark 3 in the LBA

Mark 3 in the LBLA

Mark 3 in the LNT

Mark 3 in the LSV

Mark 3 in the MAAL

Mark 3 in the MBV

Mark 3 in the MBV2

Mark 3 in the MHNT

Mark 3 in the MKNFD

Mark 3 in the MNG

Mark 3 in the MNT

Mark 3 in the MNT2

Mark 3 in the MRS1T

Mark 3 in the NAA

Mark 3 in the NASB

Mark 3 in the NBLA

Mark 3 in the NBS

Mark 3 in the NBVTP

Mark 3 in the NET2

Mark 3 in the NIV11

Mark 3 in the NNT

Mark 3 in the NNT2

Mark 3 in the NNT3

Mark 3 in the PDDPT

Mark 3 in the PFNT

Mark 3 in the RMNT

Mark 3 in the SBIAS

Mark 3 in the SBIBS

Mark 3 in the SBIBS2

Mark 3 in the SBICS

Mark 3 in the SBIDS

Mark 3 in the SBIGS

Mark 3 in the SBIHS

Mark 3 in the SBIIS

Mark 3 in the SBIIS2

Mark 3 in the SBIIS3

Mark 3 in the SBIKS

Mark 3 in the SBIKS2

Mark 3 in the SBIMS

Mark 3 in the SBIOS

Mark 3 in the SBIPS

Mark 3 in the SBISS

Mark 3 in the SBITS

Mark 3 in the SBITS2

Mark 3 in the SBITS3

Mark 3 in the SBITS4

Mark 3 in the SBIUS

Mark 3 in the SBIVS

Mark 3 in the SBT

Mark 3 in the SBT1E

Mark 3 in the SCHL

Mark 3 in the SNT

Mark 3 in the SUSU

Mark 3 in the SUSU2

Mark 3 in the SYNO

Mark 3 in the TBIAOTANT

Mark 3 in the TBT1E

Mark 3 in the TBT1E2

Mark 3 in the TFTIP

Mark 3 in the TFTU

Mark 3 in the TGNTATF3T

Mark 3 in the THAI

Mark 3 in the TNFD

Mark 3 in the TNT

Mark 3 in the TNTIK

Mark 3 in the TNTIL

Mark 3 in the TNTIN

Mark 3 in the TNTIP

Mark 3 in the TNTIZ

Mark 3 in the TOMA

Mark 3 in the TTENT

Mark 3 in the UBG

Mark 3 in the UGV

Mark 3 in the UGV2

Mark 3 in the UGV3

Mark 3 in the VBL

Mark 3 in the VDCC

Mark 3 in the YALU

Mark 3 in the YAPE

Mark 3 in the YBVTP

Mark 3 in the ZBP