Nahum 3 (BOICB)
1 Ahụhụ dịrị obodo ọbara,nke jupụtara nʼụgha,na ihe e zutere nʼohi.Ọ dịghị mgbe ị na-adịghị adọgbu. 2 Ụda ụtarị,ụda ụkwụ ụgbọ ịnyịnya,ikiri ụkwụ ịnyịnya na-agba ọsọ,na mkpọtụ nke ụgbọ ịnyịnya agha! 3 Ndị agha ịnyịnya,na-agbagharị na-efegharị mma agha na-egbu amụma,na ùbe ha na-egbuke egbuke.Ndị e gburu egbu dị ọtụtụ,ntụkọta ozu tọgbọrọ ebe niile,ozu a na-enweghị ike ịgụta ọnụ,ndị mmadụ na-asọ ngọngọ mgbe ha na-azọkwasị ozu ụkwụ na-agafe. 4 Ihe ndị a mere nʼihi enweghị afọ ojuju nke agụụ nke onye na-akwa iko,onye ji mma ile anya, nwanyị nwe mgbaasị dị iche iche,onye ji mba dị iche iche nʼagbụ site nʼịgba akwụna ya,na ọtụtụ mmadụ dị iche iche site na mgbaasị ya. 5 “Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.“Aga m ekpughepụ uwe gị, jiri ya kpuchie gị ihu,si otu a gosi mba niile nke ụwa ọtọ gị.Ihere ga-emekwa gị nʼihu alaeze niile. 6 Aga m awụkwasị gị ihe arụ dị iche iche,meso gị mmeso onye e ledara anya,mekwaa ka ị bụrụ ihe ilere anya nye mmadụ niile. 7 Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị,‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?” 8 Ị dị mma karịa Tibs,bụ obodo dị nʼọnụ mmiri Naịl,nke mmiri gbara gburugburu?Osimiri ahụ bụ ihe o ji echebe onwe ya,mmiri ahụ bụkwa mgbidi gbara ya gburugburu. 9 Kush na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ,Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya. 10 Ma otu ọ dị, ebugara ya nʼala ndị ọzọdịka ohu a dọtara nʼagha.A tụpịasịrị ụmụ ya a mụrụ ọhụrụ nʼelu nkume,nke dị nʼisi okporoụzọ ya niile.E fekwara nza iji kesaa ndị ya niile a na-asọpụrụ,e kekwara ndị ukwu ya niile mkpọrọ igwe. 11 Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke,ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo,ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị. 12 Ebe gị niile e wusiri ike dịka osisi fiignke mkpụrụ mbụ ya chara nʼelu ya.Ma mgbe a kwagharịrị yamkpụrụ ndị ahụ na-adaba nʼọnụ onye na-eri ya. 13 Lee ndị agha gị,ha niile bụ ụmụ nwanyị nʼetiti gị.E megheela ọnụ ụzọ ama nke ala gị niilenye ndị iro gị.Ọkụ erepịakwala na mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ unu niile. 14 Seta mmiri maka oge nnọchibido,mee ka ebe gị niile nke ewusiri ike siekwa ike karịa.Gwupụta ụrọ,zọta aja, jiri ụrọ ndị ahụkpụtakwa aja, rụzikwaa ụlọ ahụ. 15 Nʼebe ahụ ka ọkụ ga-erechapụ gị,mma agha ga-egbutu gị.Ọ ga-eripịa gị dịka igurube si erichapụ ihe niile dị ya nʼihu.Ọ bụladị ma i mee onwe gị ka i hie nne dịka ụkpana,maọbụ mụbaa dịka igurube. 16 Ị meela ka ndị ahịa gị mụbaa nʼọnụọgụgụ,baa ụba karịa kpakpando dị nʼeluigwe,dịka igurube ha na-eripịa ala ahụ,gbasaa nku ha efelaga 17 Ndị nche gị bara ụba igurube,ndị ode akwụkwọ gị dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka igwe igurubena-ebekwasị nʼelu mgbidi nʼụbọchị oyi.Ma mgbe anyanwụ wara, ha na-efelaga;ọ dịkwaghị onye maara ebe ha feere gaa. 18 Eze ndị Asịrịa, ndị ọzụzụ atụrụ gị na-ero ụra,ndị unu a na-asọpụrụ adaala nʼụra ọnwụ.Ndị gị niile agbasasịala nʼelu ugwu niile,ọ dịkwaghị onye ha nwere nke ga-achịkọta ha. 19 Ọ dịghị ihe nwere ike ime ka i si nʼọnọdụ ị nọ ugbu a biliekwa.Nʼihi na ọnya dị gị nʼahụ ga-egbu gị.Ndị niile nụrụ ihe dakwasịrị gịga-eji ọṅụ kụọ aka ha,nʼihi na onye ka mmadụ ahụ bụnke na-anụrụghị ụfụ nke enweghị obi ebere gị?
In Other Versions
Nahum 3 in the ANGEFD
Nahum 3 in the ANTPNG2D
Nahum 3 in the AS21
Nahum 3 in the BAGH
Nahum 3 in the BBPNG
Nahum 3 in the BBT1E
Nahum 3 in the BDS
Nahum 3 in the BEV
Nahum 3 in the BHAD
Nahum 3 in the BIB
Nahum 3 in the BLPT
Nahum 3 in the BNT
Nahum 3 in the BNTABOOT
Nahum 3 in the BNTLV
Nahum 3 in the BOATCB
Nahum 3 in the BOATCB2
Nahum 3 in the BOBCV
Nahum 3 in the BOCNT
Nahum 3 in the BOECS
Nahum 3 in the BOGWICC
Nahum 3 in the BOHCB
Nahum 3 in the BOHCV
Nahum 3 in the BOHLNT
Nahum 3 in the BOHNTLTAL
Nahum 3 in the BOILNTAP
Nahum 3 in the BOITCV
Nahum 3 in the BOKCV
Nahum 3 in the BOKCV2
Nahum 3 in the BOKHWOG
Nahum 3 in the BOKSSV
Nahum 3 in the BOLCB
Nahum 3 in the BOLCB2
Nahum 3 in the BOMCV
Nahum 3 in the BONAV
Nahum 3 in the BONCB
Nahum 3 in the BONLT
Nahum 3 in the BONUT2
Nahum 3 in the BOPLNT
Nahum 3 in the BOSCB
Nahum 3 in the BOSNC
Nahum 3 in the BOTLNT
Nahum 3 in the BOVCB
Nahum 3 in the BOYCB
Nahum 3 in the BPBB
Nahum 3 in the BPH
Nahum 3 in the BSB
Nahum 3 in the CCB
Nahum 3 in the CUV
Nahum 3 in the CUVS
Nahum 3 in the DBT
Nahum 3 in the DGDNT
Nahum 3 in the DHNT
Nahum 3 in the DNT
Nahum 3 in the ELBE
Nahum 3 in the EMTV
Nahum 3 in the ESV
Nahum 3 in the FBV
Nahum 3 in the FEB
Nahum 3 in the GGMNT
Nahum 3 in the GNT
Nahum 3 in the HARY
Nahum 3 in the HNT
Nahum 3 in the IRVA
Nahum 3 in the IRVB
Nahum 3 in the IRVG
Nahum 3 in the IRVH
Nahum 3 in the IRVK
Nahum 3 in the IRVM
Nahum 3 in the IRVM2
Nahum 3 in the IRVO
Nahum 3 in the IRVP
Nahum 3 in the IRVT
Nahum 3 in the IRVT2
Nahum 3 in the IRVU
Nahum 3 in the ISVN
Nahum 3 in the JSNT
Nahum 3 in the KAPI
Nahum 3 in the KBT1ETNIK
Nahum 3 in the KBV
Nahum 3 in the KJV
Nahum 3 in the KNFD
Nahum 3 in the LBA
Nahum 3 in the LBLA
Nahum 3 in the LNT
Nahum 3 in the LSV
Nahum 3 in the MAAL
Nahum 3 in the MBV
Nahum 3 in the MBV2
Nahum 3 in the MHNT
Nahum 3 in the MKNFD
Nahum 3 in the MNG
Nahum 3 in the MNT
Nahum 3 in the MNT2
Nahum 3 in the MRS1T
Nahum 3 in the NAA
Nahum 3 in the NASB
Nahum 3 in the NBLA
Nahum 3 in the NBS
Nahum 3 in the NBVTP
Nahum 3 in the NET2
Nahum 3 in the NIV11
Nahum 3 in the NNT
Nahum 3 in the NNT2
Nahum 3 in the NNT3
Nahum 3 in the PDDPT
Nahum 3 in the PFNT
Nahum 3 in the RMNT
Nahum 3 in the SBIAS
Nahum 3 in the SBIBS
Nahum 3 in the SBIBS2
Nahum 3 in the SBICS
Nahum 3 in the SBIDS
Nahum 3 in the SBIGS
Nahum 3 in the SBIHS
Nahum 3 in the SBIIS
Nahum 3 in the SBIIS2
Nahum 3 in the SBIIS3
Nahum 3 in the SBIKS
Nahum 3 in the SBIKS2
Nahum 3 in the SBIMS
Nahum 3 in the SBIOS
Nahum 3 in the SBIPS
Nahum 3 in the SBISS
Nahum 3 in the SBITS
Nahum 3 in the SBITS2
Nahum 3 in the SBITS3
Nahum 3 in the SBITS4
Nahum 3 in the SBIUS
Nahum 3 in the SBIVS
Nahum 3 in the SBT
Nahum 3 in the SBT1E
Nahum 3 in the SCHL
Nahum 3 in the SNT
Nahum 3 in the SUSU
Nahum 3 in the SUSU2
Nahum 3 in the SYNO
Nahum 3 in the TBIAOTANT
Nahum 3 in the TBT1E
Nahum 3 in the TBT1E2
Nahum 3 in the TFTIP
Nahum 3 in the TFTU
Nahum 3 in the TGNTATF3T
Nahum 3 in the THAI
Nahum 3 in the TNFD
Nahum 3 in the TNT
Nahum 3 in the TNTIK
Nahum 3 in the TNTIL
Nahum 3 in the TNTIN
Nahum 3 in the TNTIP
Nahum 3 in the TNTIZ
Nahum 3 in the TOMA
Nahum 3 in the TTENT
Nahum 3 in the UBG
Nahum 3 in the UGV
Nahum 3 in the UGV2
Nahum 3 in the UGV3
Nahum 3 in the VBL
Nahum 3 in the VDCC
Nahum 3 in the YALU
Nahum 3 in the YAPE
Nahum 3 in the YBVTP
Nahum 3 in the ZBP