Proverbs 14 (BOICB)
1 Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya,ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya. 2 Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ;ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị. 3 Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako,ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha. 4 Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha,ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ. 5 Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ,ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla. 6 Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya;ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ. 7 Si nʼebe onye nzuzu wezuga onwe gị,nʼihi na ị gaghị achọta ihe ọmụma nʼọnụ ya. 8 Amamihe nke onye nwere uche bụ ihe na-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga,ma enweghị uche nke ndị nzuzu bụ aghụghọ. 9 Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo;ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi. 10 Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya,ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya. 11 A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi,ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu. 12 Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ,ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ. 13 Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị,ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ. 14 Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi aghaghị inweta ụgwọ ọrụ ha,ma ezi mmadụ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya. 15 Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya;ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje. 16 Onye mara ihe na-atụ egwu ONYENWE ANYỊ na-ewezugakwa onwe ya nʼihe ọjọọ,ma onye nzuzu na-ewebiga iwe oke ma na-eche na ọ ka bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. 17 Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu,ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị. 18 Ndị na-enweghị uche na-enweta ụgwọ ọrụ nke uche gbagọrọ agbagọ,ma onye nwere uche na-enweta ihe ọmụma. 19 Ndị ọjọọ ga-akpọ isiala nʼihu ndị ezi mmadụ,ndị ajọ omume ga-ada nʼọnụ ụzọ ama ndị ezi omume. 20 Ọ bụladị ndị agbataobi onye ogbenye na-akpọ ya asị,ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi. 21 Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie,ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma. 22 Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu?Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. 23 Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru;ma oke okwu na-eweta ụkpa. 24 Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha,ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru. 25 Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ,ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ. 26 Onye ọbụla na-atụ egwu ONYENWE ANYỊ nwere ebe mgbaba;nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ. 27 Ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ bụ isi iyi nke ndụ;nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ. 28 Otuto onye eze na-enwe dabeere nʼọnụọgụgụ ndị ọ na-achị,e wezuga ndị ọ na-achị, eze enweghị ugwu ọbụla. 29 Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta,ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya. 30 Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo;ekworo na-eme ka o ree ure. 31 Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya,ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke. 32 Ọ bụladị nʼọnwụ onye ezi omume nwere ebe mgbaba nʼime Chineke,ma ndị ajọ omume na-ala nʼiyi, mgbe mbibi bịara. 33 Nʼobi onye nwere nghọta ka amamihe na-anọgide,ma ọ bụladị nʼetiti ndị nzuzu ọ na-eme ka amara ya. 34 Ezi omume na-ewuli mba elu,ma mmehie bụ ihe ihere nye ndị ọbụla. 35 Eze na-aṅụrị ọṅụ nʼihi odibo maara ihe;ma odibo na-eweta ihere na-akpali oke iwe ya.
In Other Versions
Proverbs 14 in the ANGEFD
Proverbs 14 in the ANTPNG2D
Proverbs 14 in the AS21
Proverbs 14 in the BAGH
Proverbs 14 in the BBPNG
Proverbs 14 in the BBT1E
Proverbs 14 in the BDS
Proverbs 14 in the BEV
Proverbs 14 in the BHAD
Proverbs 14 in the BIB
Proverbs 14 in the BLPT
Proverbs 14 in the BNT
Proverbs 14 in the BNTABOOT
Proverbs 14 in the BNTLV
Proverbs 14 in the BOATCB
Proverbs 14 in the BOATCB2
Proverbs 14 in the BOBCV
Proverbs 14 in the BOCNT
Proverbs 14 in the BOECS
Proverbs 14 in the BOGWICC
Proverbs 14 in the BOHCB
Proverbs 14 in the BOHCV
Proverbs 14 in the BOHLNT
Proverbs 14 in the BOHNTLTAL
Proverbs 14 in the BOILNTAP
Proverbs 14 in the BOITCV
Proverbs 14 in the BOKCV
Proverbs 14 in the BOKCV2
Proverbs 14 in the BOKHWOG
Proverbs 14 in the BOKSSV
Proverbs 14 in the BOLCB
Proverbs 14 in the BOLCB2
Proverbs 14 in the BOMCV
Proverbs 14 in the BONAV
Proverbs 14 in the BONCB
Proverbs 14 in the BONLT
Proverbs 14 in the BONUT2
Proverbs 14 in the BOPLNT
Proverbs 14 in the BOSCB
Proverbs 14 in the BOSNC
Proverbs 14 in the BOTLNT
Proverbs 14 in the BOVCB
Proverbs 14 in the BOYCB
Proverbs 14 in the BPBB
Proverbs 14 in the BPH
Proverbs 14 in the BSB
Proverbs 14 in the CCB
Proverbs 14 in the CUV
Proverbs 14 in the CUVS
Proverbs 14 in the DBT
Proverbs 14 in the DGDNT
Proverbs 14 in the DHNT
Proverbs 14 in the DNT
Proverbs 14 in the ELBE
Proverbs 14 in the EMTV
Proverbs 14 in the ESV
Proverbs 14 in the FBV
Proverbs 14 in the FEB
Proverbs 14 in the GGMNT
Proverbs 14 in the GNT
Proverbs 14 in the HARY
Proverbs 14 in the HNT
Proverbs 14 in the IRVA
Proverbs 14 in the IRVB
Proverbs 14 in the IRVG
Proverbs 14 in the IRVH
Proverbs 14 in the IRVK
Proverbs 14 in the IRVM
Proverbs 14 in the IRVM2
Proverbs 14 in the IRVO
Proverbs 14 in the IRVP
Proverbs 14 in the IRVT
Proverbs 14 in the IRVT2
Proverbs 14 in the IRVU
Proverbs 14 in the ISVN
Proverbs 14 in the JSNT
Proverbs 14 in the KAPI
Proverbs 14 in the KBT1ETNIK
Proverbs 14 in the KBV
Proverbs 14 in the KJV
Proverbs 14 in the KNFD
Proverbs 14 in the LBA
Proverbs 14 in the LBLA
Proverbs 14 in the LNT
Proverbs 14 in the LSV
Proverbs 14 in the MAAL
Proverbs 14 in the MBV
Proverbs 14 in the MBV2
Proverbs 14 in the MHNT
Proverbs 14 in the MKNFD
Proverbs 14 in the MNG
Proverbs 14 in the MNT
Proverbs 14 in the MNT2
Proverbs 14 in the MRS1T
Proverbs 14 in the NAA
Proverbs 14 in the NASB
Proverbs 14 in the NBLA
Proverbs 14 in the NBS
Proverbs 14 in the NBVTP
Proverbs 14 in the NET2
Proverbs 14 in the NIV11
Proverbs 14 in the NNT
Proverbs 14 in the NNT2
Proverbs 14 in the NNT3
Proverbs 14 in the PDDPT
Proverbs 14 in the PFNT
Proverbs 14 in the RMNT
Proverbs 14 in the SBIAS
Proverbs 14 in the SBIBS
Proverbs 14 in the SBIBS2
Proverbs 14 in the SBICS
Proverbs 14 in the SBIDS
Proverbs 14 in the SBIGS
Proverbs 14 in the SBIHS
Proverbs 14 in the SBIIS
Proverbs 14 in the SBIIS2
Proverbs 14 in the SBIIS3
Proverbs 14 in the SBIKS
Proverbs 14 in the SBIKS2
Proverbs 14 in the SBIMS
Proverbs 14 in the SBIOS
Proverbs 14 in the SBIPS
Proverbs 14 in the SBISS
Proverbs 14 in the SBITS
Proverbs 14 in the SBITS2
Proverbs 14 in the SBITS3
Proverbs 14 in the SBITS4
Proverbs 14 in the SBIUS
Proverbs 14 in the SBIVS
Proverbs 14 in the SBT
Proverbs 14 in the SBT1E
Proverbs 14 in the SCHL
Proverbs 14 in the SNT
Proverbs 14 in the SUSU
Proverbs 14 in the SUSU2
Proverbs 14 in the SYNO
Proverbs 14 in the TBIAOTANT
Proverbs 14 in the TBT1E
Proverbs 14 in the TBT1E2
Proverbs 14 in the TFTIP
Proverbs 14 in the TFTU
Proverbs 14 in the TGNTATF3T
Proverbs 14 in the THAI
Proverbs 14 in the TNFD
Proverbs 14 in the TNT
Proverbs 14 in the TNTIK
Proverbs 14 in the TNTIL
Proverbs 14 in the TNTIN
Proverbs 14 in the TNTIP
Proverbs 14 in the TNTIZ
Proverbs 14 in the TOMA
Proverbs 14 in the TTENT
Proverbs 14 in the UBG
Proverbs 14 in the UGV
Proverbs 14 in the UGV2
Proverbs 14 in the UGV3
Proverbs 14 in the VBL
Proverbs 14 in the VDCC
Proverbs 14 in the YALU
Proverbs 14 in the YAPE
Proverbs 14 in the YBVTP
Proverbs 14 in the ZBP