Acts 1 (BOICB)

1 Ezigbo enyi m Tiofilọs, nʼakwụkwọ m nke mbụ m dere gị banyere ihe niile Jisọs malitere ime nakwa ikuzi, 2 ruo nʼụbọchị e mere ka ọ laghachi nʼeluigwe mgbe o sitere nʼike Mmụọ nsọ nyesịa ndị na-eso ụzọ ya iwu, bụ ndị ọ họpụtara. 3 Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ nke ọnwụ, o gosiri ha onwe ya nʼụzọ dị iche iche nʼebe o doro anya na ya dị ndụ. O mere ka ha hụ ya anya nʼime iri ụbọchị anọ, na-akụziri ha banyere alaeze Chineke. 4 Nʼotu oge, ọ nọnyeere ha na nri, o nyere ha iwu a, “Unu esila na Jerusalem pụọ, kama cherenụ nkwa nke Nna m, nke unu nụrụ site nʼọnụ m. 5 Nʼihi na Jọn jiri mmiri mee unu baptizim, ma nʼoge na-adịghị anya, a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.” 6 Mgbe ha gbakọrọ, ha jụrụ ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugbu a ka i ga-enyeghachi Izrel alaeze ahụ?” 7 Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụghị ọrụ unu ịmata oge na mgbe Nna m na-akwado ihe o zubere ime nʼikike nke onwe ya. 8 Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ, unu ga-agbara m ama na Jerusalem, na Judịa niile ya na Sameria ruokwa ebe niile ụwa sọtụrụ.” 9 Mgbe o kwusiri nke a, e weliri ya elu mgbe ha na-ele anya, igwe ojii kpuchikwara ya, zopu ya nʼanya ha. 10 Mgbe ha na-elegidesi anya ike nʼeluigwe dịka ọ na-ala, na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe ọcha guzooro ha nso. 11 Ha sịrị, “Ndị ikom Galili, gịnị mere unu jiri guzoro ebe a na-ele anya nʼeluigwe? Jisọs a onye e sitere nʼetiti unu kpọrọ laa nʼeluigwe ga-alọghachikwa otu ahụ unu si hụ ya o siri laa nʼeluigwe.” 12 Ha sitere nʼUgwu a na-akpọ Oliv nke dị Jerusalem nso, njem nke otu ụbọchị izuike, laghachi na Jerusalem. 13 Mgbe ha batara nʼobodo, ha rigoro nʼime ụlọ ahụ dị nʼụlọ elu, ebe ha na-anọ. Ndị a bụ ndị nọ nʼụlọ ahụ: Pita, Jọn, Jemis na Andru,Filip na Tọmọs,Batalomi na Matiu,Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas nwa Jemis. 14 Ndị a niile ji otu obi nọgidesie ike nʼekpere. Ndị sonyere ha bụ ụfọdụ ndị inyom na Meri nne Jisọs, na ụmụnna ya. 15 Nʼoge ahụ, Pita bilitere nʼetiti ndị kwere ekwe ọnụọgụgụ ha dị ihe dị ka narị na iri abụọ, sị, 16 “Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo banyere Judas onye duuru ndị jidere Jisọs bịa. Mmụọ Nsọ kwuru na nke a ga-eme mgbe o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu nʼoge gara aga. 17 Ọ bụ otu nʼime anyị. O nwere oke nʼime ọrụ a.” 18 Ego ọ natara nʼihi ọrụ ọjọọ ya ka o jiri zụọ ala. Nʼala ahụ ka ọ dara sụọ isi nʼala, afọ ya etipuo, eriri afọ ya awụsịakwa. 19 Ndị niile bi na Jerusalem nụrụ akụkọ banyere ya. Nʼihi ya, ha kpọrọ ala ahụ nʼasụsụ ha Akeldama, nke pụtara Ala Ọbara. 20 Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma:“ ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu,ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’na,“ ‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’ 21 Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị, 22 bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.” 23 Ya mere, ha họpụtara mmadụ abụọ, Josef onye a na-akpọ Basabas (aha ya ọzọ bụkwa Jọstus) na Mataias. 24 Ha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ niile. Gosi anyị onye ị họpụtara nʼime mmadụ abụọ ndị a. 25 Ka ọ bụrụ onyeozi na onyendu nke ga-anọchi anya Judas onye nke hapụrụ ma gawa ebe o kwesiri ka ọ gaa.” 26 Ha fere ha nza. Nza ahụ makwara Mataias, ha gụnyere ya dị ka otu nʼime ndị ozi iri na otu ahụ.

In Other Versions

Acts 1 in the ANGEFD

Acts 1 in the ANTPNG2D

Acts 1 in the AS21

Acts 1 in the BAGH

Acts 1 in the BBPNG

Acts 1 in the BBT1E

Acts 1 in the BDS

Acts 1 in the BEV

Acts 1 in the BHAD

Acts 1 in the BIB

Acts 1 in the BLPT

Acts 1 in the BNT

Acts 1 in the BNTABOOT

Acts 1 in the BNTLV

Acts 1 in the BOATCB

Acts 1 in the BOATCB2

Acts 1 in the BOBCV

Acts 1 in the BOCNT

Acts 1 in the BOECS

Acts 1 in the BOGWICC

Acts 1 in the BOHCB

Acts 1 in the BOHCV

Acts 1 in the BOHLNT

Acts 1 in the BOHNTLTAL

Acts 1 in the BOILNTAP

Acts 1 in the BOITCV

Acts 1 in the BOKCV

Acts 1 in the BOKCV2

Acts 1 in the BOKHWOG

Acts 1 in the BOKSSV

Acts 1 in the BOLCB

Acts 1 in the BOLCB2

Acts 1 in the BOMCV

Acts 1 in the BONAV

Acts 1 in the BONCB

Acts 1 in the BONLT

Acts 1 in the BONUT2

Acts 1 in the BOPLNT

Acts 1 in the BOSCB

Acts 1 in the BOSNC

Acts 1 in the BOTLNT

Acts 1 in the BOVCB

Acts 1 in the BOYCB

Acts 1 in the BPBB

Acts 1 in the BPH

Acts 1 in the BSB

Acts 1 in the CCB

Acts 1 in the CUV

Acts 1 in the CUVS

Acts 1 in the DBT

Acts 1 in the DGDNT

Acts 1 in the DHNT

Acts 1 in the DNT

Acts 1 in the ELBE

Acts 1 in the EMTV

Acts 1 in the ESV

Acts 1 in the FBV

Acts 1 in the FEB

Acts 1 in the GGMNT

Acts 1 in the GNT

Acts 1 in the HARY

Acts 1 in the HNT

Acts 1 in the IRVA

Acts 1 in the IRVB

Acts 1 in the IRVG

Acts 1 in the IRVH

Acts 1 in the IRVK

Acts 1 in the IRVM

Acts 1 in the IRVM2

Acts 1 in the IRVO

Acts 1 in the IRVP

Acts 1 in the IRVT

Acts 1 in the IRVT2

Acts 1 in the IRVU

Acts 1 in the ISVN

Acts 1 in the JSNT

Acts 1 in the KAPI

Acts 1 in the KBT1ETNIK

Acts 1 in the KBV

Acts 1 in the KJV

Acts 1 in the KNFD

Acts 1 in the LBA

Acts 1 in the LBLA

Acts 1 in the LNT

Acts 1 in the LSV

Acts 1 in the MAAL

Acts 1 in the MBV

Acts 1 in the MBV2

Acts 1 in the MHNT

Acts 1 in the MKNFD

Acts 1 in the MNG

Acts 1 in the MNT

Acts 1 in the MNT2

Acts 1 in the MRS1T

Acts 1 in the NAA

Acts 1 in the NASB

Acts 1 in the NBLA

Acts 1 in the NBS

Acts 1 in the NBVTP

Acts 1 in the NET2

Acts 1 in the NIV11

Acts 1 in the NNT

Acts 1 in the NNT2

Acts 1 in the NNT3

Acts 1 in the PDDPT

Acts 1 in the PFNT

Acts 1 in the RMNT

Acts 1 in the SBIAS

Acts 1 in the SBIBS

Acts 1 in the SBIBS2

Acts 1 in the SBICS

Acts 1 in the SBIDS

Acts 1 in the SBIGS

Acts 1 in the SBIHS

Acts 1 in the SBIIS

Acts 1 in the SBIIS2

Acts 1 in the SBIIS3

Acts 1 in the SBIKS

Acts 1 in the SBIKS2

Acts 1 in the SBIMS

Acts 1 in the SBIOS

Acts 1 in the SBIPS

Acts 1 in the SBISS

Acts 1 in the SBITS

Acts 1 in the SBITS2

Acts 1 in the SBITS3

Acts 1 in the SBITS4

Acts 1 in the SBIUS

Acts 1 in the SBIVS

Acts 1 in the SBT

Acts 1 in the SBT1E

Acts 1 in the SCHL

Acts 1 in the SNT

Acts 1 in the SUSU

Acts 1 in the SUSU2

Acts 1 in the SYNO

Acts 1 in the TBIAOTANT

Acts 1 in the TBT1E

Acts 1 in the TBT1E2

Acts 1 in the TFTIP

Acts 1 in the TFTU

Acts 1 in the TGNTATF3T

Acts 1 in the THAI

Acts 1 in the TNFD

Acts 1 in the TNT

Acts 1 in the TNTIK

Acts 1 in the TNTIL

Acts 1 in the TNTIN

Acts 1 in the TNTIP

Acts 1 in the TNTIZ

Acts 1 in the TOMA

Acts 1 in the TTENT

Acts 1 in the UBG

Acts 1 in the UGV

Acts 1 in the UGV2

Acts 1 in the UGV3

Acts 1 in the VBL

Acts 1 in the VDCC

Acts 1 in the YALU

Acts 1 in the YAPE

Acts 1 in the YBVTP

Acts 1 in the ZBP