Isaiah 65 (BOICB)

1 “Ana m egosipụta onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.Ọ bụkwa ndị ahụ na-adịghị achọsi m ike na-achọta m.Ana m agwa mba ahụ nke na-adịghị akpọku aha m,asịrị m, ‘Lee m, anọ m nʼebe a.’ 2 Ogologo ụbọchị niile ka m gbasapụrụ aka m abụọnye ndị na-enupu isi,bụ ndị na-agbaso ụzọ na-ezighị ezindị a na-agbaso ihe ọbụla ha tụpụtara nʼuche ha, 3 ndị na-anọgide na-akpasu m iwenʼihu m mgbe niile,ndị na-achụ aja nʼubi ha a gbara ogige,nʼebe ịchụ aja eji brik wuo, 4 ndị na-anọdụ nʼetiti ili,ma na-anọdụkwa ọnọdụ abalị nʼebe nzuzo dị iche iche;ndị na-eri anụ ezi,ndị ite ofe ha jupụtara nʼanụ na-adịghị ọcha; 5 ndị na-asịrịta onwe ha, ‘Nọdụ iche, Abịala m nso,nʼihi na ị ga-emerụ m, adị m nsọ karịa gị!’Ma ndị dị otu a dịka anwụrụ ọkụ nʼimi m.Ha bụ ọkụ na-enwu ehihie na nʼabalị. 6 “Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị:Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju.E, aga m akwụghachi ha. 7 Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche,kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile.Aga m akwụghachi ha nʼuju,nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.” 8 Otu a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu,“Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnịndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya,nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m;Agaghị m ebibicha ha niile. 9 Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta,sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile.Ndị m họpụtara ga-eketa ha,ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ. 10 Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ;Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi,na ndị m na-achọsi m ike. 11 “Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ,ndị chezọrọ ugwu nsọ m,ndị na-edozi tebul maka Ihuọma,ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka. 12 Aga m eme ka unu zute mma agha;unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu.Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị;mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị.Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu,họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị.” 13 Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu,“Ndị ohu m ga-eriju afọ,ma unu ga-anọ agụụ,akpịrị ga-akpọkwa unu nkụ,ma ha ga-aṅụ mmiri.Unu ga-anọ nʼọnụma na ihere,ma ha ga-anọ nʼọṅụ. 14 Ndị ohu m ga-abụ abụnʼihi ọṅụ nke jupụtara nʼobi ha,ma unu ga-akwa akwa,nʼihi ihe mgbu nke obi unu,tiekwa mkpu akwa nʼihi obi ntiwa nke mmụọ unu. 15 Unu ga-ahapụ aha ununye ndị m họpụtara nye onwe m ka ọ bụrụ ihe ha ji abụ ọnụ;nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ ga-etigbu unu,ma ọ ga-akpọ ndị ohu ya aha ọzọ. 16 Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ,ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu,onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu.Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga,zokwa ha site nʼanya m. 17 “Nʼihi na lee, ana m ekeeluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ;ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla. 18 Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọnʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke,nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ. 19 Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem,nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m;a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ,maọbụ olu iti mkpu akwa. 20 “Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchuga-adị nʼebe ahụ ọzọ,a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya;nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọdị ka nwantakịrị;a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọdịka onye a bụrụ ọnụ. 21 Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya;ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha. 22 Ndị m agaghị ewukwa ụlọ hapụrụ ya ndị ọzọ,maọbụ ghaa mkpụrụ nʼubi nke ndị ọzọ ga-aghọrọ rie.Nʼihi na dịka osisi si adị ndụ ogologo ogeotu a ka ndị m ga-esi dịkwa ndụ ogologo oge.Ha ga-aṅụrịkwa ọṅụnʼihe ahụ ha ji aka ha rụpụta. 23 Ha agaghị adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.Ha agaghị amụtakwa ụmụ ndị ga-emesịa nwụchuo ọnwụ.Nʼihi na ha ga-abụ ndị ONYENWE ANYỊ gọziri,ha na ụmụ ụmụ ha. 24 Tupu ha akpọkuo m, aga m aza ha.Mgbe ha ka nọ na-agwa m banyere mkpa ha, aga m anụ, zakwa ekpere ha. 25 Nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-atakọ nri nʼotu ebe,ọdụm ga-ata ahịhịa dịka ehi,ma agwọ ọjọọ niile ga-ata aja!Ha agaghị emerụ ihe ọbụla ahụ,maọbụ bibie ihe ọbụla nʼugwu nsọ m.”Ka Onyenwe anyị kwuru.

In Other Versions

Isaiah 65 in the ANGEFD

Isaiah 65 in the ANTPNG2D

Isaiah 65 in the AS21

Isaiah 65 in the BAGH

Isaiah 65 in the BBPNG

Isaiah 65 in the BBT1E

Isaiah 65 in the BDS

Isaiah 65 in the BEV

Isaiah 65 in the BHAD

Isaiah 65 in the BIB

Isaiah 65 in the BLPT

Isaiah 65 in the BNT

Isaiah 65 in the BNTABOOT

Isaiah 65 in the BNTLV

Isaiah 65 in the BOATCB

Isaiah 65 in the BOATCB2

Isaiah 65 in the BOBCV

Isaiah 65 in the BOCNT

Isaiah 65 in the BOECS

Isaiah 65 in the BOGWICC

Isaiah 65 in the BOHCB

Isaiah 65 in the BOHCV

Isaiah 65 in the BOHLNT

Isaiah 65 in the BOHNTLTAL

Isaiah 65 in the BOILNTAP

Isaiah 65 in the BOITCV

Isaiah 65 in the BOKCV

Isaiah 65 in the BOKCV2

Isaiah 65 in the BOKHWOG

Isaiah 65 in the BOKSSV

Isaiah 65 in the BOLCB

Isaiah 65 in the BOLCB2

Isaiah 65 in the BOMCV

Isaiah 65 in the BONAV

Isaiah 65 in the BONCB

Isaiah 65 in the BONLT

Isaiah 65 in the BONUT2

Isaiah 65 in the BOPLNT

Isaiah 65 in the BOSCB

Isaiah 65 in the BOSNC

Isaiah 65 in the BOTLNT

Isaiah 65 in the BOVCB

Isaiah 65 in the BOYCB

Isaiah 65 in the BPBB

Isaiah 65 in the BPH

Isaiah 65 in the BSB

Isaiah 65 in the CCB

Isaiah 65 in the CUV

Isaiah 65 in the CUVS

Isaiah 65 in the DBT

Isaiah 65 in the DGDNT

Isaiah 65 in the DHNT

Isaiah 65 in the DNT

Isaiah 65 in the ELBE

Isaiah 65 in the EMTV

Isaiah 65 in the ESV

Isaiah 65 in the FBV

Isaiah 65 in the FEB

Isaiah 65 in the GGMNT

Isaiah 65 in the GNT

Isaiah 65 in the HARY

Isaiah 65 in the HNT

Isaiah 65 in the IRVA

Isaiah 65 in the IRVB

Isaiah 65 in the IRVG

Isaiah 65 in the IRVH

Isaiah 65 in the IRVK

Isaiah 65 in the IRVM

Isaiah 65 in the IRVM2

Isaiah 65 in the IRVO

Isaiah 65 in the IRVP

Isaiah 65 in the IRVT

Isaiah 65 in the IRVT2

Isaiah 65 in the IRVU

Isaiah 65 in the ISVN

Isaiah 65 in the JSNT

Isaiah 65 in the KAPI

Isaiah 65 in the KBT1ETNIK

Isaiah 65 in the KBV

Isaiah 65 in the KJV

Isaiah 65 in the KNFD

Isaiah 65 in the LBA

Isaiah 65 in the LBLA

Isaiah 65 in the LNT

Isaiah 65 in the LSV

Isaiah 65 in the MAAL

Isaiah 65 in the MBV

Isaiah 65 in the MBV2

Isaiah 65 in the MHNT

Isaiah 65 in the MKNFD

Isaiah 65 in the MNG

Isaiah 65 in the MNT

Isaiah 65 in the MNT2

Isaiah 65 in the MRS1T

Isaiah 65 in the NAA

Isaiah 65 in the NASB

Isaiah 65 in the NBLA

Isaiah 65 in the NBS

Isaiah 65 in the NBVTP

Isaiah 65 in the NET2

Isaiah 65 in the NIV11

Isaiah 65 in the NNT

Isaiah 65 in the NNT2

Isaiah 65 in the NNT3

Isaiah 65 in the PDDPT

Isaiah 65 in the PFNT

Isaiah 65 in the RMNT

Isaiah 65 in the SBIAS

Isaiah 65 in the SBIBS

Isaiah 65 in the SBIBS2

Isaiah 65 in the SBICS

Isaiah 65 in the SBIDS

Isaiah 65 in the SBIGS

Isaiah 65 in the SBIHS

Isaiah 65 in the SBIIS

Isaiah 65 in the SBIIS2

Isaiah 65 in the SBIIS3

Isaiah 65 in the SBIKS

Isaiah 65 in the SBIKS2

Isaiah 65 in the SBIMS

Isaiah 65 in the SBIOS

Isaiah 65 in the SBIPS

Isaiah 65 in the SBISS

Isaiah 65 in the SBITS

Isaiah 65 in the SBITS2

Isaiah 65 in the SBITS3

Isaiah 65 in the SBITS4

Isaiah 65 in the SBIUS

Isaiah 65 in the SBIVS

Isaiah 65 in the SBT

Isaiah 65 in the SBT1E

Isaiah 65 in the SCHL

Isaiah 65 in the SNT

Isaiah 65 in the SUSU

Isaiah 65 in the SUSU2

Isaiah 65 in the SYNO

Isaiah 65 in the TBIAOTANT

Isaiah 65 in the TBT1E

Isaiah 65 in the TBT1E2

Isaiah 65 in the TFTIP

Isaiah 65 in the TFTU

Isaiah 65 in the TGNTATF3T

Isaiah 65 in the THAI

Isaiah 65 in the TNFD

Isaiah 65 in the TNT

Isaiah 65 in the TNTIK

Isaiah 65 in the TNTIL

Isaiah 65 in the TNTIN

Isaiah 65 in the TNTIP

Isaiah 65 in the TNTIZ

Isaiah 65 in the TOMA

Isaiah 65 in the TTENT

Isaiah 65 in the UBG

Isaiah 65 in the UGV

Isaiah 65 in the UGV2

Isaiah 65 in the UGV3

Isaiah 65 in the VBL

Isaiah 65 in the VDCC

Isaiah 65 in the YALU

Isaiah 65 in the YAPE

Isaiah 65 in the YBVTP

Isaiah 65 in the ZBP