Jeremiah 30 (BOICB)
1 Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ bịakwute Jeremaya. 2 “Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel kwuru, ‘Dee ihe niile m gwara gị nʼime akwụkwọ. 3 Nʼihi na ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, ‘mgbe m ga-akpọghachite ndị m bụ Izrel na Juda si nʼebe e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọta. Aga m eme ka ha laghachi nʼala ahụ m nyere nna nna ha, ka ha nwetakwa ya.’ Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru.” 4 Ma ndị a bụ okwu ONYENWE ANYỊ kwuru banyere Izrel na Juda. 5 “Nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“ ‘A na-anụ mkpu akwa sitere nʼegwu,nke oke egwu, ọ bụghị udo. 6 Jụọnụ ajụjụ, ma hụ,nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ?Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ikeka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme,ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ? 7 Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ.O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya.Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb,ma a ga-anapụta ya site na ya. 8 “ ‘Nʼụbọchị ahụ,’‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu,tibisikwaa agbụ niile e kere ha.Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. 9 Kama ha ga-efe ONYENWE ANYỊ bụ Chineke ha,na Devid eze ha,onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha. 10 “ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m.Atụkwala ụjọ gị Izrel,’Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara.‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya,zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya.Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe.Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ. 11 Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri.‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi,bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha,agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam.Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri,ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’ 12 “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwukwara,“ ‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta,mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala. 13 O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị,o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa.Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị. 14 Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị;ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha.E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe;ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ,nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu,mmehie gị dịkwa ọtụtụ. 15 Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ?Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ?Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị,na nʼihi ọtụtụ mmehie gị. 16 “ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị;ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ.Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike.Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha. 17 Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike;aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ.Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’ 18 “Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“ ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu ya;aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya.A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya;ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya. 19 Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele,na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ.Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ,ha agaghị adịkwa ole na ole.Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ,ndị a na-agaghị eledakwa anya. 20 Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ,nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m.Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ. 21 Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha;onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta.Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso,nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam,maka ịbịaru m nso?’Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 22 ‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m,mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’ ” 23 Lee, ONYENWE ANYỊ ga-esite nʼọnụma yamee ka oke ifufe ya fee.Ọ ga-efekwasị ndị na-emebi iwudịka ifufe na-efesi ike. 24 Iwe ọkụ ONYENWE ANYỊ agaghị akwụsịtutu ruo mgbe o mezuruihe ndị o bu nʼobi.Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịaunu ga-aghọta ihe ndị a.