Lamentations 4 (BOICB)

1 Lee ka ọlaedo si chuo echu.Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma.Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile. 2 Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa,ndị dị oke ọnụahịa na mbụ dịka ọlaedo a nụchara anụcha,si dịrị ugbu a dịka ite ajanke ọkpụ ite kpụrụ. 3 Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara haazụ ụmụ ha,ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere;ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara. 4 Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ yanʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri,ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ. 5 Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche ichetọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ.Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhienọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa. 6 Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuukarịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm.Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya.Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka. 7 Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe,ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi.Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa;ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa. 8 Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi.A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi.Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha;ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ. 9 Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mmakarịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ,ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọnʼihi nri nke na-adịghị nʼubi. 10 Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebereji gbuo ụmụ ha, sie ha.Ụmụ ha ghọọrọ ha nrinʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi. 11 ONYENWE ANYỊ emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè;ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ.O sunyela ọkụ na Zayọn,nke rechapụrụ ntọala ya niile. 12 Ndị eze nke ụwa ekwetaghị;otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghịna ndị iro nwere ikesi nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem. 13 Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya,na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya,ndị wụsiri ọbarandị ezi omume nọ nʼetiti ya. 14 Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile,dịka ndị kpuru ìsì.Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha.O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka. 15 Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ!Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!”Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị,ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha,“O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a.” 16 ONYENWE ANYỊ nʼonwe ya achụsaala ha.Ọ gaghị agụnyekwa ha.Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja,ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara. 17 Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị,ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka.Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anyamaka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị. 18 Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere,nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị.Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị,tupu ọgwụgwụ anyị eruo. 19 Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ikekarịa ugo na-efe na mbara eluigwe.Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile,nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị. 20 Ume ndụ anyị, nke ONYENWE ANYỊ tere mmanụ,ka ha jidere nʼọnya ha.Anyị naara eche na anyị ga-ebi nʼokpuru ndo ya,nʼetiti mba dị iche iche. 21 Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm,onye nke bi nʼala Uz.Ma a ga-emesịakwa nye gị iko ahụ.Ị ga-esitekwa na ya ṅụọ ihe ọṅụṅụ ṅụjụbiga afọ oke. A ga-agbakwa gị ọtọ. 22 Gị ada Zayọn, ahụhụ gị agwụsịala;Ọ gaghị emekwa ka i jee biri ogologo oge na mba ọzọ.Kama, ọ ga-ata gị ahụhụ nʼihi mmehie gị, gị, ada Edọm,kpugheekwa ajọ omume gị niile.

In Other Versions

Lamentations 4 in the ANGEFD

Lamentations 4 in the ANTPNG2D

Lamentations 4 in the AS21

Lamentations 4 in the BAGH

Lamentations 4 in the BBPNG

Lamentations 4 in the BBT1E

Lamentations 4 in the BDS

Lamentations 4 in the BEV

Lamentations 4 in the BHAD

Lamentations 4 in the BIB

Lamentations 4 in the BLPT

Lamentations 4 in the BNT

Lamentations 4 in the BNTABOOT

Lamentations 4 in the BNTLV

Lamentations 4 in the BOATCB

Lamentations 4 in the BOATCB2

Lamentations 4 in the BOBCV

Lamentations 4 in the BOCNT

Lamentations 4 in the BOECS

Lamentations 4 in the BOGWICC

Lamentations 4 in the BOHCB

Lamentations 4 in the BOHCV

Lamentations 4 in the BOHLNT

Lamentations 4 in the BOHNTLTAL

Lamentations 4 in the BOILNTAP

Lamentations 4 in the BOITCV

Lamentations 4 in the BOKCV

Lamentations 4 in the BOKCV2

Lamentations 4 in the BOKHWOG

Lamentations 4 in the BOKSSV

Lamentations 4 in the BOLCB

Lamentations 4 in the BOLCB2

Lamentations 4 in the BOMCV

Lamentations 4 in the BONAV

Lamentations 4 in the BONCB

Lamentations 4 in the BONLT

Lamentations 4 in the BONUT2

Lamentations 4 in the BOPLNT

Lamentations 4 in the BOSCB

Lamentations 4 in the BOSNC

Lamentations 4 in the BOTLNT

Lamentations 4 in the BOVCB

Lamentations 4 in the BOYCB

Lamentations 4 in the BPBB

Lamentations 4 in the BPH

Lamentations 4 in the BSB

Lamentations 4 in the CCB

Lamentations 4 in the CUV

Lamentations 4 in the CUVS

Lamentations 4 in the DBT

Lamentations 4 in the DGDNT

Lamentations 4 in the DHNT

Lamentations 4 in the DNT

Lamentations 4 in the ELBE

Lamentations 4 in the EMTV

Lamentations 4 in the ESV

Lamentations 4 in the FBV

Lamentations 4 in the FEB

Lamentations 4 in the GGMNT

Lamentations 4 in the GNT

Lamentations 4 in the HARY

Lamentations 4 in the HNT

Lamentations 4 in the IRVA

Lamentations 4 in the IRVB

Lamentations 4 in the IRVG

Lamentations 4 in the IRVH

Lamentations 4 in the IRVK

Lamentations 4 in the IRVM

Lamentations 4 in the IRVM2

Lamentations 4 in the IRVO

Lamentations 4 in the IRVP

Lamentations 4 in the IRVT

Lamentations 4 in the IRVT2

Lamentations 4 in the IRVU

Lamentations 4 in the ISVN

Lamentations 4 in the JSNT

Lamentations 4 in the KAPI

Lamentations 4 in the KBT1ETNIK

Lamentations 4 in the KBV

Lamentations 4 in the KJV

Lamentations 4 in the KNFD

Lamentations 4 in the LBA

Lamentations 4 in the LBLA

Lamentations 4 in the LNT

Lamentations 4 in the LSV

Lamentations 4 in the MAAL

Lamentations 4 in the MBV

Lamentations 4 in the MBV2

Lamentations 4 in the MHNT

Lamentations 4 in the MKNFD

Lamentations 4 in the MNG

Lamentations 4 in the MNT

Lamentations 4 in the MNT2

Lamentations 4 in the MRS1T

Lamentations 4 in the NAA

Lamentations 4 in the NASB

Lamentations 4 in the NBLA

Lamentations 4 in the NBS

Lamentations 4 in the NBVTP

Lamentations 4 in the NET2

Lamentations 4 in the NIV11

Lamentations 4 in the NNT

Lamentations 4 in the NNT2

Lamentations 4 in the NNT3

Lamentations 4 in the PDDPT

Lamentations 4 in the PFNT

Lamentations 4 in the RMNT

Lamentations 4 in the SBIAS

Lamentations 4 in the SBIBS

Lamentations 4 in the SBIBS2

Lamentations 4 in the SBICS

Lamentations 4 in the SBIDS

Lamentations 4 in the SBIGS

Lamentations 4 in the SBIHS

Lamentations 4 in the SBIIS

Lamentations 4 in the SBIIS2

Lamentations 4 in the SBIIS3

Lamentations 4 in the SBIKS

Lamentations 4 in the SBIKS2

Lamentations 4 in the SBIMS

Lamentations 4 in the SBIOS

Lamentations 4 in the SBIPS

Lamentations 4 in the SBISS

Lamentations 4 in the SBITS

Lamentations 4 in the SBITS2

Lamentations 4 in the SBITS3

Lamentations 4 in the SBITS4

Lamentations 4 in the SBIUS

Lamentations 4 in the SBIVS

Lamentations 4 in the SBT

Lamentations 4 in the SBT1E

Lamentations 4 in the SCHL

Lamentations 4 in the SNT

Lamentations 4 in the SUSU

Lamentations 4 in the SUSU2

Lamentations 4 in the SYNO

Lamentations 4 in the TBIAOTANT

Lamentations 4 in the TBT1E

Lamentations 4 in the TBT1E2

Lamentations 4 in the TFTIP

Lamentations 4 in the TFTU

Lamentations 4 in the TGNTATF3T

Lamentations 4 in the THAI

Lamentations 4 in the TNFD

Lamentations 4 in the TNT

Lamentations 4 in the TNTIK

Lamentations 4 in the TNTIL

Lamentations 4 in the TNTIN

Lamentations 4 in the TNTIP

Lamentations 4 in the TNTIZ

Lamentations 4 in the TOMA

Lamentations 4 in the TTENT

Lamentations 4 in the UBG

Lamentations 4 in the UGV

Lamentations 4 in the UGV2

Lamentations 4 in the UGV3

Lamentations 4 in the VBL

Lamentations 4 in the VDCC

Lamentations 4 in the YALU

Lamentations 4 in the YAPE

Lamentations 4 in the YBVTP

Lamentations 4 in the ZBP