Psalms 37 (BOICB)

undefined Abụ Ọma Devid. 1 Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ,maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo; 2 nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa,dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa. 3 Tụkwasị ONYENWE ANYỊ obi meekwa ihe ziri ezi;biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ. 4 Ka ihe ONYENWE ANYỊ tọọ gị ụtọ.Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị. 5 Nyefee onwe gị nʼaka ONYENWE ANYỊ;tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a: 6 Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ,meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie. 7 Dere duu nʼihu ONYENWE ANYỊ,were ndidi chere ya;echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu,mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile. 8 Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe;echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ. 9 Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi,ma ndị niile olileanya ha dị na ONYENWE ANYỊ ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha. 10 Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga;ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha. 11 Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha,ha ga-enwekwa udo dị ukwuu. 12 Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume,na-ata ikekere eze megide ha; 13 ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị,nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa. 14 Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha,kwee ụta haime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa,igbu ndị ụzọ ha ziri ezi. 15 Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha,kụrisiekwa ụta ha. 16 Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nweredị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume; 17 nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume,ma ONYENWE ANYỊ ga-akwagide ndị ezi omume. 18 Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta ONYENWE ANYỊ,ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 19 Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ;ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ. 20 Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.Nʼagbanyeghị na ndị iro ONYENWE ANYỊ dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ,ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ. 21 Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya,ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere. 22 Ndị ONYENWE ANYỊ gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa,ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ. 23 Ọ bụrụ na ONYENWE ANYỊ nwere mmasị na ndụ mmadụ,ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike; 24 ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada,nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-eji aka ya ejigide ya. 25 Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi,ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume,maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri. 26 Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe,ụmụ ha ga-abụ ngọzị. 27 Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe,mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi. 28 ONYENWE ANYỊ na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya.Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi,ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ; 29 ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha,ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi. 30 Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta,ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi. 31 Iwu Chineke ya dị ya nʼobi;nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ. 32 Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo,na-achọ ịnapụ ha ndụ ha; 33 ma ONYENWE ANYỊ agaghị ahapụ ha nʼaka ha,ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe. 34 Chere ONYENWE ANYỊ,debekwa ụzọ ya.Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa;mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya. 35 Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike,ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala, 36 ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ,nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya. 37 Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama;ọganihu dịịrị onye udo. 38 Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi;ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ajọ omume. 39 Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka ONYENWE ANYỊ bịa;ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu. 40 ONYENWE ANYỊ na-enyere ha aka, na-anapụtakwa hama na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume,nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.

In Other Versions

Psalms 37 in the ANGEFD

Psalms 37 in the ANTPNG2D

Psalms 37 in the AS21

Psalms 37 in the BAGH

Psalms 37 in the BBPNG

Psalms 37 in the BBT1E

Psalms 37 in the BDS

Psalms 37 in the BEV

Psalms 37 in the BHAD

Psalms 37 in the BIB

Psalms 37 in the BLPT

Psalms 37 in the BNT

Psalms 37 in the BNTABOOT

Psalms 37 in the BNTLV

Psalms 37 in the BOATCB

Psalms 37 in the BOATCB2

Psalms 37 in the BOBCV

Psalms 37 in the BOCNT

Psalms 37 in the BOECS

Psalms 37 in the BOGWICC

Psalms 37 in the BOHCB

Psalms 37 in the BOHCV

Psalms 37 in the BOHLNT

Psalms 37 in the BOHNTLTAL

Psalms 37 in the BOILNTAP

Psalms 37 in the BOITCV

Psalms 37 in the BOKCV

Psalms 37 in the BOKCV2

Psalms 37 in the BOKHWOG

Psalms 37 in the BOKSSV

Psalms 37 in the BOLCB

Psalms 37 in the BOLCB2

Psalms 37 in the BOMCV

Psalms 37 in the BONAV

Psalms 37 in the BONCB

Psalms 37 in the BONLT

Psalms 37 in the BONUT2

Psalms 37 in the BOPLNT

Psalms 37 in the BOSCB

Psalms 37 in the BOSNC

Psalms 37 in the BOTLNT

Psalms 37 in the BOVCB

Psalms 37 in the BOYCB

Psalms 37 in the BPBB

Psalms 37 in the BPH

Psalms 37 in the BSB

Psalms 37 in the CCB

Psalms 37 in the CUV

Psalms 37 in the CUVS

Psalms 37 in the DBT

Psalms 37 in the DGDNT

Psalms 37 in the DHNT

Psalms 37 in the DNT

Psalms 37 in the ELBE

Psalms 37 in the EMTV

Psalms 37 in the ESV

Psalms 37 in the FBV

Psalms 37 in the FEB

Psalms 37 in the GGMNT

Psalms 37 in the GNT

Psalms 37 in the HARY

Psalms 37 in the HNT

Psalms 37 in the IRVA

Psalms 37 in the IRVB

Psalms 37 in the IRVG

Psalms 37 in the IRVH

Psalms 37 in the IRVK

Psalms 37 in the IRVM

Psalms 37 in the IRVM2

Psalms 37 in the IRVO

Psalms 37 in the IRVP

Psalms 37 in the IRVT

Psalms 37 in the IRVT2

Psalms 37 in the IRVU

Psalms 37 in the ISVN

Psalms 37 in the JSNT

Psalms 37 in the KAPI

Psalms 37 in the KBT1ETNIK

Psalms 37 in the KBV

Psalms 37 in the KJV

Psalms 37 in the KNFD

Psalms 37 in the LBA

Psalms 37 in the LBLA

Psalms 37 in the LNT

Psalms 37 in the LSV

Psalms 37 in the MAAL

Psalms 37 in the MBV

Psalms 37 in the MBV2

Psalms 37 in the MHNT

Psalms 37 in the MKNFD

Psalms 37 in the MNG

Psalms 37 in the MNT

Psalms 37 in the MNT2

Psalms 37 in the MRS1T

Psalms 37 in the NAA

Psalms 37 in the NASB

Psalms 37 in the NBLA

Psalms 37 in the NBS

Psalms 37 in the NBVTP

Psalms 37 in the NET2

Psalms 37 in the NIV11

Psalms 37 in the NNT

Psalms 37 in the NNT2

Psalms 37 in the NNT3

Psalms 37 in the PDDPT

Psalms 37 in the PFNT

Psalms 37 in the RMNT

Psalms 37 in the SBIAS

Psalms 37 in the SBIBS

Psalms 37 in the SBIBS2

Psalms 37 in the SBICS

Psalms 37 in the SBIDS

Psalms 37 in the SBIGS

Psalms 37 in the SBIHS

Psalms 37 in the SBIIS

Psalms 37 in the SBIIS2

Psalms 37 in the SBIIS3

Psalms 37 in the SBIKS

Psalms 37 in the SBIKS2

Psalms 37 in the SBIMS

Psalms 37 in the SBIOS

Psalms 37 in the SBIPS

Psalms 37 in the SBISS

Psalms 37 in the SBITS

Psalms 37 in the SBITS2

Psalms 37 in the SBITS3

Psalms 37 in the SBITS4

Psalms 37 in the SBIUS

Psalms 37 in the SBIVS

Psalms 37 in the SBT

Psalms 37 in the SBT1E

Psalms 37 in the SCHL

Psalms 37 in the SNT

Psalms 37 in the SUSU

Psalms 37 in the SUSU2

Psalms 37 in the SYNO

Psalms 37 in the TBIAOTANT

Psalms 37 in the TBT1E

Psalms 37 in the TBT1E2

Psalms 37 in the TFTIP

Psalms 37 in the TFTU

Psalms 37 in the TGNTATF3T

Psalms 37 in the THAI

Psalms 37 in the TNFD

Psalms 37 in the TNT

Psalms 37 in the TNTIK

Psalms 37 in the TNTIL

Psalms 37 in the TNTIN

Psalms 37 in the TNTIP

Psalms 37 in the TNTIZ

Psalms 37 in the TOMA

Psalms 37 in the TTENT

Psalms 37 in the UBG

Psalms 37 in the UGV

Psalms 37 in the UGV2

Psalms 37 in the UGV3

Psalms 37 in the VBL

Psalms 37 in the VDCC

Psalms 37 in the YALU

Psalms 37 in the YAPE

Psalms 37 in the YBVTP

Psalms 37 in the ZBP