Romans 7 (BOICB)
        
        
          1 Ọ bụ na unu amaghị ụmụnna m, unu ndị maara iwu nke ọma na ọ bụ oge mmadụ dị ndụ ka iwu na-ejide ya? 2 Dịka ihe ịmaatụ, iwu na-ejikọta nwanyị lụrụ di na di ya mgbe di ya ka nọ ndụ, ma ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, ọ nọkwaghị nʼokpuru iwu jikọtara ha dịka di na nwunye. 3 A ga-akpọ ya nwanyị na-akwa iko ma ọ bụrụ na ọ lakwuru nwoke ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ. Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼiwu ahụ. Ọ kwaghị iko ma ọ bụrụ na ọ lụọ nwoke ọzọ.  4 Ya mere, ụmụnna m, unu onwe unu kwa anwụọla nʼebe iwu dị site nʼahụ Kraịst, ka e nwe ike kenye unu onye ọzọ, bụ onye ahụ e mere ka o si nʼọnwụ bilie. Ka anyị site na ya mịa mkpụrụ nye Chineke. 5 Mgbe anụ ahụ mmehie na-achị anyị, ọchịchọ ọjọọ nke iwu na-akpali jupụtara nʼime anyị, nke mere na anyị na-amị mkpụrụ nye ọnwụ. 6 Ugbu a, a tọghapụla anyị pụọ nʼaka iwu ebe anyị nwụrụ nye ihe ndị kere anyị agbụ na mbụ, anyị anaghị ebikwa ndụ nʼusoro iwu ochie nke e dere nʼakwụkwọ, kama anyị na-eje ozi nʼusoro ndụ ọhụrụ nke mmụọ.  7 Ugbu a, gịnị ka anyị ga-ekwu? Iwu ahụ ọ bụ mmehie? Nʼezie, mbaa! Agaraghị m ama ihe mmehie bụ ma ọ bụghị site nʼiwu. Ọ bụrụ na iwu asịghị, “Enwela anya ukwu,”  agaraghị m ama na ọ bụ mmehie. 8 Ma mmehie sitere nʼiwu a megidere ọchịchọ ọjọọ, mee ka echiche m mgbe niile bụrụ ihe gbasara ihe ọjọọ, na otu m ga-esi mee ha. A sị na iwu adịghị, mmehie agaraghị adị. 9 Na mbụ, abụ m onye dị ndụ mgbe iwu na-adịghị, ma mgbe iwu bịara, e mere ka mmehie nwe ntute. 10 Anwụrụ m, ma chọpụta na iwu ahụ kwesiri iwetara m ndụ ghọziri ihe wetara ọnwụ. 11 Nʼihi na mmehie jiri ohere ahụ iwu webatara ghọgbuo m, sitekwa nʼiwu ahụ gbuo m. 12 Nʼezie, iwu ahụ dị nsọ, ihe e nyere nʼiwu dị nsọ, bụrụkwa ezi omume na ihe dị mma.  13 Mgbe ahụ, ọ pụtara na ihe ahụ dị mma wetaara m ọnwụ? Mba! Kama ọ bụ mmehie sitere nʼihe dị mma wetara m ọnwụ, ka e nwee ike gosipụta na mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya site nʼihe e nyere nʼiwu.  14 Anyị matara na iwu bụ ihe nke mmụọ ebe mụ onwe m bụ anụ ahụ efu, onye e rere dịka ohu nye mmehie. 15 O nweghị ụzọ ihe m na-eme si doo m anya. Nʼihi na ihe m na-eme abụghị ihe m chọrọ ime, ọ bụ ihe m kpọrọ asị bụ ihe na-agara m aka ime mgbe niile. 16 Ma ọ bụrụ na m eme ihe m na-achọghị ime, ana m ekwenye na iwu dị mma. 17 Ma dịka ọ dị, ọ bụkwaghị mụ onwe m na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ mmehie bi nʼime m. 18 O doro m anya na o nweghị ihe ọma ọbụla dị nʼime m, ya bụ nʼime anụ ahụ m. Nʼihi na ọ na-agụ m agụụ ime ezi ihe, ma ike ime ezi ihe adịghị nʼime m. 19 Ihe m na-eme mgbe m chọrọ ime ezi ihe abụghị ezi ihe ahụ m chọrọ ime kama ọ bụ ajọọ ihe ahụ m na-achọghị ime ka m na-eme. 20 Ọ bụrụ na m na-eme ihe ahụ m na-achọghị ime, ọ pụtara na ọ bụghị mụ onwe m na-eme ihe ndị ahụ. Kama ọ bụ mmehie bi nʼime m na-eme ha.  21 Achọpụtara m iwu nke na-arụ ọrụ nʼime m. Mgbe m chọrọ ime ihe ọma, naanị ihe ọjọọ bụ ihe na-agara m aka ime. 22 Nʼime ime onwe m, ọ na-agụ m agụụ ime ihe iwu Chineke kwuru. 23 Ma ana m ahụta iwu ọzọ dị nʼime m nke na-agba mgba megide iwu nke dị nʼuche m, ime ka m bụrụ ohu nye iwu nke mmehie na-arụ ọrụ ya nʼanụ ahụ m. 24 Lee ụdị ọnọdụ ọjọọ nke m hụtara onwe m nʼime ya! Onye pụrụ ịnapụta m site nʼanụ ahụ a nke na-eduba m nʼọnwụ? 25 Ma ekele dịrị Chineke, onye na-anapụta m site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị!Ya mere, nʼime mmụọ m, abụ m odibo nye iwu Chineke, ma nʼime anụ ahụ mmehie m, abụ m ohu nye iwu nke mmehie.
        
        
          In Other Versions
        
        
  
    Romans 7 in the ANGEFD
  
  
    Romans 7 in the ANTPNG2D
  
  
    Romans 7 in the AS21
  
  
    Romans 7 in the BAGH
  
  
    Romans 7 in the BBPNG
  
  
    Romans 7 in the BBT1E
  
  
    Romans 7 in the BDS
  
  
    Romans 7 in the BEV
  
  
    Romans 7 in the BHAD
  
  
    Romans 7 in the BIB
  
  
    Romans 7 in the BLPT
  
  
    Romans 7 in the BNT
  
  
    Romans 7 in the BNTABOOT
  
  
    Romans 7 in the BNTLV
  
  
    Romans 7 in the BOATCB
  
  
    Romans 7 in the BOATCB2
  
  
    Romans 7 in the BOBCV
  
  
    Romans 7 in the BOCNT
  
  
    Romans 7 in the BOECS
  
  
    Romans 7 in the BOGWICC
  
  
    Romans 7 in the BOHCB
  
  
    Romans 7 in the BOHCV
  
  
    Romans 7 in the BOHLNT
  
  
    Romans 7 in the BOHNTLTAL
  
  
    Romans 7 in the BOILNTAP
  
  
    Romans 7 in the BOITCV
  
  
    Romans 7 in the BOKCV
  
  
    Romans 7 in the BOKCV2
  
  
    Romans 7 in the BOKHWOG
  
  
    Romans 7 in the BOKSSV
  
  
    Romans 7 in the BOLCB
  
  
    Romans 7 in the BOLCB2
  
  
    Romans 7 in the BOMCV
  
  
    Romans 7 in the BONAV
  
  
    Romans 7 in the BONCB
  
  
    Romans 7 in the BONLT
  
  
    Romans 7 in the BONUT2
  
  
    Romans 7 in the BOPLNT
  
  
    Romans 7 in the BOSCB
  
  
    Romans 7 in the BOSNC
  
  
    Romans 7 in the BOTLNT
  
  
    Romans 7 in the BOVCB
  
  
    Romans 7 in the BOYCB
  
  
    Romans 7 in the BPBB
  
  
    Romans 7 in the BPH
  
  
    Romans 7 in the BSB
  
  
    Romans 7 in the CCB
  
  
    Romans 7 in the CUV
  
  
    Romans 7 in the CUVS
  
  
    Romans 7 in the DBT
  
  
    Romans 7 in the DGDNT
  
  
    Romans 7 in the DHNT
  
  
    Romans 7 in the DNT
  
  
    Romans 7 in the ELBE
  
  
    Romans 7 in the EMTV
  
  
    Romans 7 in the ESV
  
  
    Romans 7 in the FBV
  
  
    Romans 7 in the FEB
  
  
    Romans 7 in the GGMNT
  
  
    Romans 7 in the GNT
  
  
    Romans 7 in the HARY
  
  
    Romans 7 in the HNT
  
  
    Romans 7 in the IRVA
  
  
    Romans 7 in the IRVB
  
  
    Romans 7 in the IRVG
  
  
    Romans 7 in the IRVH
  
  
    Romans 7 in the IRVK
  
  
    Romans 7 in the IRVM
  
  
    Romans 7 in the IRVM2
  
  
    Romans 7 in the IRVO
  
  
    Romans 7 in the IRVP
  
  
    Romans 7 in the IRVT
  
  
    Romans 7 in the IRVT2
  
  
    Romans 7 in the IRVU
  
  
    Romans 7 in the ISVN
  
  
    Romans 7 in the JSNT
  
  
    Romans 7 in the KAPI
  
  
    Romans 7 in the KBT1ETNIK
  
  
    Romans 7 in the KBV
  
  
    Romans 7 in the KJV
  
  
    Romans 7 in the KNFD
  
  
    Romans 7 in the LBA
  
  
    Romans 7 in the LBLA
  
  
    Romans 7 in the LNT
  
  
    Romans 7 in the LSV
  
  
    Romans 7 in the MAAL
  
  
    Romans 7 in the MBV
  
  
    Romans 7 in the MBV2
  
  
    Romans 7 in the MHNT
  
  
    Romans 7 in the MKNFD
  
  
    Romans 7 in the MNG
  
  
    Romans 7 in the MNT
  
  
    Romans 7 in the MNT2
  
  
    Romans 7 in the MRS1T
  
  
    Romans 7 in the NAA
  
  
    Romans 7 in the NASB
  
  
    Romans 7 in the NBLA
  
  
    Romans 7 in the NBS
  
  
    Romans 7 in the NBVTP
  
  
    Romans 7 in the NET2
  
  
    Romans 7 in the NIV11
  
  
    Romans 7 in the NNT
  
  
    Romans 7 in the NNT2
  
  
    Romans 7 in the NNT3
  
  
    Romans 7 in the PDDPT
  
  
    Romans 7 in the PFNT
  
  
    Romans 7 in the RMNT
  
  
    Romans 7 in the SBIAS
  
  
    Romans 7 in the SBIBS
  
  
    Romans 7 in the SBIBS2
  
  
    Romans 7 in the SBICS
  
  
    Romans 7 in the SBIDS
  
  
    Romans 7 in the SBIGS
  
  
    Romans 7 in the SBIHS
  
  
    Romans 7 in the SBIIS
  
  
    Romans 7 in the SBIIS2
  
  
    Romans 7 in the SBIIS3
  
  
    Romans 7 in the SBIKS
  
  
    Romans 7 in the SBIKS2
  
  
    Romans 7 in the SBIMS
  
  
    Romans 7 in the SBIOS
  
  
    Romans 7 in the SBIPS
  
  
    Romans 7 in the SBISS
  
  
    Romans 7 in the SBITS
  
  
    Romans 7 in the SBITS2
  
  
    Romans 7 in the SBITS3
  
  
    Romans 7 in the SBITS4
  
  
    Romans 7 in the SBIUS
  
  
    Romans 7 in the SBIVS
  
  
    Romans 7 in the SBT
  
  
    Romans 7 in the SBT1E
  
  
    Romans 7 in the SCHL
  
  
    Romans 7 in the SNT
  
  
    Romans 7 in the SUSU
  
  
    Romans 7 in the SUSU2
  
  
    Romans 7 in the SYNO
  
  
    Romans 7 in the TBIAOTANT
  
  
    Romans 7 in the TBT1E
  
  
    Romans 7 in the TBT1E2
  
  
    Romans 7 in the TFTIP
  
  
    Romans 7 in the TFTU
  
  
    Romans 7 in the TGNTATF3T
  
  
    Romans 7 in the THAI
  
  
    Romans 7 in the TNFD
  
  
    Romans 7 in the TNT
  
  
    Romans 7 in the TNTIK
  
  
    Romans 7 in the TNTIL
  
  
    Romans 7 in the TNTIN
  
  
    Romans 7 in the TNTIP
  
  
    Romans 7 in the TNTIZ
  
  
    Romans 7 in the TOMA
  
  
    Romans 7 in the TTENT
  
  
    Romans 7 in the UBG
  
  
    Romans 7 in the UGV
  
  
    Romans 7 in the UGV2
  
  
    Romans 7 in the UGV3
  
  
    Romans 7 in the VBL
  
  
    Romans 7 in the VDCC
  
  
    Romans 7 in the YALU
  
  
    Romans 7 in the YAPE
  
  
    Romans 7 in the YBVTP
  
  
    Romans 7 in the ZBP