Acts 20 (BOICB)

1 Mgbe ọgbaaghara ndị a kwụsịrị, Pọl kpọkwara ndị na-eso ụzọ ahụ, gbaa ha ume, gwa ha ka ha nọdụ nke ọma, ọ pụrụ gawa Masidonia. 2 Mgbe ọ gagharịchara nʼakụkụ ala ahụ niile, werekwa okwu nkasiobi gbaa ndị ụmụnna ume, ọ bịaruru ala Griis. 3 Ọ nọrọ ọnwa atọ nʼebe ahụ. Mgbe ọ chọpụtara na ndị Juu agbaala ajọ izu megide ya dịka ọ na-ejikere iso ụgbọ mmiri gaa Siria, o kpebiri ka ya si ụzọ Masidonia laghachi. 4 Sopata onye Boria bụ ọkpara Pirọs, na Arịstakọs, na Sekundus ndị si na Tesalonaịka, na Gaiọs onye Debi na Timoti, na Taịkikọs na Trofimọs, ndị Eshịa sokwa ya na-aga ije a. 5 Ndị a bu ụzọ gawa, na-eche anyị na Troas. 6 Mgbe Mmemme Ngabiga ahụ gwụsịrị, anyị banyere ụgbọ mmiri rute Filipai bịakwute ha na Troas nʼụbọchị nke ise. Anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị asaa. 7 Nʼụbọchị mbụ nʼizu ụka, mgbe anyị zukọrọ ịnyawa achịcha, Pọl gwara ha okwu, ebe ọ na-akwado ịla ma chi bọọ, o kwugidere okwu ruo nʼetiti abalị. 8 Ọtụtụ oriọna dịkwa nʼime ọnụụlọ ahụ dị nʼụlọ elu ebe anyị zukọrọ. 9 Otu nwokorobịa a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala nʼoghereikuku, ọ bụ onye oke ụra bidoro ịtụ dịka Pọl na-ekwu okwu ruo oge dị anya. Mgbe ọ dara nʼoke ụra a, o sitere na nʼụlọ elu nke atọ dapụ, daa nʼala. Mgbe e buliri ya, ọ bụ onye nwụrụ anwụ. 10 Pọl rituru nʼala selite ya elu jikụọ ya. Ọ sịrị ndị gbakọrọ nʼebe ahụ sị, “Ka obi hapụ ịlọ unu mmiri ọ dị ndụ.” 11 Ọ laghachikwara nʼụlọ elu ahụ, mgbe ọ nyawachara achịcha ma riekwa, o kwugidere okwu tutu chi abọọ, ọ hapụrụ ha bilie ije ya. 12 Ha kulitere nwokorobịa ahụ na ndụ nke mere ka ọṅụ jupụta ha nʼobi. Ọ gbakwara ha ume nke ukwuu. 13 Anyị onwe anyị gara nʼihu banye nʼụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ebe anyị zubere iburu Pọl nʼụgbọ anyị. O soghị anyị nʼihi na o zubere iji ụkwụ ruo ebe ahụ. 14 Mgbe o zutere anyị nʼAsọs, anyị buru ya nʼụgbọ gaa Mitilen. 15 Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị rutere Kiọs, nʼụbọchị nke so ya, anyị gafere rute Samọs. Ma mgbe otu ụbọchị ọzọ gasịrị, anyị rutere Melitọs. 16 Nʼoge a, Pọl kpebiri na ọ gaghị akwụsị nʼEfesọs ka ọ ghara itufu oge nʼEshịa, nʼihi na ọ na-eme ngwangwa irute Jerusalem nʼụbọchị mmemme Pentikọọsụ, ma ọ bụrụ ihe ọ pụrụ ime. 17 Site na Melitọs, ọ zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye chọọchị nke Efesọs ka ha bịa zute ya. 18 Oge ha bịakwutere ya, ọ gwara ha, “Unu maara nke ọma otu m si nọ nʼetiti unu mgbe niile mụ na unu nọrọ, site nʼụbọchị mbụ ụkwụ m zọkwasịrị nʼala Eshịa tutu ruo ugbu a. 19 Arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nʼobi umeala na anya mmiri nʼetiti ntaramahụhụ dị ukwuu, site nʼizu ọjọọ ndị Juu gbara maka m. 20 Unu hụrụ na m ahapụghị ime ka unu mara ihe ọbụla ga-abara unu uru, mgbe ọbụla m na-akụziri unu ihe nʼụlọ maọbụ nʼihu ọha. 21 E kwusaala m nye ma ndị Juu ma ndị Griik okwu nchegharị nʼebe Chineke nọ, na okwukwe nʼebe Onyenwe anyị Jisọs nọ. 22 “Ma otu ọ dị, ana m aga Jerusalem dịka iwu Mmụọ Nsọ nyere m si dị, ma amaghị m ihe ọnọdụ m ga-abụ nʼebe ahụ. 23 Karịakwa na Mmụọ Nsọ na-agbara m ama nʼebe ọbụla na mkpọrọ na ntaramahụhụ na-eche m nʼebe ahụ. 24 Ma akpọghị m ndụ m ihe ọbụla. Karịa naanị ka m gbazuo ọsọ m ma jezuokwa ozi ahụ m natara nʼaka Onyenwe anyị Jisọs, nke bụ ịkọwa banyere oziọma nke amara Chineke. 25 “Ma ugbu a, amaara m na o nweghị onye ọbụla nʼime unu, bụ ndị m jegharịrị nʼetiti ha na-ezisara ihe banyere alaeze a ga-ahụ m anya ọzọ. 26 Ya mere, ana m agwasị unu ike, taa, na abụ m onye aka ya dị ọcha nʼebe ọbara onye ọbụla nʼime unu dị. 27 Nʼihi na-esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu. 28 Ma ugbu a, kpacharanụ anya! Leziekwanụ onwe unu na igwe atụrụ nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị nlekọta anya ya. Ka unu bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nke chọọchị Chineke, bụ nke o ji ọbara ya zụtara onwe ya. 29 Nʼihi na amaara m na mgbe m lachara, agụ jọgburu onwe ya ga-abata nʼetiti unu nke na-agaghị emere igwe atụrụ ebere. 30 Ụfọdụ nʼime unu ga-ebili tụgharịa eziokwu ahụ ịhụ ka ha si otu a dọrọ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ nye onwe ha. 31 Ya mere, na-echenụ nche! Chetakwanụ na nʼime afọ atọ m nọrọ nʼetiti unu, ehihie na abalị, eji m ịkwa akwa na anya mmiri na-adụ unu ọdụ. 32 “Ugbu a ana m etife unu nʼaka Chineke na nlekọta ya. Ana m etifekwa unu nʼaka okwu amara ya nke pụrụ ịgba okwukwe unu ume na inyekwa unu akụnụba ọ kwadobeere ndị ahụ e doro nsọ. 33 Ọ dịghị mgbe ọbụla agụụ ịdọtara onwe m ọlaọcha maọbụ ọlaedo maọbụ uwe nke onye ọbụla ji gụọ m. 34 Ọ bakwaghị uru ịgwa unu na ọ bụ aka m rụpụtara ọrụ gbooro m mkpa niile, na nke gbokwara mkpa ndị ahụ mụ na ha so. 35 Nʼihe niile, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka, site nʼịrụ ọrụ nʼụzọ dị otu a, na-echetara m okwu nke Onyenwe anyị Jisọs kwuru sị, ‘Ngọzị karịrị dị nʼinye enye karịa ịnara anara.’ ” 36 Mgbe o kwusiri okwu ndị a, o soro ha niile gbuo ikpere nʼala kpekwa ekpere. 37 Ha bere akwa nke ukwuu, makụọ Pọl, sutukwa ya ọnụ. 38 O wutere ha karịa na o kwuru na ha agaghị ahụ ya anya ọzọ. Emesịa, ha duru ya ruo ebe ọ banyere ụgbọ mmiri.

In Other Versions

Acts 20 in the ANGEFD

Acts 20 in the ANTPNG2D

Acts 20 in the AS21

Acts 20 in the BAGH

Acts 20 in the BBPNG

Acts 20 in the BBT1E

Acts 20 in the BDS

Acts 20 in the BEV

Acts 20 in the BHAD

Acts 20 in the BIB

Acts 20 in the BLPT

Acts 20 in the BNT

Acts 20 in the BNTABOOT

Acts 20 in the BNTLV

Acts 20 in the BOATCB

Acts 20 in the BOATCB2

Acts 20 in the BOBCV

Acts 20 in the BOCNT

Acts 20 in the BOECS

Acts 20 in the BOGWICC

Acts 20 in the BOHCB

Acts 20 in the BOHCV

Acts 20 in the BOHLNT

Acts 20 in the BOHNTLTAL

Acts 20 in the BOILNTAP

Acts 20 in the BOITCV

Acts 20 in the BOKCV

Acts 20 in the BOKCV2

Acts 20 in the BOKHWOG

Acts 20 in the BOKSSV

Acts 20 in the BOLCB

Acts 20 in the BOLCB2

Acts 20 in the BOMCV

Acts 20 in the BONAV

Acts 20 in the BONCB

Acts 20 in the BONLT

Acts 20 in the BONUT2

Acts 20 in the BOPLNT

Acts 20 in the BOSCB

Acts 20 in the BOSNC

Acts 20 in the BOTLNT

Acts 20 in the BOVCB

Acts 20 in the BOYCB

Acts 20 in the BPBB

Acts 20 in the BPH

Acts 20 in the BSB

Acts 20 in the CCB

Acts 20 in the CUV

Acts 20 in the CUVS

Acts 20 in the DBT

Acts 20 in the DGDNT

Acts 20 in the DHNT

Acts 20 in the DNT

Acts 20 in the ELBE

Acts 20 in the EMTV

Acts 20 in the ESV

Acts 20 in the FBV

Acts 20 in the FEB

Acts 20 in the GGMNT

Acts 20 in the GNT

Acts 20 in the HARY

Acts 20 in the HNT

Acts 20 in the IRVA

Acts 20 in the IRVB

Acts 20 in the IRVG

Acts 20 in the IRVH

Acts 20 in the IRVK

Acts 20 in the IRVM

Acts 20 in the IRVM2

Acts 20 in the IRVO

Acts 20 in the IRVP

Acts 20 in the IRVT

Acts 20 in the IRVT2

Acts 20 in the IRVU

Acts 20 in the ISVN

Acts 20 in the JSNT

Acts 20 in the KAPI

Acts 20 in the KBT1ETNIK

Acts 20 in the KBV

Acts 20 in the KJV

Acts 20 in the KNFD

Acts 20 in the LBA

Acts 20 in the LBLA

Acts 20 in the LNT

Acts 20 in the LSV

Acts 20 in the MAAL

Acts 20 in the MBV

Acts 20 in the MBV2

Acts 20 in the MHNT

Acts 20 in the MKNFD

Acts 20 in the MNG

Acts 20 in the MNT

Acts 20 in the MNT2

Acts 20 in the MRS1T

Acts 20 in the NAA

Acts 20 in the NASB

Acts 20 in the NBLA

Acts 20 in the NBS

Acts 20 in the NBVTP

Acts 20 in the NET2

Acts 20 in the NIV11

Acts 20 in the NNT

Acts 20 in the NNT2

Acts 20 in the NNT3

Acts 20 in the PDDPT

Acts 20 in the PFNT

Acts 20 in the RMNT

Acts 20 in the SBIAS

Acts 20 in the SBIBS

Acts 20 in the SBIBS2

Acts 20 in the SBICS

Acts 20 in the SBIDS

Acts 20 in the SBIGS

Acts 20 in the SBIHS

Acts 20 in the SBIIS

Acts 20 in the SBIIS2

Acts 20 in the SBIIS3

Acts 20 in the SBIKS

Acts 20 in the SBIKS2

Acts 20 in the SBIMS

Acts 20 in the SBIOS

Acts 20 in the SBIPS

Acts 20 in the SBISS

Acts 20 in the SBITS

Acts 20 in the SBITS2

Acts 20 in the SBITS3

Acts 20 in the SBITS4

Acts 20 in the SBIUS

Acts 20 in the SBIVS

Acts 20 in the SBT

Acts 20 in the SBT1E

Acts 20 in the SCHL

Acts 20 in the SNT

Acts 20 in the SUSU

Acts 20 in the SUSU2

Acts 20 in the SYNO

Acts 20 in the TBIAOTANT

Acts 20 in the TBT1E

Acts 20 in the TBT1E2

Acts 20 in the TFTIP

Acts 20 in the TFTU

Acts 20 in the TGNTATF3T

Acts 20 in the THAI

Acts 20 in the TNFD

Acts 20 in the TNT

Acts 20 in the TNTIK

Acts 20 in the TNTIL

Acts 20 in the TNTIN

Acts 20 in the TNTIP

Acts 20 in the TNTIZ

Acts 20 in the TOMA

Acts 20 in the TTENT

Acts 20 in the UBG

Acts 20 in the UGV

Acts 20 in the UGV2

Acts 20 in the UGV3

Acts 20 in the VBL

Acts 20 in the VDCC

Acts 20 in the YALU

Acts 20 in the YAPE

Acts 20 in the YBVTP

Acts 20 in the ZBP