Acts 25 (BOICB)

1 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site nʼoge Festọs bịara na mpaghara ọchịchị ya, o sitere Sizaria garuo Jerusalem. 2 Nʼebe ahụ ka ndịisi nchụaja na ndịisi ndị Juu kọwara ya ihe banyere Pọl. 3 Ha rịọkwara ya nʼamara ọ ga-emere ha bụ ime ka Pọl bịa na Jerusalem. Nʼihi na ha agbaala izu igbu ya nʼụzọ. 4 Ma Festọs zara, “Pọl nọ dịka onye mkpọrọ na Sizaria. Ebe ahụ ka mụ onwe m ga-alaghachi na mgbe na-adịghị anya. 5 Ya mere, ka ndịisi unu ji ikike soro m gaa, boo nwoke ahụ ebubo ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọjọọ o mere.” 6 Ọ nọnyeere ha ihe dịka ụbọchị asatọ maọbụ ụbọchị iri, tupu ọ laghachi na Sizaria. Nʼụbọchị so ya, ọ nọdụrụ nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọpụta Pọl. 7 Mgbe ọ bịaruru, ndị Juu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu na-ekwu ọtụtụ ihe megide ya nke ha na-enweghị ike ịkọwa. 8 Ma Pọl gọọrọ onwe ya, na-asị, “Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide iwu ndị Juu maọbụ ụlọnsọ, maọbụ Siza.” 9 Ma ebe Festọs na-achọ inwe ihuọma nʼebe ndị Juu nọ, ọ sịrị Pọl, “Ị chọrọ ịga Jerusalem ka m kpee gị ikpe nʼebe ahụ?” 10 Ma Pọl sịrị, “Eguzo m nʼụlọikpe Siza nʼonwe ya, ebe e kwesiri ka a nọdụ kpee m ikpe. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ndị Juu, dịka ị maara nke ọma. 11 Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere kwesiri ọnwụ, anaghị m arịọ ka m gbanarị ọnwụ. Ma ọ bụrụ na ọ dịghị eziokwu dị nʼebubo ndị Juu a na-ebo m, mmadụ ọbụla agaghị e were m nyefee nʼaka ha. Ya mere, ọ bụ Siza ka m na-akpọku.” 12 Ya mere, mgbe Festọs na ndị na-adụ ya ọdụ gbara izu, ọ zara, “Ị kpọkuola Siza, ọ bụkwa Siza ka ị ga-agakwuru.” 13 Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, eze Agripa na Benaisi bịara Sizaria ịnabata Festọs. 14 Mgbe ha nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, Festọs kọwara eze a ọnọdụ Pọl sị, “Ọ dị nwoke Feliks hapụrụ nʼụlọ mkpọrọ nʼebe a. 15 Mgbe m gara Jerusalem, ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu gwara m banyere ya. Ha rịọkwara ka m maa ya ikpe. 16 “Ma emere m ka ha ghọta na o megidere iwu ndị Rom ịrara mmadụ ọbụla nye tupu ekpee ya ikpe nyekwa ya ohere ịgọrọ onwe ya nʼihu ndị na-ebo ya ebubo. 17 Nʼihi nke a, mgbe ha bịara nʼebe a, atụfughị m oge ọbụla, kama nʼụbọchị nke ọzọ ya, anọdụrụ m nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọbata nwoke ahụ. 18 Mgbe ndị na-ebo ya ebubo biliri, ọ dịghị otu nʼime ụrụ ala ndị m chere ha ga-akpọ aha nke ha gụpụtara na o mere. 19 Okwu ha niile bụ ịrụ ụka banyere okpukpe ha, na banyere otu onye ọzọ a na-akpọ Jisọs onye nwụrụ, onye Pọl na-ekwusịkwa ike na ọ dị ndụ. 20 Ọ rara m ahụ imedo okwu dị otu a. Nʼihi ya, a jụrụ m ya ma ọ ga-amasị ya ị ga nʼụlọikpe dị na Jerusalem ka ọ nọrọ nʼebe ahụ gọrọ onwe ya. 21 Ma Pọl rịọrọ ka e debe ya nʼụlọ mkpọrọ ruo mgbe Siza nʼonwe ya ga-ekpebi ikpe ya. Ya mere, ezighachiri m ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo mgbe m jikeere izigara ya Siza.” 22 Agripa gwara Festọs, “Achọrọ m ịnụ okwu site nʼọnụ nwoke a nʼonwe ya.”Ọ sịrị, “Ị ga-anụ ya echi.” 23 Ya mere, nʼechi ya, Agripa na Benaisi rutere nʼụlọ ọha na-anọ anụ ikpe nʼoke nganga. Ọtụtụ ndịisi agha na ndị a maara aha ha nʼobodo a sooro ha. Festọs nyere iwu ka a kpọbata Pọl. 24 Festọs sịrị, “Eze Agripa na ndị niile soro anyị nọrọ nʼebe a, unu ahụla nwoke a onye ọha ndị Juu niile, ma ndị nọ nʼebe a ma ndị nọ na Jerusalem, wetara ikpe ya nʼaka m na-eti mkpu na o kwesighị ịdị ndụ ọzọ. 25 Ma achọpụtaghị m ihe ọjọọ o mere nke kwesiri ka ọ nwụọ. Ma ebe ọ rịọrọ ka Siza lenye ikpe ya anya, ekpebiri m iziga ya. 26 Ma enweghị m ihe ọbụla doro anya m ga-edegara Siza banyere ya. Ya mere m jiri kpọpụta ya nʼihu unu niile, ma karịsịa nʼihu gị onwe gị eze Agripa, ka ọ ga-abụ anyị tulesịa ihe banyere ya, ka m nwee ihe m ga-ede. 27 Nʼihi na ọ bụ ihe na-ezighị ezi na m ga-ezipụ onye mkpọrọ na-egosighị nʼebubo e boro ya.”

In Other Versions

Acts 25 in the ANGEFD

Acts 25 in the ANTPNG2D

Acts 25 in the AS21

Acts 25 in the BAGH

Acts 25 in the BBPNG

Acts 25 in the BBT1E

Acts 25 in the BDS

Acts 25 in the BEV

Acts 25 in the BHAD

Acts 25 in the BIB

Acts 25 in the BLPT

Acts 25 in the BNT

Acts 25 in the BNTABOOT

Acts 25 in the BNTLV

Acts 25 in the BOATCB

Acts 25 in the BOATCB2

Acts 25 in the BOBCV

Acts 25 in the BOCNT

Acts 25 in the BOECS

Acts 25 in the BOGWICC

Acts 25 in the BOHCB

Acts 25 in the BOHCV

Acts 25 in the BOHLNT

Acts 25 in the BOHNTLTAL

Acts 25 in the BOILNTAP

Acts 25 in the BOITCV

Acts 25 in the BOKCV

Acts 25 in the BOKCV2

Acts 25 in the BOKHWOG

Acts 25 in the BOKSSV

Acts 25 in the BOLCB

Acts 25 in the BOLCB2

Acts 25 in the BOMCV

Acts 25 in the BONAV

Acts 25 in the BONCB

Acts 25 in the BONLT

Acts 25 in the BONUT2

Acts 25 in the BOPLNT

Acts 25 in the BOSCB

Acts 25 in the BOSNC

Acts 25 in the BOTLNT

Acts 25 in the BOVCB

Acts 25 in the BOYCB

Acts 25 in the BPBB

Acts 25 in the BPH

Acts 25 in the BSB

Acts 25 in the CCB

Acts 25 in the CUV

Acts 25 in the CUVS

Acts 25 in the DBT

Acts 25 in the DGDNT

Acts 25 in the DHNT

Acts 25 in the DNT

Acts 25 in the ELBE

Acts 25 in the EMTV

Acts 25 in the ESV

Acts 25 in the FBV

Acts 25 in the FEB

Acts 25 in the GGMNT

Acts 25 in the GNT

Acts 25 in the HARY

Acts 25 in the HNT

Acts 25 in the IRVA

Acts 25 in the IRVB

Acts 25 in the IRVG

Acts 25 in the IRVH

Acts 25 in the IRVK

Acts 25 in the IRVM

Acts 25 in the IRVM2

Acts 25 in the IRVO

Acts 25 in the IRVP

Acts 25 in the IRVT

Acts 25 in the IRVT2

Acts 25 in the IRVU

Acts 25 in the ISVN

Acts 25 in the JSNT

Acts 25 in the KAPI

Acts 25 in the KBT1ETNIK

Acts 25 in the KBV

Acts 25 in the KJV

Acts 25 in the KNFD

Acts 25 in the LBA

Acts 25 in the LBLA

Acts 25 in the LNT

Acts 25 in the LSV

Acts 25 in the MAAL

Acts 25 in the MBV

Acts 25 in the MBV2

Acts 25 in the MHNT

Acts 25 in the MKNFD

Acts 25 in the MNG

Acts 25 in the MNT

Acts 25 in the MNT2

Acts 25 in the MRS1T

Acts 25 in the NAA

Acts 25 in the NASB

Acts 25 in the NBLA

Acts 25 in the NBS

Acts 25 in the NBVTP

Acts 25 in the NET2

Acts 25 in the NIV11

Acts 25 in the NNT

Acts 25 in the NNT2

Acts 25 in the NNT3

Acts 25 in the PDDPT

Acts 25 in the PFNT

Acts 25 in the RMNT

Acts 25 in the SBIAS

Acts 25 in the SBIBS

Acts 25 in the SBIBS2

Acts 25 in the SBICS

Acts 25 in the SBIDS

Acts 25 in the SBIGS

Acts 25 in the SBIHS

Acts 25 in the SBIIS

Acts 25 in the SBIIS2

Acts 25 in the SBIIS3

Acts 25 in the SBIKS

Acts 25 in the SBIKS2

Acts 25 in the SBIMS

Acts 25 in the SBIOS

Acts 25 in the SBIPS

Acts 25 in the SBISS

Acts 25 in the SBITS

Acts 25 in the SBITS2

Acts 25 in the SBITS3

Acts 25 in the SBITS4

Acts 25 in the SBIUS

Acts 25 in the SBIVS

Acts 25 in the SBT

Acts 25 in the SBT1E

Acts 25 in the SCHL

Acts 25 in the SNT

Acts 25 in the SUSU

Acts 25 in the SUSU2

Acts 25 in the SYNO

Acts 25 in the TBIAOTANT

Acts 25 in the TBT1E

Acts 25 in the TBT1E2

Acts 25 in the TFTIP

Acts 25 in the TFTU

Acts 25 in the TGNTATF3T

Acts 25 in the THAI

Acts 25 in the TNFD

Acts 25 in the TNT

Acts 25 in the TNTIK

Acts 25 in the TNTIL

Acts 25 in the TNTIN

Acts 25 in the TNTIP

Acts 25 in the TNTIZ

Acts 25 in the TOMA

Acts 25 in the TTENT

Acts 25 in the UBG

Acts 25 in the UGV

Acts 25 in the UGV2

Acts 25 in the UGV3

Acts 25 in the VBL

Acts 25 in the VDCC

Acts 25 in the YALU

Acts 25 in the YAPE

Acts 25 in the YBVTP

Acts 25 in the ZBP