Deuteronomy 22 (BOICB)

1 Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ atụrụ nwanna gị ka ọ na-akpafu, emela dịka a ga-asị na ị hụghị ya, jide ya, kpụlaara ya onye nwe ya. 2 Ọ bụrụ na ị maghị onye nwe ya, maọbụ na nwanna gị ebighị nso, were ya laa nʼụlọ gị, hapụ ya nʼebe ahụ tutu onye nwe ya achọwa ya, mgbe ahụ ka ị ga-ewere ya nyeghachi ya. 3 Otu a kwa ka ị ga-eme ma ị hụ ịnyịnya ibu nwanna gị, maọbụ uwe, maọbụ ihe ọbụla ị ga-atụtụta. Were ya debere onye nwe ya. 4 Ọ bụrụ na ị hụ ịnyịnya ibu, maọbụ ehi nwanna gị ka ha dara nʼụzọ, elela anya nʼebe ọzọ, gaa nyere ya aka bulie ya. 5 Nwanyị ekwesighị iyi uwe ndị ikom, nwoke agaghị eyikwa uwe ndị inyom. Nʼihi na ihe arụ ka ọ bụ nʼanya ONYENWE ANYỊ Chineke gị. 6 Ọ bụrụ na ị hụ akwụ nnụnụ tọgbọ nʼala, maọbụ nke dị nʼelu osisi, ọ bụrụkwa na ọ bụ nnụnụ nke nọ nʼelu ụmụ ya, maọbụ nʼelu akwa ya, ewerela nne na ụmụ nnụnụ ya. 7 Hapụ nne nnụnụ ka ọ laa, ma were naanị ụmụ ya. Ihe ga-agakwara gị nke ọma nʼihi ya, ị ga-enwekwa ndụ ogologo. 8 Mgbe i wuru ụlọ, wuokwa ihe mgbochi gburugburu elu ya, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara isi nʼelu ya dapụ, si otu a wetara ụlọ na onye nwe ya ikpe ọmụma nke iwufu ọbara. 9 Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi vaịnị gị. Ọ bụrụ na i mee otu a, ihe ọkụkụ ndị a, na mkpụrụ ha mịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ. 10 Ejikọla ehi na ịnyịnya ibu maka ịdọ ihe e ji akọ ala ubi. 11 Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ kpaa, dịka uwe ajị anụ na ogho ọcha kpaa. 12 Ị ga-akpanyere onwe gị ihe ogho akpara akpa, nʼakụkụ anọ nke uwe mgbokwasị gị. 13 Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaagbọghọ, mesie mgbe o dinakwuru ya kpebie nʼobi ya na ọ chọkwaghị ịlụ ya ọzọ, 14 ọ bụrụ na nwoke a ekwutọọ nwaagbọghọ ahụ, mebie aha ya kwuo na nwaagbọghọ ahụ amatalarị nwoke tupu ha abụọ alụọ, 15 nne nwaagbọghọ ahụ, na nna ya, ga-ewere ihe ga-egosi na nwa ha amabeghị nwoke gaa nʼihu ndị okenye obodo ahụ, nʼọnụ ụzọ ama. 16 Nna nwaagbọghọ ahụ ga-agwa ndị okenye, “Enyere m nwoke a nwa m nwanyị dịka nwunye, ma ugbu a, ọ chọkwaghị ịlụ ya. 17 Ugbu a, o boola ya ebubo ihere, sị, ‘Achọpụtaghị m ihe ọbụla nʼahụ nwa gị nwanyị a ihe na-egosi na ọ maghị nwoke.’ Ma nke a bụ ihe ngosi na ada anyị amaghị nwoke.” Mgbe ahụ ndị mụrụ ya ga-agbasapụ akwa ahụ nʼihu ndị okenye obodo ahụ. 18 Ndị okenye obodo ahụ ga-akpọrọ nwoke nyekwa ya ahụhụ. 19 Ha ga-emekwa ya ka ọ kwụọ nna nwaagbọghọ ahụ narị shekel ọlaọcha, nʼihi na o boro nwaagbọghọ Izrel na-amaghị nwoke ebubo ụgha. Nwaagbọghọ ahụ ga-anọgide bụrụ nwunye nwoke ahụ. Nwoke ahụ agaghị achụpụkwa ya ụbọchị ndụ ya niile. 20 Ma ọ bụrụ na ebubo nwoke ahụ bụ eziokwu, na achọpụtaghị ihe gosiri na nwaagbọghọ ahụ amaghị nwoke. 21 A ga-eduru nwaagbọghọ ahụ pụta nʼọnụ ụzọ ụlọ nna ya, nʼebe ahụ ka ndị ikom obodo ya ga-anọ were nkume tugbuo ya. Nʼihi na o mere ihe ihere jọgburu onwe ya nʼIzrel, site nʼibi ndụ akwụna mgbe ọ ka nọ nʼụlọ nne ya na nna ya. Ị ghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ ahụ site nʼetiti unu. 22 Ọ bụrụ na e jide nwoke ebe ya na nwunye onye ọzọ dina, ma nwoke ahụ dinara ya ma nwanyị ahụ o dinara aghaghị ịnwụ. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel. 23 Ma ọ bụrụ na nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ na nwoke ọzọ edinakọọ nʼime obodo, 24 ya na nwoke ahụ ka a ga-eduru gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo, were nkume tugbuo ha nʼebe ahụ, ka ha nwụọ, nwaagbọghọ ahụ ga-anwụ nʼihi na o tighị mkpu, ma nwoke ahụ ga-anwụ nʼihi na o mebiela nwunye nwoke ibe ya na-achọ ịlụ. Unu aghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti unu. 25 Ma ọ bụrụ na nwoke ezute nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ nʼọhịa, were ike mee ka ha abụọ dina, ọ bụ naanị nwoke ahụ ga-anwụ. 26 Aka nwaagbọghọ ahụ dị ọcha, ọ dịghị mmehie o mere nke ikpe ọnwụ ji adịrị ya, nʼihi na ọnọdụ ya dị ka ọnọdụ mmadụ ahụ onye iro ya bịakwasịrị na mberede gbuo ya. 27 A pụrụ ị sị na nwaagbọghọ ahụ tiri mkpu ma ọ dịghị onye nọ ịnapụta ya. 28 Ọ bụrụ na nwoke ọbụla ejiri ike jide nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, nke nwoke ọbụla na-ekwebeghị nkwa ịlụ, mee ka ha abụọ dinaa, 29 nwoke ahụ ga-akwụ nna nwaagbọghọ ahụ iri shekel ọlaọcha ise. Ọ ga-alụkwa nwaagbọghọ ahụ nʼihi na o mebiela ya. Ọ gakwaghị achụpụ ya ụbọchị niile nke ndụ ya. 30 Nwoke ọbụla agaghị alụ nwunye nna ya, nʼihi na ọ bụ nwunye nna ya. Ime ihe dị otu a bụ imerụ ihe ndina nna ya.

In Other Versions

Deuteronomy 22 in the ANGEFD

Deuteronomy 22 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 22 in the AS21

Deuteronomy 22 in the BAGH

Deuteronomy 22 in the BBPNG

Deuteronomy 22 in the BBT1E

Deuteronomy 22 in the BDS

Deuteronomy 22 in the BEV

Deuteronomy 22 in the BHAD

Deuteronomy 22 in the BIB

Deuteronomy 22 in the BLPT

Deuteronomy 22 in the BNT

Deuteronomy 22 in the BNTABOOT

Deuteronomy 22 in the BNTLV

Deuteronomy 22 in the BOATCB

Deuteronomy 22 in the BOATCB2

Deuteronomy 22 in the BOBCV

Deuteronomy 22 in the BOCNT

Deuteronomy 22 in the BOECS

Deuteronomy 22 in the BOGWICC

Deuteronomy 22 in the BOHCB

Deuteronomy 22 in the BOHCV

Deuteronomy 22 in the BOHLNT

Deuteronomy 22 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 22 in the BOILNTAP

Deuteronomy 22 in the BOITCV

Deuteronomy 22 in the BOKCV

Deuteronomy 22 in the BOKCV2

Deuteronomy 22 in the BOKHWOG

Deuteronomy 22 in the BOKSSV

Deuteronomy 22 in the BOLCB

Deuteronomy 22 in the BOLCB2

Deuteronomy 22 in the BOMCV

Deuteronomy 22 in the BONAV

Deuteronomy 22 in the BONCB

Deuteronomy 22 in the BONLT

Deuteronomy 22 in the BONUT2

Deuteronomy 22 in the BOPLNT

Deuteronomy 22 in the BOSCB

Deuteronomy 22 in the BOSNC

Deuteronomy 22 in the BOTLNT

Deuteronomy 22 in the BOVCB

Deuteronomy 22 in the BOYCB

Deuteronomy 22 in the BPBB

Deuteronomy 22 in the BPH

Deuteronomy 22 in the BSB

Deuteronomy 22 in the CCB

Deuteronomy 22 in the CUV

Deuteronomy 22 in the CUVS

Deuteronomy 22 in the DBT

Deuteronomy 22 in the DGDNT

Deuteronomy 22 in the DHNT

Deuteronomy 22 in the DNT

Deuteronomy 22 in the ELBE

Deuteronomy 22 in the EMTV

Deuteronomy 22 in the ESV

Deuteronomy 22 in the FBV

Deuteronomy 22 in the FEB

Deuteronomy 22 in the GGMNT

Deuteronomy 22 in the GNT

Deuteronomy 22 in the HARY

Deuteronomy 22 in the HNT

Deuteronomy 22 in the IRVA

Deuteronomy 22 in the IRVB

Deuteronomy 22 in the IRVG

Deuteronomy 22 in the IRVH

Deuteronomy 22 in the IRVK

Deuteronomy 22 in the IRVM

Deuteronomy 22 in the IRVM2

Deuteronomy 22 in the IRVO

Deuteronomy 22 in the IRVP

Deuteronomy 22 in the IRVT

Deuteronomy 22 in the IRVT2

Deuteronomy 22 in the IRVU

Deuteronomy 22 in the ISVN

Deuteronomy 22 in the JSNT

Deuteronomy 22 in the KAPI

Deuteronomy 22 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 22 in the KBV

Deuteronomy 22 in the KJV

Deuteronomy 22 in the KNFD

Deuteronomy 22 in the LBA

Deuteronomy 22 in the LBLA

Deuteronomy 22 in the LNT

Deuteronomy 22 in the LSV

Deuteronomy 22 in the MAAL

Deuteronomy 22 in the MBV

Deuteronomy 22 in the MBV2

Deuteronomy 22 in the MHNT

Deuteronomy 22 in the MKNFD

Deuteronomy 22 in the MNG

Deuteronomy 22 in the MNT

Deuteronomy 22 in the MNT2

Deuteronomy 22 in the MRS1T

Deuteronomy 22 in the NAA

Deuteronomy 22 in the NASB

Deuteronomy 22 in the NBLA

Deuteronomy 22 in the NBS

Deuteronomy 22 in the NBVTP

Deuteronomy 22 in the NET2

Deuteronomy 22 in the NIV11

Deuteronomy 22 in the NNT

Deuteronomy 22 in the NNT2

Deuteronomy 22 in the NNT3

Deuteronomy 22 in the PDDPT

Deuteronomy 22 in the PFNT

Deuteronomy 22 in the RMNT

Deuteronomy 22 in the SBIAS

Deuteronomy 22 in the SBIBS

Deuteronomy 22 in the SBIBS2

Deuteronomy 22 in the SBICS

Deuteronomy 22 in the SBIDS

Deuteronomy 22 in the SBIGS

Deuteronomy 22 in the SBIHS

Deuteronomy 22 in the SBIIS

Deuteronomy 22 in the SBIIS2

Deuteronomy 22 in the SBIIS3

Deuteronomy 22 in the SBIKS

Deuteronomy 22 in the SBIKS2

Deuteronomy 22 in the SBIMS

Deuteronomy 22 in the SBIOS

Deuteronomy 22 in the SBIPS

Deuteronomy 22 in the SBISS

Deuteronomy 22 in the SBITS

Deuteronomy 22 in the SBITS2

Deuteronomy 22 in the SBITS3

Deuteronomy 22 in the SBITS4

Deuteronomy 22 in the SBIUS

Deuteronomy 22 in the SBIVS

Deuteronomy 22 in the SBT

Deuteronomy 22 in the SBT1E

Deuteronomy 22 in the SCHL

Deuteronomy 22 in the SNT

Deuteronomy 22 in the SUSU

Deuteronomy 22 in the SUSU2

Deuteronomy 22 in the SYNO

Deuteronomy 22 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 22 in the TBT1E

Deuteronomy 22 in the TBT1E2

Deuteronomy 22 in the TFTIP

Deuteronomy 22 in the TFTU

Deuteronomy 22 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 22 in the THAI

Deuteronomy 22 in the TNFD

Deuteronomy 22 in the TNT

Deuteronomy 22 in the TNTIK

Deuteronomy 22 in the TNTIL

Deuteronomy 22 in the TNTIN

Deuteronomy 22 in the TNTIP

Deuteronomy 22 in the TNTIZ

Deuteronomy 22 in the TOMA

Deuteronomy 22 in the TTENT

Deuteronomy 22 in the UBG

Deuteronomy 22 in the UGV

Deuteronomy 22 in the UGV2

Deuteronomy 22 in the UGV3

Deuteronomy 22 in the VBL

Deuteronomy 22 in the VDCC

Deuteronomy 22 in the YALU

Deuteronomy 22 in the YAPE

Deuteronomy 22 in the YBVTP

Deuteronomy 22 in the ZBP